Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 3/8 p. 31
  • O Metụrụ Ya n’Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • O Metụrụ Ya n’Obi
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Usoro Ihe Omume Ezinụlọ—Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Adara M Ogbenye ná Mmalite, ma Baa Ọgaranya n’Ikpeazụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Na-ahụkwu Jehova na Ụmụnna Gị n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Otú Otu Nwa Nwoke Si Nyere Nna Ya Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 3/8 p. 31

O Metụrụ Ya n’Obi

“Anyị bụ ezinụlọ e nwere ụmụaka 13,” ka Gloria Adame na-ede, “ndị nwoke 4 na ndị nwanyị 9. Ọ bụ na 1984. Papa anyị lọtara Mexico wee chọpụta na mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ na United States, na ezinụlọ anyị amalitewo iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Obi adịghị ya mma ma ọlị, ọ malitekwara imegide anyị. O yiri ka kwa ụbọchị na-agafe, obi ya na-esi ike karị.

“Anyị hụrụ papa anyị n’anya nke ukwuu, anyị chọkwara ka o rite uru site n’ihe ọmụma na-enye ndụ nke anyị nọ na-enweta. Kwa ụbọchị, anyị na-ekpesi ekpere ike nye Jehova, na-arịọ ya imeghere anyị ụzọ isi soro papa anyị kwurịta okwu banyere nzube Jehova. Jehova nụrụ arịrịọ anyị n’ihi na o nyere anyị obi ike ịnọkọ na palọ kwa uhuruchi, ebe papa anyị na-anọ kwa anyasị na-ekiri telivishọn. Ebe ahụ, nne m na anyị bụ́ ụmụ agbọghọ na-anọkọ ịgụ ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị.

“Mama anyị na-eduzi nkwurịta okwu ahụ, mgbe a gụsịkwara ihe mmụta dịịrị ụbọchị, anyị na-ekpe ekpere onye kpee ibe ya ekpee. Mgbe nwanne anyị nwanyị nke ikpeazụ, bụ́ Marie, onye gbara nanị afọ ise, ga-ekpe ekpere, ọ ga-arịọsi ike, sị: ‘Jehova, biko mee ka obi papa anyị dị nro ka ọ ghọọkwa Onyeàmà gị.’ O yiri ka papa anyị adịghị ege ntị, n’ihi na ọ na-adị na-agbali ụda TV elu. Otú ọ dị, ka oge na-aga, ọ malitere ịdị na-agbadata ụda ya, ruo otu anyasị ọ gbanyụrụ ya kpam kpam.

“N’uhuruchi ahụ, dị ka ọ bụ omenala anyị, mama anyị jụrụ onye o ruuru ịgụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị. N’oké ihe iju anya nye anyị, papa anyị sịrị: ‘Ọ bụ m ka o ruuru.’ Ọ tụrụ anyị n’anya ma ọ dịghị ihe anyị kwuru. Mama anyị agbaghaghị ya ma ọ bụ jụọ ajụjụ kama o nyere ya akwụkwọ nta ahụ bụ́ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Mgbe o duzisịrị nkwurịta okwu nke ihe mmụta Bible ahụ, mama anyị jụrụ onye o ruuru ikpe ekpere. ‘Ọ bụ m ka o ruuru,’ ka papa anyị kwuru.

“O riri anyị ọnụ. N’etiti ekpere ahụ, anyị enwekwaghị ike igbochi anya mmiri anyị. Papa anyị bidokwara bewe ákwá, ọ rịọkwara Jehova ka ọ gbaghara ya maka ikwulu Ya. Ọ rịọkwara mama anyị ka ọ gbaghara ya maka imegide anyị.

“Ya mere na 1986 mmegide site n’aka papa anyị kwụsịrị. Na 1990 ezinụlọ anyị kwagara Texas na United States. Ka oge na-aga, papa anyị raara ndụ ya nye Jehova ma gosipụta ya site na baptism ime mmiri, dị ka anyị asaa bụ́ ụmụnne nwanyị mere. N’April 1997, a họpụtara papa anyị ịbụ onye Kraịst bụ́ okenye. Ruo taa, ịtụle ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị dị ka ezinụlọ bụ ihe dị anyị oké mkpa, ikpegara Jehova ekpere bụkwa ntọala nke ndụ ezinụlọ anyị.”

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

1. Ụmụ ndị nwanyị anọ na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ na Mexico. Marie nọ n’ihu

2. Juanita na Isaac Adame, ha na ụmụ ha ụfọdụ. Gloria nọ ná ngwụcha aka nri

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya