Ụzọ Isi Nagide Mmetụta Dị Iche Iche
Ị̀ NA-ELEKỌTA onye a hụrụ n’anya na-arịasi ọrịa ike ugbu a? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịdị na-enwe ụfọdụ mmetụta uche na-agbagwoju anya, na-emenyekwa ụjọ. Gịnị ka ị pụrụ ime? Tụlee mmetụta nke ụfọdụ ndị na-enye nlekọta na-agbaso mgba na aro ndị bara uru ndị nyewooro ha aka ịnagide.
Mmechuihu. Mgbe ụfọdụ, akparamàgwà nke onye na-arịa ọrịa pụrụ imechu gị ihu n’ihu ndị ọzọ. Ma ịkọwara ndị enyi na ndị agbata obi ọdịdị ọrịa nke onye ị hụrụ n’anya pụrụ inyere ha aka ịghọta, ọ pụkwara ịkpali ha ‘iwere obi soro ya’ na igosi ndidi. (1 Pita 3:8) Ọ bụrụ na o kwe mee, soro ezinụlọ ndị ọzọ nọ n’ọnọdụ yiri nke gị kwurịta okwu. Ị pụrụ inwe mmechuihu dị ala ka unu na-akọrịta ahụmahụ unu. Sue na-akọwa ihe nyeere ya aka, sị: “Emeere m papa m ebere nke ukwuu—o kpuchiri mmetụta mmechuihu ọ bụla. Àgwà ya nke ime ihe ọchị nyekwara aka.” Ee, àgwà ime ihe ọchị—n’akụkụ nke onye ọrịa ahụ na ndị na-elekọta ya—bụ ihe na-enye aka dị ukwuu n’ibelata obi iwe.—Tụlee Eklisiastis 3:4.
Egwu. Enweghị ihe ọmụma banyere ọrịa ahụ pụrụ ịbụ ihe na-emenye oké ụjọ. Ọ bụrụ na o kwe mee, chọọ okwu ndụmọdụ nke onye ọkachamara banyere ihe a ga-atụ anya ya ka ọrịa ahụ na-aga n’ihu. Mụta ụzọ isi nye nlekọta n’ọnọdụ ndị ahụ. Nye Elsa, otu n’ime isi ihe ndị kasị mkpa n’ịnagide egwu ya bụ isoro ndị ọzọ na-enye nlekọta na ndị nọọsụ na-enye nlekọta kwurịta okwu banyere ihe ndị a ga-atụ anya ha ka ọnọdụ onye ọrịa ahụ na-aka njọ. Jeanny na-adụ ọdụ, sị: “Chee egwu gị ihu ma chịkwaa ha. Egwu nke ihe pụrụ ime na-akakarị ihe na-eme eme njọ.” Dr. Ernest Rosenbaum na-atụ aro na n’agbanyeghị ihe ndị na-akpata ha, egwu gị kwesịrị ịbụ nke “e kwurịtara ka ha na-ebilite.”—Tụlee Ilu 15:22.
Mwute. Ịnagide mwute adịghị mfe, karịsịa n’ọnọdụ inye nlekọta. Ị pụrụ inwe mwute banyere enweghị onye ibe, karịsịa ma ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’anya nke na-arịa ọrịa enwekwaghị ike ikwu okwu, ịghọta ihe nke ọma, ma ọ bụ ịmata onye ị bụ. Ndị ọzọ nwere ike ha agaghị aghọtacha ụdị mmetụta ahụ ngwa ngwa. Ịgwa enyi nwere nghọta nke ga-eji ndidi na ọmịiko ṅaa ntị banyere mwute gị pụrụ iweta ahụ efe ahụ dị oké mkpa.—Ilu 17:17.
Iwe na Obi Nkoropụ. Ndị a bụ mmeghachi omume dị otú o kwesịrị n’ebe ilekọta onye na-arịasi ọrịa ike nọ bụ́ onye akparamàgwà ya pụrụ isi ike mgbe ụfọdụ. (Tụlee Ndị Efesọs 4:26.) Mata na ọtụtụ mgbe ọ na-abụ ọrịa ahụ, ọ bụghị onye ọrịa ahụ, na-akpata àgwà ahụ na-eweta obi erughị ala. Lucy na-echeta, sị: “Mgbe iwe were m n’ezie, m ga-amalite ibe ákwá. Mgbe ahụ m ga-agbalị ichetara onwe m banyere ọnọdụ na ọrịa nke onye ọrịa ahụ. Amaara m na onye ọrịa ahụ chọrọ enyemaka m. Nke ahụ ga-enyere m aka ịga n’ihu.” Nghọta dị otú ahụ nwere ike ‘ime ka ị ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.’—Ilu 14:29; 19:11.
Obi Amamikpe. Mmetụta nke obi amamikpe bụ ihe a na-ahụkarị n’etiti ndị na-enye nlekọta. Otú ọ dị, jide n’aka na ị na-arụ ọrụ dị mkpa ma sie oké ike. Nakwere eziokwu ahụ bụ na ị gaghị emeghachi omume mgbe nile n’ụzọ zuru okè n’okwu ma ọ bụ n’omume. Bible na-echetara anyị, sị: “Anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na onye ọ bụla asụghị ngọngọ n’okwu, onye ahụ bụ nwoke tozuru okè, bụrụkwa onye pụrụ ịkwa ahụ ya dum nga.” (Jemes 3:2; Ndị Rom 3:23) Ekwela ka mmetụta nke obi amamikpe gbochie gị ime ihe dị mma ugbu a. Mgbe iwe were gị banyere ihe i kwuworo ma ọ bụ mee, o yiri nnọọ ka ị ga-achọpụta na ịsị “ndo” ga-eme ka obi dị gị na onye ọrịa gị mma karị. Otu nwoke nke lekọtara onye ikwu ya rịara ọrịa dụrụ ọdụ, sị: “Mee ihe nile i nwere ike ime n’ọnọdụ ndị ahụ.”
Ịda Mbà n’Obi. Ịda mbà n’obi bụ nnọọ ihe a na-ahụkarị—nke a pụkwara ịghọta—n’ezinụlọ ndị na-anagide ọrịa siri ike. (Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 5:14.) Onye na-enye nlekọta nke na-enwe ịda mbà n’obi na-akọwa ihe nyeere ya aka: “Ọtụtụ ndị na-ekele anyị maka inye nlekọta. Nanị okwu agbamume ole na ole pụrụ inye gị nkwali iji gaa n’ihu mgbe ike gwụsịrị gị ma ọ bụ mgbe i nwere ịda mbà n’obi.” Bible na-ekwu, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi ruru ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.” (Ilu 12:25) Ndị ọzọ nwere ike ha agaghị aghọta mgbe nile mkpa agbamume dị gị. Ya mere, mgbe ụfọdụ, ị pụrụ ibu ụzọ kwupụta “nchegbu” dị n’obi gị n’ezoghị ọnụ iji nweta “okwu ọma” agbamume site n’aka ndị ọzọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na mmetụta nke ịda mbà n’obi adịgide ma ọ bụ siwanye ike, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ịga hụ dọkịta.
Amaghị Ihe A Ga-eme. Ị pụrụ inwe mmetụta nke amaghị ihe a ga-eme mgbe e nwere ọrịa na-akpata ike ọgwụgwụ. Nakwere ịbụ ezie nke ọnọdụ gị. Kweta adịghị ike gị nile—ọ dịghị gị n’aka ịchịkwa ahụ ike nke onye ọrịa ahụ, ma ị pụrụ inye nlekọta ọmịiko. Atụla anya na gị, onye ọrịa gị, ma ọ bụ ndị na-akwado gị ga-ezu okè. Echiche ziri ezi abụghị nanị na ọ na-ebelata mmetụta nke amaghị ihe a ga-eme kamakwa ọ na-eme ka ọrụ ahụ dị mfe. N’ụzọ amamihe, ọtụtụ ndị lekọtaworo onye a hụrụ n’anya na-adụ ọdụ, sị: Mụta iche otu ụbọchị ihu n’otu oge.—Matiu 6:34.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]
“Chee egwu gị ihu ma chịkwaa ha. Egwu nke ihe pụrụ ime na-akakarị ihe na-eme eme njọ”
[Igbe dị na peeji nke 7]
Okwu Agbamume Sitere n’Aka Ndị Na-enye Nlekọta
“ENWELA obi erughị ala n’ihi echiche ndị na-adịghị mma banyere onwe gị. A na-enwekarị ha n’ụdị ọnọdụ ndị ahụ. N’ezie i kwesịghị izochi mmetụta gị. Kọọrọ mmadụ ná ntụkwasị obi mmetụta ị na-enwe, ọ bụrụkwa na i nwere ike, zurutụ ike—pụtụ apụ ruo nwa oge—ka i wee nwee ume ọhụrụ.”—Lucy, onye ọrụ ya n’ụlọ ọgwụ gụnyeworo inyere ọtụtụ ndị na-enye nlekọta nakwa ndị ọrịa aka.
“Ọ bụrụ na e nwere ndị òtù ezinụlọ ma ọ bụ ndị enyi ndị nọ ma dị njikere, kwe ka ha nye aka. Ọ dị mkpa na i sooro ndị ọzọ kerịta ibu ahụ.”—Sue, onye lekọtara nna ya tupu ọ nwụọ n’ihi ọrịa Hodgkin’s disease.
“Mụta ịzụlite àgwà ime ihe ọchị.”—Maria, onye nyere aka lekọta otu ezi enyi nke ọrịa cancer gburu.
“Nọgide na-adị ike n’ụzọ ime mmụọ. Bịaruo Jehova nso, ma na-ekpe ekpere mgbe nile. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17; Jemes 4:8) Ọ na-enye enyemaka na nkasi obi site na mmụọ ya, Okwu ya, na ndị ohu ya nọ n’elu ala, na nkwa ya. Gbalịa ịbụ onye a haziri ahazi ruo n’ókè o kwere mee. Dị ka ihe atụ, ọ na-enye aka inwe usoro ihe omume maka ọgwụ na ihe ndepụta maka ndị na-enye aka.”—Hjalmar, onye lekọtara ọgọ ya nwoke na-anwụ anwụ.
“Mụta ihe nile i nwere ike ịmụta banyere ọdịdị ọrịa nke onye ọrịa gị. N’aka nke ọzọ, nke ahụ ga-enyere gị aka ịmata ihe ị ga-atụ anya ya site n’aka onye ọrịa ahụ na onwe gị na ụzọ isi lekọta onye ọrịa gị.”—Joan, onye di ya na-arịa Alzheimer’s disease.
“Ghọta na ndị ọzọ anagidewo ya tupu nke gị, na Jehova pụkwara inyere gị aka ịnagide ihe ọ bụla merenụ.”—Jeanny, onye lekọtara di ya tupu ọ nwụọ.
[Foto dị na peeji nke 8]
Iji belata egwu gị, chọpụta ihe nile i nwere ike ịchọpụta banyere ọrịa ahụ
[Foto dị na peeji nke 9]
Ịgwa enyi nwere nghọta okwu pụrụ iweta ahụ efe dị ukwuu