“Alụmdi na Nwunye Omenala” na Ghana
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA GHANA
ALỤMDI na nwunye—ọtụtụ narị puku na-abanye ná mmekọrịta a kwa afọ n’ụwa nile. Ha na-emekarị nke ahụ dị ka omenala alụmdi na nwunye dị n’ebe ha bi si dị.
Na Ghana ụdị alụmdi na nwunye a kasị mara bụ nke a na-akpọ alụmdi na nwunye omenala. Nke a na-agụnye ezinụlọ nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ ịkwụ ezinụlọ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ụgwọ isi nwanyị. Ndị mmadụ na-eme alụmdi na nwunye omenala n’ọtụtụ ebe n’Africa na n’ebe ndị dị ka Hong Kong, Papua New Guinea, na Solomon Islands tinyekwara n’etiti ndị Goajiro India n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Colombia na ebe ugwu ndịda anyanwụ Venezuela, n’ịkpọtụ ole na ole.
Ịkwụ ụgwọ isi nwanyị bụ omenala n’oge Bible. (Jenesis 34:11, 12; 1 Samuel 18:25) Nghọta e nwere n’oge ochie na taa bụ na ụgwọ isi nwanyị bụ ihe iji tie ndị mụrụ nwa agbọghọ ahụ aka n’obi maka mfu nke ozi dị iche iche na maka oge, ume, na ihe ndị e mefuru n’agụmakwụkwọ na nzụlite ya tupu ya alụọ di.
Ibu Ọrụ nke Ndị Mụrụ Ụmụ
N’oge ochie na Ghana, e nweghị iyi oge na mbedo n’etiti ndị na-eto eto. Ndị mụrụ ụmụ na-emetara ụmụ ha ndị toro eto nkwekọrịta alụmdi na nwunye mgbe ha jisịrị nlezianya tụlee ụmụ okoro na agbọghọ na-eto eto a pụrụ ịlụ alụ n’ógbè ha. Ndị nne na nna ụfọdụ na Ghana ka na-eme nke a.
Ndị mụrụ nwa okoro ahụ na-atụle ihe ndị dị ka ụdị onye nwa agbọghọ ahụ bụ; àgwà ya na nke ezinụlọ ya; ọrịa ndị a na-ebute site n’aka ndị mụrụ mmadụ nke pụrụ ịdịgide n’ezinụlọ; n’ọnọdụ nke Ndịàmà Jehova kwa, ọnọdụ ime mmụọ ya. Ọ bụrụ na ha nwere afọ ojuju, ndị mụrụ ya na-agakwuru ndị mụrụ nwa agbọghọ ahụ wee kwuo na ha chọrọ ịlụ ya.
Ugbu a ndị mụrụ nwa agbọghọ ahụ na-ajụta banyere nzụlite nke nwa okoro ahụ na ezinụlọ ya. Tụkwasị n’ihe ndị ahụ a kpọtụrụ uche n’elu, ha na-atụle ikike nwa okoro ahụ nwere ịkwado nwunye—ọ̀ na-arụ ọrụ ka ọ̀ bụ onye na-enweghị ọrụ? Ọ bụrụ na ndị mụrụ nwa agbọghọ ahụ nwere afọ ojuju, ha na-agwa ndị mụrụ nwa okoro ahụ, ndị nne na nna abụọ ahụ na-ejikọ aka mee atụmatụ ihe ndị metụtara alụmdi na nwunye ahụ, mgbe nwa okoro na nwa agbọghọ ahụ kwekọrịtasịrị.
Gịnị mere ndị nne na nna ụfọdụ ka ji na-eji aka ha achọtara ụmụ ha toworo eto ndị òtù ọlụlụ? Otu nwanyị n’India onye ndị mụrụ ya mere ndokwa maka ọlụlụ ya kwuru, sị: “Olee otú onye na-eto eto pụrụ isi ruo eru ime oké mkpebi dị otú ahụ? Ọ ka nnọọ mma ịhapụrụ ya ndị ahụ afọ ndụ na ahụmahụ ha mere ka ha ruo eru ịmara ihe bụ nhọrọ amamihe kasị dị na ya.” Okwu ya na-egosikwa echiche nke ọtụtụ ndị Africa.
Otú ọ dị, oge agbanwewala na Ghana. Iyi oge na mbedo na-aghọwanye ihe a ma ama. N’oge kwesịrị ekwesị ná mbedo, nwa okoro na nwa agbọghọ ahụ na-agwa ndị mụrụ ha ihe ha bu n’uche. Mgbe ndị mụrụ ha kwurịtasịrị okwu, mgbe ndị mụrụ ha nwesịkwara afọ ojuju na ọ bụ njikọ dị mma, ezinụlọ abụọ ahụ na-aga n’ihu n’ememe ahụ a maara ebe nile n’asụsụ dị iche iche nke Ghana dị ka ịkụ aka n’ọnụ ụzọ, ọnụ ụzọ alụmdi na nwunye.
Ememe Ịkụ Aka n’Ọnụ Ụzọ
Ndị mụrụ nwa okoro na nwa agbọghọ ahụ na-agwa ndị òtù ezinụlọ ụbọchị na nzube nke nnọkọ ahụ. Okwu ahụ bụ́ “ndị òtù ezinụlọ” na-ezo aka n’ebe ezinụlọ Africa gbasapụrụ agbasapụ nke na-agụnye ụmụnne nne na nna ndị ahụ na-alụ di na nwunye, ụmụ ụmụnne, nne na nna ochie. N’ụbọchị ahụ a kara aka, ndị nnọchiteanya sitere n’ezinụlọ abụọ ahụ na-ezukọ maka ememe ahụ. Ọ bụghị iwu na nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ ga-anọ ya. Ihe na-esonụ bụ ụdị dị mkpirikpi nke ihe mere n’otu ememe ịkụ aka n’ọnụ ụzọ dị otú ahụ.
Onye Nnọchiteanya Nwa Agbọghọ (ONNA): [N’ịgwa ndị nnọchiteanya nke nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ okwu] Anyị maara ihe mere unu ji bịa, ma ọ bụ omenala ka anyị ka jụọ, Gịnị kpọtara unu n’ebe a?
Onye Nnọchiteanya Nwa Okoro (ONNO): Nwa anyị nwoke bụ́ Kwasi na-agafe n’akụkụ ụlọ unu wee hụ otu okooko osisi mara mma wee na-achọ ka unu nye ya ikike ịkụrụ ya.
ONNA: [N’ime dị ka a ga-asị na ọ maghị ihe a na-ekwu] Ọ dịghị okooko osisi dị n’ụlọ a. Unu pụrụ ịchọpụta nke ahụ n’onwe unu.
ONNO: Nwa anyị nwoke ehieghị ụzọ. Anyị na-ekwusi ike na e nwere okooko osisi mara ezigbo mma n’ụlọ a. Aha okooko osisi ahụ bụ Afi.
ONNA: Mgbe ahụ ọ bụ okooko osisi bụ́ mmadụ. Afi bi n’ebe a.
ONNO: Anyị chọrọ ịkụ aka n’ọnụ ụzọ ma rịọ ka nwa anyị nwoke bụ Kwasi lụọ Afi.
Ugbu a ezinụlọ nwa okoro ahụ na-ewepụta ihe ụfọdụ, dị ka mmanya dị iche iche na ego. Na-adabere n’agbụrụ nke ọ bụ, a na-enwe ọdịiche n’ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ndị a na-eweta. Ememe a na-aha nnọọ ka nke nkwa ọlụlụ nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, n’ọnọdụ ụfọdụ kwa a na-ekwekọrịta inye mgbaaka nkwa ọlụlụ.
Ugbu a onye nnọchiteanya nke nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-ajụ ya n’ihu ndị nile bịaranụ ma è kwesịrị ịnara ihe ndị ahụ e wetara. Site n’azịza nkwenye ya, ndị nile bịaranụ bụ ndị ji anya ha hụ ịdị njikere ya ịlụ di. A na-ekwekọrịta akara ụbọchị ga-adịrị ezinụlọ abụọ ahụ mma maka ememe alụmdi na nwunye ahụ. A na-eji ihe oriri ntụrụndụ na-emechi ememe ahụ.
Ememe Alụmdi na Nwunye Ahụ
Ọnụ ọgụgụ ndị na-ezukọ n’ụlọ nwa agbọghọ ahụ ma ọ bụ n’ụlọ onye nnọchiteanya a họọrọ maka ịkwụ ụgwọ isi nwanyị, bụ́ ihe omume nke bụ alụmdi na nwunye ahụ, na-adị ukwuu mgbe mgbe karịa ọnụ ọgụgụ na-abịa maka ememe ịkụ aka n’ọnụ ụzọ ahụ. Nke a bụ n’ihi na ọtụtụ ndị enyi nọ ya ugbu a.
Ọnọdụ ahụ bụ nke ọṅụ. Ndị na-eto eto na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-enwe ọchịchọ ịhụ ihe e wetaara nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ. Ma ọnọdụ obi ụtọ ahụ na-aghọ nke ahụ erughị ala ka ezinụlọ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-eme mkpesa na ihe ịkwụ ụgwọ isi nwanyị ahụ ezughị ezu. Ụfọdụ ná ndị bịaranụ na-echere ịhụ ihe ga-eme mgbe ezinụlọ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ yiri ka ha na-esi ọnwụ. Onye na-ekwuchitere nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ na-eji nkà arụ ụka iji mee ka ezinụlọ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ jiri nchebara echiche gosi ọmịiko. Ọnọdụ ahụ na-adajụ mgbe ezinụlọ nwa agbọghọ ahụ kwenyere. Ọnọdụ ahụ na-agbanwe ọzọ. Ugbu a ọ bụ oriri na nkwari, a na-enyekwa obere ihe oriri ntụrụndụ.
Iji mmalite ememe alụmdi na nwunye ahu, onye na-ekwuchitere nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-agwa nnọkọ ahụ ka ha nọrọ jụụ wee nabata mmadụ nile. Ọ na-ajụ ndị nnọchiteanya nke nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ ihe mere ha ji bịa. Onye na-ekwuchitere nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ na-ekwu ihe mere ha ji bịa, na-echetaghachiri mkpọkọta ahụ na a kụworị aka n’ọnụ ụzọ nakwa na e nyewo ikike ịbanye.
Mgbe ahụ onye na-ekwuchitere ezinụlọ nke ọ bụla na-akọwapụtara mkpọkọta ahụ ndị bụ ndị òtù ezinụlọ dị nso, gụnyere onye na-enye nwa agbọghọ ahụ n’ọlụlụ, tinyekwara onye na-akwado nwa okoro ahụ n’alụmdi na nwunye ahụ. Ememe ahụ na-aga n’ihu.
ONNA: [N’ịgwa ndị nnọchiteanya nke nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ okwu] Biko wetanụ ihe alụmdi na nwunye ndị ahụ anyị kwuru ka e weta.
Onye na-ekwuchitere nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-agụpụtasị ihe ịkwụ ụgwọ isi nwanyị ahụ ka mmadụ nile wee jide n’aka na ha dị n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na ndị nnọchiteanya nke nwoke ahụ echee na ezinụlọ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ atụkwasịwo ihe n’ihe a chọrọ, ha na-edozi okwu ahụ n’etiti onwe ha tupu ụbọchị alụmdi na nwunye ahụ. Otú ọ dị, ezinụlọ nwoke ahụ na-abịa ememe ahụ, na-adị njikere ikwu ka e belata ihe ntụkwasị ọ bụla ma ọ bụrụ na ndị ụfọdụ n’ezinụlọ nke nwanyị ahụ agbaa isi akwara. N’agbanyeghị ebe mmadụ bi, a ghaghị ịkwụzu ụgwọ isi nwanyị bụ́ isi—ma ọ̀ dị elu ma ọ dị ala.
Ezinụlọ ụfọdụ na-agụpụta ihe ndị dị ka mmanya, ákwà, ihe olu, iyeri ntị, na ihe ndị inyom ndị ọzọ. N’ebe ugwu Ghana, ụgwọ isi nwanyị pụrụ ịgụnye nnu, ọjị, ọgazị, atụrụ, na ọbụna ehi. A na-enwerịrị ego na-eso ụgwọ isi nwanyị.
Ka mkparịta ụka na-aga n’ihu, nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ adịghị anọ n’ebe ahụ, kama ọ na-anọ n’ebe dị nso na-ekiri. Ọ bụghị iwu na nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ ga-anọ ya. Ya mere, onye bi n’ebe dị anya pụrụ inye ndị mụrụ ya ikike ime ihe alụmdi na nwunye n’ọnọdụ ya. Otú ọ dị, n’ọnọdụ nke a kọwara n’ebe a, nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ nọ n’ebe ahụ. Ugbu a ọ bụ oge nke ezinụlọ nke ya ikwu ihe ha chọrọ.
ONNO: Anyị emezuwo ihe nile a chọrọ anyị n’aka, ma anyị ahụbeghị nwunye nwa anyị.
Ememe alụmdi na nwunye abụghị nanị oge iji ihe akpọrọ ihe; ọ bụkwa oge ime ihe ọchị. Ezinụlọ nwa agbọghọ ahụ na-azaghachi ugbu a n’ihe ezinụlọ nwa okoro ahụ chọrọ, ịhụ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ.
ONNA: Ọ dị anyị ka ya bụrụ na nwanyị ahụ nọ n’ebe a. Ọ bụ ihe dị mwute ikwu na ọ gawo ofesi, ma anyị enweghị akwụkwọ ikike ngafe ma ọ bụ visa iji gaa kpọlata ya.
Onye ọ bụla maara ihe nke ahụ pụtara. N’otu ntabianya ahụ, ezinụlọ nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ na-enye ego—ego ọ bụla nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ pụrụ inye—ozugbo ahụkwa! akwụkwọ ikike ngafe na visa ihe atụ ahụ adịwo. Nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ alọtawokwa njem ya!
Iji tinyekwuo ihe n’ime ihe ọchị ahụ, agbụrụ ụfọdụ na-eme ndokwa ka ụfọdụ ndị enyi nke nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ mee dị ka a ga-asị na ha bụ ya. Ìgwè ahụ na-ajụ onye nke ọ bụla mere dị ka a ga-asị na ya bụ ya, ruo mgbe a kpọpụtara onye bụ n’ezie nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ n’etiti oké ụ̀zụ̀. Mgbe ahụ onye na-ekwuchitere ya na-akpọ ya òkù ịhụ ihe dị iche iche dị n’ụgwọ isi ya. A na-ajụ ya ma à ga-anara ihe nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ wetara. Ebe nile na-edere duu ka onye ọ bụla ji ịnụ ọkụ n’obi na-echebiri azịza ya. Ụmụ agbọghọ ụfọdụ na-eme ihere, ndị ọzọkwa wara anya, ma azịza ya na-abụrịrị ee, nke oké ụ̀zụ̀ ịkụ aka na-esochi.
Ọ bụrụ na nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ nọ n’ebe ahụ, ezinụlọ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-achọ ịmata ya. Ime ihe ọchị ahụ na-aga n’ihu n’akwụsịghị akwụsị ma ọ bụrụ na e mewo ndokwa ka otu n’ime ndị enyi ya mee dị ka a ga-asị na ọ bụ ya. N’inwe àgwà nke ịdị mkpa, enyi ya na-ebili ọtọ, ma a na-agwa ya ka ọ nọrọ ọdụ ozugbo ahụ.
Ndị mụrụ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-ekwu na ha chọrọ ịhụ ọgọ ha nwoke. Ugbu a onye bụ nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ n’ezie na-ebili ọtọ, na-ejupụta ná mmụmụ ọnụ ọchị obi ụtọ. Ezinụlọ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-enye ya ikike ịgakwuru di ya, bụ́ onye na-agbawa ya mgbaaka na mkpịsị aka ma ọ bụrụ na a gụnyere mgbaaka dị ka akụkụ nke ụgwọ isi nwanyị ahụ. Mgbaaka bụ ihe ọhụrụ sitere n’Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ya onwe ya, n’aka nke ya, na-agbanyekwa di ya mgbaaka na mkpịsị aka. Okwu ịja mma na ọṅụ na-ejupụta ebe nile. Maka ahụ iru ala na ibelata mmefu, ụfọdụ na-emekọtazi ememe ịkụ aka n’ọnụ ụzọ ahụ na ememe alụmdi na nwunye n’otu ụbọchị ahụ.
Ugbu a ndị nwere ahụmahụ n’ezinụlọ abụọ ahụ na-enye di na nwunye ọhụrụ ahụ ndụmọdụ n’otú ha pụrụ isi mee ka alụmdi na nwunye ha gaa nke ọma ruo mgbe ọnwụ kewara ha. Iji mechie ụbọchị ahụ, a na-enye ihe oriri ntụrụndụ.
Ememe alụmdi na nwunye ahụ agwụwo! Na Ghana, site n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu, ndị nọ n’ógbè ahụ na-ele di na nwunye ahụ anya dị ka ndị lụworo dị ka iwu kwadoro. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ndị bụ́ isi n’ezinụlọ nwa agbọghọ ahụ abịaghị ememe ahụ n’ihi ihe ụfọdụ, a na-ewegara ha ụfọdụ ná mmanya ndị ahụ e wetara ka ha wee jide n’aka na e mezuwo alụmdi na nwunye ahụ. Ọ bụrụ na nwa okoro na nwa agbọghọ ahụ bụ Ndịàmà Jehova, n’ọnọdụ ụfọdụ Ndịàmà ahụ na-emezi ndokwa ka e kwuo okwu Bible, na-enwe obere ihe oriri ntụrụndụ mgbe nke ahụ gasịrị.
Na Ghana ụfọdụ di na nwunye mere ụdị ememe alụmdi na nwunye ebe Ọdịdị Anyanwụ Ụwa, bụ́ nke a na-akpọ n’ebe a alụmdi na nwunye ọchịchị, ma ọ bụ dị ka iwu gọọmenti si dị. A pụrụ ime nke a ma ndị mụrụ ụmụ hà kwenyere ma ọ bụ na ha ekwenyeghị, ma ọ bụrụhaala na mmadụ abụọ ahụ eruwo afọ ndụ iwu kwadoro. N’alụmdi na nwunye omenala, aghaghị inweta nkwenye nke ndị mụrụ ụmụ.
N’alụmdi na nwunye n’ụzọ ọchịchị, mmadụ abụọ ahụ na-aṅụ iyi ọlụlụ. Ma adịghị aṅụ iyi n’alụmdi na nwunye omenala. Ọchịchị na-achọ ka e dejupụta alụmdi na nwunye omenala nile n’akwụkwọ, Ndịàmà Jehova na-emekwa otú ahụ. (Ndị Rom 13:1) Mgbe ahụ a na-enye satifiketi e ji dejupụta akwụkwọ.
Site n’oge ochie ruo mgbe Gold Coast, bụ́ Ghana ugbu a, ghọrọ ógbè ndị Britain na-achị, alụmdi na nwunye omenala bụ nanị ụdị alụmdi na nwunye e nwere ná mba ahụ. Mgbe ahụ ndị Britain webataara ndị amaala bi n’ebe a ụdị alụmdi na nwunye ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. E nyekwara ụmụ amaala a ikike inwe ụdị alụmdi na nwunye a, ruokwa ọtụtụ afọ ugbu a, ụdị alụmdi na nwunye ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na alụmdi na nwunye omenala anọgidewo na-agakọ ụkwụ na ụkwụ. Na Ghana a na-ele ha abụọ anya dị ka ndị iwu kwadoro, n’ihi ya bụrụkwa ndị Ndịàmà Jehova na-anakwere. Ọ bụ ihe dịịrị ndị mmadụ n’otu n’otu ịhọrọ ụdị nke ha chọrọ.
Ná mba ụfọdụ nke Africa, ọ dị mkpa idejupụta alụmdi na nwunye omenala n’akwụkwọ tupu e nwee ike ile mmadụ abụọ ahụ anya dị ka ndị lụrụ dị ka iwu kwadoro. Otú ọ dị, na Ghana alụmdi na nwunye omenala dị ka a kọwara n’elu bụ ihe ziri ezi n’ụzọ iwu n’edejupụtaghị ya n’akwụkwọ, a na-ele di na nwunye ahụ anya dị ka ndị lụrụ n’ụzọ iwu kwadoro mgbe e mezuru alụmdi na nwunye omenala ahụ. Mgbe oge na-aga, a na-edejupụta alụmdi na nwunye omenala ahụ n’akwụkwọ nanị iji nwee ihe ndekọ.
Alụmdi na nwunye bụ n’ezie onyinye ịhụnanya Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ, onyinye pụrụ iche nke a na-enyeghị ọbụna ndị mmụọ ozi. (Luk 20:34-36) Ọ bụ mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke e kwesịrị ichekwa iji nye Onye Malitere ya, bụ́ Jehova Chineke otuto.
[Foto dị na peeji nke 19]
Ka a na-agbanwerịta mgbaaka