Ịchọ Ndụ Nwere Nchebe
NCHEBE pụtara ihe dị iche iche nye ndị dị iche iche. Nye otu onye, nchebe pụtara inwe ọrụ; nye onye ọzọ, ọ pụtara akụ̀ na ụba; nyekwa onye nke atọ, nchebe pụtara gburugburu ebe obibi mpụ na-adịghị. Ọ̀ pụtara ihe ọzọ nye gị?
N’agbanyeghị ihe bụ echiche gị, obi abụọ adịghị ya na ị na-eme ihe iji gbalịa mee ka ndụ gị nwee nchebe otú ị chọrọ ka o nwee. Tụlee ihe ndị nọ na Europe na-eme iji nwetatụ nchebe onwe onye.
Agụmakwụkwọ Ka Elu
Dị ka Jacques Santer, bụ́ onyeisi oche nke Ndị Isi Mba Ndị Dị na Europe si kwuo, pasent 20 nke ndị na-eto eto nọ n’Òtù Ndị Europe enweghị ọrụ. N’ihi ya, nye ndị ọgbọ ahụ, ihe dị ukwuu dabeere n’otu ajụjụ, Olee otú m ga-esi nweta ọrụ nke ga-eme ka ndụ m nwee nchebe? Ọtụtụ ndị kwere na a pụrụ inweta ihe mgbaru ọsọ a karịsịa site n’agụmakwụkwọ ka elu, bụ́ nke, dị ka The Sunday Times nke London na-ekwu, na-enye ụmụ akwụkwọ “ọnọdụ ka nnọọ mma inweta ọrụ.”
Dị ka ihe atụ, na Germany, “ọchịchọ maka agụmakwụkwọ na ọkwá agụmakwụkwọ ka dị ukwuu dị ka ọ dịbu,” ka Nassauische Neue Presse na-akọ. Nke a dị otú a n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ́ na ibi ndụ dị ka nwa akwụkwọ n’oge nile a na-anọ na mahadum ná mba ahụ na-ewe, ná nkezi, ihe dị ka $55,000.
A ga-aja ndị na-eto eto na-eji agụmakwụkwọ akpọrọ ihe na ndị chọrọ inweta ọrụ e ji n’aka mma. Onye nwekwara nkà na iru eru na-enwekarị ohere ka mma mgbe ọ na-achọ ọrụ. Ma ọ̀ bụ mgbe nile ka agụmakwụkwọ ka elu na-eme ka e nweta ọrụ e ji n’aka? Otu nwa akwụkwọ kwuru, sị: “Amatara m site ná mmalite na ihe ọmụmụ m agaghị eme ka m ghọọ ọkachamara, ọ gaghị enyekwa nchebe.” Ọ bụghị nanị ya nọ n’ọnọdụ ahụ. N’otu afọ na-adịbeghị anya, ọnụ ọgụgụ ndị gụsịrị akwụkwọ na mahadum bụ́ ndị na-enweghị ọrụ ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwetụworo na Germany.
Na France, dị ka otu akwụkwọ akụkọ si kwuo, ndị na-eto eto na-aga mahadum n’ihi na diplọma ụlọ akwụkwọ dị elu abakebeghị uru n’ihi oké enweghị ọrụ nke ndị ntorobịa. Otú ọ dị, ọtụtụ ụmụ akwụkwọ mahadum na-aghọta eziokwu ahụ bụ́ na ná ngwụsị nke ihe ọmụmụ ha, ha “agaghị anọ n’ọnọdụ ka mma n’agbanyeghị akara ugo mmụta ha nwetara.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Independent na-akọ na na Britain “nrụgide nile nke agụmakwụkwọ na-akpa ụmụ akwụkwọ aka ọjọọ.” A na-akọ na kama inyere ụmụ akwụkwọ aka ịnagide enweghị nchebe nke ndụ, mgbe ụfọdụ ndụ a na-ebi na mahadum na-eduga ná nsogbu ndị dị ka ịda mbà n’obi, nchegbu, na ùgwù onwe onye dị ala.
Ọtụtụ mgbe, ịmụ otu aka ọrụ ma ọ bụ inweta ọzụzụ dị irè n’ịrụpụta ihe ụfọdụ na-eme ka mmadụ nwee ike inweta ọrụ e ji n’aka ngwa ngwa karịa ka inweta akara ugo mmụta mahadum na-eme.
Ihe Onwunwe 10,000 Ò Zuru?
Ọtụtụ ndị kwere na isi ihe dị n’inwe ndụ nwere nchebe bụ akụ̀ na ụba. Nke a pụrụ iyi ụzọ dị mma isi eme ihe banyere ya, ebe ọ bụ na ego buru ibu dị n’ụlọ akụ̀ bụ ihe a ga-echigharịkwuru n’oge ihe isi ike. Bible na-akọwa na ‘ego bụ ndò.’ (Eklisiastis 7:12) Otú ọ dị, akụ̀ na ụba ka ukwuu ọ̀ na-eme mgbe nile ka mmadụ nwekwuo nchebe onwe onye?
Ọ dịchaghị eme. Tụlee otú akụ̀ na ụba siworo mụbaa n’afọ 50 gara aga. Ná njedebe nke Agha Ụwa nke Abụọ, akụkụ buru ibu nke ndị bi na Germany fọrọ nke nta ka ha ghara inwe ihe ọ bụla. Taa, dị ka otu akwụkwọ akụkọ Germany si kwuo, onye Germany na-abachaghị ọgaranya nwere ngwongwo dị 10,000. Ọ bụrụ na amụma ndị e buru banyere akụ̀ na ụba mezuo, ọgbọ ndị dị n’ihu ga-enwe ọbụna karịa. Ma nkwakọba a nke akụ̀ na ụba ọ̀ na-eme ka ndụ nwee nchebe karị? Ee e. Otu nnyocha e mere na Germany kpughere na mmadụ 2 n’ime mmadụ 3 na-ewere ndụ ịbụ nke na-enwerughị nchebe otú o nwere afọ 20 ma ọ bụ afọ 30 gara aga. Ya mere oké mmụba nke akụ̀ na ụba emebeghị ka ndị mmadụ nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe karị.
Nke a kwere nghọta n’ihi na, dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, inwe mmetụta nke enweghị nchebe bụ nsogbu mmetụta uche. Akụ̀ na ụba nkịtị apụghịkwa iwepụ nsogbu mmetụta uche kpam kpam. N’eziokwu, akụ̀ na ụba na-ebelata mmetụta nke ịda ogbenye ma na-enye aka n’oge ihe isi ike. Ma n’ọnọdụ ụfọdụ, inwe nnukwu ego na-abụ oké ibu arọ dịkwa ka inwe ntakịrị.
N’ihi ya, inwe àgwà ziri ezi banyere ihe onwunwe ga-enyere anyị aka iburu n’uche na ọ bụ ezie na akụ̀ na ụba pụrụ ịbụ ngọzi, ọ bụghị ihe bụ́ isi dị n’inwe ndụ nwere nchebe. Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jisọs Kraịst gbara ụmụazụ ya ume site n’ikwu, sị: “Ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.” (Luk 12:15) Iji nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe n’ụzọ zuru okè ná ndụ, ihe karịrị akụ̀ na ụba nkịtị dị mmadụ mkpa.
Nye ndị agadi, ihe onwunwe dị mkpa ọ bụchaghị n’ihi uru ha bara n’ụzọ nkịtị kama n’ihi mmetụta e nwere banyere ha. Ihe na-echegbu ndị agadi karịa akụ̀ na ụba bụ ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e mesoro mpụ.
Nọrọ na Nche!
“Mpụ . . . abụwo nsogbu na-amụba amụba n’ụwa nile n’ime afọ 30 gara aga,” ka akwụkwọ nta bụ́ Practical Ways to Crack Crime na-ekwu, bụ́ nke e bipụtara na Britain. Ndị uwe ojii na-arụ ọrụ ka ike ha hà. Olee otú ndị ụfọdụ si na-anagide ya?
Nchebe onwe onye na-amalite n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, na Switzerland, otu onye na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ bụ ọkà n’ise ụlọ ndị nwere ihe na-egbochi ndị ohi itika ụlọ bụ́ ụlọ ndị nwere ihe mkpọchi, ibo ụzọ ndị siri ike, na window ndị nwere ígwè ngebichi. Ndị nwe ụlọ ndị a yiri ka ha na-aghọta ilu ahụ a maara nke ọma n’ụzọ nkịtị: “Ụlọ m bụ ebe mgbaba m.” Dị ka magazin akụkọ bụ́ Focus si kwuo, ụlọ ndị a dị oké ọnụ, ma a na-achọsi ha ike.
Iji nwekwuo nchebe onwe onye ma n’ụlọ ma n’èzí, ụmụ amaala nke ógbè ụfọdụ ahaziwo usoro iche nche n’ógbè ha. Ndị bi n’ógbè ụfọdụ dịpụrụ adịpụ na-eme ọbụna ihe karịrị nke ahụ, na-akwụ ụlọ ọrụ na-eche nche ụgwọ ịgbagharị n’ógbè ha n’oge hour ndị a kara aka. Ọtụtụ ndị na-eche na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ka mmadụ ghara ịnọ nanị ya n’okporo ámá tọgbọ chakoo n’abalị. Ndị mụrụ ụmụ kwa, bụ́ ndị na-enwe nchegbu banyere ọdịmma nke ụmụ ha, pụrụ imekwu ihe iji chebe ha. Tụlee aro ndị dị n’igbe dị na peji a.
Ma ọ bụghị mmadụ nile ga-azụtali ụlọ nwere ihe na-egbochi ndị ohi itika ụlọ. E wezụga nke ahụ, ndokwa ógbè na mgbagharị nke ndị nche n’ógbè nwere ike ha agaghị ebelata mpụ n’ozuzu ya; ha pụrụ nanị iche ya ihu n’ebe ndị na-enweghị nchebe. Otú a mpụ ka bụ ihe bụ́ isi na-eyi inwe nchebe onwe onye egwu. Ka ndụ anyị wee bụrụ nke nwere nchebe, a chọrọ ihe karịrị itinye mgbalị nile iji merie mpụ.
Gwọọ Ọrịa—Ọ Bụghị Nanị Mgbaàmà Ya
Onye nke ọ bụla n’ime anyị nwere ọchịchọ ebumpụta ụwa maka ndụ nwere nchebe, anyị ga-emekwa nke ọma iwere nzọụkwụ ndị ezi uche dị na ha, ndị dị irè iji mezuo nke a. Ma mpụ, enweghị ọrụ, na ihe ndị ọzọ nile na-eme ka ndụ anyị bụrụ nke na-enweghị nchebe bụ nanị mgbaàmà nke ọnọdụ na-emetụta ihe nile a kpọrọ mmadụ. Iji dozie ọnọdụ a, ọ dị mkpa ịlụso, ọ bụghị nanị mgbaàmà ya ọgụ, kama ihe na-akpata ya kpọmkwem.
Gịnị bụ isi ihe na-akpata enweghị nchebe ná ndụ anyị? Olee otú anyị pụrụ isi wepụ ya ma si otú ahụ wepụ enweghị nchebe nke ndụ ruo mgbe ebighị ebi? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ụzọ Dị Iche Iche Isi Chebe Obere Ụmụaka
N’ihi ọtụtụ ugboro a na-emetọ, na-atọrọ, ma na-egbu ụmụaka, ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ ahụwo ya dị ka ihe na-enye aka ịkụziri ụmụ ha ime ihe ndị na-esonụ:
1. Ịsị onye ọ bụla nwara ime ka ha mee ihe ha chere na ọ dị njọ ee e—n’ụzọ siri nnọọ ike.
2. Ịghara ikwe ka onye ọ bụla metụ akụkụ ahụ ha ndị dịịrị nanị ha aka ọ gwụla ma—dị ka mgbe ha na dọkịta ma ọ bụ nọọsụ nọ—nne ma ọ bụ nna ha nọ ebe ahụ.
3. Ịgbalaga, iti mkpu ma ọ bụ ịkpọku onye toro eto nọ nso maka enyemaka mgbe ha nọ n’ihe ize ndụ.
4. Ịgwa ndị nne na nna banyere ihe ọ bụla merenụ ma ọ bụ mkparịta ụka nke na-adịghị nwata ahụ mma n’obi.
5. Ịjụ izoro ndị nne na nna ihe.
Dị ka isi ihe ikpeazụ, ndị mụrụ ụmụ ga-eme nke ọma ịkpachara anya mgbe ha na-ahọrọ onye ọ bụla nke ha ga-ahapụrụ nwa ha.
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
Ka ndụ anyị wee bụrụ nke nwere nchebe, ọ dị anyị mkpa inwe ihe karịrị agụmakwụkwọ, akụ̀ na ụba, ma ọ bụ itinye mgbalị nile iji merie mpụ