Ikiri ụwa
Egwuregwu Kọmputa Ndị Na-emerụ Ahụ
Ministri Okwu Ikpe nke Brazil “amachibidowo ire otu egwuregwu kọmputa kpaliri nrụrịta ụka bụ́ nke ndị na-egwu ya na-enweta akara site n’izu obere ụgbọala na igbu ndị uwe ojii,” ka otu akụkọ Reuters na-ekwu. E weere egwuregwu ahụ dị ka nke “dị ize ndụ n’ihi na ọ na-eme ka izu ohi na igbu mmadụ ghọọ ihe na-enweghị ihe ọ bụ, ọ pụkwara ịkpali ndị na-eto eto na-egwu ya ime ihe ike.” Na 1997, ministri ahụ machibidoro otu egwuregwu kọmputa nke “nyere ndị na-egwu ya akara maka igbu ndị ji ụkwụ aga, bụ́ nke gụnyere ụmụ nwanyị meworo agadi na ụmụ nwanyị dị ime.” Ọnụ na-ekwuchitere Procon, bụ́ òtù na-ahụ maka ihe ndị ruuru ndị na-azụ ihe, kwuru, sị: “Ụdị egwuregwu ndị a dị ize ndụ ma na-emerụ ahụ n’ihi na ha na-arụpụta ime ihe ike. Ụmụntakịrị na-amalite iwere ụdị ihe omume a dị ka ihe dị otú o kwesịrị.”
Osimiri Ndị E Metọrọ Emetọ
“Iji obi ịta mmiri na-egbufe azụ̀ ókè, mmiri ọgwụ ndị nwere nsí, na ihe mkpofu ndị na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu n’oké osimiri na-etinye ihe ndabere nke ndụ n’elu ala dum n’ihe ize ndụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Nassauische Neue Presse na-akọ. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Kieler Nachrichten si kwuo, nke ọ kasị metụta bụ Osimiri Ojii. E weere ya dị ka otu n’ime usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha kasị nọrọ n’ihe ize ndụ n’ụwa, bụ́ nke pasent 90 n’ime ya na-enwetụdịghị ihe dị ndụ dị n’ime ya. Mmiri nsị a na-etinyeghị ọgwụ agbanwewo ebili mmiri na-etipụta n’ikperé mmiri nke Ukraine ịghọ mmiri ọjọọ na-achatụ nchara nchara na akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, e mepekwara ụsọ mmiri ndị dị Odessa nso nanị otu izu n’oge okpomọkụ gara aga. “A na-emetọ Osimiri Ojii ahụ nke ọjọọ ya,” ka president Romania bụ́ Emil Constantinescu, kwuru. “Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya ka ọ nwụọ, anyị ga-ahụ ihe ndị ga-esi na ya pụta bụ́ ndị ga-adị njọ karịa ka anyị pụrụ iche.” Òtù Mba Ndị Dị n’Otu akpọsawo afọ 1998 ịbụ “Afọ Oké Osimiri nke Mba Nile.”
Ọgwụ Adịgboroja
“Ihe dị ka pasent 8 nke ọgwụ ndị a na-ere n’ụwa bụ adịgboroja,” ka Le Figaro Magazine na-ekwu. Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa si kwuo, e mere atụmatụ na pasent ọgwụ adịgboroja e nwere na Brazil dị pasent 30, na Nigeria a na-echekwa na ọ dị pasent 60 bụ́ nke na-eju anya. A na-akọ na ịzụ ahịa ọgwụ adịgboroja bụ azụmahịa na-ewe ijeri dollar 300, bụ́ nke mpụ a haziri ahazi na-ebute ụzọ na ya. N’agbanyeghị mgbalị nke ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ na-eme iji kwụsị azụmahịa a, ndị uwe ojii na òtù dị iche iche nke mba nile achọtabeghị ihe ngwọta dịịrị nsogbu ahụ. N’ebe ọ dịkarịsịrị mma, ọgwụ adịgboroja pụrụ ịrụ ọrụ dị ka ọgwụ nkụjụ ahụ; n’ebe ọ dịkarịsịrị njọ, ọ pụru igbu egbu. “Ọgwụ adịgboroja na-eji ahụ ike onye ọrịa egwu ajọ egwuregwu,” ka Le Figaro Magazine na-ekwu.
Ịhụnanya Maka Égbè na United States
“Ọdịiche dị n’etiti America [United States] na mba ndị ọzọ doro anya,” ka magazin bụ́ The Economist na-ekwu. “Na 1996 e jiri obere égbè gbuo mmadụ abụọ na New Zealand, 15 na Japan, 30 na Britain, 106 na Canada, 211 na Germany na 9,390 na United States.” Kwa afọ na United States, a na-eji égbè eme ihe n’ihe dị ka ọkara nde ime mpụ na ihe dị ka ọnwụ nke mmadụ 35,000, gụnyere igbu onwe onye na ihe mberede. Ma ndị bi na United States bụ́ ndị nwere égbè “chọrọ idebe égbè ha, n’agbanyeghị ókè mfu ya dịruru elu,” ka magazin ahụ na-ekwu. “Kama ịhọrọ nchịkwa siri ike, dị ka ọtụtụ mba ndị ọzọ meworo, ha na-enubanye n’ihe megidere nke ahụ.” Ugbu a, steeti 31 na-enye akwụkwọ ikike ndị na-enye ndị mmadụ ohere ibu obere égbè ndị e zoro ezo.
Àkwà Mmiri Kasị Ogologo n’Ụwa nke Na-enweghị Idé n’Etiti Ya
Àkwà Mmiri Akashi Kaikyo dị na Japan, nke jikọtara Àgwàetiti Awaji na obodo ukwu bụ́ Kobe, bụ nke a gbapere n’April ma bụrụ nke e debanyere ozugbo n’akwụkwọ ihe ndekọ dị ka àkwà mmiri kasị ogologo n’ụwa nke na-enweghị idé n’etiti ya. “Mgbe a rụchara ya n’afọ iri, ihe owuwu ahụ bụ́ nke were ijeri $7.7 dị amaụkwụ 6,532 (mile 1.2) [mita 1,991] n’etiti ya—nke a tụrụ dị ka ịdị ogologo dị n’agbata mgbidi abụọ ahụ,” ka magazin bụ́ Time na-ekwu. “Mgbidi nke ọ bụla, bụ́ nke dị elu karịa ụlọ elu dị okpukpu 90, bụ nke a rụnyere ngwá ọrụ 20 na-achịkwa ịma jijiji; ọ bụrụ na ifufe emee ka ihe owuwu ahụ ṅagharịa, ígwè ndị na-ejide ha na-adọghachi mgbidi ndị ahụ azụ.” A rụwokwa àkwà mmiri ahụ iguzogide ala ọma jijiji ruru ịdị elu 8.0 n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ Richter. Eriri ígwè ya pụrụ ịgba ụwa gburugburu ugboro asaa ma a gbatịa ya.
Ihe Ọkụkụ Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ
Mgbe afọ 20 nke ịrụ ọrụ gasịrị, ndị ọkà mmụta ihe ọkụkụ na ndị na-akwado nchekwa nke ihe ndị sitere n’okike gburugburu ụwa ekwubiwo na pasent 12.5 nke ụdị ihe ọkụkụ 270,000 a maara n’ụwa—otu n’ime 8 ọ bụla—nọ n’ihe ize ndụ nke mkpochapụ. “Itoolu n’ime ihe ọkụkụ 10 ọ bụla e depụtara bụ nanị n’otu mba ka ha na-etolite, na-eme ka ha nọrọ n’ihe ize ndụ karịsịa nye ọnọdụ ego mba ma ọ bụ nke ógbè na nke ọha mmadụ,” ka magazin bụ́ The New York Times na-ekwu. Ndị ọkà mmụta sayensị nyere ihe abụọ bụ́ isi mere ihe ọkụkụ ji aghọ nke nọ n’ihe ize ndụ: (1) oké mbibi nke ọhịa ime ime obodo n’ihi mmepe, igbutu osisi, na ọrụ ugbo na (2) nnubata nke ihe ọkụkụ ndị e si ebe ọzọ weta bụ́ ndị na-agbasawanye ma na-akpagide ụdị ndị na-etolite ná mba ahụ. Ihe odide ahụ na-ekwu na ihe ọkụkụ “dị mkpa ná ndịgide nke ihe e kere eke” karịa anụ ndị na-enye nwa ara na nnụnụ. Ọ gakwuru n’ihu na-ekwu banyere ihe ọkụkụ, sị: “Ha na-akwado ihe ka ukwuu n’ime ihe ndị ọzọ dị ndụ, gụnyere ndụ mmadụ, site n’ịgbanwe ìhè anyanwụ ịghọ nri. Ha na-enye ihe ndị e ji eme ọtụtụ ọgwụ na usoro mkpụrụ ndụ ndị a na-esi na ha emepụta ụdị ihe ọkụkụ dị iche iche a na-akọ n’ugbo. Ha na-emejupụtakwa kpọmkwem ọdịdị mbara ala sitere n’okike, bụ́ ebe ihe nile ọzọ na-eme na-adabere.”
Ọrịa Ndị A Na-ebute n’Ụlọ Ọgwụ
“Ọrịa ndị a na-ebute n’ụlọ ọgwụ mgbe usoro nlekọta ahụ ike ma ọ bụ ịwa ahụ gasịrị bụ n’ezie nsogbu ahụ ike ọha na eze,” ka akwụkwọ akụkọ France bụ́ Le Figaro na-ekwu. Na France nanị, mmadụ 800,000 na-ebute ọrịa kwa afọ, e mekwara atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ bụ 10,000. Nzọụkwụ dị iche iche pụrụ ibelata ihe ize ndụ nke ibute ọrịa: ifesa ọgwụ na-egbu nje n’ọnụ ụlọ tupu onye ọrịa ọhụrụ nke ọ bụla abata, inyocha usoro igbu nje, na ịkwọ aka nke ọma tupu a gwọọ onye ọrịa. O doro anya na a na-elegharakarị ọtụtụ n’ime ihe ndị a anya. Otu nnyocha e mere n’otu ụlọ ọgwụ dị na Paris kpughere na nanị pasent 72 nke ndị na-arụ ọrụ enyemaka n’ụlọ ọgwụ kwuru na ha kwọrọ aka ha nke ọma mgbe ha metụsịrị onye ọrịa nke ọ bụla aka. N’ime ndị a, pasent 60 kwọrọ aka ha ihe na-erughị ugboro ole kasị mma. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwubiri na site ná ndekọ ọnụ ọgụgụ ndị dị ka ndị a na-adịghị enye olileanya, “o yiri ka e nwere ọtụtụ ọrụ a ka ga-arụ.”
Belt Oche Na-azọpụta Ndụ na Njem Ụgbọelu
Dị ka onye ọ bụla nwere ahụmahụ n’iji ụgbọelu eme njem maara, na mberede na mgbe a na-atụghị anya ya ụgbọelu pụrụ ime oké nnugharị nke pụrụ imerụ ndị njem ahụ ma ọ bụ ọbụna gbuo ha. Ndị ọkachamara na-ekwu na nanị ihe dị irè ị pụrụ ime iji zere ya bụ iyiri belt oche gị n’oge nile ị nọ ala n’ụgbọelu. “O siri nnọọ ike ibu amụma, ịchọpụta, na izere nnugharị pụtara ìhè n’ikuku,” ka magazin bụ́ U.S.News & World Report na-ekwu. Ka ndị ọkà mmụta sayensị na-eleba anya n’imepụta ihe mgbaàmà iji na-achọpụta ụdị nnugharị ahụ, ugbu a ihe ka ọtụtụ ụgbọelu na-adabere n’akụkọ ndị a na-enweta site n’ụgbọelu ndị bu ụzọ na-efe n’otu ụzọ ahụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile merụrụ ahụ mgbe e nwere nnugharị eyighị belt oche. “Ma,” ka isiokwu ahụ na-ekweta, “ndị ọrụ ụgbọelu echepụtabeghị otú e si amanye ndị nọ n’ụgbọelu iyiri belt oche.”
Chekwaa Ọkụ Eletrik
“Ngwá ụlọ ndị a na-ejighị eme ihe ma bụrụ ndị a kwụnyere n’ọkụ maka iji ha eme ihe ma a chọọ dọọrọ pasent 11 nke ike eletrik e ji eme ihe n’ụlọ na n’ọfịs na Germany,” ka obere akwụkwọ akụkọ bụ́ Apotheken Umschau na-akọ. Dị ka atụmatụ e mere maka Germany si gosi, TV, ngwá egwú stereo, kọmputa, na ngwá electronic ndị ọzọ a kwụnyere n’ọkụ maka iji ha eme ihe ma a chọọ na-adọrọ ihe dị ka ijeri kilowatt-hour 20.5 nke ike eletrik kwa afọ. Nke a karịrị ike eletrik Berlin ji eme ihe kwa afọ, bụ́ obodo kasị ukwuu nke mba ahụ. Ọ pụrụ ikwe omume ichekwa ike eletrik ma chekwaa ego gị site n’ịgbanyụ ngwá ụlọ ụfọdụ kpam kpam kama ịkwụnye ha n’ọkụ maka iji ha eme ihe ma a chọọ.
Osimiri Nwụrụ Anwụ Na-apụ Na-anya
Osimiri Nwụrụ Anwụ, bụ́ ebe kasị dị ala na ebe kasị atọ nnu nnu n’ụwa, na-apụ n’anya ngwa ngwa. Na 1965 elu Osimiri Nwụrụ Anwụ ji mita 395 dị ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ elu mmiri. Ugbu a o ji mita 413 dị ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ elu mmiri, obere ibé ala kpọrọ nkụ bụ́ nke kewara ya ụzọ abụọ apụtawo. Ụlọ oriri ndị e wuru n’ụsọ mmiri ahụ dịzi nnọọ n’elu ala ugbu a. “Ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri ya ji amaụkwụ 2.5 [sentimita 80] a na-ahụ nke ọma atalata kwa afọ, osimiri nke mmiri zuru ezu na-adịkwaghị asọbatara n’ihi ọchịchọ nke ndị mmadụ na-achọ mmiri na n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị,” ka magazin bụ́ The Dallas Morning News na-ekwu. “Ntakọrọ pụrụ iwere ọnọdụ nke Osimiri Nwụrụ Anwụ na-egosi ịdị njọ nke ụkọ mmiri dị n’ógbè ahụ, ebe ihe ndị na-egbochi ngwọta ya na-egosi ókè mmiri na udo nweruru njikọ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nke kpọrọ nkụ. . . . Taa, ebe bụ́ isi mmiri si asọba n’Osimiri Nwụrụ Anwụ, bụ́ Osimiri Jọdan, fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke Israel, Siria, na Jọdan . . . chegharịrị ihu kpamkpam gaa ebe ọzọ.” Banyere akụkọ ihe mere eme nke Osimiri Nwụrụ Anwụ, isiokwu ahụ na-asị: “Akụkọ kasị doo anya nke ukwuu bụ ihe ndekọ Bible banyere otú Obodo Ndị Ala Ha Dị Larịị ji nọrọ n’ógbè na-eme ihe oriri ruo mgbe Chineke, n’ịbụ onye na-enwekwaghị olileanya n’ihi omume ọjọọ ha, ‘zokwasịrị Sọdọm na Gọmọra brimstone na ọkụ’ iji mee ya ka ọ ghọọ ala ihe na-adịghị.”