Ikiri Ụwa
Ihe Ọmụma Kasị Ọhụrụ Banyere Eluigwe na Ala
Nchọpụta ndị e mere n’oge a na-eme ka ndị ọkà mmụta sayensị mbara igwe chegharịa echiche n’ọtụtụ nchepụta, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times si kwuo. Dị ka ihe atụ, ndị na-enyocha mbara igwe ji enyo Hubble Space Telescope na-enyobami anya n’eluigwe abịaruwo ná nkwubi okwu na e nwere 40 ruo 50 ijeri ụyọkọ kpakpando a na-eme atụmatụ ya n’eluigwe anyị. Nke a dị iche n’ebe atụmatụ ndị e meburu bụ́ 100 ijeri dị. Otu ụbọchị mgbe ha masịrị ọkwa a, ndị ọkà mmụta sayensị nke Òtù Nkà Mmụta Mbara Ụwa nke America gara n’ihu wee kọọ na ha amatawo ma ọ dịkarịa ala ọkara nke “ihe a na-achọ achọ” nke eluigwe na ala, mass nke a na-akọwaghị akọwa bụ́ nke na-enye ike ndọda na-ejikọta ụyọkọ kpakpando dị iche iche ọnụ. Ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na ọtụtụ n’ime ihe a a na-adịghị ahụ anya pụrụ ịgụnye ọnụ ọgụgụ bara ụba nke kpakpando ndị na-adịkwaghị ike a na-akpọ white dwarf. Ọzọkwa, ihe ọmụma ndị sitere n’ụgbọ mbara igwe bụ́ Galileo na-ama nchepụta echiche banyere mbara ụwa bụ́ Jupiter aka. “A na-enwe mgbe nile echiche nke ịdị umeala n’obi mgbe ihe ọmụma batara na nke mbụ ya,” ka ọkà mmụta sayensị bụ́ onye isi ọrụ bụ́ Dr. Torrence Johnson kwuru. “Ihe na-esi na ha apụta adịghị adabacha nke ọma ná nchepụta echiche anyị.”
Ịba Ụba nke Ịtọrọ Mmadụ
N’afọ na-adịbeghị anya, ndị omekome na Rio de Janeiro, Brazil, nwetara $1.2 ijeri (U.S.) nanị site n’ọrụ ịtọrọ mmadụ nke na-aba ụba, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Jornal da Tarde na-akọ, na-eme ka ịtọrọ mmadụ bụrụ ebe bụ isi mpụ a haziri ahazi si enweta ego n’obodo ukwu ahụ. Ịtọrọ mmadụ aghọwokwa ihe dị mgbagwoju anya karị. E nwere ntọrọ “àmụ̀mà,” ma ọ bụ ntọrọ nke na-adịru nwa oge nke ndị mmadụ nọ n’ọkwá dị n’etiti, “bụ́ ndị na-akwụkarị ihe mgbapụta ná nkebi ná nkebi,” na ntọrọ dị mgbagwoju anya, ndị a na-eme atụmatụ ya nke ọma nke a na-atọrọ ndị ka baa ọgaranya. Ná mba ndị ọzọ, ịtọrọ mmadụ na-abakwa ụba. Magazin bụ́ Asiaweek na-ekwu na ndị ọkachamara na Philippines na-atụ aro, n’ime ihe ndị ọzọ, sị: Emela njem nanị gị, karịsịa mgbe chi jiworo. Na-eme ka onye ị tụkwasịrị obi mara mgbe nile ebe ị ga-anọ. Dọba ụgbọ ala gị n’ebe ọkụ na-enwu nke ọma na n’ebe nwere nchebe. Ahapụla ụmụaka n’enweghị onye na-elekọta ha.
Ịdọ Aka ná Ntị Banyere Vitamin A
Dị ka otu ihe ọmụmụ banyere 22,000 ndị inyom dị ime si kwuo, nke e bipụtara na magazin bụ́ The New England Journal of Medicine, ndị nne dị ime kwesịrị ilezi anya ka ha ghara iribiga vitamin A ókè. Ọ bụ ezie na ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke vitamin A dị mkpa maka ahụ ike na uto nke nwa nọ n’afọ nne ya, a chọpụtara na nke gabigara ókè pụrụ imebi ihe. Ọ̀tụ̀tụ̀ vitamin A a tụrụ aro na o kwesịrị ekwesị maka nwanyị dị ime bụ 4,000 ihe ọ̀tụ̀tụ̀ unit a nakweere n’ebe nile, ka akwụkwọ bụ́ Tufts University Diet & Nutrition Letter na-ekwu, ndị inyom na-eri ihe karịrị 10,000 unit kwa ụbọchị “nwere ihe ize ndụ dị okpukpu abụọ na ọkara nke ịmụ nwa nwere nkwarụ, n’iji ha tụnyere ndị nne na-erighị ya gabiga ókè.” N’ihi na ahụ na-echekwa vitamin A, ọbụna iri vitamin n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu tupu a tụrụ ime pụrụ ịbụ ihe ize ndụ nye nwa ọhụrụ ahụ. A chọpụtaghị beta-carotene, ihe na-esite n’ihe ọkụkụ nke a na-agbanwe n’ụzọ ụfọdụ ka ọ bụrụ vitamin A dị n’ahụ, ịdị ize ndụ.
Osisi Na-anagide Ụmụ Ahụhụ
Otu ụlọ nsọ e ji osisi wuo na Nara, Japan, alanarịwo ruo 1,200 afọ n’enweghị mbibi site n’òké, àkị́kà, ma ọ bụ ụmụ ahụhụ ndị dị oké nta, ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. Ndị nnọchiteanya nke Mahadum Mba nke Seoul dị na Korea, na ndị Japan abụọ bụ́ ndị ọkà mmụta sayensị, banyere ọrụ ịmụ ihe mere na ụmụ ahụhụ adịghị ata ụlọ nsọ ahụ. Mgbe ha nwalere ụdị osisi cypress e ji wuo ụlọ oge gboo ahụ, ha chọpụtara na o nwere ọgwụ ụfọdụ nke na-adịghị amasị òké nke na ha agaghị ata ihe ọ bụla e ji ha techie. Ụlọ ọrụ na-awa osisi na Japan na-emepụta ihe dị ka 4,000 tọn ntụ osisi nke e ji cypress nke a mee kwa afọ, a na-atụkwa anya na ihe ndị e mepụtara site ná ntụ osisi ahụ pụrụ ịnọchi anya nsí ụfọdụ e ji eme ihe maka nchịkwa ụmụ ahụhụ.
Arịrịọ Maka Ọchịchịrị
Ndị na-enyocha mbara igwe na France na-agba mgba iji nwekwuo ọchịchịrị. Ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ọkụ na-adịghị mkpa n’ógbè ndị mepere emepe na-eme ka ọ fọdụ nke nta ka ọ ghara ikwe omume ịhụ eluigwe jupụtara na kpakpando anya. Dị ka magazin bụ́ Le Point si kọọ, ndị na-enyocha mbara igwe na-agwa ndị na-ahụ maka obodo ukwu ka ha tinye ọkụ okporo ámá ndị nwere ihe na-egbukepụ egbukepụ ndị na-eme ka ọkụ ha chee ihu n’ala, na ime ka ọ bụrụ iwu na a ga-agbanyụ ọkụ mkpọsa na nke ụlọ ọfịs, tinyere ihe ngosi ọkụ laser n’elekere 11 nke abalị. Michel Bonavitacola, onye isi oche nke Ụlọ Ọrụ Maka Nchebe Ihu Igwe n’Abalị, kwuru, sị: “Taa otu n’ime otu narị ụmụaka apụghị ikwu na ya ahụwo ụyọkọ Milky Way. Ma ihe a na-adọrọ mmasị, nke dị egwu ma bụrụ n’efu, na-enyere anyị aka ịghọta ebe anyị nọ n’ezie n’eluigwe na ala.”
Ndị Nne na Nna Nọ ná Mgbagwoju Anya
Mgbe a bịara n’ihe metụtara ịkụziri ụmụ ha ihe, ọnụ ọgụgụ dị nnọọ ọtụtụ ná ndị nne na nna na-ekwu na “inwe ihe ịga nke ọma” na “ịnọrọ onwe onye” bụ ihe ndị kasị mkpa, ha na-echekwa na ọ bụ ihe dịịrị ụmụaka ịhọrọ ụkpụrụ omume nke aka ha, dị ka nnyocha a kọrọ na magazin ndị France bụ́ L’Express si dị. Mgbe a jụrụ ha ma nzube nke nkụzi ọ̀ bụ iji kụzie ụkpụrụ omume kwesịrị ekwesị, 70 pasent nke ndị mụrụ ụmụ nọ n’agbata afọ 6 na 12 zara ee e. Pasent 60 nke ndị nne na nna na ndị nkụzi a gbara ajụjụ ọnụ chere na a dịghị akwadebe ụmụaka nke ọma maka ọdịnihu, ma n’ụzọ na-eju anya ha kwenyere na ụmụaka ga-emesịa bụrụ ezi ihe bara uru nye ọha mmadụ, ka magazin ahụ rịbara ama. Nnyocha ahụ kwadoro egwu ahụ ụfọdụ na-atụ, ka L’Express na-ekwu, na “ndị nne na nna taa adịghịzi amata ihe bụ ọrụ ma ọ bụ ibu ọrụ ha.”
Ịdọ Aka ná Ntị Banyere Nri Nwere Abụba Dị Ala
Ule ndị e ji ndị na-azụ ihe oriri mee na-ekpughe na ihe na-eko ihe oriri e ji edochi anya abụba n’ọtụtụ ihe oriri nwere abụba dị ala enweghị otu ọdịdị mmiri mmiri ahụ dị ka ezi abụba, ka akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ The Globe and Mail na-akọ, nke a pụkwara iduga ndị mmadụ n’irikwu ma ọ bụ itinye ihe ntụkwasị na ihe ndị ọzọ iji mee ka ọ tụkwuo ụtọ. Ihe ndị a na-etinye iji dochie anya abụba, dị ka shụga, nnu, na ihe aka mere ndị ọzọ e ji emeziwanye ụtọ nri, adịghị aba uru mgbe nile n’ụzọ idozi ahụ, dị ka Dr. David Jenkins, bụ́ prọfesọ nke sayensị ihe na-edozi ahụ na ọdịdị ahụ na Mahadum nke Toronto si kwuo. Dr. Jenkins na-adụ ọdụ, sị: “Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekpebie na otu n’ime ụzọ ndị ha pụrụ isi belata abụba bụ site n’iri nri nwere abụba dị ala, nke ahụ dị mma, ọ bụrụhaala na nri ahụ nwere ihe ndị na-edozi ahụ.” Ọ na-atụ aro na akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi, na ọka, tinyere akị ndị nwere abụba dị ala na ihe ndị e ji àgwà mee, bụcha nhọrọ ndị dị mma.
Ịhụnanya na Chocolate
N’ọtụtụ ala nwoke pụrụ inye nwanyị chocolate dị ka ihe ngosipụta nke ịhụnanya ya. Ọ dị mma ịmara na mmetụta uche dị elu a na-emepụta site n’iri chocolate na mmetụta nke ịdaba n’ịhụnanya pụrụ inwe ihe jikọrọ ha—mmepụta ka ukwuu nke mmiri ọgwụ ahụ bụ́ phenylethylamine n’ụbụrụ. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Medical Post nke Toronto, Canada, si kọọ, Peter Godfrey, onye Australia na-eme nchọpụta, achọpụtawo ọdịdị nke “irighiri ihe ịhụnanya,” dị ka a kpọworo ya. N’inwe ihe ọmụma ọhụrụ nke a, ndị ọkà mmụta sayensị na-enwe olileanya ịmụtakwu ihe banyere otú e si akpalite mmetụta uche n’ụbụrụ. Ọzọkwa, ka Post ahụ kwuru, ọ “pụrụ ime ka a mata ihe mere ụfọdụ ndị ji enwe oké ịhụnanya n’ebe cholocate dị.”
Àkwà Mmiri Na-aga Skye
E mepere àkwà mmiri kasị ukwuu nwere ide guzo kwem n’otu isi n’ụdị ya, dị 2.4 kilomita n’ogologo, n’oge na-adịbeghị anya na Scotland, ka The Times nke London na-akọ. Àkwà mmiri ahụ na-ejikọta Àgwàetiti Scotland bụ́ Skye na 9,000 ndị bi n’ime ya n’ebe ụsọ oké osimiri ebe ọdịda anyanwụ Scotland. Iji mee ememe mmepe ahụ, òtù egwú na-afụ ọjà na ìgwè ụgbọ ala kwụ n’ahịrị n’ahịrị nọ n’ihu ìgwè ndị na-eme njem—bụ́ ndị a kpọrọ òkù ịgafe àkwà mmiri ahụ n’efu maka ụbọchị ahụ. Àkwà mmiri ahụ na-anọchi anya usoro ime njem mmiri nke bugaworo ma ọ bụ bughachi ụgbọ ala na ndị njem n’àgwàetiti ahụ ruo 23 afọ gara aga. Dị ka The Times si kọọ, onye Scotland ahụ bụ́ odeakwụkwọ rụtụrụ aka na o kwere omume ugbu a nye ndị na-anya ụgbọ ala isite na Rom gaa Uig, n’ugwu ebe ọdịda anyanwụ Skye, n’ahapụghị ụgbọ ala ha.
Ọnyá Akpịrị “Kọmputa”
Ndị ji kọmputa eme ihe na-achọ ụzọ isi mee ka aka kwụsị igbu ha mgbu site n’iji usoro ụda olu agwa kọmputa ihe ọ ga-eme na-eche ihe ụfọdụ na-ewere dị ka nsogbu ka njọ ihu—ụda olu na-agbaka agbaka na ọbụna ụda olu na-adịghị adapụta adapụta, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail nke Canada na-akọ. Ebe ọ bụ na a ghaghị ikpọ okwu nke ọ bụla n’ụzọ pụtara nke ọma na n’otu ụda olu ahụ kpọmkwem ka kọmputa wee ghọta ya, ndị ji ya eme ihe adịghị eku ume n’ụzọ kwesịrị ekwesị, akwara ụda olu na-eyikwa ka ha esikwaghị ike. Dr. Simon McGrail nke Mahadum nke Toronto gwara Globe ahụ na ọnyá pụrụ ịmalite n’akwara ụda olu ka ha na-akụtụ n’onwe ha, ma ọ bụ ike pụrụ ịgwụ akwara ndị ahụ n’onwe ha. Iji mee ka akwara ụda olu ndị ahụ nọgide n’enweghị nsogbu, ndị ọkachamara n’ụda olu na-atụ aro ka ndị ji ya eme ihe belata oge ha na-etinye na kọmputa ndị dị otú ahụ, na-akwụsịtụ mgbe mgbe, na-aṅụ nnukwu mmiri, na-ezerekwa ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, caffeine, na ọgwụgwọ ndị pụrụ ịkpọ akwara ụda olu nkụ.