Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Ịbụ Onye Enyi M Kpachigidere?
“Enyi m mere dị ka a ga-asị na ọ bụ ya nwe m. O kweghị m ṅụọ mmiri tọgbọ iko.”—Hollie.
“ONYE na-ahụ n’anya dị [nke] na-arapara n’ahụ karịa nwanne,” ka otu ilu amamihe na-ekwu. (Ilu 18:24) Ọ bụrụkwa na i nwere enyi nke gị na ya nwere otu nkweta ahụ, omume ịkpa ọchị, ma ọ bụ mmasị, unu ga-achọkarị ịnọkọ ọnụ. Otu onye ntorobịa aha ya bụ Caroline na-ekwu, sị: “Ichi anya nke ọbụbụenyi mụ na ụfọdụ ndị n’ime ọgbakọ ndị Kraịst bụ ihe si n’anyị imekọ ihe omume dị iche iche ọnụ pụta.” Dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, Caroline wepụtara otu ọnwa nke o mere atụmatụ itinye hour 60 n’ọrụ izisa ozi ọma. Ndị enyi ya haziri usoro ihe omume ha iji kwadoo ya n’ọrụ a!
Ma ọ bụ ezie na ịnọkọ ọnụ nwere abamuru nke ya, mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịdị ka nke gabigara ókè. Hollie, e hotara ná mmalite, na-eche na otu n’ime ndị enyi ya na-akpachigide ya. Ọ bụghịkwa nanị ya na-enwe mmetụta otú a. Hollie na-ekwu, sị: “Nke ahụ yiri ka ọ na-emekwa ụmụaka ndị ọzọ. Ọ na-afọ nke nta ka ha bụrụ ahụghị ma erighị ruo mgbe oké iwe tiwapụrụ. Mgbe ahụ ha agaghị ekwurịta okwu ruo ọtụtụ izu.”
Nsogbu bụ, ọ dịghị mfe ịgwa enyi gị na i chere na ọ na-akpachigide gị nakwa na ị chọkwuru ohere. I nwere ike ịtụ ụjọ na ị ga-akpasu enyi gị iwe. I nwekwara ike ịtụ ụjọ na ị ga-etinye mmekọrịta unu n’ihe ize ndụ. Otú ọ dị, inye ohere ezi uche dị na ya n’ọbụbụenyi yikarịrị ka ọ ga-enye aka karịa ịkpasu iwe.
Iji maa atụ: N’otu ubi ọha na eze dị na Sydney, Australia, a ghaghị iji chen gbachibido otu nnukwu osisi ogige. N’ihi gịnị? N’ihi na ìgwè ndị nleta ji nwayọọ nwayọọ na-azọsi ájá ya ike ma na-akpagbu mkpọrọgwụ ya. Ọ bụrụ na e chebeghị ya, osisi ahụ gaara anwụ. Otu ihe ahụ pụrụ ịbụ eziokwu banyere ọbụbụenyi. Ịnọkọrịta ọnụ nke ukwuu pụrụ ịkpagbu mmekọrịta. Eze Solomọn dere, sị: “Mee ka ụkwụ gị kọọ ụkọ n’ụlọ mmadụ ibe gị; ka ihe gị wee ghara iju ya afọ, o wee kpọọ gị asị.”—Ilu 25:17.
Mkpa Maka Oge Onwe Onye na Ịnọrọ Iche
N’ihi gịnị ka Solomọn ji kwuo nke a? Otu ihe bụ na anyị nile nwere mkpa maka ụfọdụ oge onwe onye na ịnọrọ iche. Ọbụna Jisọs Kraịst nwere mkpa dị otú ahụ. Ọ bụ ezie na ya na ndị na-eso ụzọ ya na-akpachi anya, site n’oge ruo n’oge, ọ ga-apụ “iche ikpe ekpere.” (Matiu 14:23; Mak 1:35) Aịsak na-atụ egwu Chineke chọtakwara oge ịnọ nanị ya. (Jenesis 24:63) Ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke oge onwe onye dịkwa gị mkpa iji wee mee ihe ndị dị ka ihe omume a na-eme n’ụlọ, ọrụ ụlọ, na ọmụmụ ihe onwe onye gị nke Bible. Ọ bụrụkwa na ndị enyi gị egosi enweghị nchebara echiche site n’ileghara mkpa gị anya n’akụkụ a, iwe pụrụ itiwapụ ngwa ngwa.
Mgbe ahụ, atụla egwu ime ka enyi gị mara mgbe ị chọtụrụ oge ịnọrọ onwe gị. Ebe ịhụnanya ndị Kraịst ‘na-adịghị achọ ihe nke aka ya,’ ọtụtụ mgbe ezi enyi ga-agbalị inwe nghọta. (1 Ndị Kọrint 13:4, 5; Ilu 17:17) “N’oge m na-akwadebe maka ule ikpeazụ m,” ka otu onye ntorobịa dere, “ndị enyi m nyere m nnọọ nkwado ma gosi nghọta. Ọ na-adịrị m mfe ịgwa ha ka ha lawa mgbe m chọrọ oge iji mụọ ihe. Ịgwa ndị enyi m eziokwu dị mfe; ha maara na anyị nile nwere ibu ọrụ.”
Otú ọ dị, Ụkpụrụ Ọma ahụ na-achọ ka i gosi ndị enyi gị otu nchebara echiche ahụ. (Matiu 7:12) Otu onye na-eto eto aha ya bụ Tamara dere, sị: “Ọtụtụ ibu ọrụ m nwere emewo kpọmkwem ka m marakwuo mkpa ọ dị enyi m inwe oge ịnọrọ onwe ya.” Mgbe Tamara nwekwara ọrụ n’ụlọ, ndị enyi ya adịghị agba ya ume iji ọsọ ọsọ mee ha ma ọ bụ hapụ ha ruo mgbe e mesịrị. Kama nke ahụ, Tamara na-ekwu, sị, “ha na-enyekarịrị m aka ịrụ ọrụ m ka anyị wee nwee ike imekọ ihe ọnụ mgbe e mesịrị.” Lee ihe dị oké ọnụ ahịa ndị enyi dị otú ahụ na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha bụ—leekwa otú o si bụrụ iji oge emekọ ihe ọnụ n’ụzọ bara uru!
“Dị Obodobo n’Obi”
E nwere ihe ọzọ mere o ji bụrụ ihe amamihe inyetụ ohere ụfọdụ n’ọbụbụenyi. Mgbe anyị tinyere oge na mmetụta uche anyị nile na nanị otu ọbụbụenyi, anyị nwere ike ileghara mmekọrịta ndị ọzọ dị mkpa anya—dị ka mmekọrịta anyị na ndị mụrụ anyị na ụmụnne anyị na nke anyị na ndị Kraịst ndị ọzọ. Anyị na-akpakwara uto mmetụta uche na nke ime mmụọ anyị ókè nke ukwuu. Bible na-asị: “Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya.” (Ilu 27:17) N’ụzọ doro anya, ị pụrụ inweta nanị ‘mmụcha’ dị nta site n’isoro nanị otu onye na-akpakọrịta—karịsịa mgbe onye ahụ bụ onye ọgbọ gị.
Ya mere Bible na-akatọ ịghọ onye na-ejekwu nanị otu ìgwè, ịkpa ókè, ma ọ bụ ịkpa ókè ná ndị enyi anyị na-ahọrọ. Ọ na-agba anyị ume ‘ịdị obodobo n’obi.’ (2 Ndị Kọrint 6:13) “Ọ bụrụgodị na i nwere mmekọrịta pụrụ iche,” ka akwụkwọ bụ́ Moods and Feelings na-adụ ọdụ, “ọ dị mkpa iwepụta oge ijekwa leta ndị enyi ndị ọzọ.”
Ọ naghị adị mfe mgbe nile itinye ndụmọdụ dị otú ahụ n’ọrụ. Otu onye ntorobịa bụ́ onye Kraịst aha ya bụ Michael na-ekwu, sị: “Mụ na Troy na-emekọ ihe nile ọnụ, ma n’ọgbakọ ma n’ihe omume ọha na eze. A pụghị ikewa anyị ekewa. Mgbe ahụ Onyeàmà ọzọ na-eto eto batara n’ọgbakọ. Mụ na ya chọrọ ijekọ ozi ọnụ dị ka ndị na-ezisa ozi ọma oge nile, ya mere anyị malitere ịnọkọrịta ọnụ.” Gịnị si na ya pụta? “Troy kwụsịrị ịgwa m okwu,” ka Michael na-ekwu, “mgbe m mesịkwara mgbalị na-arụpụtaghị ihe n’idozi okwu, akwụsịrị m ịgwa ya okwu. Nke a gara n’ihu ruo otu afọ.” Ọ na-akọwa ọbụbụenyi ha dị ka nke “iji ekworo na-enwekọrọ ihe.”
Otú ọ dị, ná mmekọrịta dị mma, ndị enyi adịghị emeso ibe ha dị ka ihe onwunwe. Ya mere ọ bụrụ na otu enyi na-eguzogide mgbalị gị ịdị obodobo n’obi, ọ dị unu mkpa inwe nkwurịta okwu sitere n’obi. Ikekwe nanị ihe dị enyi gị mkpa bụ mmesi obi ike na ị ka ji ọbụbụenyi ya kpọrọ ihe. Mee ka o doo anya na unu ga-anọgide na-emekọrịta ihe ọnụ.
N’ezie, ọ pụrụ iwe enyi gị nwa oge ịnakwere echiche ahụ. Dị ka ihe atụ, Zaneta dị afọ 16 nwetụrụ ekworo mgbe ezi enyi ya malitere iso ndị ọzọ na-akpakọrịta. Ma Zaneta na-ekwu na ya meriri mmetụta ndị a, “n’ihi ekpere na ọmụmụ Bible onwe onye.” N’ụzọ dị otú a o nwere ike ịnọgide soro enyi ya na-enwe mmekọrịta chiri anya. Enyi Michael bụ́ Troy merikwara ekworo ndị o nweburu, ha ghọkwara ezi ndị enyi ọzọ. Ikekwe enyi gị ga-emekwa otú ahụ. N’ezie, ka oge na-aga, ịdị obodobo n’obi na-abara onye ọ bụla o metụtara uru. Debbie dị afọ 17 chọpụtara na mgbe ndị enyi ya metere ndị enyi ọhụrụ, “ha na-aghọkarịkwa ndị enyi m.”
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na enyi gị ajụ nnọọ ịnakwere mgbanwe ndị a ná mmekọrịta unu? Ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị ihe ọzọ ị ga-eme ma e wezụga ịgawa nke gị. Otú ọ dị, tupu i kwubie na okwu agwụla, gịnị ma ị jụta echiche ndị mụrụ gị n’okwu ahụ? E kwuwerị, nne na nna na-atụ egwu Chineke kasị bụrụ ezi ndị enyi gị n’ezie. Ha nwekwara ike inwe aro ụfọdụ dị irè nke pụrụ inyere gị aka ịzọpụta ọbụbụenyi ahụ n’emebighị mkpa i nwere maka ohere.
Soro Ndị Enyi Kwesịrị Ekwesị Na-anọkọrịta
Okwu ịdọ aka ná ntị: Ịdị obodobo n’obi apụtaghị ịhọrọ ndị enyi gị aghara aghara. Otu akwụkwọ banyere ọbụbụenyi na-ekwu, sị: “Ọ bụ ihe sitere n’okike ịdị ka ndị gị na ha na-anọkọ ọtụtụ mgbe. Mgbe ụfọdụ nke a pụrụ ime mgbe ị na-amaghị banyere ya. I nwere ike ịmalite iche echiche na ime ihe dị ka ndị ọgbọ gị n’agbanyeghị otú ị pụrụ ịdị na-eche. N’ụzọ dị otú a, ndị òtù ọgbọ gị nwere ike ịdị na-achịkwa gị.” Bible kwutere otu isi ihe a ọtụtụ puku afọ gara aga mgbe o kwuru, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.”—Ilu 13:20.
Mgbe ị nọ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ na-arụ ọrụ, ọ pụrụ ịbụ na ị ghaghị isoro ndị na-enweghị mmasị n’ijere Jehova ozi na-anọkọ. Ma mgbe ị na-ahọrọ ndị enyi gị na ha ga na-akpachi anya, cheta ndụmọdụ Bible bụ́: “Ndị enyi ọjọọ na-ebibi ezi àgwà.”—1 Ndị Kọrint 15:33, Today’s English Version.
Chetakwa na ọbụbụenyi mmadụ na Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, dị mkpa karịa nke mmadụ ọ bụla. Debbie, e hotara ná mmalite, nwere ọtụtụ ezi ndị enyi. Ma ndụmọdụ ya bụ ‘ijide n’aka na Jehova na-ebute ụzọ mgbe nile.’ Abraham oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi mere otú ahụ, Jehova kpọkwara ya “enyi m” (NW) n’ụzọ pụrụ iche. (Aịsaịa 41:8) Tụleekwa nke a: Jehova adịghị ewe iwe na i so ndị enyi gị bụ́ ndị hụkwara ya n’anya na-anọkọ; n’eziokwu, ọ na-akwado ya. Lee aha ezi Enyi ọ bụ!
[Foto dị na peeji nke 23]
Ezi ndị enyi na-amata mkpa ibe ha nwere maka oge ịnọrọ iche