Ịnagide Mmetụta Ya
KA O dina n’àkwà ụlọ ọgwụ n’aka na ụkwụ kpọnwụrụ akpọnwụ, Gilbert jụrụ dọkịta ya, sị: “Ọ̀ dị mgbe m ga-eji aka na ụkwụ m eme ihe ọzọ?” Gilbert nụrụ nzaghachi na-eweta ihe ịma aka: “Ka ị na-arụsi ọrụ ike karị, otú ahụ ka ị ga-enwetaghachi ike karị, otú ahụ ka ọ ga-adịkwa ngwa karị gị ime ya.” Ọ zaghachiri, sị: “Adị m njikere!” Usoro ọgwụgwọ anụ ahụ tinyere inwe nchekwube nyeere ya aka, n’afọ ndụ 65, isite n’iji oche nkwagharị eme ihe gaa n’ihe mkpọre, mgbe ahụ o jiri mkpara ma mesịa laghachi n’ọrụ.
“Ihe ka ọtụtụ n’ọzụzụ mgbake nke taa mgbe ọrịa strok gasịrị na-akwado echiche bụ na ọ bụrụ na e mebie otu akụkụ ụbụrụ, akụkụ ndị ọzọ pụrụ iweghara ọrụ nke mkpụrụ ndụ ahụ mebiri emebi. Otu nzube nke usoro ọgwụgwọ bụ ma iji wepụta ikike nke akụkụ ndị a ọ na-emetụtaghị ma nye mkpali iji nye ụbụrụ ohere ịchịkọtaghachi onwe ya ma nabata mgbanwe,” ka ndị na-eme nchọpụta bụ́ Weiner, Lee, na Bell kwuru. Otú ọ dị, ihe ndị ọzọkwa na-ekpebi mgbake, dị ka ebe na isi ike nke ọrịa strok ahụ, ahụ ike nke onye ahụ n’ozuzu ya, ọdịdị nlekọta ahụ ike, na nkwado nke ndị ọzọ.
Nkwado nke Ezinụlọ na Ndị Enyi
Erikka tinyere aka ná mmega ahụ ọzụzụ mgbake ruo afọ atọ, na-amụ ije ije na iji aka nri ya kwụọ ụgwọ aka ekpe ya kwarụrụ akwarụ. Ọ na-akọ ihe mere ka o nwee ike ịnagide: “Ihe kasị mkpa bụ na di m na ndị enyi m guzosiri ike n’ihe nye m. Ịmara na ha hụrụ m n’anya nyere m ume, mgbe ha gbakwara m ume ka m ghara ịda mbà, nke ahụ kwaliri m.”
Ndị òtù ezinụlọ na-aghọ ndị ibe n’usoro mgbake nke ndị ha hụrụ n’anya. Ọ dị ha mkpa ịjụ ndị ọrụ ahụ ike ajụjụ ma leruo anya n’usoro ọgwụgwọ ndị ọ pụrụ ịdị mkpa ịnọgide na-enweta n’ebe obibi ka ọganihu ndị e nweworo ghara ifu. Ndidi, obiọma, nghọta, na mmetụta ịhụnanya nke ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi gosiri na-enye ọnọdụ mmetụta uche e ji n’aka maka ịmụghachi ikwu okwu, ịgụ ihe, na nkà ndị ọzọ e ji ebi ndụ kwa ụbọchị.
N’ịgbalị inwe nguzozi n’agbata nrụgide na ịdị nro, John rụsiri ọrụ ike n’inyere nwunye ya bụ́ Ellen aka ná mmega ahụ na usoro ọgwụgwọ. Ọ na-akọwa mgbalị ezinụlọ ya, sị: “Anyị adịghị ekwe ka Ellen daba n’ọnọdụ nke mmadụ iruru onwe ya újú. Mgbe ụfọdụ anyị bụ ndị isi ọrụ dị aka ike, ma anyị na-eleru anya mgbe nile n’ihe ndị ọ na-agaghị emeli ma na-enye aka. Ọ na-enwe mmetụta karị, ya mere ana m eme mgbalị ịghara ịkpatara ya nchekasị.”
Ka Ellen na-amụ okwu ọzọ site n’enyemaka nke onye na-agwọ nsogbu okwu, John nyeere ya aka. “Imekọ ihe ọnụ bụ ụzọ isi nye agbamume, ya mere anyị ga-agụpụtara ibe anyị Bible n’olu dara ụda, nke nyere aka imeziwanye okwu ya. Ọzọkwa, n’iji nwayọọ nwayọọ ná mmalite, anyị keere òkè n’ozi, ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova. N’ụzọ dị otú a Ellen pụrụ isoro ndị ọzọ kerịta olileanya anyị nwere maka ọdịnihu. Nke a n’onwe ya bụ usoro ọgwụgwọ nye Ellen.” Ka ọ na-erule ngwụsị nke afọ atọ, Ellen akawo mma n’ụzọ dị ukwuu.
E kwesịghị mgbe ọ bụla ilelị agbamume na ume nke ndị enyi pụrụ inye, ebe ha pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu ná mgbake nke onye lanarịrị ọrịa strok. Akwụkwọ ahụ ike bụ́ Stroke kọrọ na ‘a chọpụtara na ọ̀tụ̀tụ̀ ka elu nke nkwado ọha na eze na-agba àmà ọ̀tụ̀tụ̀ mgbake dịkwu ọsọ ọsọ na ọganihu ka ukwuu n’ozuzu ya n’ịrụ ọrụ, ọbụna n’etiti ndị ọrịa nwere ọrịa strok siri ike karị.”
Bernie nwere ekele nke ukwuu maka nkwado nke ndị enyi ya nyere ya. Ọ na-echetara anyị, sị: “Nleta nke ndị enyi dị mkpa n’ịnagide. Ụda olu ọmịiko na omume nchebara echiche na-ewulite mmụọ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị mkpa mmadụ ịtụkwasị uche ná nkwarụ onye ahụ, ikwu okwu banyere ọganihu ọ bụla e nwere bụ nnọọ ihe na-agba ume.” Gịnị ka anyị nile pụrụ ime iji nye ndị na-anagide ihe na-esi n’ọrịa strok apụta nkwado? “Wega ụfọdụ okooko osisi,” ka Bernie na-atụ aro, “ma ọ bụ soro kerịta otu echiche ma ọ bụ ahụmahụ Akwụkwọ Nsọ. Nke ahụ nyeere m aka nke ukwuu.”
Melva, onye agadi lanarịrị ọrịa strok, hụrụ na ọ na-enye aka ime ka otu n’ime ụmụnna ime mmụọ ya soro ya kpee ekpere. Gilbert na-atụkwa aro nke a, na-akọwa, sị: “Ọ na-egosi na ị na-enwe nchegbu n’ezie mgbe i sooro mmadụ kpee ekpere.” Peter, bụ́ onye ọrịa strok ya mere ka ọ ghara ịhụkwa ụzọ nke ọma, na-enwe ekele mgbe ndị ọzọ na-aghọta adịghị ike ya ma wepụta oge ịgụrụ ya ihe.
Inyere mmadụ aka ịga na ịlọta site n’ebe a na-enye ọzụzụ mgbake bụkwa omume ịhụnanya. Ijide n’aka na ebe obibi nke onye ahụ nwere ọrịa strok dị nchebe dịkwa mkpa. Ọdịda bụ ihe iyi egwu dị mgbe nile mgbe nguzozi bụ nsogbu. Gilbert, dị ka ihe atụ, nwere ekele maka enyemaka obiọma nke ndị enyi bụ́ ndị, tinyere ihe ndị ọzọ, rụnyere ígwè njide aka n’ebe ịsa ahụ ya maka nchebe.
Ịmụta Inye Nkwado
Mgbanwe n’ọnọdụ uche na ohere rịrị elu nke ibe ákwá pụrụ ịbụ ihe mmechuihu nye onye nwere ọrịa strok, nakwa ihe na-etinye ndị na-ekiri ihe na-emenụ n’ọgba aghara bụ́ ndị nwere ike ha amaghị ụzọ isi zaghachi. Otú ọ dị, n’ịmụta inye nkwado, ndị enyi pụrụ ịzọpụta onye nwere ọrịa strok site ná nkewapụ iche nke pụrụ ịpụta n’ụzọ ụfọdụ. Dị ka ọ na-adịkarị, oge ibe ákwá na-ebelata. Ma mgbe anya mmiri pụtara, nọrọ jụụ ma nọnyere onye ahụ, na-ekwu ihe ọ ga-amasị gị ịnụ ma ọ bụrụ na ị bụ onye ahụ.
Karịsịa, zụlite ịhụnanya Chineke maka ndị ahụ nkwarụ ha nwere ike ịgbanwewo ọdịdị mmadụ ị mabu. Ha na-aghọta otú ọ dị gị, nke ahụkwa, n’aka nke ya, na-emetụta ụzọ ha si emeghachi omume n’ebe ị nọ. Erikka na-ekwu, sị: “O nwere ike agaghị m abụkwa otu onye ahụ ọzọ ma ọlị. Ma mmadụ ọ bụla ekwesịghị ịtụ anya nke ahụ n’aka onye nwere ọrịa strok. Ndị ikwu na ndị enyi kwesịrị ịmụta ịhụ onye ahụ n’anya otú ọ dị. Ọ bụrụ na ha jiri nlezianya nyochaa ọdịdị mmadụ ya, ha ga-achọpụta na àgwà ndị kasị adọrọ adọrọ nke oge gara aga ka nọ ya.”
Ùgwù onwe onye na-adaru n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala mgbe mmadụ na-enweghị ike ikwu okwu ma ọ bụ ịbụ onye a ghọtara. Site n’ime mgbalị ikwunyere ha okwu, ndị enyi pụrụ ikwupụta uru nke ndị ahụ nwere nsogbu ikwu okwu bara. Takashi na-ekwu, sị: “Ihe m na-eche, nke dịkwa m n’obi agbanwebeghị. Otú ọ dị, ndị mmadụ yiri ka ha na-ezere mụ na ha imekọ ihe n’ihi na mụ na ha apụghị inwe mkparịta ụka dị otú o kwesịrị. Ọ na-esiri m ike ijekwuru ndị mmadụ, ma mgbe mmadụ bịara ikwunyere m okwu, ọ bụ agbamume dị ukwuu ma na-eme m nnọọ obi ụtọ nke ukwuu!”
Ihe ndị na-esonụ bụ ụfọdụ ụkpụrụ nduzi nke pụrụ inyere anyị nile aka ịkwado na ịgba ndị nwere nsogbu ikwu okwu ume.
Ihe ka ọtụtụ n’ahụ mkpọnwụ adịghị emetụta ọgụgụ isi. Ihe ka ọtụtụ ná ndị lanarịrị ọrịa strok na-anọgide na-adị nkọ n’uche, ọ bụ ezie na okwu ha nwere ike isi ike nghọta. Ya adịla mgbe ị gwara ha okwu ka ndị na-amaghị nke a na-akọ ma ọ bụ gwawazie ha okwu ụmụaka. Jiri nkwanye ùgwù na-emeso ha.
Jiri ndidi gee ntị. Oge pụrụ ịdị ha mkpa iji chịkọtaghachi otu echiche ma ọ bụ kwusịa otu okwu, nkebi okwu, ma ọ bụ ahịrịokwu. Cheta, ọ dịghị adị onye kasị eche banyere ndị ọzọ, bụ́ onye na-ege ntị, ọkụ ọkụ ịnụta ihe.
Emela ka a ga-asị na ị ghọtara ma ọ bụrụ na ị ghọtaghị. Jiri obiọma kweta, sị: “Ewela iwe. O yighị nnọọ ka m ghọtara. Ka anyị nwalee ọzọ mgbe e mesịrị.”
Kwuo okwu nwayọọ nwayọọ na n’ụzọ doro anya n’ụda olu kwesịrị ekwesị.
Jiri ahịrịokwu ndị dị nkenke na okwu ndị a maara nke ọma mee ihe.
Jụọ ajụjụ ndị ga-achọ ka a zaa ee ma ọ bụ ee e, ma gbaa ume inye nzaghachi. Buru n’uche na ọ pụrụ ịbụ na ha enweghị ike ịghọta okwu gị.
Mee ka ụzụ ndị dị n’ebe ahụ dị ala.
Ịnagide, Site ná Nkwado Ịhụnanya Jehova
Ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ịmata ihe kpatara ọrịa strok gị, ebe nke ahụ ga-enyere gị aka ime ihe na ibelata ihe ize ndụ gị nke ọrịa strok n’ọdịnihu, ịchịkwa egwu nke na-eso ya dịkwa mkpa. Ellen na-akọ, sị: “Okwu Chineke dị n’Aịsaịa 41:10 kasiri m obi karịsịa. N’ebe ahụ ọ na-ekwu, sị: ‘Atụla egwu, gị ka M nọnyeere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke gị: M ga-agba gị ume; ee, M ga-enyere gị aka; ee, M ga-eji aka nri nke ezi omume m kwagide gị.’ Jehova abụrụwo onye dị nnọọ adị nye m, na-eme ka m ghara ịtụ egwu.”
Bible na-enyekwara Anand aka ịnagide obi nkoropụ ọ na-enwe: “Ọ na-enye m oké nkwado, ebe ọ na-akpọteghachi ma na-enye m ume ọhụrụ mgbe nile.” Nsogbu Hiroyuki bụ ụzọ isi rite uru n’Akwụkwọ Nsọ, ebe ọ na-apụghị ịtụkwasị uche n’ihe. Ọ na-ekwu, sị: “Enwetara m nkasi obi n’igere akwụkwọ Bible na kaseti a na-ege ege.”
Pọl onyeozi kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:10) Ọ bụ mmụọ Jehova nyeere Pọl aka ịrụzu ihe ọ na-apụghị ime n’onwe ya. Ndị lanarịrị ọrịa strok pụkwara ịdabere na Jehova maka ume ime mmụọ. Erikka na-akọwa, sị: “Mgbe anyị nwere ahụ ike ma na-eme ihe nile n’ume nke aka anyị, o nwere ike anyị agaghị enyecha Jehova ohere inyere anyị aka. Ma ọrụsị m enyeworo m aka ime ka mmekọrịta mụ na ya sie ike n’ụzọ pụrụ iche.”
Ndị Na-enye Nlekọta Na-enweta Nkwado
Nkwado dị ndị na-enye nlekọta mkpa n’ọrụ ha dị oké mkpa. Ebee ka ha pụrụ ichigharịkwuru maka nkwado? Otu ebe bụ n’ime ezinụlọ. Ọ dị onye òtù ọ bụla mkpa ikerịta ibu nke inye nlekọta. Yoshiko na-akọ otú ụmụ ya si nye ya nkwado mmetụta uche: “Ha ga-ege ntị ná nsogbu m dị ka a ga-asị na ọ bụ nke ha.” Ọ dị ndị òtù ezinụlọ mkpa inweta ihe ọmụma nile ha pụrụ inweta iji mụta ụzọ isi lekọta onye nwere ọrịa strok nakwa ụzọ isi mee ihe n’ihi mgbanwe nke ọdịdị onye ha hụrụ n’anya.
Olee ndị ọzọ pụrụ inye ndị na-enye nlekọta nkwado? David na ezinụlọ ya chigharịkwuuru ezinụlọ ime mmụọ ha n’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova maka inyere Victor aka: “Ha zaghachiri ná mkpa anyị. N’ime onye o ruuru ọ bịa, mgbe ụfọdụ ha na-abịa rahụ n’ụlọ anyị iji lekọtara anyị Victor n’ogologo abalị nile.”
Ọ dị onye ọ bụla na-enye nlekọta mkpa inweta ịhụnanya na-ekpo ọkụ na nkwado nke ezinụlọ ime mmụọ ya. Ma ọ pụrụ isiri ụfọdụ ike ịrịọ maka enyemaka. Haruko na-akọwa: “A na-agwakarị m, sị: ‘Ọ bụrụ na e nwere ihe ọ bụla ọ dị gị mkpa ka e nyere gị aka na ya, alala azụ ime ka anyị mara.’ Ma n’ịmara otú onye ọ bụla si jiri ọrụ n’aka, ana m ala azụ ịrịọ maka enyemaka. Ọ ga-amasị m nnọọ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ nye aka n’ụzọ ụfọdụ kpọmkwem: ‘Apụrụ m inyere gị aka n’ihichasị ihe. Olee ụbọchị ga-akasịrị gị mma?’ ‘Apụrụ m ịzụtara gị ihe, ya mere ọ̀ ga-adị mma ma m bịa ugbu a?’”
Nwunye Kenji nwere ọrịa strok; otú ọ dị, o nwere ike inye nlekọta dị ya mkpa. Ọ chọpụtara na site n’ekpere ọ pụrụ ịtụkwasị Jehova ibu arọ ya. N’ikpeazụ, nwunye ya enwekwaghị ikike ikwu okwu, n’ihi nke ahụ, Kenji enwekwaghị onye ibe ọ ga na-ekwunyere okwu. Ma ọ na-agụ Bible kwa ụbọchị. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ na-echetara m nlekọta obi ebere Jehova nye ndị e gwepịara egwepịa ná mmụọ, nke a egbochiwokwa m ịghọ onye dara mbà n’obi na onye owu na-ama.”
Ịdabere ná mmụọ Jehova pụrụ inye aka mgbe o yiri ka mmetụta uche ọ na-achọ irikpu anyị. Yoshiko, n’ịnagide mgbanwe nke ọdịdị mmadụ na iwe iwe ọkụ nke di ya mgbe ọrịa strok ya gasịrị, na-akọ, sị: “Mgbe ụfọdụ ọchịchọ nke itisi mkpu ike akwaliwo m. N’oge ndị ahụ ana m ekpegara Jehova ekpere mgbe nile, mmụọ ya na-ewetakwara m udo.” N’obi ekele maka iguzosi ike n’ihe Jehova nye ya, ọ dịghị ekwe ka ihe ọ bụla kpaghasịa ụzọ ndụ ya dị ka onye Kraịst. Ọ na-agachi nzukọ ndị Kraịst anya, na-ekere òkè n’ozi, na-enwekwa ọmụmụ Bible onwe onye. “Site n’ime òkè m,” ka Yoshiko na-ekwu, “Amaara m na Jehova agaghị agbahapụ m ma ọlị.”
Mgbe nchegbu gbebatara, Jehova nọ ya mgbe nile ige ntị. Midori, bụ́ onye di ya lanarịrị ọrịa strok, na-enweta nkasi obi n’eziokwu ahụ bụ na, n’ụzọ ihe atụ, Jehova etinyewo anya mmiri nile o bere n’ime “karama akpụkpọ” ya. (Abụ Ọma 56:8) Ọ na-echeta okwu Jisọs: “Echegbula onwe unu nye echi.” Ọ na-asị: “Ekpebiwo m inwe ndidi ruo mgbe ụwa ọhụrụ ahụ bịara.”—Matiu 6:31-34.
Iche Adịghị Ike Ndị Siri Ike Ihu
Ọ bụ eziokwu na n’ọzụzụ mgbake ha ụfọdụ na-enweta mgbake dị ịrịba ama, ma ndị ọzọ na-enweta nanị ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke ihe ịga nke ọma n’inwetaghachi ikike ndị dị tupu ọrịa strok. Gịnị pụrụ inyere ndị ikpeazụ a aka iche ihe ịma aka nke ịnakwere adịghị ike ha ihu, n’agbanyeghị otú ha siruru ike ma na-adịte anya?
Bernie, bụ́ onye ihe ka ukwuu n’ikike ngagharị ya funahụrụ n’ihi ọrịa strok, na-aza, sị: “Ọṅụ nke olileanya m nke ndụ agwụghị agwụ na paradaịs elu ala gaje ịbịa na ekpere nye Nna m nke eluigwe, bụ́ Jehova, nyeere m aka iji ịdị jụụ nakwere adịghị ike m.”
Olileanya ahụ nyeere Erikka na di ya, bụ́ Georg, aka ịnakwere adịghị ike ya ma ka na-anụ ụtọ ndụ. Georg na-akọwa, sị: “Anyị nwere nkwa Chineke nke ọgwụgwọ zuru ezu otu ụbọchị. Ya mere anyị adịghị atụkwasị uche ná nkwarụ ahụ. N’ezie, anyị ka na-eme ihe nile anyị pụrụ ime maka ahụ ike Erikka. Ma ị pụrụ ịmụta ịnagide arụkọghị ọrụ ọnụ nke uru ahụ ma tụkwasị uche n’ihe ndị dị mma karị.”—Aịsaịa 33:24; 35:5, 6; Mkpughe 21:4.
N’ọnọdụ ebe mgbake dị nnọọ nta, nkwado nke ezinụlọ na ndị enyi dị oké mkpa ọbụna karị. Ha pụrụ inyere onye ọrịa ahụ aka ịnagide ruo mgbe ọ bụ oge Chineke ịgwọta nsogbu ahụ ike nile.
Ịmara na e nwere ọdịnihu dị ebube maka ndị nwere ọrịa strok na ezinụlọ ha mgbe a ga-eweghachi ahụ ike na-eme ka ha nwee ike ịnagide ndụ otu ụbọchị n’otu oge. Ha pụrụ isi otú a jiri ndidi na-echere ahụ efe pụọ ná nhụjuanya nile, n’ụwa ọhụrụ Chineke nke na-abịa n’isi nso. (Jeremaịa 29:11; 2 Pita 3:13) Ka ọ dịgodị ugbu a, ndị nile na-echigharịkwuru Jehova pụrụ inwe obi ike na ọbụna ugbu a ọ ga-enye aka ma kwadoo ha n’ịnagide mmetụta na-akwarụ akwarụ nke ọrịa strok.—Abụ Ọma 33:22; 55:22.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]
Ezinụlọ na ndị enyi pụrụ inyere onye ọrịa ahụ aka ịnagide ruo mgbe ọ bụ oge Chineke ịgwọta nsogbu ahụ ike nile
[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]
Igbochi Ọrịa Strok
“ỤZỌ kasị mma isi mee ihe banyere ọrịa strok bụ ịgbalị igbochi ya,” ka Dr. David Levine kwuru. Ihe mbụ bụkwa isi e jikọtara ya na ihe ka ọtụtụ n’ọrịa strok bụ ọbara mgbali elu.
Nye ọtụtụ ndị, a pụrụ ịchịkwa ọbara mgbali elu site n’iri ihe oriri jupụtara na potassium ma nwee nnu, abụba ọjọọ, na cholesterol n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta. Ibelata ịṅụ mmanya na-aba n’anya pụrụ ịdịkwa mkpa. Usoro mmega ahụ chiri anya nke kwesịrị ekwesị maka afọ ndụ na ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ ịdị mma nke mmadụ pụrụ inye aka ifelata, nke pụrụ ibelata ọbara mgbali elu n’aka nke ya. A pụrụ ịṅụ ọgwụ—dị ka dọkịta si kwuo, ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ọgwụ dịnụ.
Ọrịa akwara na-ebuga ọbara n’isi na-akpachitụ ụzọ nkesa ọbara bụ isi gara n’ụbụrụ, ọ bụkwa ihe gbara ọkpụrụkpụ na-eso akpata ọrịa strok. Na-adabere n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke nsụchi, ịwa ahụ a maara dị ka carotid endarterectomy iji mepee akwara nkesa ọbara ndị sụchiri asụchi pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya. Ihe ọmụmụ egosiwo na ndị gosiri mgbaàmà na ndị akwara nkesa ọbara ha kpachiri nke ukwuu ritere uru n’ịwa ahụ tinyere usoro iji ọgwụ agwọ ọrịa. Otú ọ dị, a pụrụ inwe nsogbu ndị metụtara ịwa ahụ, ya mere a ghaghị iji nlezianya tụlee ya.
Ọrịa obi pụrụ ịmụba ihe ize ndụ nke ọrịa strok. A pụrụ iji ihe ndị na-agwọ mkpụkọ ọbara gwọọ mkpachilata uru ahụ nke oghere obi (otiti obi na-adịghị n’usoro), nke pụrụ ime ka ọbara kpụkọọ ma gaa n’ụbụrụ. Nsogbu obi ndị ọzọ pụrụ ịchọ ịwa ahụ na ịṅụ ọgwụ iji belata ihe ize ndụ nke ọrịa strok. Ọrịa shuga so na-akpata akụkụ dị ukwuu nke ndị ọrịa strok na-arịa, ya mere ịchịkwa ya na-enye aka igbochi ọrịa strok.
Ụkọ ọbara na-adịghị adịte anya, bụ́ TIA, bụ ịdọ aka ná ntị doro anya na ọrịa strok pụrụ ime. Jide n’aka na e legharaghị ha anya. Gaa hụ dibịa gị, ma mee ihe banyere ihe bụ isi na-akpata ya, ebe TIA na-amụba ihe ize ndụ nke ọrịa strok ọtụtụ okpukpu.
Ụzọ ibi ndụ na-akwalite ahụ ike, nke imeru ihe n’ókè pụrụ ime ihe dị ukwuu igbochi ọrịa strok. Nri na-edozi ahụ na mmega ahụ chiri anya tinyekwara ịṅụ mmanya na-aba n’anya obere obere na ịkwụsị ise siga pụrụ inye aka mee ka akwara nkesa ọbara dị mma, ọ pụkwara ọbụna ịkwalite mgbanwe ndị dị mma ná ndị mebiwororịị. Ịmụba iri mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri na mkpụrụ akụ́kụ́ enyewo aka, dị ka ihe ọmụmụ dịgasị iche iche si kwuo, ibelata ihe ize ndụ nke ọrịa strok.