Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 1/8 p. 4-9
  • Mmeri na Ọdachi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmeri na Ọdachi
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ikpeazụ, Ngwọta!
  • Mbịaghachi Na-egbu Egbu
  • Gịnị Kpatara Mbịaghachi Na-egbu Egbu Ahụ?
  • HIV na TB—Nsogbu Gbara Mkpị
  • TB Na-eguzogide Ọtụtụ Ọgwụ
  • Mgbochi na Ọgwụgwọ
  • Ụzọ Ọhụrụ E Si Alụ Ọgụ Megide Ụkwara Nta
    Teta!—1999
  • Njikọ Aka Na-egbu Egbu
    Teta!—1998
  • Ọnụ Ọgụgụ Na-anwụ nke Hà Ka nke Agha
    Teta!—1998
  • Ụkwara Nta Alọghachi!
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 1/8 p. 4-9

Mmeri na Ọdachi

“Akụkọ banyere ụkwara nta n’ime afọ 30 gara aga abụrụwo nke mmeri na ọdachi—mmeri nke ndị ọkà mmụta sayensị ndị wepụtara ụzọ isi chịkwaa ma mesịa kpochapụ ọrịa ahụ, na ọdachi nke ọdịda zuru ọtụtụ ebe nke iji nchọpụta ha mee ihe.”—J. R. Bignall, 1982.

ỤKWARA NTA (TB) anọwo na-egbu mmadụ eri ogologo oge. O tiri ndị Inca nke Peru ihe otiti ogologo oge tupu ndị Europe ejiri ụgbọ mmiri gaa Ndịda America. Ọ wakwasịrị ndị Ijipt n’ụbọchị mgbe fero dị iche iche ji ebube chịa. Ihe odide ndị sitere n’oge ochie na-egosi na TB chụrụ ma ndị ukwu ma ndị nta ọsọ ụkwụ eru ala na Babilọn, Gris, na China oge ochie.

Malite na narị afọ nke 18 ruo mmalite narị afọ nke 20, TB bụ isi ihe na-akpata ọnwụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ụwa. E mesịa, na 1882, dọkịta onye Germany bụ́ Robert Koch kwupụtara na ya achọpụtawo nje bacillus na-akpata ọrịa ahụ. Mgbe afọ 13 gasịrị Wilhelm Röntgen chọpụtara X ray, na-eme ka o kwe omume inyocha akpa ume nke ndị dị ndụ maka mgbaàmà nke mmerụ ahụ ụkwara nta na-enye. Ọzọ, na 1921, ndị France bụ́ ndị ọkà mmụta sayensị mepụtara ọgwụ mgbochi TB. N’ịbụ nke a kpọkwasịrị aha ndị ọkà mmụta chọpụtara ya, BCG (Bacillus Calmette-Guérin) nọgidere na-abụ nanị ọgwụ mgbochi e nwere maka ọrịa ahụ. Ka o sina dị, TB nọgidere na-akpa ike dị egwu.

N’ikpeazụ, Ngwọta!

Ndị dibịa kpọgara ndị na-arịa TB n’ogige nlekọta dị iche iche. A na-enwekarị ụlọ ọgwụ ndị a n’ugwu, ebe ndị ọrịa pụrụ izuru ike ma kuru ikuku ndụ. E mesịa, na 1944, ndị dọkịta nọ na United States chọpụtara streptomycin, bụ́ ọgwụ nje mbụ a chọpụtara na ọ dị irè megide TB. Mmepụta nke ọgwụ ndị ọzọ e ji agwọ TB sochiri ngwa ngwa. N’ikpeazụ, a pụrụ ịgwọ ndị na-arịa TB, ọbụna n’ebe obibi ha.

Ka ọ̀tụ̀tụ̀ mbufe dalatara, ọdịnihu yiri ihe nwere nchekwube. E mechiri ogige nlekọta dị iche iche, ihe adịkwaghị n’akpa ego e nwere maka nnyocha TB. A gbahapụrụ usoro mgbochi ndị e nwere, ndị ọkà mmụta sayensị na ndị dọkịta legara anya n’ihe ịma aka ọgwụ na ahụ ike ndị ọhụrụ.

Ọ bụ ezie na TB ka na-akpa ike dị ukwuu n’akụkụ ụwa ndị ka na-emepe emepe, n’ezie ihe ga-aka mma. TB bụzi akụkọ. Nke ahụ bụ ihe ndị mmadụ chere, ma ha dara ya.

Mbịaghachi Na-egbu Egbu

N’etiti afọ ndị 1980, TB malitere ịbịaghachi n’ụzọ na-atụ ụjọ ma na-egbu egbu. E mesịa, n’April 1993, Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) kwupụtara na TB bụ “ọnọdụ mberede zuru ụwa ọnụ,” na-agbakwụnye na “ọrịa ahụ ga-ewere ihe karịrị nde ndụ 30 n’afọ iri na-abịanụ ọ gwụla ma e mere ihe ozugbo iji gbochie mgbasa ya.” Ọ bụ nkwupụta mbụ n’ụdị ya n’akụkọ ihe mere eme nke WHO.

Kemgbe ahụ, ọ dịbeghị ‘ihe e mere ozugbo’ nke gbochiworo mgbasa nke ọrịa ahụ. N’ezie, ọnọdụ ahụ akawo njọ. N’oge na-adịbeghị anya, WHO kọrọ na TB alawo ọtụtụ ndị mmadụ n’iyi na 1995 karịa n’afọ ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme. WHO dọkwara aka ná ntị na ihe ruru ọkara ijeri mmadụ nwere ike ịrịa TB n’ime afọ 50 na-abịanụ. N’ụzọ na-arịwanye elu, ndị mmadụ ga-arịa ụdị TB nke na-esikarị ike ngwọta, nke na-eguzogide ọtụtụ ọgwụ.

Gịnị Kpatara Mbịaghachi Na-egbu Egbu Ahụ?

Otu ihe kpatara ya bụ na n’ime afọ 20 gara aga, usoro nchịkwa TB emebiwo ma ọ bụ bụrụ nke na-adịkwaghị n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Nke a akpatawo igbu oge n’ịchọpụta na ịgwọ ndị na-arịa ọrịa ahụ. N’aka nke ya, nke ahụ akpatawo ọnwụ ka ukwuu na mgbasa nke ọrịa ahụ.

Ihe ọzọ kpatara mpụtaghachi nke TB bụ ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ogbenye, ndị na-adịghị eri ihe na-edozi ahụ bụ́ ndị bi n’obodo ukwu ndị mmadụ jupụtara, karịsịa nnukwu obodo nke akụkụ ụwa ndị ka na-emepe emepe. Ọ bụ ezie na ọ bụghị nanị ndị ogbenye na-arịa TB—onye ọ bụla pụrụ ibute TB—ọnọdụ obibi na-adịghị ọcha na nke oké ụba mmadụ na-eme ka ọ ka mfe isite n’otu onye fere onye ọzọ. Ha na-amụbakwa ohere ndị e nwere na usoro ahụ mmadụ ji alụso ọrịa ọgụ agaghị enwetụ ike iguzogide ọrịa ahụ.

HIV na TB—Nsogbu Gbara Mkpị

Nsogbu gbara ọkpụrụkpụ bụ na TB na HIV, bụ́ nje ọrịa AIDS, aghọwo ndị òtù na-egbu egbu. N’ime otu nde mmadụ a na-eme atụmatụ na ihe ndị metụtara AIDS gburu na 1995, ikekwe TB gburu otu ụzọ n’ime ụzọ atọ. Nke a bụ n’ihi na HIV na-ebelata ikike ahụ nwere iguzogide TB.

N’ime ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ, nje TB adịghị eru n’ókè nke ịkpata ọrịa mgbe ọ bụla. N’ihi gịnị? N’ihi na a na-akpọchibido nje bacillus TB n’ime mkpụrụ ndụ ndị a na-akpọ macrophage. Usoro ahụ mmadụ ji alụso ọrịa ọgụ, karịsịa T lymphocyte, ma ọ bụ mkpụrụ ndụ T, na-akpọchi ha n’ebe ahụ.

Nje bacillus TB yiri ubí ndị nọ n’ime nkata ndị nwere ihe mkpuchi dị mma. Nkata ndị ahụ bụ macrophage, ihe mkpuchi ndị ahụ bụkwa mkpụrụ ndụ T. Ma, mgbe nje ọrịa AIDS rutere ebe ahụ, ọ na-agbapụ ihe mkpuchi ndị ahụ n’elu nkata ndị ahụ. Mgbe nke ahụ mere, nje bacillus ahụ na-agbapụ ma nwere onwe ha ibibi akụkụ ọ bụla nke ahụ.

N’ihi ya, ndị na-arịa AIDS yikarịrị nnọọ ka ha ga-arịa TB pụtara ìhè karịa ndị nwere usoro dị mma nke ahụ ji alụso ọrịa ọgụ. “Ndị nwere HIV nọ n’ihe ize ndụ karịsịa,” ka ọkachamara TB na Scotland kwuru. “Ndị ọrịa abụọ nwere HIV n’otu ụlọ ahụ ike dị na London butere ọrịa ahụ mgbe ha nọdụsịrị na paseji mgbe e bu onye na-arịa TB n’elu àkwà gafee.”

N’ụzọ dị otú a, AIDS amụbawo mgbasa nke TB. Dị ka otu atụmatụ gosiri, ka ọ na-erule afọ 2000, mgbasa nke AIDS ga-eme ka e nwee nde 1.4 ndị na-arịa TB bụ́ ndị na-agaraghị adị ma ọ bụghị ya. Otu ihe dị mkpa ná mmụba nke TB abụghị nanị na ọ na-adịkarịrị ndị na-arịa AIDS mfe ibute ọrịa ahụ, kamakwa ha pụrụ ibunye ndị ọzọ TB, gụnyere ndị na-enweghị AIDS.

TB Na-eguzogide Ọtụtụ Ọgwụ

Ihe ikpeazụ nke na-eme ka ọgụ a na-alụso TB sikwuo ike bụ mpụta nke ụdị TB ndị na-eguzogide ọgwụ. Ụdị ndị a bụ́ ọkpọka na-achọ ime ka ọrịa ahụ bụrụ nke na-enweghị ngwọta ọzọ, dị ka ọ dị n’oge a na-enwebeghị ọgwụ nje.

N’ụzọ na-emegide onwe ya, enyeghị ọgwụ TB n’ụzọ kwesịrị ekwesị bụ isi ihe na-akpata TB na-eguzogide ọtụtụ ọgwụ. Ịgwọ TB n’ụzọ dị irè na-erucha ihe karịrị ọnwa isii ma ọ dịkarịa ala ma na-achọ ka ndị ọrịa na-aṅụ ụdị ọgwụ anọ n’akwụsịtụghị akwụsị. Ọ pụrụ ịdị onye ọrịa ahụ mkpa ịṅụ ihe ruru mkpụrụ ọgwụ iri na abụọ n’ụbọchị. Ọ bụrụ na ndị ọrịa aṅụchighị ọgwụ ahụ anya ma ọ bụ anatazughị ọgwụgwọ ahụ, ụdị TB siri ike ma ọ bụ ndị a na-apụghị igbu egbu na-apụta. Ụdị ụfọdụ na-eguzogide ihe ruru asaa n’ime ọgwụ TB ndị bụ isi.

Ọ bụghị nanị na o siri ike ịgwọ ndị na-arịa TB na-eguzogide ọtụtụ ọgwụ, ọ dịkwa oké ọnụ. Ọnụ ahịa ya pụrụ ịfọ nke nta ka o jiri okpukpu 100 karịa nke ịgwọ ndị ọzọ na-arịa TB. Dị ka ihe atụ, na United States ụgwọ ọgwụ maka ọgwụgwọ nke otu onye ọ na-arịa pụrụ ịgafe $250,000!

WHO na-eme atụmatụ na ihe dị ka nde mmadụ 100 n’ụwa nile pụrụ ibute ụdị TB ndị na-eguzogide ọgwụ, nke a na-apụghị iji ọgwụ TB ọ bụla a maara gwọta ụfọdụ n’ime ha. Ụdị ndị a na-egbu egbu na-efe efe dị ka ụdị ndị a na-ahụkarị.

Mgbochi na Ọgwụgwọ

Gịnị ka a na-eme iji lụsoo ọnọdụ mberede a zuru ụwa ọnụ ọgụ? Ụzọ kasị mma isi chịkwaa ọrịa a bụ ịchọpụta na ịgwọ ọrịa ndị e butere ebute ná mbido mbido. Ọ bụghị nanị na nke a na-enyere ndị malitewororị ịrịa ọrịa aka kama ọ na-akwụsịkwa ibunye ndị ọzọ ọrịa ahụ.

Mgbe a na-agwọghị TB, ọ na-egbu ihe karịrị ọkara ndị ọ na-arịa. Otú ọ dị, mgbe e nyere ya ọgwụgwọ kwesịrị ekwesị, a na-agwọta TB n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’onye ọ bụla ọ na-arịa ma ọ bụrụ na ọ bụghị ụdị nke na-eguzogide ọtụtụ ọgwụ kpatara ya.

Dị ka anyị hụworo, ọgwụgwọ dị irè na-achọ n’aka ndị ọrịa ịnatazu usoro ọgwụgwọ ahụ nile. Ọtụtụ mgbe, ha adịghị anatazu ya. N’ihi gịnị? Ụkwara, ahụ ọkụ, na mgbaàmà ndị ọzọ na-akwụsịkarị n’ime izu ole na ole mgbe ọgwụgwọ malitesịrị. N’ihi ya, ọtụtụ ndị ọrịa na-ekwubi na a gwọtala ha ma kwụsị ịṅụ ọgwụ.

Iji lụsoo nsogbu a ọgụ, WHO na-akwalite usoro ihe omume a na-akpọ DOTS, bụ́ nke pụtara “usoro ọgwụgwọ ilekwasị ndị a na-agwọ anya, ruo nwa oge.” Dị ka aha ahụ na-egosi, ndị ọrụ ahụ ike na-elegide anya iji jide n’aka na ndị ọrịa ha na-aṅụ ọ̀tụ̀tụ̀ ọ bụla nke ọgwụ ndị ahụ, ọ dịkarịa ala ruo ọnwa abụọ mbụ nke ọgwụgwọ ahụ. Ma, nke a adịghị mfe ime mgbe nile n’ihi na ọtụtụ n’ime ndị na-arịa TB bụ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ. Ebe ọ bụ na ndụ ha na-ejupụtakarị n’oké ọgba aghara na nsogbu—ụfọdụ enweghị ọbụna ebe obibi—ihe ịma aka nke ịhụ mgbe nile na ha na-aṅụ ọgwụ ha pụrụ ịdị nnọọ ukwuu.

Ya mere, è nwere atụmanya ọ bụla maka imesị merie ihe otiti a n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ?

[[Igbe dị na peeji nke 5]

Akwụkwọ Ihe Ọmụma Banyere TB

Nkọwa: TB bụ ọrịa na-awakpokarị ma na-ebibi akpa ume, ma ọ pụrụ ịgbasa gaa n’akụkụ ahụ ndị ọzọ, karịsịa ụbụrụ, akụrụ, na ọkpụkpụ.

Mgbaàmà: TB nke akpa ume pụrụ ịkpata ịkwa ụkwara, ịta ahụ na enweghị agụụ iri ihe, oké ịgba ọsụsọ n’abalị, enweghị ume, ekurughị ume ala, na obi mgbu.

Otú e si achọpụta ya: Ule akpụkpọ ahụ maka ụkwara nta pụrụ igosi ma mmadụ ò butewo nje bacillus ahụ. X ray obi pụrụ ikpughe mmerụ ahụ n’akpa ume, bụ́ nke pụrụ igosi na e butewo TB pụtara ìhè. Inyocha asọ mmiri nke onye ọrịa n’ụlọ ime nnyocha bụ ụzọ a pụrụ ịdabere na ya karịsịa iji chọpụta nje TB bụ́ bacillus.

Ndị kwesịrị ka e lee ha ahụ: Ndị nwere mgbaàmà TB ma ọ bụ ndị ha na onye na-arịa TB nọworo oké nso ugboro ugboro—karịsịa n’ọnụ ụlọ ndị ikuku na-adịghị abatacha.

Ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa: E nwere nanị otu ọgwụ mgbochi ọrịa—nke a maara dị ka BCG. Ọ na-egbochi TB dị oké njọ n’ụmụaka ma o nwechaghị ihe ọ na-emere ndị nọ n’oge uto na ndị okenye. Ọ dịkarịsịa mma, ọgwụ mgbochi ọrịa ahụ na-enye nchebe ruo ihe dị ka afọ 15. BCG na-echebe nanị ndị na-ebutebeghị ya; ọ dịghị abara ndị buteworo ya uru.

[Igbe dị na peeji nke 6]

TB na Ejiji

Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iju anya, na narị afọ nke 19, e gosiri oké mmasị n’ebe TB dị, ebe ọ bụ na ndị mmadụ kwenyere na mgbaàmà ọrịa ahụ na-akwalite echiche ime nkà, nke ịchọ ihe mma.

Onye France na-ede egwuregwu na akụkọ bụ́ Alexandre Dumas dere banyere mmalite afọ ndị 1820 na Mémoires ya, sị: “Ọ bụ nnọọ ihe na-ewu ewu ịrịa ọrịa obi; onye ọ bụla na-arịa ụkwara nta, karịsịa ndị na-ede uri; ọ bụ ụzọ na-ewu ewu isi nwụọ tupu e ruo afọ iri atọ.”

A kọrọ na onye England na-ede uri bụ́ Lord Byron sịrị: “Aga m achọ ịbụ onye ụkwara nta [TB] gburu . . . n’ihi na ụmụ agbọghọ nile ga-asị, ‘Leedị Byron ahụ kwesịrị imere ebere, ka o siri maa mma mgbe ọ na-anwụ!’”

Onye America na-ede akwụkwọ bụ́ Henry David Thoreau, onye o doro anya na ọ bụ TB gburu ya, dere, sị: “Ire ure na ọrịa na-amakarị mma, dị ka . . . oké ahụ ọkụ nke ụkwara nta.”

N’ikwu banyere mmasị a e nwere n’ebe TB dị, otu isiokwu dị na The Journal of the American Medical Association kwuru, sị: “Mmetụta ịhụnanya a siri ike nghọta e nwere n’ọrịa ahụ metụtazuru nhọrọ ejiji; ụmụ nwanyị gbalịsiri ike inwe ọdịdị chagharịrị achagharị, nke dị peke peke, tee ihe otite nchagharị, ma nwee mmasị n’ákwà ndị dị fere fere, na-atagide n’ahụ—nke yiri nnọọ ọdịdị ndị dị ka ha nwere nsogbu iri ihe nke ndị e ji eme ngosi uwe taa na-achọsi ike.”

[Igbe dị na peeji nke 7]

Ọ̀ Dị Mfe Ibute TB?

“E nweghị ebe a pụrụ izonarị nje ụkwara nta,” ka Dr. Arata Kochi, bụ́ onye ntụzi nke Usoro Ihe Omume Ụwa Maka TB nke WHO na-adọ aka ná ntị. “Onye ọ bụla pụrụ ibute TB nanị site n’ikuru nje TB a kwapụtaworo n’ụkwara ma ọ bụ nke e zepụtara n’uzere gaa n’ikuku. Nje ndị a pụrụ ịdịgide n’ikuku ruo ọtụtụ hour; ọbụna ọtụtụ afọ. Anyị nile nọ n’ihe ize ndụ.”

Otú ọ dị, tupu TB arịawa mmadụ, ihe abụọ aghaghị ime. Nke mbụ, ọ ghaghị ibute nje TB. Nke abụọ, ibute nje ahụ aghaghị imesị bụrụ ọrịa.

Ọ bụ ezie na o kwere omume ịghọ onye butere ọrịa site n’iso onye bu ọrịa na-efe efe nke ukwuu mekọọ ihe ruo nwa oge, o yikarịrị ka a pụrụ ịgbasa TB site n’iso onye ahụ na-emekọ ihe ugboro ugboro, dị ka nke na-eme n’etiti ndị òtù ezinụlọ dị ọtụtụ biri n’otu ụlọ.

Nje bacillus ndị onye butere ọrịa ahụ kuuru na-amụba n’obi. Otú ọ dị, n’ime mmadụ 9 n’ime 10, usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ na-egbochi mgbasa nke ọrịa ahụ, onye ahụ butere nje ahụ adịghịkwa ada ọrịa. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ a pụrụ ịkpakeli nje bacillus ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụrụ na usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ abụrụ nke HIV, ọrịa shuga, iji ọgwụ agwọ ọrịa cancer, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ belatara ikike ya.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]

New Jersey Medical School—National Tuberculosis Center

[Foto dị na peeji nke 7]

Nje bacillus TB ndị nje AIDS wepụtara yiri ubí ndị e si na nkata tọhapụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya