Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 7/8 p. 4-7
  • Mgbidi Ndị Na-egbochi Nkwurịta Okwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbidi Ndị Na-egbochi Nkwurịta Okwu
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ọdịbendị Si Emetụta Ndị Anyị Bụ
  • ‘Ụzọ nke Anyị Kasị Mma!’
  • Ịgbasawanye Echiche Anyị
  • Ibibi Mgbidi Iji Wuo Àkwà
    Teta!—1996
  • Ọdịbendị Obodo na Ụkpụrụ Ndị Kraịst Hà Kwekọrọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Anyị Bi n’Obodo Ọzọ?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Gịnị Ka M Pụrụ Ime Ma M Nọrọ n’Obodo Omenala Ha Dị Iche na nke Anyị?
    Teta!—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 7/8 p. 4-7

Mgbidi Ndị Na-egbochi Nkwurịta Okwu

ROBERT bụ onye ozi ala ọzọ nke Watch Tower, onye bi na Sierra Leone, Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa. Otu ụbọchị n’oge na-adịghị anya mgbe ọ batasịrị ná mba ahụ, ka ọ na-aga n’okporo ụzọ, ọ hụrụ na ụmụntakịrị ógbè ahụ na-agụ ya ka egwú, sị: “Onye ọcha! Onye ọcha!” Robert, bụ́ onye isi ojii si America, legharịrị anya gburugburu ịhụ onye ọcha ahụ, ma ọ dịghị onye ọzọ nọ n’ebe ahụ. Mgbe ahụ ọ ghọtara na ọ bụ ya ka ụmụaka ahụ na-akpọ!

E nweghị obi ọjọọ dị n’egwú ahụ. Ụmụntakịrị ahụ na-ekwupụta nanị mmata ha matara na Robert sitere n’ọdịbendị dị iche na nke ha. Ịkpọ Robert onye ọcha bụ ụzọ kasị mma ha pụrụ icheta isi kwupụta ndịrịta iche ahụ.

Otú Ọdịbendị Si Emetụta Ndị Anyị Bụ

A kọwawo ọdịbendị n’ụzọ sara mbara dị ka “ụdị echiche e nwekọrọ ọnụ, . . . omenala, nkweta, na ihe ọmụma nke e ji mara ụzọ ịdị ndụ.” Anyị na-amụta ọtụtụ abamuru ọdịbendị site ná nkụzi efu, ma anyị na-amụtakwa ihe dị ukwuu ọbụna n’amaghị banyere ya. Otu onye nchọpụta kwuru, sị: “Site kpọmkwem na mgbe a mụrụ [nwata], omenala nke a mụnyere ya n’ime ya na-akpụzi ahụmahụ na akparamàgwà ya. Mgbe ọ na-erule oge ọ pụrụ ikwu okwu, ọdịbendị ya akpụziwo ya, mgbe o towokwara eto ma nwee ike ikere òkè n’ihe omume ya, àgwà ọdịbendị ya bụ àgwà ya, nkweta ya bụ nkweta ya, ihe ndị na-ekweghị omume ya bụ ihe ndị na-ekweghị ya omume.”

N’ọtụtụ ụzọ ọdịbendị na-eme ka ndụ dịrị anyị mfe karị. Dị ka ụmụntakịrị anyị na-amụta ngwa ngwa ime ihe ga-atọ ndị mụrụ anyị ụtọ. Ịmara ihe a na-anakwere n’ọha mmadụ anyị na ihe a na-adịghị anakwere na-eduzi anyị n’ime mkpebi banyere otú e si eme omume, ihe a ga-eyi, na otú e si emeso ndị ọzọ.

N’eziokwu, ihe anyị bụ dị ka mmadụ adịghị adabere nanị ná nzụlite ọdịbendị anyị. N’ime ọdịbendị ọ bụla, a na-enwe ndịrịta iche n’etiti ndị mmadụ. Mkpụrụ ndụ ebumpụta ụwa, ahụmahụ anyị ná ndụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ, na-ekpebikwa ụdị ndị anyị bụ. Otú o sina dị, ọdịbendị bụ enyo nke anyị na-esite na ya ahụ ụwa.

Dị ka ihe atụ, ọdịbendị anyị na-ekpebi ọ bụghị nanị asụsụ anyị na-asụ kama otú anyị si asụ ya. N’akụkụ ụfọdụ nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ndị mmadụ na-ewere ikike nke iji nkà jiri ọtụtụ okwu kwuo ihe ha bu n’uche n’oké ihe, na-eji nkwughachi na okwu myirịta eme ihe. N’ụzọ dị iche, ndị mmadụ ná mba ndị dị n’Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa adịghị enwekebe nkwurịta okwu nkịtị. Otu ilu ndị Japan na-egosipụta echiche nke a: “Ọnụ mmadụ pụrụ igbu ya.”

Ọdịbendị anyị na-achịkwa otú anyị si ele oge anya. Na Switzerland ọ bụrụ na i jiri minit iri bịa n’azụ oge n’agba e yiri, a ga-atụ anya ka ị rịọ mgbaghara. Ná mba ndị ọzọ ị pụrụ iji otu hour ma ọ bụ abụọ bịa n’azụ oge, a gaghịkwa atụcha anya ka ị rịọ mgbaghara.

Ọdịbendị anyị na-akụzikwara anyị ihe ndị bara uru. Chee echiche otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị, sị: “Ị na-edo ahụ nke ukwuu. Ị na-ebu ibu n’ezie!” Ọ bụrụ na i tolitere n’ọdịbendị Africa ebe a na-ele ịgba dimkpa anya dị ka ihe dị mma, o yikarịrị ka ị ga-enwe obi ụtọ n’okwu ahụ. Ma ọ bụrụ na a zụlitere gị n’ọdịbendị Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, bụ́ ebe a na-ewere ịdị gịrịgịrị dị ka oké ihe, o yikarịrị ka okwu ahụ bụ eziokwu ga-akpasu gị iwe.

‘Ụzọ nke Anyị Kasị Mma!’

Ihe na-egbochikarị nkwurịta okwu n’etiti ndị ọdịbendị ha dịgasị iche bụ na ndị mmadụ n’ebe nile na-echekarị na ọdịbendị nke ha ka mma. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị na-eche na nkweta, ụkpụrụ, ọdịnala, ụdị ejiji, na echiche anyị banyere ịma mma ziri ezi, kwesị ekwesị, kakwa nke ọ bụla ọzọ mma. Anyị na-achọkarịkwa iji ụkpụrụ ndị nke ìgwè anyị nwere na-ekpe ọdịbendị ndị ọzọ ikpe. A na-akpọ ụdị iche echiche ahụ ịhụ agbụrụ n’anya. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ịhụ agbụrụ n’anya . . . , a pụrụ ikwu na ọ fọrọ nke nta ka o zuo ụwa nile. Ndị òtù nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọdịbendị nile n’ụwa na-ewere ụzọ ịdị ndụ nke ha dị ka nke ka elu ọbụna karịa nke ndị kasị bụrụ ndị agbata obi ha.”

Narị afọ abụọ gara aga, otu onye England ji ọkwá squire kwuru okwu ahụ n’ezoghị ọnụ, sị: “[Site n’ihe] m na-ahụ, ndị ala ọzọ bụ ndị nzuzu.” Onye editọ akwụkwọ nhota nke okwu ndị a pụtara na ya dere, sị: “[Nke a] aghaghị ịbụ echiche zuru ụwa ọnụ dị nnọọ ka e kwuworo ya mgbe ọ bụla.”

Ihe atụ nke ekweghị ibe nọrọ n’ebe ndị nwere ọdịbendị dị iche juru ebe nile. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye Germany na-ede akwụkwọ ọgụgụ bu ụzọ dee ya n’afọ ndị 1930, a na-ekwukarị na ọ bụ onye ndú Nazi bụ́ Hermann Göring kwuru okwu nhota na-esonụ: “Mgbe ọ bụla m nụrụ okwu ahụ bụ ọdịbendị, ana m ewepụta égbè m.”

Echiche ịhụ agbụrụ n’anya siri ike pụrụ iduga ná mkpapụ iche, nke pụkwara imesị duga n’ibu iro na esemokwu. Richard Goldstone bụ ọkàiwu nke Òtù Nnọkọ Ikpe Zuru Ụwa Maka Ndị Omekome nke na-eleba anya na mpụ agha weere ọnọdụ na Rwanda na ebe bụbu Yugoslavia. Banyere omume obi ịta mmiri e mere n’esemokwu abụọ ahụ, o kwuru, sị: “Ihe dị otú a pụrụ ime ebe ọ bụla. N’ebe a e nwere mba abụọ ndị nwere ọdịbendị na akụkọ ihe mere eme dịgasị iche, ma onye agbata obi [na-arụ] otu ụdị arụrụala ahụ megide onye agbata obi ya. Ụdị agha obi ọjọọ nke a nke agbụrụ ma ọ bụ okpukpe bụ nnọọ mkpapụ iche e weere ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ime ihe ike. A ghaghị iwere ìgwè ahụ a na-emegbu dị ka ndị na-erughị ịbụ mmadụ ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ nọ n’ime. Ozugbo e mere nke a, ọ na-eme ka ndị nkịtị nwere onwe ha pụọ n’ihe mgbochi ụkpụrụ omume ndị gaara egbochi ha [pụọ] n’ihe ndị dị otú ahụ jọgburu onwe ha.”

Ịgbasawanye Echiche Anyị

Dị ka ọ na-adịkarị, ndị anyị na-ahọrọ ịbụ ndị enyi anyị bụ ndị dị nnọọ ka anyị, ndị nwere otu omume na ụkpụrụ ndị anyị nwere. Anyị na-atụkwasị ha obi, na-aghọtakwa ha. Anyị na-enwe ntụsara ahụ n’ịnọnyere ha. Ọ bụrụ na anyị elee akparamàgwà nke onye ọzọ anya dị ka nke na-adịghị mma ma ọ bụ nke na-adabaghị adaba, ikekwe ndị enyi anyị ga-ekwenyere anyị n’ihi na ha nwere otu ụdị mbunobi ahụ anyị nwere.

Mgbe ahụ, gịnị ka anyị pụrụ irite site n’iso ndị ọzọ na-emekọrịta ihe, bụ́ ndị dị iche n’ebe anyị nọ n’ihi nzụlite ọdịbendị? Otu ihe bụ na ezi nkwurịta okwu ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere ndị ọzọ ji eche echiche ma na-eme omume otú ha si eme. Kunle, onye Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa na-ekwu, sị: “A na-agwasi ọtụtụ ụmụntakịrị Africa ike ka ha ghara ikwu okwu mgbe ha na-eri nri. Otú ọ dị, ná mba ụfọdụ nke Europe, a na-agba ume inwe mkparịta ụka n’oge nri. Gịnị na-eme mgbe onye Europe na-esoro onye Africa eri nri? Onye Europe ahụ na-enwe ijuanya banyere ihe mere onye Africa ji yie ka ọ gbachiri nnọọ nkịtị ná nri ya. Otú ọ dị, onye Africa na-enwe ijuanya banyere ihe mere onye Europe ji na-achịchọ ọnụ dị ka nnụnụ!” N’ụzọ doro anya, n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ịghọta nzụlite ọdịbendị otu onye na ibe ya pụrụ ime ihe dị ukwuu n’iwepụ mbunobi ọha mmadụ.

Ka anyị na-amata ndị nwere ọdịbendị dị iche, ọ bụghị nanị na anyị na-emeziwanye nghọta anyị banyere ndị ọzọ kama anyị na-aghọtakwa onwe anyị n’ụzọ ka mma. Otu ọkà mmụta mmalite mmadụ dere, sị: “Ihe ikpeazụ onye bi n’ime ime oké osimiri ga-achọpụta ga-abụ mmiri. Ọ ga-amata banyere ịdị adị ya nanị ma ọ bụrụ na ihe mberede ụfọdụ ewepụta ya n’elu ma mee ka o nweta ikuku. . . . Ikike nke ịhụ ọdịbendị nke mba mmadụ n’ozuzu ya . . . na-achọ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke inwe echiche ziri ezi, bụ́ nke dị ụkọ ma ọ bụrụ na ọ dị mgbe a na-enweta ya.” Otú o sina dị, site n’ikpughepụ onwe anyị nye ọdịbendị ndị ọzọ, anyị na-adị ka onye ahụ bi n’oké osimiri, bụ́ onye e mere ka o nweta ikuku; anyị na-amata banyere “mmiri” ọdịbendị nke anyị bi n’ime ya. Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Thomas Abercrombie kwupụtara ya n’ụzọ dị mma, sị: “Onye ọdịbendị ndị ọzọ na-aratabeghị apụghị ịghọta ihe mgbochi ndị nke ya nwere ma ọlị.”

N’ikwu ya ná mkpirikpi, inwe mmasị n’ọdịbendị ndị ọzọ pụrụ ime ka ndụ anyị ka mma site n’ịgbasawanye echiche anyị, ka anyị wee nwee ike ịghọta ma onwe anyị ma ndị ọzọ karị. Ọ bụ ezie na ihe nketa ọdịbendị na echiche nke ịhụ agbụrụ n’anya pụrụ ịbụ mgbidi megide nkwurịta okwu, ọ bụghị iwu na ha ga-abụ. A pụrụ ịkwatusị mgbidi ndị ahụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Ndị òtù nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọdịbendị nile n’ụwa na-ewere ụzọ ịdị ndụ nke ha dị ka nke ka elu ọbụna karịa nke ndị kasị bụrụ ndị agbata obi ha.”—The New Encyclopædia Britannica

[Foto dị na peeji nke 7]

Anyị pụrụ ịmụta ịnụ ụtọ ihe ọma nke ọdịbendị ndị ọzọ

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 6]

Ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1995 Digital Wisdom, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya