Mgbe Mpụ Na-adịghị
Ị̀ PỤRỤ iche echiche banyere ụwa mpụ na-adịghị? Eleghị anya ị pụghị ma ọ bụrụ na ị gụwo akụkọ ndị dị ka nke pụtara n’akwụkwọ akụkọ Germany a na-ebi kwa ụbọchị bụ́ Süddeutsche Zeitung: “Ndị ọkachamara n’inyocha mpụ na-ekwu banyere ụdị mpụ ọhụrụ. Okwu ha jupụtara n’ịtụ anya ihe ọjọọ, nkọwa ha na-enyekwa dị oké njọ.”
Dị ka nnyocha e mere ọtụtụ puku ndị Europe na 1995 si gosi, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-enwe nchegbu banyere ịbụ onye mpụ metụtara. Na Germany, Netherlands, Poland, Russia, na United Kingdom, mpụ nọ n’elu elu ná ndepụta nke ihe ndị mmadụ kasị atụ egwu. E debere egwu mpụ n’ọnọdụ nke abụọ na Denmark, Finland, na Switzerland na nke atọ na France, Gris, na Itali. N’ime mba 12 ndị e nyochara, ọ bụ nanị Spain bụ nke na-edepụtaghị mpụ n’etiti ihe atọ ahụ bụ́ isi na-akpata egwu.
Ọ̀tụ̀tụ̀ ime mpụ arịwo elu n’ụzọ dị egwu n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe n’ime afọ asaa gara aga. N’ọtụtụ n’ime mba ndị a, mmụba ahụ abụrụwo ihe nọ n’agbata pasent 50 na 100, ebe ọ bụ ọbụna malite na pasent 193 ruo 401 ná mba ndị ọzọ!
Ma, n’otu oge, e nwere ụwa nke mpụ na-adịghị. Ọ̀ bụ olee mgbe, oleekwa otú e si mebie ụwa ahụ?
Olee Ebe Mpụ Si Malite?
Mpụ, bụ́ nke a kọwara dị ka “oké ịda iwu,” malitere n’ógbè ndị bụ mmụọ. E kenyeghị ụmụ mmadụ mbụ, bụ́ Adam na Iv, ọchịchọ ime mpụ, ọ bụghịkwa ha kpatachara mbata nke mpụ n’ime ọha mmadụ. Otu nwa mmụọ Chineke nke zuru okè kwere ka echiche ọjọọ gbanye mkpọrọgwụ n’obi ya, bụ́ nke, mgbe ọ zụlitere ya, dubara na mpụ. Ọ bụ onye ahụ kpatara mmebi nke ụwa mbụ ahụ mpụ na-adịghị. Site n’imebi iwu Chineke, o mere onwe ya onye omempụ, a kọwakwara ya n’ime Bible dị ka Setan bụ́ Ekwensu.—Jemes 1:13-15; Mkpughe 12:9.
Ebe ọ malitere imegide Chineke n’eluigwe nke a na-adịghị ahụ anya, Setan kpebisiri ike ịgbasaru ụzọ ime mpụ ya n’ebe ndị mmadụ nọ n’ụwa nọ. Ihe ndekọ Bible banyere otú Ekwensu si mee nke a dị nkenke, dịkwa mfe, ma bụrụ eziokwu. (Jenesis, isi nke 2-4) Adam na Iv, n’ịbụ ndị omempụ a dị aghụghọ, nke karịrị mmadụ ike duhiere, jụrụ irube isi n’ụkpụrụ Chineke. Ha ghọrọ ndị omempụ site n’inupụrụ Chineke isi. Ka oge na-aga, obi abụọ adịghị ya na o riri ha ọnụ mgbe ọkpara ha, bụ́ Ken, garuru n’ókè nke ịnapụ nwanne ya nwoke bụ́ Ebel ihe kasị oké ọnụ ahịa o nwere, bụ́ ndụ n’onwe ya!
N’ụzọ dị otú a, n’ime mmadụ anọ mbụ biri n’ụwa, atọ ghọrọ ndị omempụ. Adam, Iv, na Ken si otú a tụfuo ohere ha nwere ibi n’ime ụwa nke mpụ na-adịghị. Ka oge a nile gasịrị, n’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ụdị ụwa dị otú ahụ dị nso ugbu a?