Ịhụnanya M Hụrụ Ụwa Ga-ezu Ezu Ruo Mgbe Ebighị Ebi
Dị ka Dorothy Connelly Si Kọọ
Mgbe m bụ obere nwa, a gwara m na m ga-aga hel n’ihi na abụ m onye agbụrụ Aborigine. Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, na 1936, anụrụ m otu okwu Bible e tinyere na tepụ nke gbanyụrụ ọkụ hel ahụ ma kpalie olileanya n’ime m. Olileanya ahụ na-enwu enwu ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Tupu mụ akọwaa ihe kpatara ya, ka m kọọrọ unu banyere onwe m.
A MỤRỤ m ihe dị ka n’afọ 1911. M na-asị “ihe dị ka” n’ihi na n’oge ndị ahụ ndị agbụrụ Aborigine adịghị enye onwe ha nsogbu ma ọlị maka akara ụbọchị na satifiketi ọmụmụ. Ndị mụrụ m bụ ndị na-arụsi ọrụ ike, na-atụ egwu Chineke. Anyị biri n’obodo nta bụ Springsure, dị nso n’Ugwu Carnarvon mara mma, jupụtara na nkume, nke dị n’etiti Queensland, Australia.
Otu ezinụlọ ndị ọcha zụlitere papa m n’okpukpe Roman Katọlik. Ma, ndị mụrụ m bụ́ ndị agbụrụ Aborigine kụnyere n’ime m omenala obodo ha na ịhụnanya maka ụwa. Anyị chụrụ nta anụ ọhịa kangaroo, emu, mbe mmiri, na agwọ ma gbuo azụ̀ na witchetty grub (nnukwu egú a na-eri eri). Ma erighị m emu ma ọlị. N’ezinụlọ anyị, ọ bụ nanị m ka a machibidoro iwu iri ya n’ihi na ọ bụụrụ m ihe nnọchianya nke ndị nna nna m ha. Dị ka ọdịnala ma ọ bụ “Oge Nrọ” ndị agbụrụ Aborigine si dị, onye nke ọ bụla si n’ebo a nwere ihe nnọchianya nke ndị nna nna ya ha, ezinụlọ na ebo na-ahụ na e debere mmachibido iwu nke ihe ahụ.
Ọ bụ ezie na nkwenkwe ihe nnọchianya nke ndị nna nna gbanyere mkpọrọgwụ na nkwenkwe ụgha, ịhụ na e debere nsọ ala a bụ ihe ncheta nke ịdị nsọ nke ndụ. Ndị agbụrụ Aborigine egbughị anụ dị ka ihe egwuregwu. Ana m echeta ịkwụrụ ọtọ kpọnwụọ n’ihi oké iwe papa m were mgbe o jidere m ka m na-atụkasị ụkpara ndị dị ndụ n’oge m bụ obere nwa. “Nke ahụ jọgburu onwe ya!” ka o tiri ná mkpu. “Ị́ maghị na Chineke kpọrọ obi ọjọọ asị? Olee otú ọ ga-esi masị gị ma ọ bụrụ na mmadụ emee gị ya?”
Anyị nwere ọtụtụ nkwenkwe ụgha. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa nzá (obere nnụnụ) egwuo egwu na nso nso ogige anyị, ọ pụtara akụkọ ọjọọ; ma ọ bụ ọ bụrụ na ikwiikwii ebekwasị n’elu úkwù osisi e gbuturu egbutu dị nso n’oge ehihie, anyị kwenyere na ọ pụtara na mmadụ gaje ịnwụ. A na-ewerekwa ụfọdụ nrọ dị ka ihe àmà ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, ịhụ mmiri apịtị ná nrọ pụtara na otu onye n’ezinụlọ na-arịa ọrịa. Ma ọ bụrụ na mmiri ahụ na-asọpụta apịtị, mgbe ahụ a na-ewere ya na mmadụ anwụọla. N’eziokwu, anyị bụ ndị Katọlik, ma nke a ewepụghị nkwenkwe ụgha nile nke agbụrụ anyị.
Ezinụlọ m nọgidekwara na-asụ asụsụ ndị agbụrụ Aborigine anyị. Otú ọ dị, ugbu a ọ bụ otu n’ime ọtụtụ asụsụ ndị fọrọ nke nta ka a kwụsị ịsụ ha. Ma, enwere m ike ịsụ ya mgbe ụfọdụ mgbe m na-agwa ndị ọzọ banyere Bible. Otú ọ dị, m na-ejikarị Bekee ma ọ bụ brokin nke obodo anyị eme ihe.
Ọzụzụ Bara Uru M Natara na Nwata
Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri, ezinụlọ anyị biri n’ugbo ebe a na-azụ ehi, dị ihe dị ka kilomita 30 site na Springsure. Kwa ụbọchị m na-eji ụkwụ gaa kilomita ole na ole iji ruo n’ụlọ dị n’ugbo ahụ iji rụọ ọrụ ụlọ dịịrị m. Otu obere bọket mmiri ara ehi na otu ogbe bred bụ ụgwọ ụbọchị m. Ezinụlọ anyị biri n’obere ụlọ e ji mkpo osisi rụọ, bụ́ ụdị ụlọ ndị agbụrụ Aborigine na-arụkarị. Mgbe ọ bụla mmiri zoro, anyị ga-ehi ụra n’ọgba ndị dị nso n’abalị ahụ. M̀ lere ụzọ ndụ a dị mfe anya dị ka ihe isi ike? Ee e. Ọ bụwo ụzọ ndụ nke ndị agbụrụ Aborigine ruo ọtụtụ narị afọ, anyị nakwekwaara ya.
N’eziokwu, obi dị m ụtọ na abụghị m ada akụ̀, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, nakwa na enwere m nne na nna na-ahụ n’anya bụ́ ndị nyere m ọzụzụ, mere ka m rụsie ọrụ ike, kụzikwaara m otú e si eji ala akpata nri. Na 1934, ntakịrị oge mgbe anyị kwagasịrị n’otu ala ọha dị nso na Woorabinda, Queensland, ahapụrụ m ụlọ na nke mbụ ya ma gaa n’ebe ọdịda anyanwụ ịrụ ọrụ n’ugbo ebe a na-azụ ehi na atụrụ dị ka odibo na onye e goro ego ịrụ ọrụ ọ bụla. N’ikpeazụ, ọrụ bugara m n’ebe ọwụwa anyanwụ, kpọmkwem ná mpụta obodo ukwu bụ́ Rockhampton dị n’ụsọ oké osimiri. N’ebe ahụ ka m zutere di m nwụworo anwụ ugbu a, bụ́ Martin Connelly, nwa onye Ireland. Anyị lụrụ na 1939.
Ịmụta Eziokwu Bible
Ana m akwanyere Bible ùgwù dị omimi mgbe nile. Mgbe m bụ onye ntorobịa, nwanyị na-elekọta ugbo ahụ a na-azụ ehi ga-akpọkọta anyị bụ́ ụmụntakịrị—ndị agbụrụ Aborigine na ndị ọcha—ma na-akọrọ anyị akụkọ banyere Jisọs. N’otu oge, ọ kọwara ihe okwu Jisọs bụ́: ‘Egbochila ụmụntakịrị ịbịakwute m’ pụtara. (Matiu 19:14, King James Version) Na nke mbụ ya kemgbe a gwara m na a mara m ikpe ịga hel, enwetụrụ m olileanya.
Ka e mesịrị anụrụ m okwu ahụ e tinyere na tepụ, nke e hotara ná mmalite, banyere adịghị ọkụ nke hel. Ọ bụ ezie na nke ahụ mere ka m malite iche echiche, ezuteghị m Ndịàmà Jehova ọzọ ruo na 1949. Mgbe ahụ anyị bi na Emerald, dị ihe dị ka kilomita 250 n’ebe ọdịda anyanwụ Rockhampton. Onye bịara na nke anyị, bụ́ R. Bennett Brickell,a sooro anyị kwurịta ihe banyere Bible. Mgbe nke ahụ gasịrị, ụlọ anyị ghọrọ ebe obibi Ben mgbe ọ bụla ọ bịara n’ógbè anyị. Anyị nile, gụnyere Martin na ụmụ anyị anọ, na-akwanyere ya ùgwù n’ụzọ dị omimi. Ozi Bible amasịghị Martin, ọ bụ ezie na ọ na-egosikarị Ndịàmà obiọma, na-elekwa ha ọbịa, karịsịakwa Ben.
Ben nyere m ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, ma e nwere otu nsogbu gbara ọkpụrụkpụ—apụghị m ịgụ ihe. N’ihi ya, Ben ji ndidi gụọrọ mụ na ụmụaka ndị ahụ Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, na-akọwa ihe ọ gụrụ ka ọ na-agụ ya. Lee ka o si dị iche n’ụzọ na-enye ume ọhụrụ n’ebe onye ụkọchukwu nọ bụ́ onye, ozugbo o mechara ihe omume okpukpe ndị e ji emeju iwu, adịghị ewepụta ọbụna minit ise iji kụziere anyị otú e si agụ ihe! Ben gosiri anyị site na Bible na ọ bụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya malitere ọtụtụ nkwenkwe ụgha ndị jichiworo ihe a kpọrọ mmadụ, gụnyere ndị obodo anyị. Lee ka m si malite inwe ekele maka okwu Jisọs bụ́: “Eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu”!—Jọn 8:32.
Obi tọrọ m ụtọ ịmụta nzube Chineke nke inwe paradaịs elu ala maka ndị na-erubere ya isi. Karịsịa, amalitere m inwe agụụ maka mbilite nke ndị nwụrụ anwụ; mama m nwụrụ na 1939, papa m nwụkwara na 1951. Ana m atụkarị anya ụbọchị mgbe m ga-enwe ike ịmakụ ha ma nabataghachi ha n’ụwa nke ha hụrụ n’anya nke ukwuu. Leekwa obi ụtọ ọ ga-abụ ịkụziri ha banyere Jehova Chineke na Alaeze ya!
Onye Na-amaghị Akwụkwọ Na-ekwusa Ozi ọma
Ka ihe ọmụma m nke Bible mụbawanyere, achọrọ m isoro ndị ọzọ kerịta ya. Esooro m ndị ikwu m na ndị enyi m kwurịta ya, n’otu mgbe ahụkwa achọrọ imekwu ihe. Ya mere oge ọzọ Ben bịara Emerald, achịkọọrọ m ụmụ m ngwa ngwa, anyị nile sokwaara ya gaa ime nkwusa. O gosiri m ụzọ dị mfe e si agwa mmadụ okwu, kụziekwara m ka m dabere na Jehova site n’ekpere. Aghaghị m ikweta na ụzọ m si agwa mmadụ okwu, agaghị nnọọ were were, ma o sitere m n’obi.
Nke mbụ, agwara m ndị nwe ụlọ na apụghị m ịgụ ihe; nke abụọ kwa, agwara m ha ka ha gụọ akụkụ Bible ndị m rụtụụrụ ha aka. Eburuwo m akụkụ Bible ndị a n’isi. Ụfọdụ na-eji ijuanya ele m anya n’obodo a ndị ọcha ka n’ọnụ ọgụgụ, ma ndị mmadụ adịghị akparịkarị mmadụ. Ka oge na-aga, amụtara m ịgụ ihe. Lee ka nke a si kwalite obi ike m na ọnọdụ ime mmụọ m!
Mgbakọ Mbụ M Gara
Na March 1951, ebe m rarawooro ndụ m nye Jehova, erutere m n’ihe abụọ ọzọ dị ịrịba ama ná ndụ m: baptism ime mmiri na mgbakọ Ndịàmà Jehova nke mbụ m gara. Ma nke ahụ pụtara ịga obodo ukwu bụ́ Sydney—atụmanya na-akụda mmụọ nye nwa agbọghọ si ime obodo. Ọzọkwa, enweghị m ego ụgbọ okporo ígwè. Ya mere, gịnị ka m pụrụ ime?
Ekpebiri m ịgba chaa chaa iji nweta ego ụgbọ m. ‘Ana m eme ihe a maka Jehova,’ ka m chere, ‘n’ihi ya eji m n’aka na ọ ga-enyere m aka irite ihe.’ Mgbe a na-atụchala kaadị ugboro ole na ole, ọ dị m ka o nyeworo m aka, n’ihi na m nwere ego zuru ezu iji kwụọ ego ụgbọ ọgịga na ọlụlọ.
Ben maara banyere atụmatụ m ịga Sydney, ya mere oge ọzọ ọ bịara, ọ jụrụ m ma m nwere ego zuru ezu. “Eenụnụ!” ka m zaghachiri. “Enwetara m ego ụgbọ okporo ígwè site n’ịgba chaa chaa iji nweta ya.” Ihu ya gbarụrụ, amatakwara m ozugbo na ekwuwo m ihe na-adịghị mma. Ya mere n’ịgọpụ onwe m ngwa ngwa, agbakwụnyere m, sị: “Gịnị na-emedị gị? Ezughị m ya ezu!”
Mgbe Ben kụjụchara, n’ụzọ obiọma ọ kọwara ihe mere ndị Kraịst na-adịghị agba chaa chaa ma gbakwụnye, n’ụzọ na-emesi obi ike, sị: “Ma ụta adịghịrị gị. Agwaghị m gị.”
E Mere Ka Ahụ Ruo M Ala
Mgbakọ ụbọchị anọ ahụ, March 22-25, 1951, bụ nke mbụ m sooro Ndịàmà buru nnọọ ibu mekọrịta ihe. Ebe m maara nanị Ben na mmadụ ole na ole ndị ọzọ, ejighị m n’aka otú a ga-esi nabata m. Ya mere ị pụrụ iche echiche aha obi ụtọ m nwere ịbụ onye ndị ga-abụ ụmụnna ime mmụọ m, bụ́ ndị na-egositụghị ajọ mbunobi, nabatara n’ụzọ na-ekpo ọkụ. E nwere m ahụ iru ala na ntụsara ahụ n’ezie.
M ka na-echeta mgbakọ ahụ nke ọma, karịsịa n’ihi na eso m n’ime mmadụ 160 e mere baptism na Botany Bay. O doro anya na abụ m otu onye n’ime ndị mbụ bụ́ ndị agbụrụ Aborigine nke Australia ghọrọ Ndịàmà Jehova. Foto m pụtara n’akwụkwọ akụkọ Sunday nakwa n’ihe nkiri sịnịma e gosiri n’ebe a na-ekiri ihe nkiri sịnịma.
Nanị Onyeàmà Nọ n’Obodo
Otu ọnwa mgbe m si Sydney lọta, ezinụlọ anyị kwagara Mount Isa, bụ́ obodo a na-egwupụta ihe n’ala nke dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Queensland. Ruo afọ isii anyị biri n’otu obere ụlọ dị ka ndị nlekọta nke otu nnukwute ibé ala dị nnọọ ná mpụga obodo. Anyị ji osisi anyị gbutara n’ọhịa dị nso rụọ ahụ obere ụlọ anyị. Anyị ji drọn bitumen ndị meworo ochie ndị anyị gbuwara akụkụ ha ma mee ha ka ha dị mbadamba mee elu ụlọ ahụ. Martin nwetara ọrụ n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè, ma aṅụrụma ya mesịrị bibie ahụ ike ya. Mgbe ahụ, aghọrọ m onye nanị ya na-akwado ezinụlọ anyị. Ọ nwụrụ na 1971.
Iji malitegodị, nanị m bụ Onyeàmà na Mount Isa. Ben na-abịa kwa ọnwa isii ma ọ bụ karịa, ebe Mount Isa bụ akụkụ nke nnukwu ókèala ịgba àmà ya. Ọ bụrụ na ọ daba na ọ bịara n’obodo n’oge Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs Kraịst—oge pụrụ nnọọ iche nye Ben, ebe o nwere olileanya nke ndụ eluigwe—ọ na-esoro ezinụlọ anyị mee ya, mgbe ụfọdụ n’úkwù osisi.
Ben adịghị anọtekarị aka, ya mere mụ na ụmụaka m mere ihe ka ukwuu n’ịgba àmà anyị n’onwe anyị. N’eziokwu, nanị anyị nọ; ma mmụọ Jehova nyere anyị ike, otú ahụkwa ka nzukọ ya na-ahụ n’anya mere. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị kwesịrị ntụkwasị obi na nwunye ha lụsoro oké okpomọkụ, ijiji, uzuzu, na ụzọ ndị jọrọ njọ ọgụ iji bịa Mount Isa ịgba anyị ume, n’agbanyeghị na ruo ọtụtụ afọ ìgwè anyị dị nnọọ ntakịrị. Ọzọkwa, Ndịàmà si n’ọgbakọ agbata obi anyị e hiwere ọhụrụ na Darwin, dị ihe karịrị kilomita 1,200 site n’ebe anyị nọ, na-abịa mgbe ụfọdụ.
E Hiwe Ọgbakọ
Na December 1953 e hiwere ọgbakọ na Mount Isa. A họpụtara Ben ịbụ onye nlekọta, mụ na ada m bụ́ Ann bụ nanị ndị ọzọ keere òkè n’ozi n’oge ahụ. Ma n’oge na-adịghị anya Ndịàmà ndị ọzọ kwabatara n’obodo ahụ. Ókèala anyị malitekwara ịmịpụta ìgwè na-eto eto nke ndị na-eso ụzọ, gụnyere, ka oge na-aga, ọtụtụ ndị agbụrụ Aborigine.
Ọgbakọ ahụ nọgidere na-amụba, n’oge na-adịghịkwa anya ọ bịara doo anya na Ụlọ Nzukọ Alaeze nke anyị ga na-enwe nzukọ na ya dị anyị mkpa. Na May 1960, mgbe ịrụsi ọrụ ike dị ukwuu gasịrị, anyị rụchara ụlọ nzukọ ọhụrụ nke anyị. N’ime afọ 15 sochirinụ, e wusawanyere ya ugboro abụọ. Ma ka ọ na-erule etiti afọ ndị 1970, anyị nwere ihe dị ka mmadụ 120 na-ekere òkè n’ozi ihu ọha, ụlọ nzukọ ahụ bịakwara dị nnọọ obere ọzọ. Ya mere e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze mara mma, nke nwere oche 250, a rarakwaara ya nye na 1981. N’ihi inwe ebe ga-abakwu ndị mmadụ, e jiriwo ụlọ ahụ na-eme ihe maka mgbakọ ndị buru ibu karị a na-akpọ mgbakọ sekit.
Mmụba n’Etiti Ndị Agbụrụ Aborigine
Nke na-enye m obi ụtọ bụ nhiwe nke e hiwere otu ìgwè ndị agbụrụ Aborigine na Ndị Àgwàetiti e jikọtara ya na Ọgbakọ Mount Isa na 1996. Ndị Àgwàetiti bụ ndị agbụrụ Aborigine si n’àgwàetiti ndị dị nso n’elu ala nke Australia. Nzube bụ́ isi nke ìgwè a bụ ịgba àmà ka mma nye ndị agbụrụ Aborigine, ndị ụfọdụ n’ime ha yichara ka ha adịghị enwecha ahụ iru ala mgbe ha na ndị ọcha nọ.
Ihe dị ka ìgwè 20 ndị ọzọ dị otú ahụ nke ndị agbụrụ Aborigine nọgasị na gburugburu Australia. Ọzọkwa, e hiwewo ọgbakọ ndị agbụrụ Aborigine n’Adelaide, Cairns, Ipswich, Perth, na Townsville. Ihe dị ka mmadụ 500—gụnyere ụfọdụ n’ime ndị ezinụlọ m—na-aga n’ìgwè na n’ọgbakọ ndị a. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 10 nke ndị agbụrụ Aborigine bụ́ ndị nkwusa bụ ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị ozi oge nile!
Amalitere m ịrịa ọrịa shuga na 1975, n’ime ọtụtụ afọ ndị a kwa, nrịanrịa a, bụ́ nke ọtụtụ ndị agbụrụ Aborigine na-arịa, akpatawo mbibi dị ukwuu. Ịgụ ihe aghọwo ihe na-esiwanye ike. Ma, Jehova anọgidewo na-akwagide m ma na-enye m ọṅụ.
Enwere m obi ekele maka ndị ozi nwere obi ike bụ́ ndị jewooro mụ na ezinụlọ m ozi. Oké ịnụ ọkụ n’obi ha, ịhụnanya ha, na akụ̀ ime mmụọ ndị ha buru n’elu ịnyịnya ígwè ka ha na-agbafe okporo ụzọ na ụzọ ọhịa ndị jupụtara n’uzuzu, nke dara owu nke Queensland dịpụrụ adịpụ mere ka o kwe anyị omume ịmụta eziokwu Bible. Ugbu a m ji obi ike na-echere oge mgbe ịhụnanya m hụrụ ụwa ga-ezu ezu ruo mgbe ebighị ebi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akụkọ ndụ dị ịrịba àmà nke Ben Brickell pụtara n’Ụlọ Nche nke September 1, 1972 (Bekee), peji nke 533-536.
[Map/Foto dị na peeji nke 23]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Perth
Dorothy taa
Darwin
Cairns
Townsville
Mount Isa
Rockhampton
Emerald
Springsure
Woorabinda
Ipswich
Adelaide
Sydney
[Foto dị na peeji nke 21]
Nnọkọ mmụgharị ihe nke mụ na Ben n’etiti afọ ndị 1950