Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 11/8 p. 22-25
  • Eziokwu Nyeghachiri M Ndụ M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eziokwu Nyeghachiri M Ndụ M
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aṅụrụma na Ọgwụ Ọjọọ
  • Nne M Achọpụta
  • Inweta Enyemaka Ndị Ọkachamara
  • M Ka Bụ Ajọ Nwa nke Ezinụlọ Ahụ
  • Ọ Fọrọ nke Nta Ka M Chọta Eziokwu
  • Eziokwu Azọpụta M
  • Zere Ihe Mgbu Ahụ
  • Mụ na Chineke na Mama M Dịzi ná Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • “Jehova, Ị Chọta M!”
    Teta!—2004
  • Ihe Nketa Ndị Kraịst nke Dị Ụkọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Gịnị Mere Mụ na Ndị Mụrụ M Ji Esekarị Okwu?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 11/8 p. 22-25

Eziokwu Nyeghachiri M Ndụ M

Ọrịa AIDS egbuwo ihe ka ọtụtụ ná ndị bụbu enyi m. Tupu ọnwụ ha, m na-ahụkarị ha n’okporo ámá. M ga-anwụworị n’otu aka ahụ ma a sị na ọ bụghị maka eziokwu. Ka m kọwaa.

A MỤRỤ m na December 11, 1954, nwa nke abụọ na nke ikpeazụ nke John na Dorothy Horry. Ha kpọrọ m Dolores, ma n’ọmụmụ mama m kpọrọ m Dolly n’ihi na o chere na m yiri nwa bebi. Utu aha ahụ dịgidere, ma ndị mmadụ amaghị ma ọlị mgbe ahụ na m ga-aghọ nsogbu kasị njọ mama m ga-enwe.

Anyị biri n’otu ụlọ dị n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè—nke a kpọrọ aha ahụ n’ihi ọdịdị ogologo na ịdị warara ya. Ọ dị n’Okporo Ámá nke 61 na New York City. Ụlọ ahụ adịchaghị mma; anyị na òké na-azọrịta ụzọ. Otú ọ dị, mgbe ọ tasịrị m n’otu abalị, anyị si n’ebe ahụ kwapụ n’egbughị oge.

Na 1957 anyị kwagara n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke ndịda Manhattan. N’iji ya tụnyere ebe anyị si kwafeta, nke a magburu onwe ya—ụlọ ihi ụra mara mma, nnukwu ogige ntụrụndụ dị n’èzí window m, na ịnọ na-ahụ Osimiri Ọwụwa Anyanwụ site n’ebe ahụ. A pụrụ ikiri ụgbọ epeepe na-agafe na ụmụaka na-agba bọl ụkwụ na baseball n’ogige ntụrụndụ ahụ. Ee, nke a bụụrụ m paradaịs. Mgbe ahụ ụwa m nke dị nchebe malitere ịdakpọ.

Aṅụrụma na Ọgwụ Ọjọọ

Mama na papa m na-ese okwu nke ukwuu. Aghọtaghị m ihe kpatara ya na mbụ, ma mgbe ahụ amalitere m ịghọta na mmanya na-egbu papa m mgbe nile. Ọ pụghị ijigide ọrụ, ọ bụkwa nanị mama m na-arụ ọrụ. Mgbe ndị enyi m chọpụtara na papa m bụ onye aṅụrụma, ọchị a chịrị m mere ka ndụ m ghara inwe obi ụtọ.

Ihe nọgidere na-aka njọ. N’ikpeazụ, papa m malitere ime ihe n’aka ike, mama m chụpụkwara ya. Ya mere anyị ghọrọ ezinụlọ nke nanị nne. Adị m ihe dị ka afọ asatọ ma ọ bụ itoolu, ọnọdụ ezinụlọ anyị mekwara ka m yie onye na-enweghị olileanya. Mama m aghaghị ịrụ ọrụ n’esepụghị aka iji gboo mkpa ndị e nwere, na-ahapụ mụ na nwanne m nwanyị na nke ndị agbata obi ma anyị lọta akwụkwọ.

Ka m na-erule ogo akwụkwọ nke isii, aghọrọ m onye na-enupụ isi nke ukwuu. M na-ahapụ ịga klas ma gaa n’Ogige Tompkins Square dị nso ma na-agbalị iji mmanya chezọọ nsogbu m. N’oge na-adịghị anya amalitere m ịgbaso ìgwè ndị enyi tọrọ m nke ukwuu. Adị m nanị afọ 11, ma eburu m ibu karịa ndị ọgbọ m, ya mere e chere na m dị afọ 16 ma ọ bụ 17. Ìgwè ndị enyi ọhụrụ a na-aṅụbiga mmanya ókè, na-ese wii wii, na-eji ọgwụ LSD eme ihe, na-agbanyekwa heroin n’ahụ. Achọrọ m ikwekọ, n’ihi ya amalitere m ịnwale ihe ndị a. Ka m na-erule afọ 14, adabeere m na ha iji nwee ike ime ihe.

Nne M Achọpụta

“M webatara gị n’ime ụwa a, m ga-ewepụkwa gị.” Nke a bụ okwu ndị nne nọ n’ógbè anyị, bụ́ ndị ụmụ ha wetawooro mwute na mmechuihu n’ụzọ miri emi. Mgbe mama m, onye bụkarị mmadụ dị nnọọ nwayọọ nke isi jụrụ oyi, chọpụtara na nwa ya dị afọ 14 ji heroin eme ihe, o kwuru na ya ga-eme nnọọ nke ahụ—iwepụ m.

M gbabara n’ime ụlọ ịsa ahụ ma gbalịa ịkpọchi ụzọ site n’iji ụkwụ m gbagide n’ọkwá ịsa ahụ, ma emeghị m ihe ngwa ngwa ma ọlị. Anọ m ná nsogbu n’ezie ugbu a! Ọ baghị uru ikwuwe ya, e tiri m eti eti. Nanị ihe zọpụtara m n’iwe mama m bụ na nwanne m nwanyị na onye ahụ gbara m àmà nwere ike ịbata n’ime ụlọ ịsa ahụ ma jide nne m ka m wee nwee ike isi n’ụlọ ahụ gbapụ. Mgbe m mesịrị lọghachi ụlọ—agbapụwo m ruo ụbọchị ole na ole—m kwetara ịnara enyemaka ụfọdụ maka nsogbu ọgwụ ọjọọ m.

Inweta Enyemaka Ndị Ọkachamara

Ọnwa ole na ole n’ihu, ahụrụ m mkpọsa ngwá ahịa na TV banyere ụlọ ọrụ na-enyere ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ aka. Ọ bụ ebe ndị chọrọ enyemaka n’ezie iji merie nsogbu ọgwụ ọjọọ ha pụrụ inweta ya. M sooro mama m kparịta ihe m hụrụ, o zigakwara m n’otu n’ebe ndị ha nwere na New York City. Ụlọ ọrụ ahụ na-enye ọnọdụ yiri nke ezinụlọ ebe ndị mmadụ na-enweta nkwali iji gbanwee ụzọ ndụ ha dum. Ebiri m n’ebe ahụ ruo ihe dị ka afọ abụọ na ọkara.

Ọ bụ ezie na enyemaka e nyere baara m uru, enwere m nkụda mmụọ dị omimi mgbe m matara na ụfọdụ ndị ọrụ m tụkwasịrị obi ma na-akwanyere ùgwù—ndị kwesịwokwara ịkwụsị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe—alaghachiwo na ha ọzọ. Ọ dị m ka m bụ onye a raara nye na onye nzuzu. Ha akụziworo anyị na okwu ochie ahụ bụ́, “Onye ihe riri ahụ n’otu oge, na-abụ onye ihe riri ahụ mgbe nile,” bụ ụgha. Ma ugbu a, m na-ewere ha dị ka ihe àmà dị ndụ na ọ bụghị.

Ka o sina dị, mgbe m dị afọ 17, alọtara m ụlọ n’abụkwaghị onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ, m kpebisikwara ike ime ike m nile ịghara iji heroin mee ihe mgbe ọ bụla ọzọ. Ka ọ dị mgbe ahụ, nne m na nwanne m nwanyị amalitewo isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible.

M Ka Bụ Ajọ Nwa nke Ezinụlọ Ahụ

Ọ bụ ezie na mụ akwụsịwo iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ọ ka dị m ka m bụ ajọ nwa nke ezinụlọ ahụ. Nke a bụ n’ihi na adịghị m njikere ịdị ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ nduzi ọhụrụ nke ezinụlọ ahụ, bụ́ ndị gụnyere eseghị siga, agaghị egwú disko na ihe ndị ọzọ. Ọ dịteghị aka tupu mama m achụpụ m n’ụlọ n’ihi na m jụrụ ịgbanwe mkpakọrịta na àgwà m nke ndị ụwa. Akpọrọ m ya asị n’ezie maka nke a, ma n’ezie ọ bụ ihe kasị mma ọ ga-enweworị ike imere m. O guzosiri ike n’ụkpụrụ ziri ezi, ọ dịghịkwa mgbe ọ mara jijiji.

Ya mere ahapụrụ m ụlọ iji biere onwe m ndụ ọhụrụ na nke ka mma. Alaghachiri m n’ụlọ akwụkwọ ịmụ ọrụ aka iji nye aka n’inweta ego m ga-eji gụsịa akwụkwọ na kọleji. Emere m nnọọ nke ọma, a nabatakwara m ọzọ n’ọha mmadụ. Enwetara m ọrụ dị mma na ụlọ nke aka m. Mgbe ahụ mmekọrịta ịhụnanya malitere mgbe m zutere otu enyi m nwoke n’oge gara aga. Anyị maliteghachiri mmekọrịta anyị, burukwa n’obi ime ihe n’ụzọ ziri ezi ma lụọ di na nwunye.

Otú ọ dị, ka oge na-aga, enyi m nwoke malitere iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ihe malitekwara ịkara anyị abụọ njọ. N’enweghị ike idi ihe mgbu mmetụta uche ahụ, emere m ihe m kasị mara—eji m ọgwụ bịadaa mmetụta m. Amalitere m iji cocaine eme ihe, bụ́ nke nyere ihe a kpọrọ mmanya ogbugbu ndị ọgaranya. Cocaine bụ ihe a nakweere n’oge ahụ n’ihi na ọtụtụ ewereghị ya dị ka ihe na-eri ahụ. Ma nye m ọ dị njọ karịa heroin.

N’etiti afọ ndị 1970, ejiwo m cocaine mee ihe ruo ihe dị ka afọ atọ. N’ikpeazụ, m malitere ịhụ ọnọdụ na-adịwanye njọ m nọ n’ime ya, m malitekwara ịjụ sị, ‘Nke a ọ̀ gwụla ihe dị ná ndụ?’ Ekpebiri m na ọ bụrụ na ọ gwụla, mgbe ahụ ike ya agwụwo m. M laghachikwuuru mama m ma gwa ya na ihe m hụrụ ezuwo, nakwa na m na-agaghachi n’ụlọ ọrụ ahụ na-enyere ndị nwere nsogbu aka. Mgbe otu afọ na ọkara ọzọ n’ebe ahụ gasịrị, m nweghachiri onwe m ọzọ n’ọgwụ ọjọọ.

Ọ Fọrọ nke Nta Ka M Chọta Eziokwu

Ọzọ enwetara m ọrụ dị mma ma chọta ụlọ obibi mara mma na enyi nwoke. Anyị kwekọrịtara nkwa ọlụlụ. Ka ọ dị mgbe ahụ, mama m na-akpọtụrụ m n’ụzọ chiri anya. Ọ na-agwa m okwu banyere Bible, na-ezitekwara m magazin Ụlọ Nche na Teta!, ma ọ dịghị mgbe m lere anya na ha. Agwara m mama m banyere atụmatụ m ịlụ di ma nwee ezinụlọ. Ya mere o ziteere m otu akwụkwọ nke gbanwere ndụ m ruo mgbe ebighị ebi—Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ.

Ka m na-agụ akwụkwọ a, amatara m ihe m chọrọ nakwa na anọwo m na-achọ inweta ya n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ikpeazụ, e nwere onye ghọtara otú ọ dị m na ihe dị m n’obi n’ezie. Abụghị m mmadụ dị iche n’ihi inwe mmetụta ndị m nwere—adị m otú o kwesịrị. Ma, onye ọ bụ mụ na ya chịrị m ọchị mgbe m gbalịrị igosi ya akwụkwọ Ndu Ezi-na-ulo na Bible. Ọ chọghị ime mgbalị ndị dị mkpa iji nụ ụtọ ndụ ezinụlọ nwere obi ụtọ. Ya mere enwere m mkpebi siri ike ime—ịnọgide ka ọ̀ bụ ịpụ. Ekpebiri m na ọ bụ oge isi n’ebe ahụ pụọ.

Enyi m nwoke were oké iwe. Mgbe m lọtara ụlọ otu ụbọchị, achọpụtara m na o jiriwo ágụbà berisịa uwe m nile. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile m nwere adịkwaghị—akpụkpọ ụkwụ, kootu, arịa ụlọ—ma ọ́ bụghị na e berisịrị ya ọ bụrụ na e rere ya ere. Nanị ihe fọdụụrụ m bụ uwe ndị m yi. Achọrọ m idina ala wee nwụọ. Mgbe ụfọdụ ná ndụ ike ọgụ na mgba na-agwụ gị. N’ihi ya ị na-alaghachi n’ime ihe i meworo mgbe nile iji nagide—iji ọgwụ bịadaa mmetụta ndị ahụ. Ekpebiri m na ma ọ́ bụghị nke ahụ ọ bụrụ igbu onwe onye.

Ọ bụ ezie na m laghachiri n’ọgwụ ọjọọ ọzọ, ọ dịghị mgbe ike gwụrụ mama m n’ebe m nọ. Ọ na-eleta m ma na-ewetara m Ụlọ Nche na Teta! Otu uhuruchi n’oge mkparịta ụka, agwara m ya otú ọ dị m—na ike agwụwo m ime mgbalị nakwa na amakwaghị m ihe m ga-eme. O kwuru nanị, sị: “Ị nwalewo ihe ọ bụla ọzọ, gịnị ma ị nwalee Jehova?”

Eziokwu Azọpụta M

Ọ bụ n’afọ 1982 ka m kwenyere ime ihe ọ nọgideworo na-agba m ume ime eri ọtụtụ afọ. Amalitere m ịmụsi Bible ike. N’oge na-adịghị anya enwere m oké mkpali banyere ihe ndị m na-amụta. Amalitere m ịghọta na ndụ m dị nnọọ oké ọnụ ahịa nye Jehova, nakwa na e nwere ezi nzube ná ndụ. Ma aghọtara m na ọ bụrụ na m gaje ijere Jehova ozi, enwere m ọtụtụ mgbanwe ime, nakwa na nkwado mmetụta uche na nke ime mmụọ dị m mkpa. Ya mere arịọrọ m mama m ma m pụrụ ịkwafetaghachi n’ụlọ.

Mama m ji akọ mee ihe, ebe ọ bụ na mụ emechuwo ya ihu ọtụtụ ugboro. Ọ gwara otu okenye ndị Kraịst banyere arịrịọ m ịkwafeta bịa binyere ya ọzọ. Mgbe ọ matatụrụ na mama m chere na e nwere ezi ohere na m pụrụ ịgbanwe n’ezie ugbu a, ọ gbara ume, sị: “Gịnị ma i nye ya ohere ọzọ?”

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, emechughị m mama m ihu n’oge nke a. M gara n’ihu n’ịmụ Bible ma malite ịgachi nzukọ ndị Kraịst anya. Site n’enyemaka Jehova, agbanwere m ndụ m kpam kpam. Okwu ndụmọdụ Bible, bụ́ Okwu Chineke nke eziokwu, nyere mere ka m nwee ike ịlanarị oge ndị siri ike. (Jọn 17:17) Ọbụna na m kwụsịrị ise siga, bụ́ iri ahụ nke siiri m ike imeri karịa iri ahụ nke heroin na cocaine. Na nke mbụ ya, enwere m obi ụtọ n’ezie ịdị ndụ.

Ọnwa ole na ole n’ihu, na December 24, 1983, egosipụtara m nraranye m nye Jehova site na baptism ime mmiri. N’April sochirinụ, amalitere m ịsụ ụzọ inyeaka, bụ́ otu ụdị nke ozi a mụbara amụba. Na mbụ, ndị bụbu ndị enyi m ji m mere ihe ọchị mgbe ha hụrụ m n’ozi. Ọ bụ nnọọ dị ka Pita onyeozi buru ụzọ dọọ aka ná ntị: “Nke ha na-eche na ọ bụ ihe mmadụ na-ahụghị mgbe ọ bụla na unu adịghị eso ha n’omume ahụ gbabaa n’otu njubiga ókè ahụ nke ndụ ịla n’iyi, ha na-ekwulu unu.”—1 Pita 4:4.

Na September 1984, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ oge nile, n’oge na-adịghịkwa anya ana m eduzi ọmụmụ Bible iri kwa izu. Ụfọdụ n’ime ọmụmụ ihe ndị a bụ nke m so ndị kwaworo m emo mgbe m malitere ije ozi na mbụ na-enwe. Nke a bụ oge na-akpali akpali nke ukwuu ná ndụ m n’ihi na enwere m ike inyere ọtụtụ ndị ntorobịa aka ịnata eziokwu Bible. Ọ masịwo m mgbe nile inwe ụmụ, ya mere ịbụ nne, dị ka a pụrụ ikwu ya, nye ụmụ ime mmụọ abụrụwo isi iyi nke ọṅụ na-adịgide adịgide nye m.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 4:15.

Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ana m ahụ n’okporo ámá dị nso n’ụlọ anyị ndị bụbu ndị enyi m, bụ́ ndị mụ ha jikọworo ọgwụ ọjọọ mee ihe n’otu oge. Dị ka ihe si n’iso ndị bu ọrịa ahụ na-ekerịta otu ndụdụ, ha ebutewo ọrịa AIDS, na-asọkwa oyi n’anya. Ọtụtụ anwụwo eri ogologo oge. Amatara m na ikekwe na mụ onwe m gaara anwụwo ma a sị na ọ bụghị eziokwu Bible. Ya bụ, o nyeghachiwo m ndụ m.

Zere Ihe Mgbu Ahụ

Ọ na-adị m mgbe mgbe ka ya bụrụ na m amataworị eziokwu mgbe m bụ nwatakịrị wee zere ndụ nke jupụtara n’ihe mgbu na nhụjuanya. Jehova na-enyere m aka ugbu a ịnagide ihe mgbu nke oge ntorobịa e mefusịrị emefusị kpatara, ma aghaghị m ichere ruo n’usoro ihe ọhụrụ maka ngwọta zuru ezu nke apa mmetụta uche ndị ahụ. (Mkpughe 21:3, 4) Taa m na-agbalịsi ike ịgwa ndị na-eto eto na ha bụ ndị a gọziri agọzi ịmara Jehova na inweta enyemaka nke nzukọ ya iji tinye ihe ọ na-akụzi n’ọrụ.

Ụwa pụrụ iyi ihe na-adọrọ adọrọ ma na-adọ akpịrị. Ọ na-emekwa ka i kwere na ị pụrụ inwe ụdị mkpori ndụ ya n’enweghị ihe mgbu. Ma o doro anya na nke a ekweghị omume. Ụwa ga-erigbu gị, mgbe o rigbuchara gị, ọ ga-atụfu gị. Bible na-ekwu n’ụzọ ziri ezi na Ekwensu bụ onye na-achị ụwa—chi ya n’ezie—nakwa na anyị ekwesịghị ịhụ ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị na ya n’anya. (Jọn 12:31; 14:30; 16:11; 2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 2:15-17; 5:19) Ebe ọ bụ na ndị ụwa na-adị ndụ dị ka ndị ohu nke mmebi, mkpakọrịta ha apụghị iwetara gị ezi obi ụtọ.—2 Pita 2:19.

Olileanya m bụ na ịkọ ihe ndị a banyere onwe m ga-enyere ndị ọzọ aka ịhụ na “ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie”—ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke—bụ nanị ndụ bara uru nke a ga-achụso. N’agbanyeghị ihe ụtọ na ihe ilu anyị pụrụ izute ka anyị na-aga ije n’eziokwu ahụ, ahịhịa dị n’akụkụ nke ọzọ nke ogige ahụ, n’ụwa Setan, adịghị akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ karị. Setan na-anwa nanị ime ka o yie otú ahụ. Ana m ekpe ekpere na, tinyere ụmụnna m ndị ikom na ndị inyom nile bụ́ ndị Kraịst, m ga-elekwasị anya m ná ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie, ee, ná ndụ ebighị ebi n’ụwa Paradaịs. (1 Timoti 6:19)—Dị ka Dolly Horry si kọọ.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na nne m, na-agba àmà n’Ogige Tompkins Square

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya