Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Mere Nwanne M Nwoke Ji Enweta Nlebara Anya Nile?
“Ihe na-enye m nsogbu bụ na mgbe ụmụnne m kpara àgwà ọjọọ, ha na-enweta nlebara anya dị ukwuu—nke dị mma na nke na-adịghị mma. Ma ebe m na-erubekarị isi, a naghị eji m akpọrọ ihe.”—Kay dị afọ 18.a
“A na-enye ụmụnne m nlebara anya karị, na-emesokwa ha nke ọma karị. Nlebara anya ọ bụla m na-enweta na-abụkarị n’ụdị ndụmọdụ. Ọ ga-akara m mma ma a sị na mụ amata na ha na-enwetakwa ndụmọdụ.”—Ruth dị afọ 15.
“Ọ na-eyi m ka ụmụnne m ndị tọrọ m ha na-enweta ihe ùgwù na nlebara anya karị.”—Bill dị afọ 13.
MALITE n’ụbọchị a mụrụ anyị, anyị nile chọrọ nlebara anya site n’aka ndị mụrụ anyị. I cheekwa na ị dịghị enweta òkè ruuru gị na ya, n’ụzọ kwere nghọta, ị pụrụ inwe mwute na iwe. Karịsịa ma o yie ka a na-elekwasị nwanne gị—nke kasị okenye, nke kasị nta, nke kasị akpa àgwà dị mma, ma ọ bụ ọbụna nke kasị enupụ isi—anya n’oge nile. Ị pụrụ ọbụna inwe mmetụta dị ka Devid nwere mgbe o dere, sị: “E chezọwo mụ onwe m dị ka onye nwụrụ anwụ pụrụ n’obi mmadụ: aghọwo m ihe na-ala n’iyi.”—Abụ Ọma 31:12.
Ikiri ka a na-enye nwanne gị nlebara anya nke ị ga-achọ inweta n’onwe gị pụrụ ịfụ ụfụ. Ma ọ̀ na-apụta nnọọ na a hụghị gị n’anya? Ọ dịghị ma ọlị. Mgbe ụfọdụ ndị ntorobịa na-enwetakwu nlebara anya n’ihi na ha nwere ikike pụrụ iche ma ọ bụ ụdị omume enyi. Kenneth dị afọ 11 na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na nwanne m nwoke nke nta, bụ́ Arthur, nọ nanị n’elementrị nke atọ, ọ nọ n’òtù egwú ndị elementrị nke ise. Ọ na-emekwa nke ọma n’egwuregwu na ná mgbakọ na mwepụ. N’eziokwu, ọ na-enweta akara kasị mma n’ihe ọmụmụ ya nile n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe ụfọdụ ana m eche na ndị mmadụ nwere mmasị n’ebe ọ nọ karịa m, ma adịghị m emere ya anyaụfụ. Ma eleghị anya m na-emetụ.”
Tụkwasị na nke ahụ e nwere ndị ntorobịa ndị yiri ka ha na-enweta òkè kasịnụ nke oge ndị mụrụ ha nanị n’ihi na ha bụ ndị kasị okenye—ma ọ bụ ndị kasị nta. Bible na-ekwu banyere nwa okorobịa ahụ bụ́ Josef, sị: “Israel hụrụ Josef n’anya karịa ụmụ ya nile, n’ihi na nwa agadi ya ka ọ bụ.” (Jenesis 37:3, 4) N’aka nke ọzọ, Todd dị afọ 18 chere na a na-egosi nwanne ya nwoke ihu ọma maka ịbụ ọkpara. Ọ na-echeta: “Otu mgbe a gwara anyị weta foto nwa ọhụrụ kasị amasị anyị maka ihe omume ụlọ akwụkwọ. Enwere m nanị ike ịchọta foto ole na ole nke m ma hụ ọtụtụ foto nke nwanne m nwoke nke tọrọ m. O mere ka m chee ihe kpatara ya.”
Ma, mgbe mgbe, a na-enyekwu nlebara anya n’ihi na nwanne gị na-enwe nsogbu—ikekwe nsogbu ndị ị na-amaghị. “Mgbe m dị ihe dị ka afọ 16, nwanne m nwoke nke tọrọ m nwere ihe isi ike,” ka Cassandra, onye dị afọ 22 ugbu a, na-akọwa. “O jighị n’aka ma ọ chọrọ n’ezie ife Jehova, ndị mụrụ m wee tinye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ uche ha dum n’ebe ọ nọ. N’oge ahụ, apụghị m ịghọta ihe kpatara ya. Echere m na ha adịghị eche banyere m ma ọlị. O mere ka m nwee mwute na mmetụta ịbụ onye e leghaara anya—ọ gbakakwara m isi.”
Ihe Mere Ha Na-eji Emelara Otu Onye Ihe
Otú ọ dị, n’oge ụfọdụ, ikpe imelara otu onye ihe n’ụzọ doro anya na-ama ndị mụrụ ụmụ. Otu nne kwetara, sị: “Amaara m na nwa m nwoke, bụ́ Paul, maara n’ụzọ na-afụ ụfụ banyere nnukwute obi ụtọ anyị nwere n’ada anyị. Ọ gwawo anyị hoo haa, sị, ‘Gị na papa m na-elerịta onwe unu anya mgbe nile ma Liz kwuo okwu.’ Ná mmalite anyị amaghị ihe ọ na-ekwu. E mesịa anyị ghọtara na anyị na-elerịtakarị ụdị anya ndị a na-egosi ‘nwa a dị egwu.’ Ebe o meworo ka anyị mara, anyị emewo ezi mgbalị ịkwụsị ya.”
Ma gịnị medịrị ndị mụrụ ụmụ ji emelara otu onye ihe? Nzụlite ha pụrụ ịbụ otu isi ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mama gị tolitere dị ka nwa ikpeazụ, ọ pụrụ itinye onwe ya n’ụzọ chiri anya karị n’ọnọdụ nwa ya nke ikpeazụ. N’amaghị ụma, ọ pụrụ ịdị na-adụnyere onye ahụ úkwù. Ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna pụrụ inwe ọmịiko maka nwatakịrị nke ya na ya nwere omume yirinụ ma ọ bụ otu mmasị. Tụlee ihe Bible na-ekwu banyere Aịsak na Rebeka maka ụmụ ejima ha, bụ́ Jekọb na Ịsọ: “Ụmụ okoro ahụ wee too eto: Ịsọ wee bụrụ nwoke maara ịchụ nta, onye ọhịa; ma Jekọb bụ nwoke zuru okè, na-ebi n’ụlọikwuu. Aịsak wee hụ Ịsọ n’anya, n’ihi na ihe a chụtara ná nta na-atọ ya ụtọ n’ọnụ: ma Rebeka hụrụ Jekọb n’anya.”—Jenesis 25:27, 28.
Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na o yiri ka ndị mụrụ gị hà na-egosi otu n’ime ụmụnne gị ihu ọma?b Ị pụrụ ịnwa ịgwa ndị mụrụ gị okwu banyere ya n’ụzọ dị jụụ, n’ataghị ha ụta. (Ilu 15:22) Site n’iji nkwanye ùgwù gee ha ntị, ị pụrụ inwe ike ịhụ ihe site n’ụzọ ha si ele ihe anya. Nke a pụrụ inye aka ịkụjụ obi nkoropụ gị. (Ilu 19:11) Otu onye nọ n’afọ iri na ụma na-ekwu, sị: “O nyere m nsogbu n’ezie na a dọọrọ Mama m gaa n’ebe nwanne m nwoke nọ karịa n’ebe m nọ. Mgbe m jụrụ ya banyere ya, ọ kọwara na ebe nwanne m nwoke yiri papa m nke ukwuu, a dọọrọ ya gaa n’ebe ọ nọ. Ebe m yikwara ya nke ukwuu, a dọọrọ papa m gaa n’ebe m nọ. N’otu aka ahụ, ebe mụ na ya yiri nke ukwuu, anyị na-akpasurịta onwe anyị iwe. Ebe papa m na nwanne m nwoke yikwara nke ukwuu, ha na-akpasurịta onwe ha iwe nke ukwuu. Ozugbo o si otú ahụ kọwaa ya—ọ bụ ezie na m enwebigaghị ọṅụ ókè banyere ya—apụrụ m ịnakwere ya.”
Mmeso Na-ahaghị Nhata —Ọ̀ Bụ Ikpe Na-ezighị Ezi?
Ma, gịnị mere ndị mụrụ ụmụ enweghị nnọọ ike imeso onye ọ bụla kpọmkwem n’otu ụzọ? Beth, onye dị afọ 18 ugbu a, na-asị: “Mgbe m dị ihe dị ka afọ 13, echere m na e kwesịrị imeso mụ na nwanne m nwoke n’ụzọ hà nhata—kpọmkwem n’otu ụzọ. Ma ọ bụ m ka a na-abara mba mgbe ọ bụla, ebe a na-ahapụ ya n’ihe ọ bụla. Ọ na-etinyekwu oge n’isoro papa m na-arụ ọrụ n’ụgbọala. O yiri nnọọ ihe na-adịghị mma.”
Ma mmeso na-ahaghị nhata abụchaghị ikpe na-ezighị ezi. Tụlee otú Jisọs Kraịst siri mesoo ndị ozi ya. Ajụjụ adịghị ya na ọ hụrụ ha 12 n’anya, ma ọ kpọrọ nanị 3 n’ime ha òkù ịhụ ihe omume ụfọdụ pụrụ iche, gụnyere mbilite n’ọnwụ nke nwa nwanyị Jaịrọs na nnwogha ahụ. (Matiu 17:1; Mak 5:37) Ọzọkwa, Jisọs sooro Jọn onyeozi nwee ọbụbụenyi chiri anya nke pụrụ iche. (Jọn 13:23; 19:26; 20:2; 21:7, 20) Nke a ọ̀ bụ ihe na-ahaghị nhata? Kpọmkwem. Ọ̀ bụ ihe na-adịghị mma? Ọ dịghị ma ọlị. N’ihi na ọ bụ ezie na a dọọrọ Jisọs gaa kpọmkwem n’ebe ụfọdụ nọ, o legharaghị mkpa nke ndị ozi ya ndị ọzọ anya.—Mak 6:31-34.
N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ pụrụ ịbụ na otu n’ime ụmụnne gị na-enweta nlebara anya pụrụ iche n’ihi nkà, ụdị onye ọ bụ, ma ọ bụ mkpa. Dị ka ọ na-adịkarị, nke a pụrụ ịbụ ihe na-afụ ụfụ ịhụ. Ma ajụjụ bụ, À na-eleghara mkpa gị anya n’ezie? Mgbe ị chọrọ ndụmọdụ, enyemaka, ma ọ bụ nkwado ndị mụrụ gị, hà na-ewepụtara gị onwe ha? Ọ bụrụ otú ahụ, ị̀ pụrụ ikwu n’ezie na ị bụ onye a na-emeso n’ụzọ na-ezighị ezi? Bible na-agba anyị ume imeso ndị ọzọ “dị ka mkpa ha si dị.” (Ndị Rom 12:13, NW) Ebe gị na ụmụnne gị bụ ndị nwere mkpa dị iche iche, ọ pụghị nnọọ ikwe ndị mụrụ gị omume imeso unu n’otu ụzọ mgbe nile.
Beth, nke e hotara na mbụ, si otú a bịa ghọta na mmeso ha nhata adịghị mma mgbe nile nakwa na mmeso dị mma adịghị aha nhata mgbe nile. Ọ na-ekwu, sị: “Abịara m ghọta na mụ na nwanne m nwoke bụ mmadụ abụọ dị iche ma chọọkwa ka e mesoo anyị n’ụzọ dị iche. N’ileghachi anya azụ, enweghị m ike ikweta na apụghị m ịhụ nke ahụ mgbe m dị nta karị. Echere m na ọ bụ nanị n’ihi otú i si ele ihe anya n’afọ ndụ ahụ.”
Ịmụta Inwe Nghọta
Ee, “otú i si ele ihe anya” nwere ọtụtụ ihe ime n’otú i si emeghachi omume nye ọnọdụ gị. Dị ka ugegbe anya ndị jiri oji, mmetụta uche gị pụrụ ịgbanwe ụzọ i si na-ahụ ihe. Mkpa mmetụta uche maka nlebara anya na nnwapụta nke ndị mụrụ ụmụ sikwara ike. Ndị nnyocha bụ́ Stephen Bank na Michael Kahn na-ekwu, sị: “Ọ bụrụgodị na ndị mụrụ ụmụ enwee ike iru ọnọdụ ahụ kasị mma nke imeso ụmụ ha dị iche iche n’eleghị nke ọ bụla anya n’ihu, nwa nke ọ bụla ga-ahụta ndị mụrụ ya dị ka ndị na-egosi otu n’ime ụmụ ndị ọzọ ihu ọma.”
Dị ka ihe atụ, tụleghachi ihe ndị ntorobịa atọ ahụ e hotara ná mmalite kwuru. Ọnọdụ ha gaara eyi ihe na-akụda obi e wezụga n’ihi otu eziokwu: Ha bụ ụmụnne! Ee, onye nke ọ bụla na-eche na ndị ọzọ na-enwetakwu nlebara anya nakwa na ọ bụ ya ka a na-eleghara anya! Mgbe ahụ, ụzọ anyị si ele ihe na-agbagọkarịtụ agbagọ. “Onye mmụọ ya jụrụ ajụrụ bụ onye nghọta,” ka Ilu 17:27 na-ekwu. Inwe nghọta bụ ile ihe anya n’ụzọ ezi uche dị na ya na n’ụzọ ziri ezi, ọ bụghị n’ụzọ mmetụta uche. Nghọta pụrụ inyere gị aka ịmata na ọ bụ ezie na ndị mụrụ gị agaghị emeso unu nile n’otu ụzọ, ha bu ọdịmma kasị mma nke unu nile n’obi! Ịmata nke a pụrụ inyere gị aka izere iwe iwe na inwe obi ilu.
Ma, gịnị ma ọ bụrụ n’eziokwu na o yiri ka ị dịghị enweta nlebara anya ruuru gị? Gịnị ka ị purụ ime? A ga-atụle nke a ná mbipụta dị n’ihu nke Teta!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ.
b Isiokwu na-abịa n’ihu ga-atụlekwu n’ụzọ zuru ezu isiokwu maka ịnagide imelara otu onye ihe.
[Foto dị na peeji nke 24]
Mmeso na-ahaghị nhata pụrụ iyi ihe na-adịghị mma