Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 1/8 p. 14-17
  • Kilimanjaro—Uko nke Africa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kilimanjaro—Uko nke Africa
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Uko” Africa
  • Ọnụ Ọnụ Ya Ndị Na-adọrọ Mmasị
  • Njikọ nke Ihe Ndị Dị Ndụ na Ebe Obibi Ha Magburu Onwe Ya
  • Imeri “Kili”
  • Ugwu Nọ n’Ihe Ize Ndụ
    Teta!—2005
  • Ugwu Ihe Mere Ha Ji Dị Anyị Mkpa
    Teta!—2005
  • Ndị Na-akpọ Ụgba na Nkume Dị Elu nke Ugwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Teta!—1998
g98 1/8 p. 14-17

Kilimanjaro—Uko nke Africa

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA KENYA

NANỊ afọ 150 gara aga, ime ime Africa nọgidere bụrụ ebe a na-amaghị ama n’ụzọ dị ukwuu. Nye ndị si ebe ọzọ n’ụwa, kọntinent ukwu a bụ ebe a na-achọpụtabeghị na ebe dị omimi. N’ime ọtụtụ akụkọ sitere n’Ọwụwa Anyanwụ Africa, otu karịsịa yiri ihe pụrụ iche nye ndị Europe. Ọ bụ akụkọ ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị Germany aha ha bụ́ Johannes Rebmann na Johann L. Krapf kọrọ, bụ́ ndị zọọrọ na na 1848 ha hụrụ n’ebe dị nso n’akara kere ụwa abụọ otu ugwu dị elu nke na ọnụ ọnụ ya na-enwu ọcha n’ihi snow.

Ọ bụghị nanị na e nwere obi abụọ n’akụkọ ahụ bụ na ugwu snow kpuchiri elu ya dị n’ebe okpomọkụ Africa kama e jikwa ya mee akaje. Ma, akụkọ banyere nnukwute ugwu kpaliri ọchịchọ ịmata ihe na mmasị nke ndị ọkà mmụta ọdịdị mbara ala na ndị na-eme nchọpụta, ha mesịkwara nwapụta akụkọ ndị ozi ala ọzọ ahụ. E nwere n’ezie ugwu mgbawa nke snow kpuchiri elu ya n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa nke aha ya bụ Kilimanjaro. Ụfọdụ ndị ghọtara nke ahụ ịpụta “Ugwu nke Ịdị Ukwuu.”

“Uko” Africa

Taa a ma Kilimanjaro ukwu ahụ ama n’ihi oké ịma mma na oké ịdị elu ya. Ọ bụ ihe ole na ole a na-ahụ na-adọrọ mmasị ma kwesị ncheta dị ka nke ìgwè enyi na-ata nri na-agafe ala Africa ahụ dị larịị, nke kpọrọ nkụ, nke uzuzu jupụtara, nke na-enwe n’azụ ya “Kili” nke snow kpuchiri elu ya ka ọ na-eguzo n’ụzọ dị ebube n’ebe dị anya.

Kilimanjaro bụ ugwu kasị elu na kọntinent Africa, na-esokwa n’ugwu mgbawa ndị kasị ukwuu n’ụwa ndị na-adịghị akpa ike. Ọ dị na Tanzania, na ndịda nke akara kere ụwa abụọ nakwa na nso ókèala mba Kenya. N’ebe a ala agbọpụtawo ihe karịrị ijeri kubik mita anọ nke ihe ndị ugwu na-agbawapụta, na-emepụta ugwu a nke ọnụ ọnụ ya ruru n’ìgwè ojii.

Ịdịpụ iche nke ugwu a na-emesikwu ịdị ukwuu ya ike. N’iguzo nanị ya na n’ebe dị iche, ọ malitere site n’ime ọhịa nke obodo Masai bụ́ ala kpọrọ nkụ, dịrị n’ebe ji ihe dị ka mita 900 karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri, ruo mita 5,895 n’ịdị ukwuu! Ka a sịkwa ihe mere e ji na-akọwa Kilimanjaro mgbe ụfọdụ dị ka uko nke Africa.

A na-akpọkwa Kilimanjaro “Ugwu Ìgwè Ndị Njem,” n’ihi na dị ka ogidi ọkụ, a pụrụ ịhụ nnukwu mkpụkọba ice ya site n’ọtụtụ narị kilomita n’akụkụ ọ bụla. N’ọtụtụ narị afọ gara aga elu ya nke jupụtara na snow na-eduzikarị ìgwè ndị njem ndị si n’ebe ime ime Africa na-emepeghị emepe na-apụta, bụ́ ndị bukọjuru ọdụ́, ọlaedo, na ndị ohu.

Ọnụ Ọnụ Ya Ndị Na-adọrọ Mmasị

Ọnụ ọnụ ugwu abụọ na-agbawa agbawa mejupụtara Kilimanjaro. Kibo bụ ọnụ ọnụ ugwu na-agbawa agbawa bụ isi; ice na snow na-adịgide adịgide na-ekpuchi ọnụ ọnụ ya ha nhata. N’akụkụ ọwụwa anyanwụ ọnụ ọnụ ugwu nke abụọ, nke aha ya bụ Mawenzi, dị mita 5,150, ọ bụkwa n’onwe ya elu ugwu nke atọ kasị elu n’Africa, ma a gụpụ Kibo na Ugwu Kenya. N’ụzọ dị iche n’akụkụ n’akpọdaghị oké mkpọda nke Kibo, Mawenzi bụ ọnụ ọnụ ugwu bụ́ nkume nkume, nke a kpụrụ n’ụzọ mara mma, nke nwere ahụ ájá nkume ndị dị nnọọ jagajaga n’akụkụ nile. Mbara ala kpọdara akpọda, sara mbara nke nnukwute nkume jupụtara na ya jikọtara ọnụ ọnụ ugwu Kibo na Mawenzi n’oghere dị mita 4,600. N’akụkụ ọdịda anyanwụ Kibo ka e nwere Shira, nke bụ́ ihe fọdụrụnụ ná mgbawa nke ugwu mgbawa oge ochie nke ikuku na mmiri bufusịworo kemgbe, nke na-aghọ ugbu a ala ọzara dị larịị nke na-adọrọ mmasị ji mita 4,000 karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri.

Njikọ nke Ihe Ndị Dị Ndụ na Ebe Obibi Ha Magburu Onwe Ya

Usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ nke Kilimanjaro bụ nke nwere ógbè dị iche iche ndị ịdị elu, mmiri ozuzo, na ihe ọkụkụ kewagasịrị. Oké ọhịa ebe okpomọkụ a na-emetọbeghị kpuchiri mkpọda ala ala ya ebe ìgwè enyi na atụ Cape na-awagharị. Ụdị enwe dị iche iche bi n’elu elu nke oké ọhịa ahụ, onye ọbịa pụkwara mgbe ụfọdụ ịhụperetụ ele ugwu na ele nta ndị na-ezere mmadụ, ndị na-ezobanye n’ahịhịa ndị kwụkọrọ akwụkọ n’ụzọ dị mfe.

N’elu oké ọhịa ahụ bụ ógbè ebe e nwere osisi heather. Osisi ochie hịrị ahị, ndị isi ike nke ifufe na afọ ndụ hịkọtara, bụ ndị eriri lichen ndị yiri ogologo ajị agba chara awọ nke ndị ikom mere agadi na-akwụkọta n’ahụ ha. N’ebe a akụkụ ugwu na-eghere oghe, osisi heather gbara agba na-etokwa nke ọma. Nkwụkọta nke ahịhịa nke ùkwù okooko osisi ndị na-egbukepụ egbukepụ tụgwara na-eme ka ime ime obodo ahụ bụrụ ebe mara mma ikiri.

Ma ịrịgotụ n’elu gafere elu osisi ndị ahụ, a na-ahụ ala ọzara. Ihe ọkụkụ ndị pụrụ iche n’ile anya a na-akpọ groundsel gbara agba ndị na-eru mita anọ, na lobelia, ndị na-eyi nnukwute cabbage ma ọ bụ artichoke na-anọchi osisi. Okooko osisi ndị na-adịghị achanwụ achanwụ, ndị na-adị ka okporo ọka ma kpọọ nkụ n’aka na-eto gburugburu nnukwute nkume na nkume ndị na-apụtachaghị nke ọma site n’ala ma na-atụkwasị ụcha ụfọdụ na mbara ahụ nke gaara na-acha awọ awọ.

Ịgatụkwu n’elu karị, ala ọzara ndị ahụ na-enye ohere maka ógbè nke ihe ndị na-eto n’ugwu. Ụcha ala ahụ gbachuru agbachu na-enwe ngwakọta nke ụcha nchara nchara na awọ awọ. Ihe ọkụkụ ole na ole pụrụ ịgbanye mkpọrọgwụ na gburugburu ebe a na-enwekebeghị ahịhịa, nke kpọrọ nkụ. N’ebe a nnukwu warawara ala nke bụ ọzara dị elu, nke kpọrọ nkụ ma bụrụ nkume nkume, jikọtara ọnụ ọnụ ugwu abụọ ahụ bụ isi, bụ́ Kibo na Mawenzi. Ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ gabigara ókè ebe a, na-eru 38 degree Celsius n’ehihie ma na-agbada nnọọ ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri ji akpụkọ n’abalị.

N’ikpeazụ anyị eruo ógbè ọnụ ọnụ ya. Ebe a ikuku ya jụrụ oyi, dịkwa ọcha. N’ịbụ nke ihu igwe na-acha anụnụ anụnụ dị n’azụ ya, nnukwu mkpụkọba ice na-enwupụ ọcha, na-adị nnọọ iche n’ụzọ mara mma n’ala ugwu ahụ dị ojii. Ikuku ya na-adị feke feke, nweekwa ihe dị ka ọkara ikuku oxygen a na-enweta n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri. N’elu ọnụ ọnụ Kibo nke dị larịị ka e nwere oghere nke ugwu mgbawa, nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dị nnọọ okirikiri kpọmkwem ma dị kilomita 2.5 n’asa. N’ime oghere ahụ na kpọmkwem n’etiti ugwu ahụ ka e nwere akatamkpo olulu ntụ nke ọ̀tụ̀tụ̀ ya karịrị mita 300 n’uhie, na-emibanyeru mita 120 n’oghere ugwu mgbawa ahụ. Úzù sulfur dị ọkụ na-esite n’obere olulu (olulu anwụrụ ọkụ) dị iche iche na-eji nke nta nke nta abanye n’ikuku ahụ jụrụ oyi, na-agba akaebe nye oké ọgba aghara dị n’ime ime dike ahụ gbachiri nkịtị.

Ibu ibu na ịdị ukwuu nke Kilimanjaro na-enye ya ohere imepụta ihu igwe nke ya. Ifufe dị udè, nke na-efebata site n’Oké Osimiri India gafere ala ndịda kpọtụrụ nkụ, na-efekwasa ugwu ahụ wee daghachi azụ gaa n’elu ebe ọ na-akpụkọ ma mee ka e nwee mmiri ozuzo. Nke a na-eme ka mkpọda ya ndị dị ala karị dị mma maka ubi kọfị na ihe oriri ndị na-akwagide ndị bi gburugburu ala ala ugwu ahụ.

Imeri “Kili”

Ndị bi Kilimanjaro nso nwere nkwenkwe na-enweghị isi na mkpọda ya bụ ebe obibi nke ajọ mmụọ ndị ga-emerụ onye ọ bụla ahụ nke na-anwa iru elu ya nke ice juru nso. Nke a gbochiri ndị bi ebe ahụ ịgbalị iru ọnụ ọnụ ya. Ọ bụzi na 1889 ka ndị Germany abụọ na-eme nchọpụta rịrị ugwu ahụ ma guzoro n’ebe kasị elu n’Africa. A rịrughị ọnụ ọnụ ugwu nke abụọ ahụ bụ́ Mawenzi, bụ́ nke chọrọ nkà karị iji rịa ya, ruo na 1912.

Taa ahụmahụ ịrị Kilimanjaro ghere oghe nye onye ọ bụla ahụ siri ike, ọ na-ewukwa nnọọ ewu nye ndị ọbịa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa. Ndị isi ogige ntụrụndụ nke Tanzania nwere ndokwa a haziri nke ọma maka ndị na-achọ ịrị ugwu ahụ. A pụrụ ịgbaziri uwe na ngwá ọrụ. E nwere ndị nnabata na ndị nduzi a zụrụ azụ, ụlọ ndị ọbịa dị iche iche na-enyekwa ebe obibi na-enye ahụ iru ala site ná mmalite ruo ná njedebe nke njem ịrị ugwu ahụ. E nwere ụlọ akịrịka a rụrụ nke ọma n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu dị iche iche, ndị bụụrụ onye ahụ na-arị ugwu ebe ihi ụra na ndo.

Mmadụ ịhụ Kilimanjaro n’onwe ya bụ ihe na-adọrọ mmasị ma na-akpali echiche. Mmadụ pụrụ ikwenye ngwa ngwa n’okwu ahụ e kwuru maka Chineke: “Onye na-eji ike Ya mee ka ugwu nile guzosie ike.” (Abụ Ọma 65:6) Ee, n’elu elu nakwa nanị ya n’Africa, Kilimanjaro na-eguzo dị ka ihe akaebe dị elu nye ike nke Onye Okike Ukwu ahụ.

[Map dị na peeji 16]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

AFRICA

Kenya

KILIMANJARO

Tanzania

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya