M̀ Pụrụ Ime nke Ọma Karị n’Ụlọ Akwụkwọ?
“Akara mmụta dị oké mkpa nye ndị mụrụ m. ‘Kedụ akara i nwetara n’ule mgbakọ na mwepụ unu? Kedụ akara i nwetara n’ule asụsụ Bekee unu?’ Ọ na-afụkasị m ahụ!”—Sam dị afọ 13.
Ọ BỤGHỊ nanị Sam nwere nsogbu ahụ. N’ezie, ndị dere akwụkwọ bụ́ “Could Do Better” dere, sị: “Anyị ahụbeghị nne ma ọ bụ nna na-eche na nwa ha na-eme nke ọma dị ka o nwere ike ime n’ụlọ akwụkwọ.” Ma ọtụtụ ndị ntorobịa, dị ka Sam, na-eche na ndị mụrụ ha na-arụgide ha gabiga ókè iji mee ka ọrụ ụlọ akwụkwọ ha ka mma—ikekwe ọbụna mekarịsịa nke ọma. Ha pụrụ izutekwu nrụgide n’ime klas. “Ndị nkụzi adịghị enwecha ndidi,” ka otu onye nọ n’afọ iri na ụma na-ekpesa. “Ha na-achọ ka i cheta ihe ozugbo, ọ bụrụkwa na i chetaghị, ha na-eme ka i yie onye nzuzu. Ya mere anaghịdị m anwa.”
A na-akpọkarị ndị na-eto eto na-emezughị ihe nne na nna na ndị nkụzi na-atụ anya ya ndị na-adịghị emetacha nke ọma. Ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ụmụ akwụkwọ nile nwere mgbe ha na-adịghị emetacha nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. N’ihi gịnị? Ọ dị mma ịmara na umengwụ ma ọ bụ enweghị ike ịmụta ihe abụkebeghị ihe na-akpata ya.a
Ihe Mere na Ụfọdụ Adịghị Emetacha nke Ọma
N’ezie, mgbe a bịara n’ihe metụtara ọrụ ụlọ akwụkwọ, e nwere ndị ntorobịa ndị o yiri ka ha na-enwe afọ ojuju nanị n’ịgụferewa n’etinyeghị mgbalị. “Ọ bụrụ na m pụrụ ime ihe kasị nta iji lafere,” ka Herman dị afọ 15 na-ekweta, “M na-eme nnọọ nke ahụ.” Otú ọ dị, n’ikwu eziokwu, ọ bụghị ndị ntorobịa nile a bụ ndị na-enweghị mmasị banyere ịmụ ihe. Ọ pụrụ ịbụ nanị na otu ihe ọmụmụ adịghị adọrọ mmasị ha. E nweziri ụfọdụ ndị nwere ihe isi ike ịhụ abamuru nke ihe ha na-amụ. Reuben, dị afọ 17, tinyere ya n’ụzọ a: “E nwere ihe ọmụmụ ndị m ji n’aka na ọ dịghị mgbe m ga-eji ha eme ihe ọzọ mgbe m hapụsịrị ụlọ akwụkwọ.” Enweghị mmasị ma ọ bụ nkwali pụrụ n’ụzọ dị mfe iduga n’emetachaghị nke ọma.
E nwere ihe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na otú onye nkụzi si akụzi ihe dị ọsọ ọsọ gabiga ókè nye gị, iwe ga-ewe gị. Ọ bụrụ na ọ dịbigara nwayọọ ókè, ọ ga-agwụ gị ike. Nrụgide ndị ọgbọ pụkwara imetụta ókè ị na-emeru nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Akwụkwọ bụ́ Kids Who Underachieve na-akọwa, sị: “Ọ bụrụ na nwata dị nkọ, nke ma akwụkwọ achọọ ka ndị òtù ọgbọ na-enweghị mmasị n’agụmakwụkwọ nabata ya, ọ pụrụ inwe mmetụta nke ịbụ onye a rụgidere ịghara imetacha nke ọma.” N’ihi ya, otu onye nọ n’afọ iri na ụma kpesara na mgbe ya rụsiri ọrụ ike n’afọ ndị mbụ ya n’ụlọ akwụkwọ, ndị ọzọ kwosara ya ekworo ma jiri ya mee ihe ọchị. Ee, onye ntorobịa pụrụ iche izi ezi nke ụkpụrụ dị n’Ilu 14:17 ihu: “Onye ọ bụla nke [nwere ikike iche echiche, NW], a na-akpọ ya asị.”
Mgbe ụfọdụ, mkpọrọgwụ nke emetachaghị nke ọma na-abami abami karị. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị ntorobịa na-eji echiche na-adịghị mma banyere onwe ha etolite. Nke a pụrụ ịpụta mgbe a na-akpọkarị nwatakịrị utu aha ndị na-adịghị mma, ndị dị ka ejula iberibe, onye nzuzu, ma ọ bụ onye umengwụ. Ọ bụ ihe mwute na aha ndị dị otú ahụ pụrụ imesịa bụrụ eziokwu. Dị ka otu dọkịta si tinye ya, “ọ bụrụ na a gwa gị na ị dị nzuzu, i kwerekwa ya, ị ga-eme omume otú ahụ.”
Ihe ka n’ọtụtụ mgbe, agbamume nke ndị mụrụ ụmụ na ndị nkụzi na-esite n’ezi obi. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nke ahụ, ndị ntorobịa pụrụ iche na a na-achọ ihe gabigara ókè n’aka ha. Ọ bụrụ na nke ahụ eyie eziokwu n’ọnọdụ gị, jide n’aka na ndị mụrụ gị na ndị nkụzi gị adịghị anwa ịkpasu gị iwe. Ikekwe nanị ihe ha chọrọ bụ ka i mee ike gị nile. Ma, nchegbu nke iru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ a chọrọ pụrụ ime ka ọ dị gị nnọọ ka gị kwụsị. Ma adala mbà: Ị pụrụ ime nke ọma karị n’ụlọ akwụkwọ.
Ịbụ Onye A Kwaliri
Nzọụkwụ mbụ bụ ịbụ onye a kwaliri! Iji mee nke ahụ, ọ dị gị mkpa ịhụ nzube nke ihe ị na-amụ. Bible na-asị: “Onye na-arụ ọrụ ubi kwesịrị ịrụ ọrụ ubi n’olileanya, onye na-azọcha ọka [kwesịkwara] ịzọcha n’olileanya na ọ ga-eketa.” (1 Ndị Kọrint 9:10) Ịhụ abamuru nke “ịrụ ọrụ” n’ihe ọmụmụ ụfọdụ abụghị ihe na-adị mfe mgbe nile. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ikwu, sị, ‘Achọrọ m ịbụ onye na-ede usoro ịrụ ọrụ kọmputa. Ya mere gịnị mere m ga-eji mụọ akụkọ ihe mere eme?’
N’ezie, ọ bụghị ihe nile dị n’usoro ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ gị pụrụ iyi nke dị mkpa—ma ọ dịghị ihe ọzọ ọ bụghị ugbu a. Ma gbalịa ilepụ anya n’ihu. Mmụta gụnyere ihe ọmụmụ dị iche iche ga-amụba nghọta gị banyere ụwa nke gbara gị gburugburu. Ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà Jehova achọpụtawo na agụmakwụkwọ zuru ezu enyeworo ha aka ‘ịghọ ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ,’ na-enye ha nkà ka ukwuu n’iche ozi Alaeze ahụ n’ihu ndị mmadụ sitere n’akụkụ dị iche iche nke ndụ. (1 Ndị Kọrint 9:22) Ọ bụrụgodị na otu ihe ọmụmụ eyie ka o nwere abamuru dị nta, ị na-erite uru site n’ịmụta ya. Ọ dịkarịa ala, ị ga-amụba “izuzu” gị, bụ́ ihe ga-abara gị uru nke ukwuu ma e mesịa.—Ilu 1:1-4.
Ụlọ akwụkwọ pụkwara ikpughe nkà gị ndị zoro ezo. Pọl onyeozi degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Mee ka onyinye amara Chineke nwuru ọkụ, bụ́ nke dị n’ime gị.” (2 Timoti 1:6) Ihe àmà na-egosi na a họpụtawo Timoti maka ozi ụfọdụ pụrụ iche n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ma ọ dị mkpa ka a zụlite ikike Chineke nyere ya—“onyinye amara” ya—ka ọ ghara ịtọgbọ nkịtị ma laa n’iyi. N’ezie, Chineke ejighị aka ya kpọmkwem nye gị ikike mmụta gị, dị ka ọ dị n’onyinye Timoti. Ka o sina dị, ikike ndị i nwere—ma hà bụ na nkà ise ihe, egwú, mgbakọ na mwepụ, sayensị, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ—dịịrị nanị gị, ụlọ akwụkwọ pụkwara inyere gị aka ịchọpụta na ịzụlite onyinye ndị dị otú ahụ.
Àgwà Ọmụmụ Ihe Ndị Dị Mma
Otú ọ dị, iji rite uru kasịnụ n’ụlọ akwụkwọ, usoro ọmụmụ ihe dị mma dị gị mkpa. (Tụlee Ndị Filipaị 3:16.) Hazie oge zuru ezu iji mụzuo ihe buru ibu, ma na-akwụsịtụ site n’oge ruo n’oge ka i wee nwee ike inwetaghachi ume ọhụrụ. Ọ bụrụ na ọmụmụ ihe gị na-agụnye ịgụ ihe, buru ụzọ nyochaa ihe ọgụgụ ahụ ka i wee nwee ike ịmara ihe ọ na-ekwu banyere ya. Ọzọ, wepụta ajụjụ dabere n’isiokwu nke isiakwụkwọ dị iche iche ma ọ bụ isiokwu ndị bụ isi. Mgbe ahụ gụwa, na-achọ azịza nye ajụjụ gị ka ị na-agụ. N’ikpeazụ, lee ma ị ga-ekwupụtaghachili ihe ị mụworo n’isi.
Jikọta ihe ị mụtara na ihe ndị ị mabu. Dị ka ihe atụ, ihe ọmụmụ sayensị pụrụ ịbụ ụzọ isi ‘hụ ihe Chineke anya na-adịghị ahụ nke ọma.’ (Ndị Rom 1:20) Ihe ọmụmụ akụkọ ihe mere eme pụrụ inyere gị aka ịnwapụtara onwe gị eziokwu nke okwu ahụ bụ́: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ka ị na-etinye onwe gị n’ọmụmụ ihe, o yiri ka ị ga-ahụ na ịmụ ihe na-adịwanye mfe—ọbụna na-enyekwu ọṅụ! Solomọn kwuru, sị: “Ihe ọmụma dịịrị onye nghọta mfe.”—Ilu 14:6.
Nọgide Na-enwe Àgwà Ziri Ezi
Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ a na-ejikọta emetachaghị nke ọma na nhọrọ ndị enyi mmadụ. Ndị enyi gị hà na-agba ume ime nke ọma, ka hà bụ ndị na-adịghị emetacha nke ọma n’onwe ha? Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Ya mere jiri amamihe họrọ ndị gị na ha na-akpakọrịta. Soro ndị nwere àgwà ziri ezi banyere ụlọ akwụkwọ na-akpakọrịta. Alala azụ iji aka gị kọọrọ onye nkụzi gị banyere ihe mgbaru ọsọ gị ime ka akara mmụta gị ka mma. Obi abụọ adịghị ya na onye nkụzi gị ga-etinyekwu mgbalị iji nyere gị aka ime otú ahụ.
Mgbe echiche na-ezighị ezi banyere ikike gị na-enye gị nsogbu, tụlee ihe atụ nke Pọl onyeozi. Mgbe ndị mmadụ katọrọ ikike ikwu okwu ya, ọ zaghachiri: “A sị na ọ bụ ezie na abụ m onye na-amụtaghị akwụkwọ n’ụzọ ikwu okwu, ma abụghị m otú a n’ụzọ ihe ọmụma.” (2 Ndị Kọrint 10:10; 11:6) Ee, Pọl lekwasịrị anya n’ebe ndị ọ na-eme nke ọma kama n’adịghị ike ya. Olee ebe ndị ị na-eme nke ọma? Ọ bụrụ na i nweghị ike ịkpọ ha otu otu, gịnị ma ị kọọrọ onye toworo eto na-enye nkwado? Enyi dị otú ahụ pụrụ inyere gị aka ịchọpụta ebe ndị ị na-eme nke ọma na iji ha mee ihe kasị mma.
Ịga n’Ihu n’Agbanyeghị Nsogbu
“Tinye uche gị dum, ume ọrụ gị nile, n’ihe ndị a, ka ọganihu gị pụta ìhè ka mmadụ nile wee hụ.” (1 Timoti 4:15, Phillips) Dị ka nna nke na-agwa nwa ya okwu, Pọl gbara Timoti nweworo ihe ịga nke ọma ume inwekwu ọganihu n’ozi ya. N’oge Bible ngwaa Grik bụ́ “ọganihu” pụtara n’ụzọ nkịtị “igburu gaa n’ihu,” na-echetara mmadụ onye na-asụcha ụzọ isi gafee n’ime ọhịa. Mgbe ụfọdụ, ịga akwụkwọ pụrụ iyi nke ahụ. Ma ọ ga-aka mfe nke ukwuu ịga n’ụzọ nke agụmakwụkwọ ma ọ bụrụ na i chee na ụgwọ ọrụ ya n’ikpeazụ bara uru.
Mgbalị, nkwali, na ịmụ ihe na-aga ụkwụ na ụkwụ. Iji maa atụ: Cheedị banyere onye na-akpọ ngwá egwú. Ọ bụrụ na ọ na-anụ ụtọ ya, ọ na-akpọkwu. Ka ọ na-akpọkwu ya, otú ahụ ka ọ na-akpọta ya karị, bụ́ nke na-amụba ọṅụ ya n’aka nke ọzọ. Ka anyị na-amụ ihe karị, otú ahụ ka ọ na-aka mfe ịmụta ọbụna karị. Ya mere adala mbà n’obi n’ọrụ ụlọ akwụkwọ gị. Tinye mgbalị dị mkpa, soro ndị ga-enyere gị aka ime nke ọma na-akpakọrịta, chetakwa okwu Azaraịa gwara Eze Esa oge ochie: “Ekwela ka aka unu kụdaa: n’ihi na ụgwọ ọrụ dịịrị ọrụ unu.”—2 Ihe E Mere 15:7.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ndị ntorobịa nwere nsogbu ịmụta ihe pụrụ iche ihe ịma aka ndị pụrụ iche ihu n’akụkụ a. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee Teta!, July 8, 1996, peji nke 23-25.
[Foto dị na peeji nke 17]
Alala azụ ịkọrọ onye nkụzi gị banyere ihe mgbaru ọsọ gị ime ka akara mmụta gị ka mma
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọ bụrụgodị na otu ihe ọmụmụ eyie ihe nwere abamuru dị nta, ị na-erite uru site n’ịmụta ya