Ịwa Ahụ N’ejighị Ọbara—A Mata Abamuru Ya
NA 1996 Kọleji Ndị Eze Maka Ndị Na-awa Ahụ nke England bipụtara otu akwụkwọ nta a kpọrọ Code of Practice for the Surgical Management of Jehovah’s Witnesses. N’ime akwụkwọ nta ahụ ndị ahụ na-awa ahụ na-ekwu, sị: “Ihe ize ndụ nke mmịnye ọbara na-eme ka ọ dị mma ịtụle usoro ọgwụgwọ ọzọ mgbe ọ bụla ọ pụrụ ikwe mee.”
Magazin bụ́ AHA NEWS, bụ́ nke Òtù Ụlọ Ọgwụ America na-ebipụta, kọkwara ihe mere abamuru nke ịwa ahụ n’ejighị ọbara jiworo bụrụ nke a matara. “Ihe malitere dị ka nkwenkwe okpukpe na-aghọ ọgwụgwọ a na-ahọrọ na nkà na ụzụ nwere ọganihu,” ka magazin ahụ a na-ebipụta kwa izu kwuru. “Ịgwọ ọrịa na ịwa ahụ n’ejighị ọbara, bụ́ nke nkwenkwe Ndịàmà Jehova kwaliri n’otu akụkụ, na-agate aka na-agabiga mkpa nke ọha mmadụ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe banye n’ọnụ ụlọ ịwa ahụ ná mba a dum.”
Ihe mere ọtụtụ ndị dọkịta ji na-akwado ịwa ahụ n’ejighị ọbara bụ isiokwu pụtara ná mbipụta nke ọnwa atọ ikpeazụ nke 1997 nke akwụkwọ na-enyere magazin bụ́ Time aka. “Ụjọ ọrịa AIDS bụ nanị otu ihe kpatara ya,” ka isiokwu ahụ kwuru. Isiokwu ahụ kọrọ kpọmkwem banyere ọrụ a na-arụ n’Ụlọ Ọrụ New Jersey Na-ahụ Maka Ọganihu nke Ịgwọ Ọrịa na Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara nke Ụlọ Ọgwụ Englewood, dị n’Englewood, New Jersey.
Time kwuru, sị: “Ụlọ ọrụ ahụ nọ n’isi n’ime ihe karịrị 50 na United States ndị na-awa ahụ ugbu a n’ejighị ọbara. N’ejitụghịdị ọbara ọ bụla e nyere enye eme ihe, ha na-ewepụta usoro ịwa ahụ dị iche iche bụ́ nke gaara agụnye mmịnye ọbara, ya na ụzọ ịwa ahụ ndị na-ebelata n’ụzọ dị ukwuu, ma ọ bụ nke na-afọdụ nke nta ka ọ kwụsị ọbara ịgbafusi n’ahụ.”
Ọ Dị Irè, Ọ Dịghịkwa Ize Ndụ
Okwu mmalite nke isiokwu Time kọrọ ahụmahụ Henry Jackson, bụ́ onye ọbara dị ukwuu gbara n’ime ahụ nke wụfuru pasent 90 nke ọbara ya ma mee ka ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri ahụ hemoglobin ya daa ruo gram 1.7 n’ime desilita ọ bụla bụ́ nke na-eyi ndụ egwu. E si n’ụlọ ọgwụ New Jersey ọzọ, nke na-agaghị agwọ ya n’ejighị mmịnye ọbara mee ihe kpọfee Jackson n’Ụlọ Ọgwụ Englewood.
N’ụlọ ọgwụ Englewood, n’okpuru nlekọta nke Dr. Aryeh Shander, e nyere Jackson “ngwakọta nke ihe ndị na-akwalite iron na vitamin, tinyere ‘ọ̀tụ̀tụ̀ dị ike’ nke ọgwụ na-akwalite ọbara, mmiri ọgwụ aka mere bụ́ erythropoietin, nke na-akpali ụmị ọkpụkpụ imepụta mkpụrụ ndụ ọbara uhie. N’ikpeazụ, a gbanyere ya mmiri ọgwụ n’akwara iji kwalite ntakịrị nrugharị nke ọbara ka fọdụụrụ ya n’ahụ.”
Time kọrọ na n’ụbọchị ole na ole mgbe e mesịrị, “ụlọ ọgwụ nke mbụ ahụ kpọrọ na fon ịjụ ma Jackson ọ nwụọla. N’iji afọ ojuju a na-ezoghị ezo, Shander gwara ha, sị: ‘Ọ bụghị nanị na ọ nwụghị, kama ahụ adịla ya mma, o ruwokwa mgbe ọ ga-ala, n’oge na-adịghị anya ọ ga-amalitekwa ime ihe ndị ọ na-emebu.’”
N’ajụjụ ọnụ a gbara ya na telivishọn na November 28, 1997, Dr. Edwin Deitch, bụ́ onye ntụzi ahụ ike na ọgwụ maka usoro ejighị ọbara eme ihe n’Ụlọ Ọgwụ Mahadum, dị na Newark, New Jersey, kọwara otú ime nnyocha banyere ịwa ahụ n’ejighị ọbara si malite: “Ndịàmà Jehova . . . mere mgbalị dị ukwuu ịnwa ịchọta ndị ga-awa ahụ n’ejighị ọbara. Ụfọdụ n’ime ihe ndị a chọpụtara ná nnyocha ndị ahụ gosiri na ha mere nke ọma karịa ka a tụrụ anya ya, [karịa] ndị naara ọbara.”
Dr. Deitch gbakwụnyere, sị: “Ọbara pụrụ ibelata ikike usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ ma kpata nsogbu nke ibute ọrịa mgbe a wasịrị ahụ; ọ pụrụ ịmụba ihe ize ndụ nke mmadụ ịrịa ọrịa cancer ugboro ugboro, ya mere ọbara, ọ bụ ezie na ọ dịbu mma n’ọnọdụ ụfọdụ, na-aghọ nke nwere ihe dị njọ.” Banyere ịwa ahụ n’ejighị ọbara, Dr. Deitch kwubiri, sị: “O doro anya na ọ na-akwalite mgbake onye ọrịa n’enweghị nsogbu dị ukwuu, [ọ] na-ewekwa ego dị ala. N’ihi ya kwa, ọ bara uru n’ezie n’ọnọdụ nile.”
N’ihi ya, dị ka Time kwuru, “ọtụtụ ndị ọrịa na-achọsi nhọrọ ndị na-adịghị ize ndụ na ndị dị irè karịa mmịnye ọbara ike.” Magazin ahụ kọkwara, sị: “Dị ka ụfọdụ atụmatụ e mere gosiri, 25% nke mmịnye ọbara e mere na United States adịghị mkpa. E nwekwara ihe ndị na-egosi na ndị ọrịa apụghị ịnakwere ọ̀tụ̀tụ̀ hemoglobin dị elu dị ka e cheburu nakwa na ndị na-eto eto karịsịa nwere ọbara e chekwara echekwa n’ahụ ha. . . . [Shander] kwenyesiri ike na izere ọbara bụ nhọrọ kwesịrị ekwesị na nke ka mma nye ihe ka ọtụtụ ndị ọrịa.”
Ọ bụ ezie na ibute ọrịa site ná mmịnye ọbara bụ ihe ize ndụ bụ́ isi, e nwere ndị ọzọ. “Ọbara e chekwara echekwa, mgbe e mechara ka ọ jụọ oyi ma chekwaa ya, adịghị enwe ikike ọbara ọhụrụ nwere nke ibugharị ikuku oxygen,” ka Dr. Shander kọwara. “Anyị ka na-amalite ịghọta ihe anyị na-eme mgbe anyị mịnyere mmadụ ọbara.”
“Ụkpụrụ E Ji Atụ Ihe”
“N’ikpeazụ,” ka Time kwubiri, “e nwere ọnụ ahịa ya: n’ihe dị ka $500 maka otu mmịnye ọbara, tinyere ego ntụkwasị ndị ụlọ ọgwụ, ngụkọta nke ụgwọ a ga-akwụ na-eru n’agbata $1 ijeri na ijeri $2 kwa afọ, bụ́ nke karịrị ihe mere a ga-eji atụle ụdị ọgwụgwọ ọzọ.” Ego buru oké ibu nke mmịnye ọbara na-efu yiri ugbu a ka ọ bụ ihe bụ́ isi mere ịwa ahụ n’ejighị ọbara jiworo ghọọ ihe a na-anakwere n’ebe nile.
Sharon Vernon, bụ́ onye ntụzi nke Ụlọ Ọrụ Maka Ịgwọ Ọrịa na Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara na St. Vincent Charity Hospital, dị na Cleveland, Ohio, kwuru banyere ịgwọ ndị ọrịa n’ejighị ọbara: “Ọ na-aba ụba n’ihi na ndị dibịa na-aghọta na ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara bụ ụkpụrụ e ji atụ ihe n’ebe a na-ebelata mmefu ego. Ahụmahụ anyị abụwo na ọbụna ụlọ ọrụ inshọransị ndị na-adịghị ihe jikọrọ anyị na ha, na-ezitere anyị ndị mmadụ, n’ihi na ọ na-echebere ha ego.”
N’ụzọ doro anya, ndị ọrụ ahụ ike na ọgwụ na-amata ịwa ahụ n’ejighị ọbara n’ike n’ike, nke ahụ bụkwa n’ihi ọtụtụ ihe.
[Igbe dị na peeji nke 19]
Mkpebi Ndị Ụlọikpe Mere na Nso Nso A
Mkpebi abụọ ndị ụlọikpe mere na steti nke Illinois, U.S.A., na November na December nke 1997 dị ịrịba ama. Na nke mbụ, a kwụrụ Mary Jones, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ego iti aka n’obi dị $150,000 n’ihi na a mịnyere ya unit ọbara abụọ na 1993 n’agbanyeghị ọjụjụ doro anya ọ jụrụ ụdị ọgwụgwọ a. Nke bụ ọnụ ọgụgụ ego kasị ukwuu nke Onyeàmà natatụworo maka ihe mgbu mmetụta uche o nwere n’ihi mmịnye ọbara ọ na-achọghị.
Okwu ikpe nke abụọ metụtara Onyeàmà bụ́ Darlene Brown nke dị ime mgbe ahụ, bụ́ onye a mịnyere ọbara n’ike n’ihi nwa o bu n’afọ dị izu 34. Na December 31, 1997, Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe nke Illinois kọwara mkpebi ikpe ya site n’ikwu na “mmịnye ọbara bụ usoro ọgwụgwọ na-awakpo awakpo nke na-emebi ezi ahụ ike nke onye toruworo ogo mmadụ.” Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe ahụ chịkọtara mkpebi ikpe ya site n’ikwu na “n’okpuru iwu nke Mba a, . . . anyị apụghị ịmanye nwanyị dị ime ibu ibu ọrụ nke iwu chọrọ ka o wee kwenyere usoro ọgwụgwọ na-awakpo awakpo.”
Na February 9, 1998, Ụlọikpe Dị Elu nke Tokyo gbanwere mkpebi ikpe nke ụlọikpe ka ala, bụ́ nke kpebiri na otu dọkịta mere ihe ziri ezi n’ịmịnye Misae Takeda ọbara mgbe a na-awa ya ahụ na 1992. Ụlọikpe Dị Elu ahụ kwupụtara na “e kwesịrị ịkwanyere ikike onye ọrịa ahụ nwere ịhọrọ ọgwụgwọ ùgwù. Ọ bụ ihe iwu na-akwadoghị ịmịnye ya ọbara.” A kwụrụ Misae Takeda ego iti aka n’obi dị yen 550,000 ($4,200).