Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 9/8 p. 4-5
  • Igbu Onwe Onye—Ihe Otiti nke Ndị Na-eto Eto

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbu Onwe Onye—Ihe Otiti nke Ndị Na-eto Eto
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
  • Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—2001
  • Ihe Mere Ike Ndụ Ji Agwụ Ndị Mmadụ
    Teta!—2001
  • Igbu Onwe Onye—Nsogbu Zuru Ebe Nile nke Na-apụtachaghị Ìhè
    Teta!—2000
  • Mgbe Olileanya Na Ịhụnanya Na-adịkwaghị
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 9/8 p. 4-5

Igbu Onwe Onye—Ihe Otiti nke Ndị Na-eto Eto

DỊ KA a ga-asị na agha, igbu mmadụ, na arụrụala ezughị ibibi ndị ntorobịa anyị, e nwere mbibi onwe onye n’ụdị nke igbu onwe onye nke ndị ntorobịa. Iji ọgwụ na mmanya na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-ebibi uche na ahụ ndị ntorobịa, na-akpata ọtụtụ ọnwụ n’etiti ndị na-eto eto. Okwu e ji echeta onye nwụrụ anwụ a na-amatawanye nke ọma bụ na onye ahụ nwụrụ n’ihi ịṅụbiga ọgwụ ọjọọ ókè, ma ọ̀ kpachaara anya ma ọ bụ na ọ kpachaghị anya.

Magazin bụ́ Morbidity and Mortality Weekly Report nke April 28, 1995, kwuru na “igbu onwe onye bụ ihe nke atọ kasị akpata ọnwụ n’etiti ndị nọ n’oge uto dị afọ 15-19 na United States.” Dr. J. J. Mann na-ede na The Decade of the Brain, sị: “Ihe karịrị ndị America 30,000 [na 1995 ọnụ ọgụgụ ahụ bụ 31,284] na-egbu onwe ha kwa afọ. Ọ dị mwute ikwu na ọ bụ ndị ntorobịa na-emekarị ya . . . Ihe ji okpukpu iri karịa mmadụ 30,000 ndị ahụ na-anwa igbu onwe ha, ma lanarị. . . . Ịmata ndị ọrịa nọ n’ihe ize ndụ nke igbu onwe onye bụ ihe ịma aka bụ́ isi a na-enwe n’ụlọ ọgwụ n’ihi na ndị ọrụ ahụ ike apụghị n’ụzọ dị mfe ịma ihe dị iche n’etiti ndị ọrịa nwere oké ịda mbà n’obi bụ́ ndị ga-anwa igbu onwe ha na ndị na-agaghị anwa.”

Simon Sobo, onyeisi nke ngalaba ọrịa uche na New Milford Hospital, Connecticut, U.S.A., kwuru, sị: “E nwewo ịnwa igbu onwe onye n’oge opupu ihe ubi a [1995] karịa ka m hụworo n’ime afọ 13 m nọworo n’ebe a.” Na United States, ọtụtụ puku ndị nọ n’afọ iri na ụma na-anwa igbu onwe ha kwa afọ. Nke ọ bụla a nwara ime bụ arịrịọ maka enyemaka na nlebara anya. Ònye ga-anọ ya inye aka tupu oge agafee?

Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Ọnọdụ ahụ adịghị iche nke ukwuu n’ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. N’India, dị ka India Today si kwuo, ihe dị ka ndị ntorobịa 30,000 gburu onwe ha na 1990. Na Canada, Finland, France, Israel, Netherlands, New Zealand, Spain, Switzerland, na Thailand, ọnụ ọgụgụ ndị na-eto eto na-egbu onwe ha amụbawo. Otu akụkọ e nwetara na 1996 nke sitere n’aka Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) na-ekwu na ebe e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị ntorobịa igbu onwe ha bụ na Finland, Latvia, Lithuania, New Zealand, Russia, na Slovenia.

Australia nwekwara otu n’ime ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị ntorobịa igbu onwe ha. Ná mba a na 1995, pasent 25 nke ụmụ okoro na pasent 17 nke ụmụ agbọghọ nile nwụrụnụ bụ ndị gburu onwe ha, dị ka otu akụkọ dị na magazin bụ́ The Canberra Times si kwuo. Ọnụ ọgụgụ nke igbu onwe onye “gara nke ọma” n’etiti ụmụ okoro bụ́ ndị Australia ji okpukpu ise karịa nke ụmụ agbọghọ. A na-ahụ nkezi yiri nke ahụ n’ihe ka n’ọtụtụ mba.

Nke a ọ̀ pụtara na ụmụ okoro yikarịrị ka ha ga-anwa igbu onwe ha karịa ụmụ agbọghọ? Ọ bụchaghị otú ahụ. Ihe ndekọ e nwere na-egosi obere ọdịiche n’etiti ndị nwoke na ndị nwanyị ịnwa igbu onwe ha. Otú ọ dị, “ụmụ okorobịa ji ihe dị ka okpukpu anọ karịa ụmụ agbọghọ na-egbu onwe ha ná mba ndị mepere emepe dị ka ọnụ ọgụgụ kasị ọhụrụ sitere n’aka WHO [Òtù Ahụ Ike Ụwa] si kwuo.”—The Progress of Nations, nke òtù UNICEF bipụtara.

Ma ọbụna ndekọ ọnụ ọgụgụ ndị a na-atụ ụjọ nwere ike ghara ikwu otú nsogbu ahụ haruru. Ndekọ ọnụ ọgụgụ banyere ndị ntorobịa igbu onwe ha, bụ́ ndị e kwupụtara n’okwu nnyocha ahụ ike na ime nchọpụta, n’ụzọ dị ịtụnanya na-adị mfe ọgụgụ. Otú ọ dị, ihe a na-adịghị aghọtakarị ma ọ bụ hụ n’onye nke ọ bụla nwụrụnụ bụ ezinụlọ ndị e tisasịrị etisasị na obi mgbawa, nhụjuanya, mwute, na obi nkoropụ nke ndị a hapụrụ ka ha na-achọ ihe ndị kpatara ya.

Ya mere, à pụrụ igbochi ọdachi ndị dị ka ndị ntorobịa igbu onwe ha? A matawo ụfọdụ ihe ndị bụ́ isi na-akpata ya, ọ pụkwara inye aka n’izere ọnọdụ a dị mwute.

[[Igbe dị na peeji nke 5]

Ihe Ndị Na-akpali Igbu Onwe Onye

E nwere ọtụtụ echiche banyere ihe ndị na-akpali igbu onwe onye. “Igbu onwe onye na-esite ná mmeghachi omume mmadụ nye nsogbu ọ ghọtara dị ka nke karịrị ya, dị ka inwe mmetụta nke ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe ndị ọzọ nọ, ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya (karịsịa di ma ọ bụ nwunye), ezinụlọ tisara etisa n’oge mmadụ bụ nwata, ọrịa anụ ahụ siri ike, ịka nká, enweghị ọrụ, nsogbu ego, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ.”—The American Medical Association Encyclopedia of Medicine.

Dị ka ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Emile Durkheim si kwuo, e nwere ụdị anọ bụ́ isi nke mmadụ igbu onwe ya:

1. Igbu onwe onye n’ihi ọdịmma onwe onye nanị—‘A na-eche na nke a na-esite na mmadụ esoghị ọha na eze na-emekọ ihe. N’ịnọkarị nanị ha, ndị gburu onwe ha n’ihi ọdịmma onwe ha nanị enweghị ihe jikọrọ ha na ógbè ha, ha adabereghịkwa na ya.’ Ha na-anọkarị nanị ha.

2. Igbu onwe onye n’ihi ịchọ ọdịmma nke ndị ọzọ—“Onye ahụ na-esoro otu ìgwè na-emekọ ihe gabiga ókè nke na ọ na-eche na ọ dịghị àjà gabigara ókè ịchụ.” Ihe atụ ndị e nyere bụ ndị nyara ụgbọelu Japan ná mwakpo ga-eri isi ha n’Agha Ụwa nke Abụọ na ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè bụ́ ndị na-egbu onwe ha ka ha na-egbu ndị ha weere ịbụ ndị iro ha. Ihe atụ ndị ọzọ ga-abụ ndị ahụ nwụworonụ site n’ịchụ onwe ha n’àjà iji dọrọ uche ndị mmadụ gaa n’òtù ha.

3. Igbu onwe onye n’ihi ndakpọ mmekọrịta ọha na eze—“Onye gburu onwe ya n’ihi ndakpọ mmekọrịta ọha na eze enweghị ike ime ihe banyere nsogbu n’ụzọ ezi uche dị na ya, ọ na-ahọrọkwa igbu onwe ya dị ka ihe ngwọta nke nsogbu. [Nke a] na-eme mgbe mmekọrịta onye ahụ na ọha na eze bụ́ nke maara ya ahụ gbanwere na mberede na n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ.”

4. Igbu onwe onye n’ihi enweghị olileanya—‘A na-eche na ihe na-akpata nke a bụ iwu nchịkwa gabigara ókè nke ọha na eze bụ́ nke na-egbochi nnwere onwe mmadụ n’ụzọ dị ukwuu.’ Ndị dị otú ahụ gburu onwe ha “na-eche na ha enweghị ọdịnihu dị mma.”—Adolescent Suicide: Assessment and Intervention, nke Alan L. Berman na David A. Jobes dere.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Ụfọdụ n’ime omume ndị na-emerụ ahụ ndị pụrụ iduga n’onye ntorobịa igbu onwe ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya