Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 4/8 p. 7-11
  • Inwe Ekele Maka Ndị Inyom na Ọrụ Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inwe Ekele Maka Ndị Inyom na Ọrụ Ha
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Inyom Dị Ka Ndị Na-akpata Nri
  • Ndị Nne na Ndị Nkụzi
  • Ọmịiko Dị Oké Mkpa
  • “Nye Ya Ụgwọ Ọrụ Ọ Rụtaworo”
  • Ndị Inyom “Ndị Na-adọgbu Onwe Ha n’Ọrụ n’Ime Onyenwe Anyị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Chineke Chọrọ Ka A Na-akwanyere Ụmụ Nwaanyị Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-abụrụ Ndị Inyom?
    Teta!—1998
  • Ọnọdụ Onye Bụ Nwanyị n’Akwụkwọ Nsọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 4/8 p. 7-11

Inwe Ekele Maka Ndị Inyom na Ọrụ Ha

PUKU afọ atọ gara aga, otu nwoke aha ya bụ Lemuel dere nkọwa dị mma nke nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma. E dekọrọ nke a na Bible n’Ilu isi nke 31. Nwanyị ahụ bụ́ onye o toro ezi àgwà ya ji ọrụ n’aka n’ezie. O lekọtara ezinụlọ ya, zụọ ma ree ihe n’ọma ahịa, zụọ ma ree ala, kwaara ezinụlọ ya uwe, ma rụọ ọrụ n’ugbo.

E wereghị nwanyị a n’onye na-abụghị ihe. ‘Ụmụ ya na-akpọ ya onye a gọziri agọzi, di ya na-etokwa ya.’ Nwanyị dị otú ahụ bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Bible na-ekwu na, “Ọ karịrị nnọọ ọtụtụ ruby n’ọnụ ahịa.”—Ilu 31:10-28, New International Version.

Kemgbe oge Lemuel, ọrụ ndị inyom aghọwo nnọọ nke dị mgbagwoju anya karị. Ọrụ ha nke narị afọ nke 20 na-achọkarị ha n’aka ịbụ ndị nwunye, ndị nne, ndị nọọsụ, ndị nkụzi, ndị na-akpata nri, na ndị ọrụ ugbo—ha nile n’otu oge ahụ. Ndị inyom a na-apụghị ịgụta ọnụ na-achụ ihe dị ukwuu n’àjà nanị iji jide n’aka na ụmụ ha nwere ihe zuru ezu iri. Ọ̀ bụ na ndị inyom ndị a nile kwa ekwesịghị ekele na otuto?

Ndị Inyom Dị Ka Ndị Na-akpata Nri

Taa ndị inyom dị ukwuu karịa mgbe ọ bụla ọzọ aghaghị ịrụ ọrụ n’èzí iji nye aka kwadoo ezinụlọ ha ma ọ bụ bụrụ nanị ndị na-akwado ezinụlọ ha. Akwụkwọ bụ́ Women and the World Economic Crisis bu otu akụkọ nke kwuru, sị: “Ọrụ ụlọ abụghị nanị ọrụ ndị inyom na-arụ. E nwere ndị inyom ole na ole n’ebe ọ bụla n’ụwa bụ́ ndị pụrụ ịzọrọ ịbụ ‘nanị odozi akụ̀.’” Ọrụ ndị inyom abụkebeghịkwa nke na-akpali mmasị. Ọ bụ ezie na magazin ma ọ bụ usoro ihe nkiri telivishọn pụrụ igosi ndị inyom dị ka ndị isi n’ọfịs ndị mara mma, nke bụ ezie na-adịkarị nnọọ iche. Ọnụ ọgụgụ ka nnọọ ukwuu nke ndị inyom bi n’ụwa na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ruo ọtụtụ hour maka ụgwọ ọrụ ihe onwunwe na-ebughị ibu.

Ọtụtụ narị nde ndị inyom na-arụ ọrụ n’ubi, na-akụ ihe ọkụkụ, na-elekọta obere ala ezinụlọ anya, ma ọ bụ na-elekọta anụ ụlọ. Ọrụ a—a na-adịghị akwụkarị ezi ụgwọ ma ọ bụ a na-adịghị akwụ ụgwọ—na-azụ ọkara ndị bi n’ụwa. “N’Africa, ọ bụ ndị inyom na-akọ pasent 70 nke ihe oriri, n’Esia ọnụ ọgụgụ ya bụ pasent 50-60, na Latin America kwa pasent 30,” ka akwụkwọ bụ́ Women and the Environment na-akọ.

Mgbe ndị inyom na-arụ ọrụ a na-akwụ ụgwọ, ha na-erikarị ụgwọ dị ala karịa ndị nwoke na-arụ ọrụ, nanị n’ihi na ha bụ ndị inyom. Ịkpa ókè a bụ kpọmkwem ọnọdụ dị njọ nye onye bụ nne bụ́ onye nanị ya na-akpa afọ ezinụlọ ịnagide, bụ́ ọrụ nke na-aghọwanye ihe a na-ahụkarị. Otu akụkọ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-eme ngụkọ na n’agbata pasent 30 na pasent 50 nke ezinụlọ nile dị n’Africa, Caribbean, na Latin America na-adabere n’ebe nwanyị nọ dị ka onye bụ isi na-akpata nri ha. Ọbụnakwa ná mba ndị ka mepee emepe, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị inyom aghaghị ịghọ ndị bụ isi na-akpata nri.

Ịda ogbenye nke ime obodo n’ihe ka ukwuu ná mba ndị ka na-emepe emepe na-eme ka ọnọdụ a na-arị elu. Di nke ọ na-esiri ike mgbe nile ịzụ ezinụlọ ya pụrụ ikpebi ịkwaga n’obodo ukwu dị nso ma ọ bụ ọbụna ná mba ọzọ iji nweta ọrụ. Ọ na-ahapụ nwunye ya ilekọta ezinụlọ. Ọ bụrụ na ọ dabaziere ya ịchọta ọrụ, ọ na-eziga ego n’ụlọ. Ma n’agbanyeghị ezi ebumnobi ya, nke a adịghị agakarị n’ihu. Ezinụlọ ọ hapụworo pụrụ ịda ogbenye karị, ọdịmma ha ugbu a na-adaberekwa n’ebe onye bụ nne nọ.

Ọnọdụ ọjọọ a nke na-akpata nke ka njọ, nke a kọwara n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka “ime ka ịda ogbenye ghọọ nke nwanyị,” na-ebokwasị ọtụtụ nde ndị inyom ibu arọ dị ukwuu. “Ezinụlọ nke ndị inyom bụ isi ha, nke e mere ngụkọ ya ịbụ otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ngụkọta ya gburugburu ụwa, yikarịrị ka ha ga-ada ogbenye karịa nke ndị ikom bụ isi ha, ọnụ ọgụgụ nke ezinụlọ ndị dị otú ahụ na-arịkwa elu,” ka akwụkwọ bụ́ Women and Health na-akọwa. Ma n’agbanyeghị otú o si sie ike, ịkpata nri abụghị nanị ihe ịma aka nke ndị inyom na-eche ihu.

Ndị Nne na Ndị Nkụzi

Nne aghaghịkwa ilekọta ọdịmma mmetụta uche nke ụmụ ya. Ọ na-ekere ókè dị mkpa n’inyere nwatakịrị aka ịmụta banyere ịhụnanya na mmetụta ịhụnanya—ihe mmụta nke pụrụ ịdị nnọọ mkpa dị ka igbo mkpa anụ ahụ ya. Iji toruo ịbụ okenye guzoziri eguzozi, gburugburu ebe obibi na-ekpo ọkụ, e chebere echebe dị nwatakịrị mkpa ka ọ na-etolite. Ọzọkwa, ọrụ onye bụ nne dị oké mkpa.

N’akwụkwọ bụ́ The Developing Child, Helen Bee na-ede, sị: “Nne na-ahụ n’anya na-eche banyere nwa ya, na-egosi ịhụnanya, na-ebute mkpa nke nwa ahụ ụzọ mgbe nile, na-egosi ịnụ ọkụ n’obi maka ọrụ nwa ahụ, na-emeghachikwa omume n’ụzọ dị ngwa na n’ụzọ ọmịiko nye mmetụta nke nwa ahụ.” Ụmụaka ndị nwetara ikpo ọkụ dị otú ahụ site n’ebe ezi nne nọ kwesịrị n’ezie igosi ya ekele ha.—Ilu 23:22.

Site n’inye nwa ara, ọtụtụ ndị nne na-enye nwa ha ọnọdụ na-ekpo ọkụ malite mgbe a mụrụ ya. Karịsịa n’ezinụlọ ndị dara ogbenye, mmiri ara nne bụ onyinye bara oké uru ọ pụrụ inye nwa ọ mụrụ ọhụrụ. (Lee igbe dị na peji nke 10-11.) N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible na-agwa anyị na Pọl onyeozi ji mmetụta ịhụnanya ya na-ekpo ọkụ maka ndị Kraịst bi na Tesalọnaịka tụnyere nke “nwanyị nke na-azụ nwa” onye “na-elezi ụmụ nke aka ya anya nke ọma.”—1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8.

E wezụga inye nri na ilezi ụmụ ya anya nke ọma, nne na-abụkarị onye nkụzi ha bụ isi. “Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị,” ka Bible na-adụ ọdụ, na-ezo aka n’òkè dị ukwuu ndị nne na-ekere n’izi ụmụ ha ihe. (Ilu 1:8) N’ụzọ bụ isi ọ bụ nne ma ọ bụ nne nne na-eji ndidi na-akụziri nwatakịrị ikwu okwu, ịga ije, na ịrụ ọrụ ụlọ na ihe ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ.

Ọmịiko Dị Oké Mkpa

Otu n’ime onyinye ndị kasịnụ nke ndị inyom pụrụ inye ezinụlọ ha bụ ọmịiko. Mgbe onye òtù ezinụlọ dara ọrịa, nne na-eweghara ọrụ nke nọọsụ, ka ọ ka na-ahụ maka ibu ọrụ ya ndị ọzọ nile. “N’ezie ndị inyom na-enye ihe ka ọtụtụ ná nlekọta ahụ ike n’ụwa,” ka akwụkwọ bụ́ Women and Health na-akọwa.

Ọmịiko nke nne pụrụ ọbụna ịkwali ya iri obere nri ka ụmụ ya ghara ịkwụ agụụ. Ndị na-eme nnyocha achọpụtawo na ụfọdụ ndị inyom na-ele nri ha na-eri anya dị ka nke zuru ezu ọ bụ ezie na ha adịghị eri ihe ahụ ha chọrọ. Ọ maara ha nnọọ ahụ inye di na ụmụ ha òkè ka ukwuu nke na ọ bụrụhaala na ha ka pụrụ ịrụ ọrụ, ha na-ewere ya na ha erijuola afọ.

Mgbe ụfọdụ ọmịiko nwanyị na-apụta ìhè ná nchegbu ya maka gburugburu ebe ha bi. Gburugburu ebe obibi ahụ dị ya mkpa, ebe ọ bụ na ọ na-atakwa ahụhụ mgbe oké ọkọchị, mgbasa nke ọzara, na igbukpọsị oké ọhịa na-emebi ala. N’otu obodo n’India, iwe were ndị inyom mgbe ha nụrụ na ụlọ ọrụ na-egbutu osisi gaje igbutu ihe dị ka osisi 2,500 n’otu oké ọhịa dị nso. Osisi ndị ahụ dị ndị inyom ahụ mkpa maka nri, nkụ, na nri anụ ụlọ. Mgbe ndị ahụ na-egbutu osisi bịarutere, ndị inyom ahụ ewerelaarịị ọnọdụ, jikọta aka ha, na-agba osisi ndị ahụ gburugburu iji chebe ha. ‘Unu aghaghị igbupụ isi anyị ma ọ bụrụ na unu chọrọ igbutu osisi ndị ahụ,’ ka ndị inyom ahụ gwara ndị ahụ na-egbutu osisi. A zọpụtara oké ọhịa ahụ.

“Nye Ya Ụgwọ Ọrụ Ọ Rụtaworo”

Ma ọ nọ n’ọrụ nke onye na-akpata nrị, nne, onye nkụzi, ma ọ bụ isi iyi nke ọmịiko, nwanyị kwesịrị ka a kwanyere ya ùgwù ma jaa ya mma, dị ka a na-eme ọrụ ya. Nwoke amamihe bụ́ Lemuel, bụ́ onye kwuru okwu ịja mma banyere nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma, ji ma ọrụ nwanyị ma ndụmọdụ ya kpọrọ ihe. N’eziokwu, Bible na-akọwa na o nwetara ihe ka ukwuu n’ozi ya site ná ntụziaka nke nne ya nyeworo ya. (Ilu 31:1) Lemuel kwenyesiri ike na e kwesịghị iwere nwunye na nne nke na-etinye uche n’ọrụ ya n’onye na-abụghị ihe. “Nye ya ụgwọ ọrụ ọ rụtaworo,” ka o dere. “Ọrụ ya na-ewetara ya otuto.”—Ilu 31:31, NIV.

Otú ọ dị, mgbe Lemuel dekọrọ echiche ndị ahụ, ha abụghị nanị ngosipụta nke echiche mmadụ. E dekọrọ ha na Bible, nke bụ́ Okwu Chineke. “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta.” (2 Timoti 3:16) Okwu ndị ahụ na-egosi echiche nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile banyere ndị inyom, ebe ọ bụ na Chineke mere ka e dee okwu ndị ahụ dị na Bible site n’ike mmụọ nsọ maka izi anyị ihe.

Ọzọkwa, Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu na ndị bụ di kwesịrị ịdị “na-ekenye [nwunye ha] nsọpụrụ.” (1 Pita 3:7) Ná Ndị Efesọs 5:33 kwa, a gwara di, sị: “Unu onwe unu n’otu n’otu hụkwa nwunye unu n’anya, onye ọ bụla ya hụ nwunye nke aka ya n’anya, dị ka ọ na-ahụ onwe ya n’anya.” N’ezie, Ndị Efesọs 5:25 na-ekwu, sị: “Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ Ya n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi ya.” Ee, Kraịst gosiri ụmụazụ ya ịhụnanya dị otú ahụ nke na ọ dị njikere ịnwụ n’ihi ha. Lee nnọọ ezi ihe nlereanya, nke achọghị ọdịmma onwe onye o setịpụụrụ ndị bụ di! Ụkpụrụ ndị Jisọs kụzikwara ma bie ndụ na ya gosiri ụkpụrụ Chineke, bụ́ ndị e dekọrọ na Bible maka abamuru anyị.

Ma, n’agbanyeghị ịrụsi ọrụ ike ha n’ọtụtụ akụkụ, ọtụtụ ndị inyom adịghị enweta otuto maka ihe ha na-eme. Olee otú ha pụrụ ọbụna isi meziwanye ọnọdụ ha ná ndụ ugbu a? Ọzọkwa, è nwere ihe ọ bụla na-egosi na omume a na-emeso ha ga-agbanwe? Gịnị bụ ihe a na-atụ anya n’ọdịnihu maka ndị inyom?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10, 11]

Ụzọ Atọ Nwanyị Pụrụ Isi Meziwanye Ọnọdụ Ya

Agụmakwụkwọ. E nwere ihe dị ka nde 600 ndị inyom bụ iti n’ụwa—nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-enwetụbeghị ohere ịga akwụkwọ. Ọ pụrụ ịbụ na gị onwe gị gatụrụ akwụkwọ nke nta, ma nke ahụ apụtaghị na ị pụghị izi onwe gị ihe. Ọ dịghị mfe, ma ọtụtụ ndị inyom enwewo ihe ịga nke ọma. “Ihe ndị metụtara okpukpe pụrụ ikere òkè dị mkpa n’ịkwali ndị toruworo ogo mmadụ inweta nkà nke ịma otú e si agụ na otú e si ede,” ka akwụkwọ bụ́ Women and Literacy na-akọwa. Gị inwe ike ịgụ Bible n’onwe gị bụ ezi ụgwọ ọrụ maka ịmụta ịgụ ihe. Ma e nwere ọtụtụ abamuru ndị ọzọ.

Ọ bụghị nanị na nne nke maara akwụkwọ nwere ohere ka ukwuu nke inweta ego kama ọ pụkwara ịmụta banyere omume ndị na-akwali ezi ahụ ike. Obodo dị n’India bụ́ Kerala na-egosi n’ụzọ na-akpali akpali abamuru nke ịma ka e si ede na ka e si agụ. Ọ bụ ezie na ógbè a erughị nkezi ma a bịa n’ihe metụtara ego a na-akpata, pasent 87 nke ndị inyom ya maara ka e si agụ na ka e si ede. N’ụzọ na-akpali mmasị, n’otu obodo ahụ, ọnwụ ụmụ ọhụrụ ji okpukpu ise dị ala karịa n’obodo ndị ọzọ n’India; ná nkezi, ndị inyom na-adị ndụ afọ 15 karị; ụmụaka nwanyị nile na-agakwa akwụkwọ.

Dị ka ọ na-adịkarị, nne ma ka e si agụ na ka e si ede na-akpali usoro ịmụta ihe n’ime ụmụ ya—ọ dịghị mfe. Agụmakwụkwọ nke ụmụaka nwanyị bụ atụmatụ magburu onwe ya. Ọ dịghị ihe ọzọ nwere ike dị otú ahụ imeziwanye ahụ ike ezinụlọ na imeziwanye ndụ nke ndị inyom n’onwe ha, ka mbipụta nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) bụ́ The State of the World’s Children 1991 na-ekwu. Obi abụọ adịghị ya, nkà ịgụ na ide ihe ga-enyere gị aka ịbụ nne na onye na-akpata nri ka mma.a

Ahụ ike. Dị ka onye bụ nne, ọ dị gị mkpa ilekọta onwe gị, karịsịa ma ọ bụrụ na ị dị ime ma ọ bụ na-enye nwa ara. Ị̀ pụrụ imeziwanye ihe oriri gị? Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị inyom dị ime n’Africa nakwa n’ebe ndịda na ebe ọdịda anyanwụ Esia na-arịa ọrịa ụkọ ọbara. E wezụga ịmịkọrọ ume gị, ụkọ ọbara na-amụba ihe ize ndụ nke e jikọtara ya na ịmụ nwa ma na-emeghekarị ohere maka ịba ịrịa mmadụ. Ọ bụ ezie na anụ ma ọ bụ azụ̀ pụrụ ịdị ụkọ ma ọ bụ dịrị oké ọnụ, àkwá na mkpụrụ osisi ma ọ bụ akwụkwọ nri ndị jupụtara n’iron pụrụ ịdị. Ekwela ka nkwenkwe ụgha kwụsị gị iri nri ndị na-edozi ahụ, ekwekwala ka omenala obodo napụ gị òkè gị ná nri ezinụlọ.b

Inye nwa ara dị mma nye gị nakwa nye nwa gị. Mmiri ara ka ọnụ ala, ka ịdị ọcha, na-edozikwa ahụ karịa ihe ọ bụla e ji edochi anya ha. UNICEF na-agbakọ na a pụrụ izere otu nde ọnwụ ụmụaka kwa afọ ma ọ bụrụ na ndị nne ga-enye ụmụ ọhụrụ ara n’ime ọnwa anọ ruo ọnwa isii mbụ nke ndụ ha. Otú ọ dị, ọ bụrụ na nne nwere ọrịa na-efe efe nke a maara na ọ ga-ebufe ya site na mmiri ara, mgbe ahụ e kwesịrị iji ụzọ ọzọ na-adịghị ize ndụ e si enye nri mee ihe.

Jide n’aka na e nwere ebe kwesịrị ekwesị ikuku si apụ ma ọ bụrụ na ị na-esi ihe n’ime ụlọ gị n’ọkụ na-enwu enwu. “Ma eleghị anya ịbụ onye e kpughere nye anwụrụ ọkụ na gas ndị na-egbu egbu e ji esi nri bụ ihe ize ndụ ahụ ike kasị njọ sitere n’ọrụ a na-arụ nke a maara taa,” ka akwụkwọ bụ́ Women and Health na-adọ aka ná ntị.

Esela ụtaba, n’agbanyeghị nrụgide ọ bụla. Mkpọsa siga nke gbasaruru ebe nile ná mba ndị ka na-emepe emepe na-elekwasị ndị inyom anya, na-agbalị ime ka ha kweta na ise siga bụ ịwa anya. Nke a abụtụghị eziokwu. Ise siga na-emerụ ụmụ gị ahụ, ọ pụkwara igbu gị. A gbakọtara na n’ikpeazụ ụtaba iri ha ahụ na-egbu otu ụzọ n’ime ụzọ anọ nke ndị nile na-ese siga. Ọzọkwa, ndị ọkachamara na-adọ aka ná ntị na ohere onye na-ese siga nke mbụ ya nwere ịghọ onye ụtaba riri ahụ buru nnọọ ibu.

Ịdị ọcha. Ihe nlereanya gị na ndụmọdụ gị banyere ịdị ọcha dị mkpa maka ahụ ike nke ezinụlọ gị. Mbipụta bụ́ Facts for Life na-edepụta usoro ndị bụ́ isi na-esonụ maka ezi ịdị ọcha:

• Jiri ncha na mmiri kwọọ aka gị mgbe ọ bụla i metụchara nsị aka na tupu i metụ nri aka. Jide n’aka na ụmụ gị na-akwọ aka ha tupu ha erie nri.

• Gaa mposi n’ụlọ mposi, na-edebekwa ya ọcha ma na-ekpuchi ya ekpuchi. Ọ bụrụ na nke a ekweghị omume, na-anyụ nsị n’ebe dịpụrụ anya site n’ụlọ gị dị ka o kwere omume, ma lie nsị ahụ ozugbo.—Tụlee Deuterọnọmi 23:12, 13.

• Gbalịa iji mmiri dị ọcha na-emere ezinụlọ gị ihe. Iji mezuo nke a, na-ekpuchi olulu mmiri ekpuchi ma jiri arịa ndị dị ọcha na-ekuru mmiri.

• Ọ bụrụ na ị pụghị inweta mmiri dị mma ọṅụṅụ, sie mmiri n’ọkụ, mgbe ahụ hapụkwa ya ka ọ jụọ oyi tupu ịṅụ ya aṅụ. Ọ bụ ezie na mmiri a na-esighị n’ọkụ pụrụ iyi ka ọ dị ọcha, ọ ka pụrụ ịbụ nke e metọrọ emetọ.

• Cheta na nri a na-esighị esi yikarịrị ka ọ ga-ebufe ọrịa. E kwesịrị ịsacha nri ndị a ga-eri n’esighị n’ọkụ tupu e rie ha, mgbe ahụ riekwa ya ngwa ngwa òkè o kwere omume. E kwesịrị isi ihe oriri ndị ọzọ nke ọma, karịsịa anụ nkịtị na anụ ọkụkọ.

• Debe nri ọcha ma kpuchie ya ekpuchie ka ahụhụ ma ọ bụ ụmụ anụ ghara inwe ike imetọ ya.

• Kpọọ ọkụ ma ọ bụ lie ihe mkpofu si n’ụlọ.c

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ndịàmà Jehova na-ahazi klas ka e si agụ na ka e si ede n’efu dị ka akụkụ nke usoro ihe omume mmụta Bible ha sara mbara.

b Ná mba ụfọdụ, e nwere nkwenkwe ụgha bụ́ na ndị inyom ekwesịghị iri azụ̀, àkwá, ma ọ bụ ọkụkọ mgbe ha dị ime, n’ihi egwu nke imerụ nwa e bu n’afọ ahụ. Mgbe ụfọdụ omenala na-achọ ka nwanyị rie nri e rifọrọ erifọ, ozugbo ndị ikom na ụmụaka ndị nwoke risịrị nri.

c Lee Teta! nke April 8, 1995, peji nke 6-11, iji nwetakwuo ihe ọmụma.

[Foto dị na peeji nke 8]

Ọtụtụ ndị inyom ná mba Ebe Ọdịda Anyanwụ na-arụ ọrụ n’ọfịs

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Ọtụtụ ndị inyom aghaghị ịrụ ọrụ n’ọnọdụ ndị ruru unyi

[Ebe E Si Nweta Foto]

Godo-Foto

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndị nne bụ ndị nkụzi n’ụlọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya