Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Ma Ọ Bụrụ na Ọ Dịghị Egosighachi M Ịhụnanya?
“Ọ na-enye m nsogbu. Amalitewo m ịhụ ya n’anya. Ma amaghị m mmetụta ọ na-enwe n’ebe m nọ. Gịnị ka m ga-eme? Ọ̀ bụ ime ka ọ mara mmetụta m na-enwe? Mbanụ, agaghị m emeli ya! Gịnị ka ndị ọzọ ga-ekwu banyere m?”—Huda.a
HUDA, bụ́ otu nwa agbọghọ bụ́ onye Lebanọn, nwere ịhụnanya n’ebe onye na-egosighachighị ya ịhụnanya nọ. Ọ bụghị nsogbu a na-adịghị ahụkebe. Nwa agbọghọ ọzọ, aha ya bụ Zeina, nwere ahụmahụ yiri nke ahụ. Ọ na-echeta: “Ana m ahụ ya kwa ụbọchị n’ihi na ọ bụ onye agbata obi anyị. Ọ mara ezigbo mma ma na-adọrọ adọrọ. Ya mere amalitere m ịhụ ya n’anya.”
N’ezie, ọ dịghị ihe dị njọ n’inwe mmetụta siri ike n’ebe mmadụ nọ—ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye onye Kraịst pụrụ ịlụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Ilu 5:15; 1 Ndị Kọrint 7:39) Ọ dịghịkwa njọ nwa agbọghọ ịchọ ịlụ di ma nwee ezinụlọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ị malite ịhụ onye ruru eru bụ́ onye na-amaghị banyere—ma ọ bụ na-adịghị egosighachi—mmetụta ndị ị na-enwe n’anya?
Ihe Mgbu nke Ịrịa Ọrịa Ịhụnanya
Dị ka Huda, i nwere ike chee na ị nọ n’etiti oké ọgba aghara mmetụta uche. Oké mkpali mmetụta uche pụrụ ịbụ nke nkụda mmụọ na-agwụ ike sochiri ngwa ngwa. “Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m ka m bụ nwa agbọghọ kasị nwee obi ụtọ n’ụwa, mgbe ụfọdụkwa ọ na-adị m ka m bụ nke kasị nwee mwute,” ka Zeina kwuru. Ịhụnanya a na-egosighachighị pụrụ ịbụ isi iyi nke nchegbu, ehighị ụra abalị, ọbụnakwa ịda mbà n’obi.
Bible na-ekwu n’Ilu 13:12, sị: “Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa.” Mgbe a na-ahụtụdịghịkwa ihe ndị a na-atụ anya ha, ọ pụrụ ịdị na-agbawa obi! Ị pụrụ ịhụ ka ị na-eche banyere onye a mgbe nile, na-enwe oké mmasị ịnụ obere akụkọ ọ bụla banyere ya. Ị pụrụ ichepụta ụzọ dị iche iche isi dọta uche ya ma ọ bụ ihe ndị na-enweghị isi ka gị na ya wee nọrọ. Mgbe ị nọkwa ya n’akụkụ, ọ pụrụ isiri gị ike ịkpazi àgwà.
Ọtụtụ ihe pụrụ ịdị mgbagwoju anya karịsịa mgbe onye ahụ i nwere mmetụta ịhụnanya n’ebe ọ nọ na-elebara gị nnọọ anya mgbe ụfọdụ n’oge ndị ọzọkwa na-emezi ka a ga-asị na o nweghị mmasị ọ bụla n’ebe ị nọ. Ọ bụrụkwa na ị hụ ya ka ọ na-elebara nnọọ onye ọzọ anya ma ọ bụ na-egosi ndị ọzọ obiọma na nkwanye ùgwù efu, ọ pụrụ ịkpali ekworo n’ime gị. Bible na-ekwu, sị: “Ihe na-enweghị obi ebere ka ọnụma bụ, iju mmiri ka iwe bụkwa; ma ònye ga-eguzo n’ihu ekworo?”—Ilu 27:4.
Huda kwetara: “Enwere m ajọ ekworo a na-apụghị ịkọwa akọwa nke na a sị na m agbanweghị, ara gaara agba m.” Mmetụta nke ịsọ onwe onye oyi pụkwara isi na ya pụta. Huda kwuru, sị: “Atara m onwe m ụta maka ịmalite ịhụ onye na-ahụghị m n’anya n’anya na maka ịta onwe m ahụhụ.”
Ọ bụ ezie na n’ọtụtụ ala Ebe Ọdịda Anyanwụ nwa agbọghọ pụrụ inwere onwe ya ijekwuru nnọọ nwa okorobịa ma kwupụta mmetụta ya, ọ bụghị ụmụ agbọghọ nile ga-achọ ime otú ahụ. N’ọdịbendị ụfọdụkwa, a ga-ewere ya ịbụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ọbụna ihe dị njọ nwa agbọghọ ibu ụzọ mee otú ahụ. Mgbe ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ị malitewo ịhụ onye na-adịghị egosighachi gị ịhụnanya n’anya?
Iji Nlezianya Nyochaa Mmetụta Gị
Nke mbụ, gbalịa inyocha mmetụta gị n’ụzọ dị nwayọọ na n’ụzọ ziri ezi. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye na-atụkwasị obi n’obi nke aka ya, onye ahụ bụ onye nzuzu.” (Ilu 28:26) N’ihi gịnị? N’ihi na ọtụtụ mgbe mkpebi nke obi anyị na-ehie ụzọ. (Jeremaịa 17:9) Ihe e chekwara na ọ bụ ịhụnanya na-aghọkarị ihe ọzọ. “Nlebara anya na ịhụnanya dị m mkpa,” ka Huda kwetara. “Mmadụ ịhụ m n’anya na ilekọta m dị m mkpa. Site n’oge m bụ nwata enwetabeghị m ịhụnanya. Nke ahụ metụtara m nke ukwuu.” Ọ bụrụ na i si n’ọnọdụ ezinụlọ ebe a na-adịghị ahụ n’anya ma ọ bụ ebe a na-emetọ mmadụ, ị pụkwara inwe agụụ maka ịhụnanya na ịbụ onye a nabatara. Ma mmekọrịta ịhụnanya ọ̀ bụ ngwọta ya n’ezie?
N’ụzọ dị mwute, ndị na-enweghị obi ụtọ, ndị owu na-amakwa, adịghị aghọkebe ezigbo ndị òtù ọlụlụ. Ha na-aba n’alụmdi na nwunye na-atụ anya inweta ihe ha chere dị ha mkpa nke ukwuu. Otú ọ dị, ezi obi ụtọ na-abịa site n’inye ihe, ọ bụghị ịnata ihe. (Ọrụ 20:35) Nwanyị na-adịkwa nnọọ njikere karị ịnagide alụmdi na nwunye ma ọ bụrụ na onwe ya na-eju ya afọ n’ụzọ ezi uche dị na ya ma ‘ghara ile ihe nke aka ya anya, kama na-elekwa ihe nke mmadụ ibe ya anya.’—Ndị Filipaị 2:4.
Mgbe ị na-enwe nrụgide ịlụ di, n’ụzọ dị mfe ị pụrụ imeghachibiga omume ókè n’ebe nlebara anya ọ bụla sitere n’aka onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nọ. Mgbe ụfọdụ ọ bụ ndị enyi na ezinụlọ na-akwalite ọchịchọ nwa agbọghọ maka mmekọrịta ịhụnanya. Ụfọdụ ọha mmadụ na-emesi ike n’ebe ọ dị ukwuu nwata nwanyị ịlụ di ozugbo o ruru ogo ịlụ di. Akwụkwọ bụ́ Women in the Middle East na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na nwanyị eruwela afọ iri atọ ma ka nọrọ n’enweghị di, ọ na-aghọ ihe na-akpatara ezinụlọ ya oké nchegbu.” N’ihi na o metụtara nsọpụrụ ezinụlọ, nna pụrụ ịnwa ike ụmụ ya di na nwata dị ka o kwere mee.
Ka o sina dị, ụkpụrụ Bible na-ebute ọdịbendị ụzọ. Akwụkwọ Nsọ na-agbakwa ndị na-eto eto ume ichere ruo mgbe ha “gafere ntoju ntorobịa” tupu ịlụ di ma ọ bụ nwunye. (1 Ndị Kọrint 7:36, NW) Ya mere, gịnị ma ọ bụrụ na ọ dị gị ka ndị enyi gị ma ọ bụ ndị mụrụ gị hà na-arụgide gị n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Bible na-agwa anyị na nwa agbọghọ Shulam ahụ na-atụ egwu Chineke gwasiri ndị enyi ya ike ‘ka ha ghara ịkpọte, ghara imekwa ka ịhụnanya teta, ma ọlị, ruo mgbe ọ ga-atọ ya ụtọ.’ (Abụ Nke Abụ 2:7) Ikekwe ikwupụta uche gị n’ụzọ siri ike otú ahụ ga-arụpụta ihe, karịsịa ma ọ bụrụ na ndị mụrụ gị na-atụ egwu Chineke.
Iche Eziokwu Ahụ Ihu
Ka o sina dị, ị ghaghị imesị chee eziokwu banyere onye ahụ i chere na ị hụrụ n’anya ihu. Ime otú ahụ nwere ike ọ gaghị adị mfe, o nwekwara ike ịkpatara gị ihe mgbu n’ụzọ mmetụta uche. Ma Akwụkwọ Nsọ na-adụ ọdụ, sị: “Zụta eziokwu, erekwala ya.” (Ilu 23:23) Jụọ onwe gị, ‘M̀ nwere ihe ndabere ọ bụla ezi uche dị na ya maka inwe ịhụnanya? Olee ókè m maruru onye a n’ezie? Gịnị ka m maara banyere uche, mmetụta, echiche, àgwà, ụkpụrụ omume, ikike, nkà, na ụzọ ndụ ya?’
Ihe ọzọ a ga-atụle bụ ma onye ahụ ò kwupụtawo ezi mmasị ọ bụla n’ebe ị nọ ka ọ bụ na o kwupụtabeghị. Ọtụtụ mgbe, a na-aghọtahie obiọma ma ọ bụ omume enyi nkịtị. “Ọ na-anwa igosi obiọma,” ka Huda kwuru, “ma a ghọtara m okwu na omume ya dị ka mmasị onwe onye n’ihi na m chọrọ nke ahụ. Mgbe m ghọtasịrị na o nweghị mmasị n’ebe m nọ, ihere mere m. Echere m na erughị m eru inweta mmasị ya nakwa na ọ dị ihe na-eme m.”
Ikekwe i nwewo mmetụta dị otú ahụ n’ihi ahụmahụ yiri nke ahụ. Otú ọ dị, ghọta na n’ihi na ị masịghị nnọọ onye a apụtaghị na ị gaghị amasị nnọọ onye ọzọ. E kwuwerị, nke a abụghị nanị nwa okorobịa nọ n’ụwa!
Imeri Ihe Mgbu Ahụ
Ya bụrụgodị otú ahụ, ọ pụrụ iwetụ oge iji merie ihe mgbu gị. Gịnị pụrụ inye aka? Otu bụ ikwupụta obi gị ma gwa “ezi enyi”—onye Kraịst tozuru okè bụ́ onye ga-aṅa gị ntị, ihe nzuzo gị. (Ilu 17:17, NW) Ikekwe e nwere nwanyị metụworo okenye nọ n’ọgbakọ nke ị pụrụ iso kwurịta okwu. Nne na nna bụ́ ndị Kraịst pụkwara ịrụ ọrụ dị mkpa n’inye enyemaka na nkwado. Zeina na-echeta: “Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst nọ n’ọgbakọ anyị chọpụtara nsogbu m, o tozukwara okè inyere m aka. Ahụ ruru m ala mgbe mụ na ya nọ, agwakwara m ya ihe nile. Ọ gbara m ume ịgwa ndị mụrụ m okwu. Ya mere agwara m ha okwu, ha ghọtakwara m ma nyere m aka.”
Chetakwa ike nke ekpere. (Abụ Ọma 55:22) Huda na-asị: “Ekpere m kpegaara Jehova nyeere m aka ichezọ ihe mgbu m. Agụkwara m isiokwu ndị na-enye aka dị na magazin Ụlọ Nche na Teta!” Tụkwasị na nke ahụ, ọ dị mkpa ka ị ghara ikewapụ onwe gị iche. (Ilu 18:1) Soro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe. “Ihe ọzọ nyeere m aka,” ka Zeina na-echeta, “bụ na anọgidere m na-eji ọrụ n’aka, ghọọkwa ọsụ ụzọ [onye na-ezisa ozi ọma oge nile]. Amụbakwara m mkpakọrịta mụ na ndị inyom ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. Nke a nyeere m aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ.”
Bible na-ekwu banyere “mgbe ịhụ n’anya,” ọ pụkwara ịbụ na ka oge na-aga ị ga-ahụ onye ga-ahụkwa gị n’anya. (Eklisiastis 3:8) Jehova Chineke kenyere n’ime ụmụ mmadụ ọchịchọ nke ịnụ ụtọ obi ụtọ nke ịhụnanya alụmdi na nwunye, ị pụkwara imesi nweekwa ike inweta ndokwa ọma a nke Onye Ukwu Mere anyị. Ka ọ dịgodị, gịnị ma i rite uru kasịnụ n’afọ ndị ị nọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye, ndị ‘nchegbu na-adịghị,’ dị ka Pọl onyeozi na-ekwu? (1 Ndị Kọrint 7:32-34) Otú o sina dị, ị pụrụ ijide mmezu nke nkwa Bible n’aka: “Ị [Jehova] na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.”—Abụ Ọma 145:16.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ iji chebe ihe dịịrị nanị ndị o metụtara.
[Foto dị na peeji nke 17]
Mgbe ụfọdụ, a na-aghọtahie obiọma