Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 7/8 p. 4-7
  • Mgbe Ibu Ibu Karị Na-akaghị Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Ibu Ibu Karị Na-akaghị Mma
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ibu Ibu Karị, Ihe Ize Ndụ Karị
  • Ụkpụrụ Nduzi Ndị Ọhụrụ Banyere Ịdị Arọ́
  • Olee Otú Anyị Si Bịa Buo Oké Ibu?
  • Ànyị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma?
  • Oké Ibu—Gịnị Na-akpata Ya?
    Teta!—2004
  • Ibu Oké Ibu Ọ̀ Bụ Nsogbu n’Ezie?
    Teta!—2004
  • Ịlụso Oké Ibu Ọgụ—Ò Ruru Mgbalị E Meere Ya?
    Teta!—2004
  • Oké Ibu—Gịnị Bụ Ngwọta Ya?
    Teta!—2004
Teta!—1997
g97 7/8 p. 4-7

Mgbe Ibu Ibu Karị Na-akaghị Mma

“Uwe m adịkwaghị aba m,” ka Rosa dị afọ 35 kwara n’arịrị. “Ugbu a adị m ihe ruru kilogram 86, echetụbeghịkwa m n’echiche na m ga-ebu ibu otú a!”

Ọ BỤGHỊ nanị Rosa na-echegbu onwe ya banyere ibu ọ na-ebukwu. Na United States, ebe o bi, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mba ahụ buru oké ibu.a Nkezi nke ndị toruworo ogo mmadụ buru oké ibu na Britain mụbara okpukpu abụọ n’ime afọ iri. Na Japan kwa—ebe ibubiga ibu ókè dịbu ụkọ—ibu oké ibu na-aghọ ihe a na-ahụkebe.

Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ụmụaka buru ibu karịa otú ha kwesịrị. Ihe dị ka nde 4.7 ndị ntorobịa America nọ n’agbata afọ 6 na 17 bubigara ibu ókè nke ukwuu, ebe ihe dị ka 20 pasent n’ime ụmụaka Canada buru oké ibu. N’afọ ndị a ibu oké ibu na nwata amụbawo okpukpu atọ na Singapore.

Ná mba ụfọdụ, a na-ele inwe ahụ n’ihi ibu ibu anya dị ka ihe àmà nke ọganihu na ahụ ike, ọnọdụ a na-achọsi nnọọ ike karịa ịda ogbenye na erijughị afọ. Ma n’ala Ọdịda Anyanwụ, bụ́ ebe a na-enwetakarị ihe oriri ngwa ngwa, a dịghị elekarị ibu ibu anya dị ka ihe a na-achọsi ike. N’ụzọ dị iche, ọ na-abụkarị ihe na-akpata oké nchegbu. N’ihi gịnị?

“Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ kwenyere na ibu oké ibu bụ nsogbu nke ọdịdị ile anya,” ka Dr. C. Everett Koop, onye bụbu dọkịta ukwu nke United States, na-ekwu, “n’ezie ọ bụ nnukwute ọrịa.” Ọkà ná mmiri ọgwụ endocrine bụ́ F. Xavier Pi-Sunyer, nke New York, na-akọwa, sị: “[Ime ka America maa abụba] na-etinye ọnụ ọgụgụ mmadụ ka ukwuu n’ihe ize ndụ nke ọrịa shuga, ọbara mgbali elu, ahụ mkpọnwụ, ọrịa obi, ọbụna ụdị ọrịa cancer ụfọdụ.”

Ibu Ibu Karị, Ihe Ize Ndụ Karị

Tụlee otu ihe ọmụmụ nke ụmụ nwanyị nọọsụ 115,000 bụ́ ndị America, bụ́ ndị e lekwasịrị anya ruo afọ 16. Ihe ọmụmụ ahụ chọpụtara na mgbe ndị toruworo ogo mmadụ tụkwasịrị ọbụna kilogram ise ruo asatọ, ọ na-arụpụta ihe ize ndụ ka elu nke ọrịa obi. Ihe ọmụmụ a, nke e bipụtara na The New England Journal of Medicine nke September 14, 1995, gosiri na otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị na-anwụ n’ihi ọrịa cancer na otu ọkara nke ndị na-anwụ n’ihi ọrịa obi bụ n’ihi ibubiga ibu ókè. Dị ka otu akụkọ nke dị na The Journal of the American Medical Association (JAMA) nke May 22/29, 1996, si kwuo, “78% nke ọbara mgbali elu n’ụmụ nwoke na 65% n’ụmụ nwanyị bụ nke a pụrụ ikwu kpọmkwem na ọ bụ n’ihi ibu oké ibu.” Òtù Ọrịa Cancer nke America na-ekwu na ndị “bubigara ibu ókè n’ụzọ pụtara ìhè” (40 pasent ma ọ bụ karị gafee ịdị arọ́ kwesịrị ekwesị) “nwere ihe ize ndụ ka elu nke ọrịa cancer.”

Ma ọ bụghị nanị ibukwu ibu dị ize ndụ; otú e si kesaa abụba nke ahụ na-emetụtakwa ihe ize ndụ nke ịrịa ọrịa. Ndị nwere abụba gabigara ókè n’afọ nọ n’ezie n’ihe ize ndụ ka elu karịa ndị buru ibu karị n’úkwù na n’apata ụkwụ ha. E jikọtara abụba dị n’akụkụ ebe afọ na ihe ize ndụ ka elu nke ọrịa shuga, ọrịa obi, ọrịa cancer ara, na ọrịa cancer akpa nwa.

N’otu aka ahụ, ndị ntorobịa bubigara ibu ókè na-arịa ọbara mgbali elu, ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol dị elu, na ọnọdụ ndị na-ebute ụzọ tupu ọrịa shuga. Ha na-aghọkarịkwa ndị toruworo ogo mmadụ buru oké ibu. The New York Times, n’iji ihe ndekọ e bipụtara n’akwụkwọ ahụ ike Britain bụ́ The Lancet eme ihe, kọrọ na “ndị buru ibu mgbe ha bụ ụmụaka nwụrụ n’oge ma rịa ọtụtụ ọrịa mgbe ha dị ntakịrị nke ukwuu karịa otú ọ dị n’ọha.”

Ụkpụrụ Nduzi Ndị Ọhụrụ Banyere Ịdị Arọ́

Gọọmenti United States, n’ikwenyesi ike na e nwere nsogbu siri ike banyere ịdị arọ, mere ka ụkpụrụ nduzi ịdị arọ́ ọ tụrụ aro ya na 1995 sikwuo ike. (Lee igbe dị na peji na-esonụ.) Ụkpụrụ nduzi ahụ dị ọhụrụ nwere “ibu dị mma,” “ibu gabigatụrụ ókè,” na “ibu gabigara ókè nke ukwuu.” Ụkpụrụ nduzi ahụ na-emetụta ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwanyị toruworo ogo mmadụ, n’agbanyeghị afọ ndụ ha.

Ụkpụrụ nduzi nke 1990 nyere ohere maka uto nke ógwè ahụ n’oge a katatụrụ ahụ, nke a na-akpọkarị mgbasawanye n’oge a katatụrụ ahụ. Ụkpụrụ nduzi ọhụrụ ahụ enyeghị ohere a, ebe ihe àmà na-egosi na ndị toruworo ogo mmadụ ekwesịghị ibukwu ibu ka oge na-aga.b Ya mere, onye a na-elebu anya dị ka onye buru ibu otú o kwesịrị pụrụ ịhụ onwe ya ugbu a n’òtù ndị bubigara ibu ókè. Dị ka ihe atụ, onye dị sentimita 168 n’ogologo nke nọ n’agbata afọ 35 na 65 bụ́ onye dara kilogram 75 gaara anọworị n’òtù ndị buru ibu dị mma n’okpuru ụkpụrụ nduzi nke 1990. Ma n’okpuru ụkpụrụ nduzi ọhụrụ ahụ, ọ ga-eji kilogram ise bubiga ibu ókè!

Olee Otú Anyị Si Bịa Buo Oké Ibu?

Àgwà e ketara eketa pụrụ imetụta ohere mmadụ nwere ibu oké ibu, ma ha adịghị akpata ibukwu ibu ná mba Ọdịda Anyanwụ. Ọ bụ ihe ọzọ dị iche na-akpata nsogbu ahụ.

Ndị ọkachamara banyere ahụ ike kwetara na iri abụba pụrụ ime ka anyị buo ibu. Anụ dị ukwuu na ọtụtụ ihe e ji mmiri ara ehi mee, ihe ndị e siri n’ovun, nri ngwa ngwa, nri mgbadume, nri e ghere eghe, ofe, gravy, na mmanụ ndị jupụtara n’abụba, irikwa ha pụrụ iduje n’ibu oké ibu. N’ụzọ dị aṅaa?

Iri calorie n’ihe oriri anyị na-eri karịa otú ahụ anyị na-emefu na-akpatara anyị ibu ibu. Abụba nwere calorie itoolu na gram ọ bụla, ma e jiri ya tụnyere calorie anọ n’otu gram protein ma ọ bụ otu gram carbohydrate. Ya mere anyị na-eri calorie ka ukwuu mgbe anyị na-eri abụba. Ma e nwere isi ihe ọzọ dị mkpa—ụzọ ahụ mmadụ si eji ume sitere na carbohydrate, protein, na abụba eme ihe. Ahụ na-ebu ụzọ gbarie carbohydrate na protein, mgbe ahụzi abụba. A na-agbanwe calorie abụba ndị a na-ejighị mee ihe ịghọ abụba ahụ. Ya mere igbubilata ihe oriri ndị nwere abụba bụ ụzọ dị mkpa isi felata.

Ma, ụfọdụ ndị kwenyere na ha ebelatawo abụba ha na-eri na-achọpụta na ahụ ha ka na-ebu ibu. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na ha na-eri nri buru ibu. Otu ọkachamara banyere iri ihe na United States na-ekwu, sị: “Anyị na-eribiga nri ókè n’ihi na a na-ebupụta nri gafere ókè. Mgbe ọ dị, anyị erie ya.” Ndị mmadụ yikwara ka ha na-eribiga nri ndị nwere ntakịrị abụba ma ọ bụ ndị na-enweghị abụba ókè. Ma otu ọkachamara n’ụlọ ọrụ na-enye ndụmọdụ nke ụlọ ọrụ mmepụta ihe oriri na United States na-akọwa, sị: “A na-emekarị ka ihe ndị e gbubilatara abụba dị na ha tọkwuo ụtọ site n’ịmụba [ịdị elu nke calorie] shuga dị na ya.” N’ihi ya, The New York Times kọrọ, sị: “Omume abụọ nke afọ ndị 1990—iji ego zụta ihe ka ukwuu na iri ihe oriri ndị nwere ntakịrị abụba, ma ọ bụ ndị na-enweghị abụba—aghọwo ịkpọ òkù maka iribiga ihe ókè,” n’ihi ya ibukwu ibu.

Ụzọ ndụ ịnọ nkịtị n’arụghị ọrụ na-akwalitekwa ibu ibu. Otu ihe ọmụmụ e mere na Britain chọpụtara na ihe gafere otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị toruworo ogo mmadụ n’ala ahụ na-enwe ihe na-erughị minit 20 nke mmega ahụ dị n’ókè kwesịrị ekwesị kwa izu. Ihe na-erughị ọkara enweghị mgbe ha ji etinye aka n’egwuregwu siri ike. Iji ụgbọala eme njem anọchiwo anya ịga ije n’ọtụtụ mba Ọdịda Anyanwụ, ịrị elu nke ikiri telivishọn na-akwalite ma ịdị umengwụ ma iribiga ihe ókè. Na United States, ụmụaka na-anọdụ ala ma kirie telivishọn ruo ihe e mere atụmatụ ya ịbụ hour 26 kwa izu, ka a gharazie ikwuwe oge e tinyere n’egwuregwu vidio. Ka ọ dịgodị, nanị ihe dị ka 36 pasent nke ụlọ akwụkwọ ka na-enwe mmụta mmega ahụ.

E nwekwara ihe ndị metụtara ọnọdụ uche ndị na-akpata ibubiga ibu ókè. “Anyị na-eri nri n’ihi mkpa mmetụta uche,” ka Dr. Lawrence Cheskin, nke Ogige Nchịkwa Ibu Ibu nke John Hopkins na-ekwu. “Anyị na-eri nri mgbe obi dị anyị ụtọ, anyị na-eri nri mgbe iwe ji anyị. Anyị etolitewo na-ekwenye na ihe oriri bụ ihe nnọchianya maka ọtụtụ ihe ndị ọzọ.”

Ànyị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma?

Okwu metụtara ibubiga ibu ókè dị mgbagwoju anya. Kwa afọ, ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde 80 ndị America na-ahọrọ ókè na ụdị ihe ha na-eri. Ma ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha nile na-alaghachi n’ụzọ ha sibu eri nri ngwa ngwa ha felatatụrụ. N’ime afọ ise, 95 pasent na-ebughachi ibu.

Ihe dị mkpa iji felata na ịdịgide otú ahụ bụ mgbanwe nke ụzọ ndụ. Ụdị mgbanwe ndị ahụ chọrọ mgbalị na itinye uche n’ihe, tinyere enyemaka site n’aka ndị ezinụlọ na ndị enyi. N’ọnọdụ ụfọdụ enyemaka nke ndị ọkachamara ahụ ike pụkwara ịdị mkpa.c Otú ọ dị, ka mgbalị gị wee gaa nke ọma, a ghaghị inwe mkpali ziri ezi. Ọ dị mma ịjụ onwe gị, sị, ‘Gịnị mere m ji chọọ ifelata?’ Mgbalị gị ifelata yikarịrị ka ọ ga-aga nke ọma ma ọ bụrụ na ọchịchọ izere ihe ize ndụ ahụ ike na-agakọ ya na ọchịchọ inwe mmetụta ka mma na inwe ọdịdị ka mma na ime ka ndụ gị ka mma.

Ị pụrụ iri ọtụtụ ihe oriri dị ụtọ ma na-eju afọ nke na-edozi ahụ ma nwee calorie dị nta. Ma tupu i kpebie ihe oriri ndị pụrụ inyere gị aka ifelata, ka anyị tụlee otú ihe ụfọdụ dị n’ihe oriri pụrụ isi ghọọ ihe ize ndụ ahụ ike.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A na-akọwakarị ibu oké ibu dị ka 20 pasent ma ọ bụ karị gafere ihe e kwenyere na ọ bụ ịdị arọ́ kwesịrị ekwesị.

b Ụkpụrụ nduzi nke 1995 na-emetụta ihe ka ukwuu n’afọ ndụ nile ma ọ bụghị ha nile. “E nwere nkwekọrịta zuru ọha ọnụ na ụkpụrụ nduzi ọhụrụ ahụ banyere ịdị arọ́ ikekwe adịghị emetụta ndị gafeworo afọ 65,” ka Dr. Robert M. Russell na-ekwu na JAMA nke June 19, 1996. “Ntakịrị ibubiga ibu ókè n’onye metụworo agadi pụrụ ọbụna ịba uru site n’inyekwu ya ume maka oge nrịanrịa na site n’inye aka ichebe ibu nke uru ahụ na nke ọkpụkpụ.”

c Maka aro ụfọdụ banyere ifelata, lee Teta! nke May 8, 1994 (Bekee), peji nke 20-22; January 22, 1993 (Bekee), peji nke 12-14; na May 8, 1991, peji nke 3-12.

[Chaatị dị na peeji nke 6]

Ị̀ nọ n’òtù “ibu dị mma,” “ibu gabigatụrụ ókè,” ka ọ̀ bụ “ibu gabigara ókè nke ukwuu”? Graph e gosiri n’ebe a ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ahụ

Ụkpụrụ Nduzi Ịdị Arọ́ nke 1995 Maka Ma Ụmụ Nwoke Ma Ụmụ Nwanyị

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ogo *

198cm

190cm

180cm

170cm IBU DỊ MMA IBU GABIGATỤRỤ ÓKÈ IBU GABIGARA ÓKÈ NKE UKWUU

160cm

150cm

30kg 40kg 50kg 60kg 70kg 80kg 90kg 100kg 110kg

Ịdị arọ́†

Ihe ndekọ dabeere na: Ngalaba Ọrụ Ugbo nke United States, Ngalaba Ahụ Ike na Ije Ozi Ọha na Eze nke United States

* N’eyighị akpụkpọ ụkwụ.

† N’eyighị uwe. Ịdị arọ́ ndị ka elu bụ maka ndị nwere uru ahụ na ọkpụkpụ karị, dị ka ọtụtụ ụmụ nwoke.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya