Ọrịa Aids n’Africa—Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ụta Dịịrị Krisendọm?
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! n’Africa
Dị ka e ji ya mee ihe n’isiokwu a, okwu bụ́ “Krisendọm” na-ezo aka n’Iso Ụzọ Kraịst ọnụ efu, bụ́ nke dị iche n’Iso Ụzọ Kraịst nke Bible.
Krisendọm
“Akụkụ ụwa ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ndị bi na ha na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst.”—Webster’s New World Dictionary.
Ọrịa AIDS
“Ọnọdụ nke mbibi ikike ahụ mmadụ nwere ịlụso ọrịa ọgụ nke na-agụnye mbibi nke nje usoro mkpụrụ ndụ na-ebibi usoro na-alụso ọrịa ọgụ.” —Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary.
ỌRỊA AIDS bụ ihe otiti zuru ụwa ọnụ. Ihe dị ka 17 nde mmadụ ebuteworị nje HIV, bụ́ nje na-akpata ọrịa AIDS. Ọ na-agbasakwa n’ụzọ dị oké ngwa.
Ọ bụ ezie na e lebawo anya n’ụzọ dị ukwuu n’ihe banyere ọgwụ, ọchịchị, na mmetụta uche nke e jikọrọ ha na ihe otiti a, e kwuwo ihe dị nta banyere ihe banyere okpukpe ndị ọ gụnyere. Ugbu a echiche bụ́ na a na-ejikọta okpukpe ná mgbasa nke ọrịa AIDS pụrụ iyi ihe na-ekweghị omume nye ụfọdụ ndị na-agụ akwụkwọ anyị. Ma ọ bụghị ihe ezi uche na-adịghị ya mgbe ị tụlere ọnọdụ biliteworo na kọntinent Africa.
Ọrịa AIDS etiwo Africa aka dị oké njọ.a Ụfọdụ na-ekwu na kọntinent ahụ nwere 67 pasent nke ndị nile bu ọrịa AIDS n’ụwa. Na Chad, ọnụ ọgụgụ ndị bu ọrịa ahụ e nyere akụkọ ha n’ime afọ ise gara aga ejiriwo 100 ugboro mụbaa. Ma, a na-eme atụmatụ na e nyewo akụkọ banyere nanị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị nile na-arịa ọrịa ahụ. Dị ka akụkọ Ụlọ Akụ̀ Ụwa nyere si dị, ọrịa AIDS abụrụwo ihe kasị akpata ọnwụ n’etiti ndị meworo okenye n’ọtụtụ nnukwu obodo n’Africa.
Okpukpe—Ò Keere Òkè?
N’ezie, Iso Ụzọ Kraịst—okpukpe nke Jisọs Kraịst kụziri—apụghị ịbụ ya ka a ga-ata ụta maka ọdachi a. Otú ọ dị, dị ka e gosiri n’okpuru, okwu ahụ bụ́ “Krisendọm” na-ejikọta ala ndị ahụ ebe ndị mmadụ na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst. Ọ pụtara ìhè na aka Krisendọm dị na ya. Ọ bụghị na chọọchị dị iche iche kpatara ma ọ bụ gbasara nje ọrịa AIDS n’onwe ha. Kama ọrịa AIDS agbasawo n’Africa n’ụzọ bụ isi n’ihi mmekọahụ nwoke na nwanyị a na-enwe aghara aghara.b A pụrụ isi otú a kpọọ ọrịa AIDS nsogbu omume, n’ihi nke ahụkwa, na-akpata ụfọdụ ajụjụ okpukpe ndị siri ike. E kwuwerị, “Iso Ụzọ Kraịst” Africa bụ ihe e si kpọmkwem n’ala Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa webata. Ndị ndú chọọchị malitere ọrụ nke ịtọghata ndị Africa gaa n’ụdị okpukpe nke ha, na-ekwu na o wetara ụzọ ndụ nke ka ụzọ ọdịnala ndị Africa mma. Mmetụta Krisendọm ò mere n’ezie ka omume nke ụmụazụ ọhụrụ ya ka mma? Ọgba aghara ọrịa AIDS na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ bụ nnọọ ihe na-emegide nke ahụ weere ọnọdụ.
Tụlee, dị ka ihe atụ, mba Chad. N’ime obodo ukwu anọ ya ndị bụ isi, atọ nwere ụba mmadụ buru ibu nke “ndị Kraịst.” Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu n’otu nke ọzọ bụ ndị Alakụba. Ma, ọ bụ n’obodo ukwu atọ “ndị Kraịst” ahụ ka nje ahụ na-akpa ike ugbu a! E nwere otu ọnọdụ ahụ na kọntinent ahụ dum. Etiti na ebe ndịda Africa, bụ́ ndị Kraịst n’ọnụ efu, nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ka elu nke ibute ọrịa ahụ karịa Ebe Ugwu Africa, nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ya bụ ndị Alakụba.
Otú Africa Si Ghọọ “Onye Kraịst”
N’ihi gịnị ka nje a jiworo gbasaa oké ngwa ngwa otú a n’etiti ndị mmadụ na-azọrọ na ha bụ ụmụazụ Kraịst? N’eziokwu, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị Africa na-akpọ onwe ha ndị Kraịst, ọ bụ nnọọ ole na ole na-adị ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume nke Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ ndị e setịpụrụ n’ime Bible. Nke a yiri ka ọ bụ kpomkwem ihe si n’ụzọ ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm jiri rụọ ọrụ “ntọghata” ha nke ndị Africa pụta.
Na narị afọ nke 18 na nke 19, a malitere ịkatọ nkwenkwe ọdịnala Krisendọm. Oké nkatọ ghọrọ ihe zuru ebe nile, na-ewetu Bible n’ala n’anya ọtụtụ mmadụ ịbụ akwụkwọ ọgụgụ efu nke oge ochie. A malitere ịnakwere nkụzi evolushọn, ọbụna n’etiti ndị ụkọchukwu. A kụrụ mkpụrụ nke obi abụọ. A rụrụ inwe okwukwe n’Akwụkwọ Nsọ ụka. N’ọnọdụ a ọ dịghị eju anya na mgbalị Krisendọm ‘ịtọghata’ ndị Africa lekwasịrị anya n’ụzọ ka ukwuu n’ihe nkịtị. Ndị ozi ala ọzọ chọọchị gbasara oziọma ọrụ ebere, na-emesikarị ihe ike n’ịrụ ọrụ nkwalite ọdịmma ụmụ mmadụ karịa n’inyere ndị a tọghatara aka ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible banyere omume ọma. Ikekwe n’elezighị anya, ndị ozi ala ọzọ nyere aka n’imebi ọdịdị omume nke dị adị.
Dị ka ihe atụ, eri ogologo oge, ịlụ karịa otu nwanyị abụrụwo omenala dị n’ọtụtụ mmepeanya nke ndị Africa. Otú ọ dị, inwe mmekọahụ aghara aghara dị ụkọ, ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ n’agbụrụ dị iche iche nwere iwu ndị siri ike banyere ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye. Joseph Darnas, onye laworo ezumike nká n’ọrụ nkụzi, onye a maara nke ọma na Chad, gwara Teta! na tupu ndị ozi ala ọzọ nke chọọchị abịa, “e chere na ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye na-eweta isi ọjọọ.” N’ihi ya, “a na-enye onye ikpe mara ahụhụ dị ukwuu maka itinye ógbè ahụ n’ihe ize ndụ—ọtụtụ mgbe site n’ọnwụ.” Ọ̀ bụ nkwenkwe ụgha? Ee, ma nkwenkwe ndị dị otú ahụ gbochitụrụ inwe mmekọahụ aghara aghara.
Ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm ewee rute. Ha mere nkwusa megide ịlụ karịa otu nwanyị ma ha mere ihe dị nta iji mee ka a gbasoo ụkpụrụ Bible banyere omume ọma. Ọ bụ ezie na Bible kwuru na a ga-achụpụ ndị na-akwa iko na-enweghị nchegharị n’ọgbakọ ndị Kraịst, o siri ike chọọchị Krisendọm inye ndị dara iwu ahụhụ. (1 Ndị Kọrint 5:11-13) Ruo ugbu a, ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Africa enweela aha ọjọọ maka omume rụrụ arụ ha, ma ha ka bụ ndị òtù chọọchị nwere ezi nguzo. A dịghị ahụkebe ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye n’etiti ndị Kraịst ọnụ efu n’Africa.
E nwekwara ihe nlereanya ọjọọ nke ndị ụkọchukwu n’onwe ha na-esetịpụ. N’ọdịbendị a nke dabeere n’ezinụlọ, ọ bụ ihe dị ka o kwesịrị ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma nwee ọtụtụ ụmụ. Eleghị anya nke a bụ ihe mere ọnụ ọgụgụ na-eju anya nke ndị ụkọchukwu Katọlik ji chee na ha ziri ezi n’ejighị nkwa ha nke ịdị ọcha na nke alụghị nwunye kpọrọ ihe. The New York Times nke May 3, 1980, kọrọ sị: “N’ọtụtụ akụkụ nke ime ọhịa, . . . ndị ụkọchukwu na ndị bishọp na-alụ karịa otu nwanyị.”
Dị ka o si adịkarị, a dịghị edejupụta akwụkwọ alụmdi na nwunye ndị dị otú ahụ, “ndị nwunye” ahụkwa, n’ezie, bụ nanị ndị iko nwanyị. A pụghị ileghara àgwà ọjọọ dị otú ahụ anya dị ka ihe na-adịghị mkpa. Dị ka Times ahụ si kọọ, “otu onye ụkọchukwu Katọlik a ma ama” na-ekwenye na “onye ụkọchukwu Africa bụ ihe nnọchianya nke ike, onye ike dị n’aka kama ịbụ ohu nke Jisọs Kraịst.” O yiri ka ozi na-esite n’aka ndị a “ike dị n’aka” bụ, “Na-emenụ dị ka m na-ekwu, ọ bụghị dị ka m na-eme.”
Mgbasa nke Ihe Ntụrụndụ Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa
N’aka nke ọzọ, a gaghị eleghara njupụta nke ihe ntụrụndụ rụrụ arụ n’ụzọ mmekọahụ anya, bụ́ nke nubataworo n’ime Africa n’afọ ndị a. Na Chad ụlọ ihe nkiri vidio a na-adịghị eleru anya nke ọha mmadụ ndị na-enye ihe ntụrụndụ dị otú ahụ ebilitewo n’ebe nile—n’ebe obibi onwe onye, n’ebe a na-adọba ụgbọ ala, na, ọtụtụ mgbe, n’ogige ebe obibi dị iche iche mgbe chi jiri. Ihe ngosi ndị a dị ọnụ ala, na-efu ihe dị ala dị ka 25 franc (cent 5, U.S.). Obere ụmụaka na-aga. Olee ebe ihe nkiri a si abịa? Ihe ka ọtụtụ n’ime ya sitere na United States—ala na-azọrọ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ya bụ ndị Kraịst!
Ma mgbasa a nke ọdịbendị Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa ò nwewo mmetụta ọ bụla n’ezie n’ahụ ndị na-ekiri ya? Otu onye ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova, onye jeworo ozi afọ 14 n’Etiti Africa, na-asị: “Ndị mba a na mba ndị Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa adịghị enwecha mmekọrịta ma e wezụga site n’ihe ha na-ahụ na teepu vidio. Ha chọrọ ịdị ka ndị Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa ha na-ahụ n’ihe nkiri ndị a. Achọpụtabeghị m ihe ọmụmụ ọ bụla e dekọrọ edekọ iji nwapụta nke a, ma o yiri ihe doro ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ n’ebe a anya na ntụrụndụ ndị dị otú a na-akwalite mmekọahụ rụrụ arụ.”
Lee ka o si bụrụ ihe na-eju anya na ka ndị ọrụ ahụ ike na-agbalịsi ike ịkwụsị mgbasa ọrịa mmekọahụ na-egbu egbu, ebe ndị a na-akpọkarị mba ndị Kraịst na-ekpopụta n’ụba atụmatụ ndị na-akwalite àgwà rụrụ arụ, ndị dị oké ize ndụ! Ọ bụ ezie na chọọchị dị iche iche emewo ihe dị nta iji gbochie ọnọdụ a ná mba nke ha ma ọ bụ n’ofesi, gọọmenti ụfọdụ nke Africa, dị ka Chad na Cameroon, agbalịwo ịmachibido iwu ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, ibelata mbata nke ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-abata ná mba ha. Ma mgbalị ha akụwo afọ n’ala mgbe mgbe.
Ihe na-esi n’ihe a nile apụta abụrụwo mgbasa sara mbara nke nretọ omume ọma n’etiti ndị Africa bụ “ndị Kraịst.” Ọnọdụ akụ̀ na ụba jọrọ njọ enwewokwa mmetụta na-ebibi ihe. N’ihi na ọrụ dị ụkọ, a na-amanyekarị ndị ikom ịhapụ ezinụlọ ha ruo ọtụtụ ọnwa iji wee chọta ọrụ. Ndị ikom dị otú ahụ bụ nnọọ ndị ndị akwụna nọ n’ebe ahụ na-elekwasị anya. Otú ọ dị, ndị akwụna na-abụkarị ndị dara ogbenye n’onwe ha. Ndị mụrụ ụmụ na-achọ ka a kwụọ ha ụgwọ isi nwanyị dị elu sokwa na-akpata ya. Ọtụtụ ndị ikom adịghị alụ nwunye n’ihi na ha apụghị inweta ego dị mkpa iji kwụọ ụgwọ isi nwanyị. N’ihi ya ụfọdụ na-ekpebizi ibi ndụ nke inwe mmekọahụ aghara aghara. N’ọnọdụ omume na akụ̀ na ụba dị otú ahụ, ọrịa AIDS agbasawo n’ụzọ dị oké ngwa.
Ihe Ngwọta Nye Ọgba Aghara Ahụ
N’ụzọ doro anya, ọ bụghị Krisendọm ka ụta nile dịịrị maka ọgba aghara ọrịa AIDS n’Africa. Ma o doro anya n’ụzọ dị mwute na a ga-ata ya ụta dị ukwuu. Nke a nwere ihe dị oké mkpa ọ pụtara nye ndị chọrọ iso ná ndị Jisọs kpọrọ “ndị na-akpọ isiala n’ezie.”—Jọn 4:23.
E wezụga ụta, gịnị ka a pụrụ ime iji kwụsị ihe otiti ọrịa AIDS? Gọọmenti dị iche iche n’Africa amalitewo mkpọsa mgbochi ọrịa AIDS, na-akwalite iji condom eme ihe. Ma Dr. Samuel Brew-Graves, onye nnọchiteanya nke Òtù Ahụ Ike Ụwa maka Nigeria, ji ezoghị ọnụ kweta nke a, sị: “Onye ahụ aghaghị ịgbaso ụzọ ndụ dị mma . . . , ezinụlọ ahụ aghaghịkwa . . . izere inwe mmekọahụ aghara aghara.”
Ogologo oge tupu ọrịa AIDS aghọọ okwu ọha maara, Bible kagburu inwe mmekọahụ aghara aghara ma kwalite ịdị ọcha, njide onwe onye, na ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye. (Ilu 5:18-20; 1 Ndị Kọrint 6:18) Ọtụtụ narị puku Ndịàmà Jehova n’Africa pụrụ ịgba akaebe na ịgbaso ụkpụrụ ndị a na-enye nchebe pụtara ìhè pụọ n’ebe ọrịa AIDS na ọrịa mmekọahụ ndị ọzọ dị. Nrapagidesi ike ha n’ụkpụrụ Bible bụ nnọọ amamikpe nye Krisendọm. Ezi ndị Kraịst a etinyewokwa olileanya ha n’ụwa ọhụrụ na-abịa nke ‘ezi omume ga-ebi n’ime ya.’ (2 Pita 3:13) Nye ndị nwere okwukwe, nke a bụ ngwọta kasịnụ nye ọgba aghara ọrịa AIDS.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee usoro isiokwu bụ́ “Ọrịa AIDS n’Africa—Olee Ụzọ Ọ Ga-esi Kwụsị?” ná mbipụta anyị nke November 8, 1992.
b A pụkwara ịgbasa ọrịa ahụ site ná mmịnye ọbara na site n’iji ntụ́tụ́ e ji gbanye mmadụ ọgwụ n’akwara mee ihe. Ndị Kraịst ụfọdụ aka ha dị ọcha ebutewo ọrịa ahụ site n’aka ndị òtù ọlụlụ ha nweworo mmekọahụ rụrụ arụ ma ọ bụ jiworo ọgwụ ọjọọ mee ihe.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 26]
“N’ọtụtụ akụkụ nke ime ọhịa, . . . ndị ụkọchukwu na ndị bishọp na-alụ karịa otu nwanyị.”—The New York Times
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Ihe nlereanya ọjọọ nke ndị ụkọchukwu Krisendọm akwalitewo ntiwapụ nke inwe mmekọahụ aghara aghara n’Africa
[Foto dị na peeji nke 27]
A na-ekpughe ndị na-eto eto nye ntụrụndụ rụrụ arụ nke mba “ndị Kraịst” na-ebuga ná mba ọzọ