Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 10/8 p. 31
  • Ihe Mere Ọtụtụ Ji Na-ajụ Ọbara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Ọtụtụ Ji Na-ajụ Ọbara
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Mmịnye Ọbara—Arụmụka Dịteworo Aka
    Teta!—2000
Teta!—1998
g98 10/8 p. 31

Ihe Mere Ọtụtụ Ji Na-ajụ Ọbara

N’IHE a kpọrọ mkpebi dị ịrịba ama, ụlọikpe Ontario kpebiri na ọ bụ òtù Red Cross nke Canada kpatara mbute nke mmadụ abụọ naara mmịnye ọbara butere nje HIV—ha abụọ naara ọbara bu nje nke sitere n’ahụ otu onye nyere ọbara ya. “Mgbe ihe na-akpata ọdachi dị ka ọbara bu nje na-eyi ndụ ndị naara ya egwu,” ka Ọkàikpe Stephen Borins kwuru, “ọ na-adị mkpa ime ihe ngwa ngwa.”

N’afọ ndị 1980, ihe dị ka ndị Canada 1,200 butere nje HIV, 12,000 ọzọ butekwara ịba ọcha n’anya C—ha nile site n’ọbara na ihe ndị si n’ọbara bụ́ ndị bu nje. Iji nye aka belata ọnụ ọgụgụ ndị na-ebute ọrịa, a na-eji nlezianya ka nnọọ ukwuu enyocha ndị na-enye ọbara ha. Ma ọ bụghị ndị nile na-enye ọbara ha na-ekwu eziokwu banyere omume mmekọahụ ha. Dị ka ihe atụ, otu nnyocha e mere na United States na-egosi na 1 onye n’ime mmadụ 50 nyere ọbara ha akọghị ihe ndị pụrụ ịkpata ihe ize ndụ, dị ka idina ụdị onwe ma ọ bụ isoro onye akwụna nwee mmekọahụ.

Eziokwu ahụ bụ́ na inyocha ọbara abụghị ihe a pụrụ ịdabere na ya so na-etinye ihe n’ọnọdụ ahụ nke amaghị ihe a ga-eme. Dị ka magazin bụ́ New Scientist si kwuo, “ọ bụrụ na mmadụ enye ọbara mgbe ọ na-erubeghị izu atọ o butechara nje HIV, nnyocha ndị nke oge a adịghị achọpụta nje virus ndị ahụ. Maka ịba ọcha n’anya C, ‘oge a ọ na-apụtabeghị ìhè’ pụrụ ịnọfe ọnwa abụọ.”

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e nwewo ndalata dị ịrịba ama n’ọnụ ọgụgụ ndị Canada dị njikere inye—ma ọ bụ ịnara—ọbara. Paul Schratz bụ́ onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ na-ede, sị: “Ebe e nwere ndalata ná mmasị inye, na ịrị elu n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-apụghị inye, ekele dịrị Chineke na Ndịàmà Jehova na-ebute ụzọ n’inyocha ihe ndị e ji edochi anya ọbara.”

N’ụzọ na-akpali mmasị, magazin bụ́ The Toronto Star na-akọ na n’ime otu afọ na-adịbeghị anya, ihe dị ka mmadụ 40 “bịara n’ụlọ ọgwụ Canada ghaa ụgha na ha bụ Ndịàmà Jehova n’ihi na ha achọghị mmịnye ọbara.” Nnyocha na-egosi na ihe dị ka pasent 90 nke ndị Canada ga-ahọrọ ihe ụfọdụ e ji edochi anya ọbara karịa ọbara onye ọzọ nyere. N’ihi ya, iji ọbara eme ihe abụkwaghị nanị okwu okpukpe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya