Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
N’ihi Gịnị Ka M Ji Arịasi Ọrịa Ike?
MGBE Jason dị afọ 13, o setịpụrụ obi ya n’otu ụbọchị ije ozi dị ka onye ozi oge nile na Betel, isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova na Brooklyn, New York. O meere onwe ya igbe osisi, kpọọkwa ya igbe Betel ya. Ọ malitere ịkwakọba ihe n’ime ya bụ́ ihe ndị o chere ga-aba uru mgbe ọ malitere ọrụ Betel ya.
Otú ọ dị, nanị ọnwa atọ ka afọ nke 18 a mụrụ ya gasịrị, a chọpụtara na Jason na-arịa ọrịa Crohn’s disease—ọrịa afọ mgbu, na-adịghị akwụsị akwụsị. “Ọ ghasara m nnọọ isi,” ka ọ na-echeta. “Nanị ihe m pụrụ ime bụ ịkpọ papa m n’ebe ọrụ na ibe ákwá. Amara m na, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ pụtara na nrọ m na-arọ ịga Betel enweela ihe mgbochi.”
Nrịanrịa bụ otu ihe gbara ọkpụrụkpụ mere “ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) Ọtụtụ nde a na-apụghị ịgụ ọnụ nke ndị na-eto eto so ná ndị ọrịa. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-emesị dị mma. Ma ndị ọzọ aghaghị ịgbaso ọrịa ndị na-adịghị ala ala mgba ma ọ bụ, n’ọnọdụ ụfọdụ, nke na-eyi ndụ egwu. Mkpagbu ndị a gụnyere n’ime ndị nke ndị ntorobịa na-enwekarị bụ ọrịa asthma, ọrịa shụga, ọrịa ọmị ọbara, nrịanrịa ndị na-efe efe, àkwụ́kwụ̀, ọrịa uche, na ọrịa cancer. Ndị ntorobịa ụfọdụ na-enwe ọtụtụ ọrịa ná ndụ ha.
‘N’ihi Gịnị Ka Ihe A Ji Na-eme M?’
Nrịanrịa na-akpatakarị nrụgide nke uche na mmetụta uche, tinyekwara ahụhụ anụ ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọrịa emee ka ị ghara ije akwụkwọ ruo ọtụtụ ọnwa, ọ bụghị nanị na ị pụrụ ịla azụ n’agụmakwụkwọ kama ị ga-enwekwa mmetụta ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe ọha na eze nọ. Mgbe Sunny dị afọ 12 na-aghaghị ịhapụ akwụkwọ n’ihi ọnụnọ ndị ọ nọrọ site n’oge ruo n’oge n’ụlọ ọgwụ, ọ na-enwe nchekasị, ‘Gịnị ka ụmụ klas m na-eme? Gịnị na-efunahụ m taa?’
N’ụzọ yiri nke ahụ, uto ime mmụọ pụrụ iyi ihe nọ ná nsogbu mgbe ị rịasiri ọrịa ike na ị pụghị ịga nzukọ ndị Kraịst ma ọ bụ ọbụna ịgụ Bible. N’ọnọdụ dị otú a i nwekwuru mkpa nkwado mmetụta uche na nke ime mmụọ. Ná mmalite, ị pụrụ ịjụ ikwere nchọpụta. E mesịa, ị pụrụ iwe oké iwe, ikekwe wesawa ya onwe gị, na-eche na ị ka-ezereworị nrịanrịa ahụ n’ụzọ ụfọdụ. Ị pụrụ inwe mmetụta itiwe, sị, ‘N’ihi gịnị ka Chineke jiri hapụ ka ihe a mee m?’ (Tụlee Matiu 27:46.) N’ezie, o kwekọrọ ekwekọ ma ọ dịghị ihe ọzọ ịdatụ mbà n’obi.
Tụkwasị na nke a, onye na-eto eto pụrụ ọbụna iche na ọ bụrụ na o mee mgbalị ụfọdụ pụrụ iche, dị ka ịgbalị ịbụtụkwu ezi mmadụ, Chineke ga-ewepụ nrịanrịa ya. Otú ọ dị, echiche dị otú ahụ pụrụ iduje ná ndakpọ olileanya, ebe Chineke na-ekweghị nkwa ọgwụgwọ ọrụ ebube n’oge a.—1 Ndị Kọrint 12:30; 13:8, 13.
Ikekwe i nwewo olileanya na ị gaghị anwụ ma ọlị—na ị ga-anọ ndụ mgbe Chineke ga-eweta “oké mkpagbu ahụ.” (Mkpughe 7:14, 15; Jọn 11:26) Ọ bụrụ otú ahụ, ịmata na i bu nrịanrịa na-eyi ndụ egwu pụrụ ịbụ ihe na-awụ oké akpata oyi n’ahụ. Ị pụrụ ichewe ma o nwewo ihe i mere megide Jehova, ma ọ bụ ị pụrụ iche na Chineke ewepụtawo gị maka otu ule pụrụ iche nke iguzosi ike n’ezi ihe. Otú ọ dị, ndị a abụghị nkwubi okwu ndị kwesịrị ekwesị. “Chineke bụ Onye a na-apụghị iwere ihe ọjọọ nwaa Ya, Ya onwe ya adịghị anwakwa onye ọ bụla,” ka Okwu Chineke, bụ́ Bible na-ekwu. (Jemes 1:13) Ọrịa na ọnwụ bụ akụkụ na-adịghị enye obi ụtọ nke ọnọdụ mmadụ ugbu a, anyị nile nọkwa n’okpuru “mgbe na ihe ndapụta.”—Eklisiastis 9:11.
Ịgbaso Egwu Mgba
Ịda oké nrịanrịa pụrụ ịkpatara gị inwe mmetụta egwu miri emi nke mbụ ya. Akwụkwọ bụ́ How It Feels to Fight for Your Life dekọrọ nchọpụta nke ndị na-eto eto 14 na-arịa ajọ ọrịa. Dị ka ihe atụ, Anton, dị afọ iri, tụrụ egwu na ya ga-anwụ mgbe ọrịa asthma dị njọ bịakwasịrị ya. Elizabeth kwa, dị afọ 16, onye na-alụso ọrịa cancer ọkpụkpụ ọgụ, tụrụ egwu ịlakpu ụra ma ghara iteta.
Otú ọ dị, ndị ntorobịa ụfọdụ na-enwe ụdị egwu ndị dị iche—egwu na ọ dịghị onye ga-achọtụdị ịlụ ha ma ọ bụ egwu na ha agaghị amụta ụmụ ahụ siri ike mgbe e mesịrị ná ndụ. Ndị na-eto eto ndị ọzọ na-atụ egwu na ha pụrụ ibunye ndị òtù ezinụlọ ha nrịanrịa ha, ma ọrịa ha ọ̀ na-efe efe ma ọ bụ na ọ dịghị efe.
Ọ bụrụgodị na ọrịa kwụsịrị ịkpa ike ma ọ bụ belatara, mgbe ọ bụla ọ kara njọ, egwu pụrụ ịbịaghachi. Ọ bụrụ na ị tụwo ụdị egwu ndị ahụ, ị matara na ha na-eme eme n’ezie. Ọ dabara nke ọma na nsọpụta mbụ nke mmetụta uche na-ezighị ezi na-adajụkarị ka oge na-aga. Mgbe ahụ ị pụrụ ịmalite iji nghọta ka ukwuu tụlee ọnọdụ gị.
Ihe Ịma Aka nke Ịrịa Ọrịa
“Mgbe ị dị obere, ị na-enwe mmetụta onye ike juru n’ahụ,” ka Jason na-ekwu, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ. “E mesịa, na mberede, ịrịa ajọ ọrịa na-akwapụ gị na nke ahụ. Ị na-enwe mmetụta na i mewo agadi na mberede, ebe ị na-aghaghị ịnọrọzi ọdụ ma mewe ihe nwayọọ nwayọọ.” Ee, iche ịkpa ókè ndị ọhụrụ ihu bụ ihe ịma aka.
Jason chọpụtara na oké ihe ịma aka ọzọ na-abịa mgbe ndị ọzọ na-aghọtaghị ọnọdụ gị. Jason nwere ihe a pụrụ ịkpọ “nrịanrịa a na-adịghị ahụ anya.” Ọdịdị elu ahụ ya na-ekpuchi nsogbu dị n’ime. “Ahụ m adịghị agbari nri otú o kwesịrị,” ka Jason na-akọwa, “ya mere aghaghị m iri ihe mgbe mgbe, ana m erikwa ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu karịa otú ọtụtụ ndị na-eri. Ma, aka m dịkwa tịga tịga. Ọzọkwa, mgbe ụfọdụ ike na-agwụbiga m oké nke na apụghị m imeghe anya m emeghe n’etiti ụbọchị. Ma ndị mmadụ na-ekwu okwu ndị na-egosi na ha chere na m na-eri oké nri ma ọ bụ dị umengwụ. Ha na-ekwu ihe ndị dị ka: ‘Ị maara na ị pụrụ ime nke ọma karị. Ị naghị agbalịtụdị agbalị!’”
Jason nwere ụmụnne ndị ọ tọrọ na-adịghị aghọta mgbe nile ihe mere na ọ pụghị ime ihe ndị ọ na-emebu, dị ka ịkpọrọ ha ga gbaa bọl. “Ma amaara m na m merụọ ahụ,” ka Jason na-ekwu, “ọ pụrụ iwe ọtụtụ izu iji laa. Ha na-ewere ihe ụfụ ha na-atụnyere nke m na-asịkwa, ‘Nanị ihe o ji na-eti mkpu bụ ka a tụpụrụ ya ọnụ.’ Ahụ ụfụ ha kasị njọ bụ ma eleghị anya ihe dị ka mkpọbi ụkwụ, ya mere ha apụghị ichetụdị n’echiche ihe ụfụ m na-enwe dị ka ya.”
Ọ bụrụ na nrịanrịa gị yiri ka ọ na-ebo ezinụlọ gị ibu arọ, ị pụrụ ịgbaso obi amamikpe mgba. Ndị mụrụ gị pụrụ inwekwa obi amamikpe. “Ma nne m ma nna m kwere na ọ pụrụ ịbụ ha bufere m nsogbu ahụ,” ka Jason na-ekwu. “Ụmụaka na-emekarị mgbanwe nye nrịanrịa mgbe ha bịasịrị nakwere ya. Ma ọ na-esiri ndị nne na nna ike karị. Ha na-arịọ m mgbaghara ugboro ugboro. Aghaghị m ịnọgide na-eme ike m nile iji gbalịa ime ka mmetụta obi amamikpe ha jụrụ.”
Njem Ịnata Ọgwụgwọ —Ha Abụghị Egwuregwu
Ịgawa na-ahụ dọkịta mgbe nile pụrụ ịbụ isi iyi nke nchegbu. Ha pụrụ ime ka ị na-enwe mmetụta nke na ị baghị uru, na i nweghịkwa onye inyeaka. Nanị ịnọdụ ala n’ọnụ ụlọ ile ahụ nke ụlọ ọgwụ na-echere ka o ruoro gị pụrụ ịkpata ụjọ. “Ị na-enwe mmetụta . . . oké owu ọmụma, ọ ga-adịkwa mma ma e nwee onye nọnyeere gị,” ka Joseph na-ekwu, onye dị afọ 14, na-arịa ọrịa obi. Ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ ndị na-eto eto adịghị enweta ụdị nkwado ahụ, ọbụna site n’aka ndị mụrụ ha.
Ile ahụ pụrụ n’otu aka ahụ ịkpali nchegbu. N’ikwu eziokwu, ule ụfọdụ pụrụ iweta oké obi ọjọọ. Mgbe e mesịrị, ọ pụrụ ịbụ na ị ga-anagide ọtụtụ ụbọchị ma ọ bụ izu nke nchegbu ebe ị na-eche ka rịzọlt pụta. Ma buru nke a n’uche: Ile ahụ adịghị ka ile ule n’ụlọ akwụkwọ; inwe nsogbu ahụ ike apụtaghị na o nwewo otú isi daa.
N’ezie, ule pụrụ inye ihe ọmụma na-enye aka nke ukwuu. Ọ pụrụ igosi na i nwere nsogbu ahụ ike dị mfe ọgwụgwọ. Ma ọ bụ, ọ bụru na ọ dịghị otú ahụ, ule pụrụ inye aka igosi ihe ị pụrụ ime iji nagide ọrịa ahụ. Ọ pụrụ ọbụna igosi na i nwedịghị nrịanrịa e chere na i nwere. Ya mere gbalịa ka ị ghara ịmabanye ná nkwubi okwu banyere ọnọdụ gị.
Inwewe oké nchekasị bụ nanị ike ọgwụgwụ ka ọ ga-akpatara gị. Bible na-ekwu, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala.” (Ilu 12:25) Kama nke ahụ, Chineke na-akpọ anyị òkù ịgwa ya banyere nchegbu anyị. Ọ dị anyị mkpa ịtụkwasị obi na ọ na-eche banyere anyị nakwa na ọ ga-enye anyị nduzi ya na amamihe iji gbasoo nsogbu ahụ mgba n’ụzọ kachasị mma pụrụ ikwe omume.—Abụ Ọma 41:3; Ilu 3:5, 6; Ndị Filipaị 4:6, 7; Jemes 1:5.
Anyị pụrụ inwe obi ụtọ na Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, emewo ndokwa iwebata ụwa ọhụrụ nke ezi omume. Ọ ga-akpọlite ọbụna ndị nwụworo anwụ, na-enye ha ohere ịnụ ụtọ ụwa ọhụrụ ahụ. Bible na-emesi anyị obi ike na n’oge ahụ “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.
Tupu mgbe ahụ eruo, ọ pụrụ ịbụ na ị ga-anagide ajọ nrịanrịa. Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ ihe ndị dị irè ị pụrụ ime iji nweta ihe kachasị mma n’ọnọdụ gị. Anyị ga-atụle ndị a n’isiokwu nke dị n’ihu.
[Foto dị na peeji nke 14]
Ị pụrụ ịjụ, ‘N’ihi gịnị ka Chineke jiri hapụ ka ihe a mee m?’