Ọnụ Ọgụgụ Na-arị Elu nke Ndị Gbara Ọsọ Ndụ
AGHA, ụnwụ nri, na mkpagbu etetọwo ihe ka ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Dị ka ihe si n’ime ya pụta, e nwewo mgbe nile ndị nwere mkpa maka ebe nchebe. N’akụkọ ihe mere eme, mba na ndị mmadụ enyewo ndị nọ ná mkpa nchebe.
Ndị Aztec, Asiria, Gris, Hibru, Alakụba, na ndị ọzọ n’oge gboo sọpụụrụ iwu ndị na-enye nchebe. Plato, bụ́ onye ọkà ihe ọmụma Gris dere n’ihe karịrị narị afọ 23 gara aga, sị: “Onye ala ọzọ, e kewapụrụ n’ebe ndị ala ya na ezinụlọ ya nọ kwesịrị ịbụ onye ndị mmadụ na chi dị iche iche ga-egosi ịhụnanya ka ukwuu. Ya mere a ghaghị ilezi anya ka a ghara imejọ onye ala ọzọ.”
N’ime narị afọ nke 20, ọnụ ọgụgụ ndị gbara ọsọ ndụ arịwo elu nke ukwuu. Ná mgbalị iji lekọta 1.5 nde ndị gbara ọsọ ndụ fọdụrụ site n’Agha Ụwa nke Abụọ, e guzobere Ụlọ Ọrụ Mba Ndị Dị n’Otu Na-ahụ Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ (UNHCR) na 1951. E bu n’uche na ọ ga-adịru afọ atọ, n’ịdabere n’echiche nke bụ na ndị gbara ọsọ ndụ e nwere mgbe ahụ ga-abụ ndị e jikọtara n’oge na-adịghị anya n’ọha mmadụ ebe ha nwetara nchebe. E chere na a pụrụ ikposa òtù ahụ ma nke ahụ gasịa.
Otú ọ dị, n’ime ọtụtụ iri afọ, ọnụ ọgụgụ ndị gbara ọsọ ndụ rịrị elu n’akwụsịghị akwụsị. Ka ọ na-erule 1975, ọnụ ọgụgụ ha eruwo 2.4 nde. Na 1985 ọnụ ọgụgụ ahụ bụ 10.5 nde. Ka ọ na-erule 1995, ọnụ ọgụgụ nke ndị na-anata nchebe na enyemaka site n’aka òtù UNHCR arịwo elu ruo 27.4 nde!
Ọtụtụ ndị tụrụ anya na oge mgbe Agha Nzuzo ahụ gasịworo ga-emeghe ụzọ iji dozie nsogbu zuru ụwa ọnụ nke ịgba ọsọ ndụ; o meghị ya. Kama nke ahụ, mba dị iche iche ekewasịwo n’ihi ihe ndị metụtara akụkọ ihe mere eme na agbụrụ, na-akpata esemokwu. Ka agha na-aga n’ihu, ndị mmadụ na-agbapụ, na-amara na ndị ọchịchị ha apụghị ma ọ bụ agaghị echebe ha. Dị ka ihe atụ, na 1991, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde abụọ nke ndị Iraq gbabajuru ná mba ndị gbara ha agbata obi. Kemgbe ahụ, ihe dị ka 735,000 ndị gbara ọsọ ndụ agbapụwo n’ebe bụbu Yugoslavia. Mgbe ahụ, na 1994, agha obodo e nwere na Rwanda manyere ihe karịrị ọkara nke ọnụ ọgụgụ mba ahụ bụ́ 7.3 nde mmadụ ịgbapụ n’ebe obibi ha. Ihe dị ka 2.1 nde ndị Rwanda gbabara ná mba Africa ndị dị ha nso.
Gịnị Mere Nsogbu ahụ Ji Na-akawanye Njọ?
E nwere ọtụtụ ihe na-akpata ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị gbara ọsọ ndụ. N’ebe ụfọdụ, dị ka Afghanistan na Somalia, ọchịchị mba ahụ adakpọwo. Nke a emewo ka ihe nile dịrị n’aka ìgwè ndị nkịtị bu ngwá agha, bụ́ ndị na-akwakọrọ ngwongwo n’ime ime obodo n’enweghị mgbochi, na-akpata ịnọ n’egwu na mgbapụ.
N’ebe ndị ọzọ, esemokwu na-adabere n’oké ndịrịta iche nke agbụrụ ma ọ bụ okpukpe, nke ebumnobi bụ isi nke ìgwè ndị na-alụ agha bụ ịchụpụ ndị nkịtị. Banyere agha ahụ a lụrụ n’ebe bụbu Yugoslavia, otu onye nnọchiteanya UN kwara arịrị n’etiti 1995, sị: “Nye ọtụtụ ndị, o siri nnọọ ike ịghọta ihe ndị na-akpata agha a: onye na-alụ agha, ihe ndị mere e ji na-alụ agha. E nwere oké mgbapụ site n’otu akụkụ, mgbe ahụkwa izu atọ mgbe nke ahụ gasịrị, e nwere oké mgbapụ site n’akụkụ nke ọzọ. O siri nnọọ ike nghọta ọbụna nye ndị kwesịrị ịghọta ya.”
Ngwá agha ọgbara ọhụrụ ndị na-ebibi ihe nke ukwuu—rọketi ndị a na-agbapụ n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu, àkụ́ ụta na-ere ọkụ, ìgwè ngwá agha, na ihe ndị yiri ha—na-atụkwasị ihe n’oké igbu ọchụ ahụ, na-emekwa ka ọ̀tụ̀tụ̀ nke esemokwu ahụ dịwanye ukwuu. Ihe ọ na-arụpụta: ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị gbara ọsọ ndụ. N’oge ndị na-adịbeghị anya ihe dị ka 80 pasent nke ndị gbara ọsọ ndụ n’ụwa nile esiwo ná mba ndị ka na-emepe emepe gbapụ gaa ná mba ndị gbara ha agbata obi, bụkwa ndị ka na-emepe emepe, ndị a na-akwadoghịkwa akwado ilekọta ndị na-achọ nchebe.
N’ọtụtụ agha, ụkọ ihe oriri na-atụkwasị ihe ná nsogbu ahụ. Mgbe ndị mmadụ na-akwụ agụụ, ikekwe n’ihi na e gbochiri ìgwè ndị na-ebubata ihe enyemaka ịbata, ha na-abụ ndị a manyere ịgbapụ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-ekwu, sị: “N’ebe ndị dị ka Mpi Africa, njikọ nke oké ọkọchị na agha emetọwo ala nke ukwuu nke na ọ pụkwaghị inye ihe ndị e ji ebi ndụ. Ma ọtụtụ narị puku ndị na-agbapụ hà na-agbapụrụ agụụ ma ọ bụ agha adịghị mkpa.”
Ọtụtụ Nde A Na-achọghị
Ọ bụ ezie na a na-asọpụrụ echiche nke inye nchebe n’ọnụ efu, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị gbara ọsọ ndụ na-agwụ ọtụtụ mba ike. E nwere ọnọdụ yiri nke ahụ n’Ijipt oge ochie. Mgbe Jekọb na ezinụlọ ya gbagara Ijipt iji gbanarị mwakpo nke ụnwụ nri afọ asaa ahụ, a nabatara ha. Fero nyere ha ‘ebe kasị mma nke ala ahụ,’ bụ́ ebe ha ga-ebi.—Jenesis 47:1-6.
Otú ọ dị, ka oge na-agabiga ndị Israel mụbara nke ukwuu, “ala ahụ wee jupụta na ha.” Ugbu a ndị Ijipt meghachiri omume n’ụzọ obi ọjọọ, ma “ka ha [ndị Ijipt] na-eweda ha ala, otú a ka ha [ndị Israel] na-aba ụba, otú a ka ha na-agbasakwa. Ike wee gwụsịa ha n’ihi ụmụ Israel.”—Ọpụpụ 1:7, 12.
N’otu aka ahụ, ‘ike na-agwụsị’ mba dị iche iche taa ka ọnụ ọgụgụ nke ndị gbara ọsọ ndụ nọgidere na-amụba. Ihe bụ isi na-akpata nchegbu ha bụ ọnọdụ akụ̀ na ụba. Ọ na-efu ego dị ukwuu iji nye ọtụtụ nde ndị gbara ọsọ ndụ nri, uwe, ụlọ, na ichebe ha. N’agbata 1984 na 1993, mmefu kwa afọ nke òtù UNHCR rịrị elu site na $444 nde ruo $1.3 ijeri. Ọ bụ mba ndị ka baa ọgaranya, ndị ụfọdụ n’ime ha na-agbaso nsogbu akụ̀ na ụba nke onwe ha mgba, na-enye ihe ka ukwuu n’ego ahụ. Mba ndị na-enye onyinye na-eme mkpesa mgbe ụfọdụ, sị: ‘Ọ na-esiri anyị ike inyere ndị na-enweghị ebe obibi nọ n’okporo ámá anyị aka. Olee otú ọ pụrụ isi bụrụ ihe dịịrị anyị ịhụ maka ndị na-enweghị ebe obibi na mbara ụwa dum, karịsịa ebe ọ bụ na nsogbu ahụ yiri ka ọ ga na-eto eto karịa ibelata?’
Gịnị Na-eme Ka Ihe Siwanye Ike?
Ndị gbara ọsọ ndụ rutere ná mba ndị bara ọgaranya na-achọpụtakarị na ọtụtụ puku ndị kwagaworo n’otu mba ahụ n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba emewo ka ọnọdụ siwanyere ha ike. Ndị a na-akwagharị n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba abụghị ndị gbara ọsọ ndụ n’ihi agha ma ọ bụ mkpagbu ma ọ bụ ụnwụ nri. Kama nke ahụ, ha chọ ndụ ka mma bịa—ndụ nke ịda ogbenye na-adịghị. N’ihi na ha na-emekarị dị ka a ga-asị na ha bụ ndị gbara ọsọ ndụ, na-eji nzọrọ ụgha enye òtù nchebe nsogbu, ha na-eme ka o siere ndị gbara ọsọ ndụ n’ezie ike inweta mmeso nke eleghị mmadụ anya n’ihu.a
E jiriwo nnubata nke ndị gbara ọsọ ndụ na ndị kwagara ná mba ọzọ tụnyere iyi abụọ sọworo n’akụkụ ibe ha ndị rubaworo ruo ọtụtụ afọ ná mba ndị bara ọgaranya. Otú ọ dị, iwu ndị na-esiwanye ike megide ịkwaga ná mba ọzọ emechiwo iyi nke ndị na-akwaga ná mba ọzọ n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba. N’ihi ya, ha aghọwo akụkụ iyi nke ndị gbara ọsọ ndụ, iyi a ejubigawokwa ókè ịkpata iju mmiri.
N’ịmara na ọ pụrụ iwe ọtụtụ afọ iji nyochaa arịrịọ nchebe ha, ndị kwagara ná mba ọzọ n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba na-eche na ha nọ n’ọnọdụ mmeri mmeri. Ọ bụrụ na a nabata arịrịọ ha maka nchebe, ha na-emeri, ebe ọ bụ na ha nwere ike ịnọgide n’ọnọdụ akụ̀ na ụba ka mma. Ọ bụrụ na a jụ arịrịọ ha, ha na-emerikwa, ebe ọ bụ na ha aghaghị inwetaworị ego, mụtakwa ọrụ aka ụfọdụ ha pụrụ iji laghachi ná mba ha.
Ka ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị gbara ọsọ ndụ, tinyekwara ndị aghụghọ na-erubanye ná mba ndị ọzọ, ọtụtụ mba na-ala azụ ná nnabata ha na-enye, na-emechikwa ọnụ ụzọ ha. Ụfọdụ emechiwo ókèala ha n’ihu ndị na-agbapụ agbapụ. Mba ndị ọzọ ewepụtawo iwu na ụkpụrụ ndị dị nnọọ irè n’igbochi ndị gbara ọsọ ndụ ịbata n’ala ha. Mba ndị ọzọkwa ejiriwo aka ike chụghachi ndị gbara ọsọ ndụ n’ala ebe ha si gbapụ. Otu akwụkwọ nke òtù UNHCR na-ekwu, sị: “Ịrị elu na-adịghị akwụsị akwụsị n’ọnụ ọgụgụ—ma nke ndị gbara ọsọ ndụ n’ezie ma nke ndị kwagara n’ebe ọzọ n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba—ewetaworo ọdịnala inye nchebe ahụ gbaworo 3,500 afọ oké nrụgide, na-eweta ya nso ndakpọ.”
Ịkpọasị na Egwu
Ihe na-atụkwasị ihe ná nsogbu nke onye gbara ọsọ ndụ bụ nchegbu nke ụjọ onye ọbịa—ịtụ ndị ala ọzọ egwu na ịkpọ ha asị. N’ọtụtụ mba, ndị mmadụ na-eche na ndị na-abụghị ndị ala ha na-eyi njimara, ọdịbendị, na ọrụ ala ha egwu. Mgbe ụfọdụ a na-egosipụta egwu ndị dị otú ahụ n’ime ihe ike. Magazin bụ́ Refugees na-ekwu, sị: “Kọntinent Europe na-ahụ otu mwakpo dabeere n’ịkpa ókè agbụrụ kwa nkeji atọ ọ bụla—ebe nnabata nke ndị na-achọ nchebe na-abụkarịkwa ebe a na-elekwasị anya.”
Otu ihe a mapawara n’ebe etiti Europe na-egosipụta ibu iro dị omimi, ibu iro nke a na-ekwughachi n’ụzọ na-arị elu n’ọtụtụ ala nke ụwa. Ozi obi ọjọọ ya na-elekwasị anya n’ebe ndị ala ọzọ nọ: “Ha bụ etuto jọgburu onwe ya nke na-afụkwa ụfụ n’ahụ mba anyị. Agbụrụ nke na-enweghị ọdịbendị ọ bụla, ụkpụrụ omume ma ọ bụ okpukpe, ìgwè na-eme ihe ike na-enweghị ebe obibi, ma na-ezu nanị ohi. N’ịbụ ndị ruru unyi, ndị igwu juru n’isi, ha na-ebi n’okporo ámá na ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsịtụ. Ka ha kwakọrọ nkịkara ákwà ha ruru unyi ma laa ruo mgbe ebighị ebi!”
N’ezie, ọ dịghị ihe ga-amasị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị gbara ọsọ ndụ karị ‘ịla ruo mgbe ebighị ebi.’ Ọ na-agụ ha agụụ ịla. Ọ na-agụsi obi ha agụụ ike isoro ezinụlọ na ndị enyi ha bie ndụ dị n’udo, nke kwesịkwara ekwesị. Ma ha enweghị ebe obibi ha ga-ala.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Na 1993, gọọmenti ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe nanị mefuru $11.6 ijeri iji hazie ma nabata ndị na-achọ nchebe.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]
Ọnọdụ Ọjọọ nke Ndị Gbara Ọsọ Ndụ
“Ị̀ maara na ọtụtụ narị puku ụmụaka gbara ọsọ ndụ na-akwụ agụụ alaba ụra kwa abalị? Ma ọ bụ na ọ bụ nanị otu nwata n’ime ụmụaka asatọ gbara ọsọ ndụ gatụrụla akwụkwọ? Ihe ka ukwuu n’ụmụaka ndị a agatụbeghị sịnịma, ma ọ bụ ogige ntụrụndụ, ma ya fọdụkwa ịga ebe ndebe ihe mgbe ochie. Ọtụtụ na-etolite n’ime ogige e ji waya gbaa ma ọ bụ n’ogige ndị dịpụrụ adịpụ. Ha ahụtụbeghị ehi ma ọ bụ nkịta. Ọnụ ọgụgụ dị nnọọ ukwuu nke ụmụaka gbara ọsọ ndụ chere na ahịhịa akwụkwọ ndụ bụ ihe oriri, ọ bụghị ihe a ga-egwuri egwu ma ọ bụ gbaa ọsọ n’elu ya. Ụmụaka gbara ọsọ ndụ bụ akụkụ kasị ewute ewute n’ọrụ m.”—Sadako Ogata, Ụlọ Ọrụ Mba Ndị Dị n’Otu Na-ahụ Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ.
[Ebe E Si Nweta Foto]
U.S. Navy photo
[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]
Jisọs Gbara Ọsọ Ndụ
Josef na Meri na nwa ha nwoke, bụ́ Jisọs, biri na Betlehem. Ndị na-agụ kpakpando sitere n’Ọwụwa Anyanwụ ji onyinye nke ọlaedo, frankincense, na myrrh bịa. Mgbe ha pụsịrị otu mmụọ ozi bịakwutere Josef, na-asị: “Bilie, kuru Nwatakịrị ahụ na nne Ya gbalaga n’Ijipt, nọọ n’ebe ahụ ruo mgbe ọ bụla m ga-agwa gị: n’ihi na Herọd gaje ịchọ Nwatakịrị ahụ ka ọ laa Ya n’iyi.”—Matiu 2:13.
N’egbughị oge ha atọ gbagara mba ọzọ maka nchebe—ha ghọrọ ndị gbara ọsọ ndụ. Herọd were oké iwe na ndị ahụ na-agụ kpakpando abịaghị gwa ya banyere ebe Onye ahụ e buru n’amụma ịbụ eze ndị Juu nọ. Ná mgbalị kụrụ afọ n’ala igbu Jisọs, o nyere ndị ya iwu ka ha gbusịa ụmụaka nile bụ ndị ikom nọ na Betlehem na gburugburu ya.
Josef na ezinụlọ ya nọgidere n’Ijipt ruo mgbe mmụọ ozi Chineke bịakwutere Josef ọzọ ná nrọ. Mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Bilie, kuru Nwatakịrị ahụ na nne Ya, gaa ala Israel: n’ihi na ndị na-achọ ndụ Nwatakịrị ahụ anwụwo.”—Matiu 2:20.
Dị ka ihe àmà na-egosi, Josef bubu n’obi ibiri na Judia, bụ́ ebe ha bi tupu mgbapụ ha gaa Ijipt. Ma a dọrọ ya aka ná ntị ná nrọ na ọ ga-adị ize ndụ ime otú ahụ. N’ihi ya, iyi egwu nke ime ihe ike metụtara ndụ ha ọzọ. Josef, Meri, na Jisọs mere njem gaa n’ebe ugwu ruo Galili ma biri n’obodo bụ́ Nazaret.
[Foto dị na peeji nke 21]
N’ime afọ ndị a ọtụtụ nde ndị gbara ọsọ ndụ agbapụwo gaa ná mba ndị ọzọ n’ihi ndụ ha
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Aka ekpe n’elu elu: Albert Facelly/Sipa Press
Aka nri n’elu elu: Charlie Brown/Sipa Press
Ala ala: Farnood/Sipa Press
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 18]
Nwata nwoke n’aka ekpe: UN PHOTO 159243/J. Isaac