Nnwere Onwe Ikwu Okwu n’Ebe Obibi—Ọ̀ Bụ Bọmbụ Na-achọ Mgbawa?
MGBE mmadụ tiri mkpu ụgha n’ime ụlọ ihe nkiri nke mmadụ jupụtara na ya, sị, “Ọkụ!” e wee zọgbuo ụfọdụ n’ọsọ eleghị anya n’azụ iji gbapụ, ọ̀ bụ na onye ahụ tiri mkpu ahụ aghaghị ịbụ onye ụta dịịrị maka ọnwụ na ihe ọghọm ndị si na ya pụta? Ọ bụrụ na mmadụ asị, “ekwenyeghị m n’ihe ị na-ekwu, ma m ga-ekwuchitere ikike i nwere ikwu ya,” è nyere gị ikike zuru ezu ime mkpebi, nnwere onwe a na-akparaghị ókè, ikwu ihe ọ bụla masịrị gị n’ihu ọha, n’agbanyeghị ihe ga-esi na ya pụta? E nwere ndị chere otú ahụ.
Dị ka ihe atụ, na France, mgbe ndị na-agụ egwú rap kwalitere ogbugbu nke ndị uwe ojii, ụfọdụ ndị nụrụ egwú ahụ ewee gbuo ndị uwe ojii, é kwesịghị ijideworị ndị egwú rap ahụ maka ịkpali ime ihe ike? Ka è kwesịrị ichebe ha n’okpuru akwụkwọ iwu nke ihe ruuru mmadụ? Mgbe ndị na-agbasa akụkọ na redio na telivishọn na usoro njikọ kọmputa na-ewepụtara ụmụaka, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha na-eme ihe nkiri ndị a n’ụzọ na-emerụ ha onwe ha na ndị ọzọ ahụ, ihe omume ihe ike na ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, é kwesịghị ịta ndị nnyocha nke ihe ndị dị otú ahụ ụta?
Otu ihe ọmụmụ nke Òtù Akparamàgwà Mmadụ n’America mere “na-agbakọ na nwata ọ bụla nke na-ele TV 27 hour kwa izu, ga-ele 8,000 igbu ọchụ na 100,000 ihe omume ihe ike site n’afọ 3 ruo afọ 12,” ka magazine bụ́ U.S.News & World Report kọrọ. Ndị mụrụ ụmụ hà pụrụ ileghara nke a anya dị ka ihe na-enwechaghị mmetụta n’ahụ ụmụ ha? Ka ọ̀ pụrụ ịgụnye “ihe ize ndụ doro anya nke dịkwa adị”? Ọ̀ bụ n’ebe a ka a na-aghaghị itinye ihe mgbochi ma ọ bụ ịkpara nnwere onwe ikwu okwu ókè?
Otu ihe ọmụmụ ndị ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ na mahadum duziri kpughere na mgbe a nọgidere na-egosi otu ìgwè nke ndị dị afọ anọ ihe osise na-atọ ọchị nke “ndị dike ọkpụkpụ aka,” na-egosikwa ìgwè ọzọ ụdị “nke na-adịghị enye mkpali,” o yikarịrị ka ndị hụrụ ndị dike ahụ na-akpa ike na-eti aka ma na-atụfusị ihe mgbe e mesịrị. Mmetụta nke ime ihe ike TV adịghị akwụsị mgbe mmadụ toro. Otu ihe ọmụmụ mahadum ọzọ, mgbe e lekwasịrị 650 ụmụaka anya site na 1960 ruo 1995, na n’ile anya n’ụzọ ha si ekiri telivishọn na akparamàgwà ha, chọpụtara na ndị kiriri ihe omume telivishọn ndị a kasị mee ihe ike na ha mgbe ha bụ ụmụaka tolitere ma tinye aka n’àgwà ndị kasị bụrụ nke obi ọjọọ mgbe ha ghọrọ ndị toworo eto, tinyere imetọ onye mmadụ na-alụ na ịkwọ ụgbọ ala mgbe a ṅụbigara mmanya ókè.
Ọ bụ ezie na ụmụaka ụfọdụ nwere ike ghara ikwenye ná mmetụta telivishọn na ihe nkiri na-enwe n’ahụ ha, ndị ọzọ ga-ekwenye. Na 1995, Ụmụaka Ugbu A, otu ìgwè nkwado dị na California, jụtara echiche 750 ụmụaka, bụ́ ndị dị afọ 10 ruo 16. Ihe ọmụmụ ahụ gosiri na 6 n’ime 10 kwuru na mmekọahụ a na-enwe na TV na-akpali ụmụaka inwe mmekọahụ mgbe ha bụ nnọọ ụmụaka.
Ụfọdụ pụrụ ikwu na ọ pụrụ ịbụ na ụmụaka agaghị ewere ime ihe ike telivishọn dị ka ihe bụ ezie nakwa na ihe nkiri ndị ahụ na-atụ egwu adịghị enwe mmetụta n’ahụ ha. “Ọ bụrụ otú ahụ,” ka otu akwụkwọ akụkọ ndị Britain kwuru, gịnị mere ndị na-ahụ maka ụlọ akwụkwọ n’ebe etiti America ji gwa ọtụtụ puku ụmụaka na e nweghị Mbekwu Ninja Na-agbanwe Ndị Dị Afọ Iri na Ụma n’ọwa mmiri ndị dị n’ógbè ahụ? Ndị nkwado obere Mbekwu ahụ anọgidewo na-arịkpu n’ime ọwa mmiri iji chọọ ha, nke ahụ bụ ihe kpatara ya.”
Taa oké arụmụka na-arị elu banyere ihe ụfọdụ ndị na-ele anya dị ka nkewa dị aghụghọ n’etiti nnwere onwe ikwu okwu na ime ihe ike nke okwu a na-ekwu n’ọtụtụ ebe na United States megide nsikwopụ afọ ime kpatara. Ndị ọkachamara n’okwu ndị megidere nsikwopụ afọ ime na-eme mkpesa n’ihu ọha na ndị dọkịta na ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ndị a na-adịghị enye mmadụ àkwà na ha, bụ́ ndị na-esikwopụ afọ ime bụ ndị ogbu mmadụ, na ha onwe ha ekwesịghịkwa ịdị ndụ. Ole na ole na-anụ ọkụ n’obi n’ime ha na-ekwu ka e gbuo ndị dọkịta na ndị na-enyere ha aka. A na-ezobe ndị nledo n’ebe dị iche iche inweta akara ụgbọala, a na-enyefekwa akara ndị dị otú ahụ, aha na adres ha. Dị ka ihe si n’ime ya pụta, a gbagbuwo ndị dọkịta na ndị òtù ọrụ ụlọ ọgwụ a na-adịghị enye mmadụ àkwà na ha égbè, gbuokwa ha.
“Nke a abụghị okwu nnwere onwe ikwu okwu,” ka onye isi nke òtù bụ́ Planned Parenthood Federation nke America tiri ná mkpu. “Nke a na iti mkpu sị, ‘Ọkụ!’ n’ime ụlọ ihe nkiri nke ndị mmadụ jupụtara bụ otu ihe ahụ. Anyị nwere ụlọ ihe nkiri nke ndị mmadụ jupụtara na ya; lee nnọọ ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị e gburu n’ụlọ ọgwụ ndị a na-adịghị enye mmadụ àkwà na ha n’ime afọ ole na ole ndị gara aga.” Ndị na-akwalite ime ihe ike a na-ekwu na nanị ihe ha na-eme bụ iji nnwere onwe ha eme ihe dị ka Mmegharị Mbụ nke America nyere ikike ya—nnwere onwe ikwu okwu. Otú ahụ ka ọ na-agakwa n’ihu. A ga-anọgide na-alụ ọgụ banyere ihe a ruuru mmadụ n’usoro mgbasa ozi ọha na eze, ụlọikpe aghaghịkwa ịdị na-edozi okwu ahụ, n’ụzọ dị mwute, n’ụzọ na-agaghị eju mmadụ nile afọ.
Ihe Ndị Mụrụ Ụmụ Pụrụ Ime
Ebe obibi kwesịrị ịbụ ebe izu ike nye ụmụaka, ọ bụghị ebe ha pụrụ ịghọ ihe dị mfe nnweta nye ndị ahụ ga-achọ irigbu ma metọọ ha ma ọ bụ ebe a pụrụ ịkpali ọdịdị mmadụ ndị dị jụụ igosipụta ọdịdị ga-agbanwe gaa n’ime ihe ike. “Obi pụrụ isi gị ike na nwa gị agaghị aghọ onye na-eme ihe ike mgbe ọ bụla n’agbanyeghị ime ihe ike ọ nọgidere na-ekiri na TV,” ka otu prọfesọ mahadum na United States nke na-agwa ndị mụrụ ụmụ okwu kwuru. “Ma ị pụghị ijide n’aka na nwa onye ọzọ, nke e ji otu ụdị ime ihe ike ahụ zụlite, apụghị igbu ma ọ bụ kwarụọ nwa gị.” Mgbe ahụ ọ gbara ume, sị: “Ibelata ohere ụmụaka nwere ikiri ime ihe ike TV kwesịrị ịghọ akụkụ nke atụmatụ ahụ ike ọha na eze, dị nnọọ ka oche nchebe, okpu ịnyịnya ígwè, ọgwụ mgbochi ọrịa na ezi ihe na-edozi ahụ.”
Ọ bụrụ na ị gaghị ekwe ka onye ị na-amaghị ama bata n’ime ụlọ gị wee na-ekwu okwu na-adịghị ọcha, na-agwakwa nwa gị okwu n’ụzọ rụrụ arụ banyere mmekọahụ na ime ihe ike, mgbe ahụ ekwela ka redio na telivishọn bụrụ onye ahụ ị na-amaghị ama. Mata mgbe i kwesịrị ịgbanyụ ya ma ọ bụ ịgbanwee ụlọ ọrụ mgbasa ozi. Mara ihe nwa gị na-ekiri, ma na telivishọn ma na kọmputa, ọbụna mgbe ọ nọ nanị ya n’ime ụlọ ya. Ọ bụrụ na ọ maara otú e si eji kọmputa eme ihe na usoro njikọ ndị ọ pụrụ inweta, ọ pụrụ ịwụ gị akpata oyi n’ahụ ịhụ ihe mejupụtara ihe ọ na-ekiri kwa anyasị. Ọ bụrụ na ị kwadoghị ihe nwa gị na-ekiri, kwuo nnọọ ee e, kọwaakwa ihe kpatara ya. Ọ gaghị anwụ ma ọ bụrụ na e gbochie ya.
N’ikpeazụ, kụziere ụmụ gị ịdị ndụ dị ka ụkpụrụ Chineke si dị, ọ bụghị dị ka akparamàgwà nke usoro ihe ọjọọ nke a si dị—ya na okwu na ime ihe ike na omume ya ndị rụrụ arụ. (Ilu 22:6; Ndị Efesọs 6:4) Pọl onyeozi nyere ndị Kraịst ndụmọdụ ndị bịara n’ezi oge nke anyị nile kwesịrị ịdị ndụ kwekọrọ na ya. “Ma ịkwa iko, na adịghị ọcha nile, ma ọ bụ anyaukwu, ka a ghara ịkpọ ọbụna aha ya n’etiti unu, dị ka o kwesịrị ndị nsọ; ma ọ bụ ihe ihere, ma ọ bụ ikwu okwu nzuzu, ma ọ bụ okwu na-abaghị n’ihe, nke na-ekwesịghị: ma kama nke ahụ ikele ekele.”—Ndị Efesọs 5:3, 4.
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ụfọdụ usoro ihe omume TV pụrụ iduga n’ime mpụ na omume rụrụ arụ