Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 12/8 p. 16-18
  • N’ihi Gịnị Ka M Ga-eji Nọrọ n’Enweghị Nne na Nna?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka M Ga-eji Nọrọ n’Enweghị Nne na Nna?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • O Sighị Gị n’Aka
  • Ahụmahụ Na-akpaghasị Uche
  • Inweta Enyemaka
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ndị Ntorobịa Ihe Banyere Unu Na-emetụ Ndị Mụrụ Unu n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ịsọpụrụ Ndị Nne na Nna Anyị Meworo Agadi
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 12/8 p. 16-18

N’ihi Gịnị Ka M Ga-eji Nọrọ n’Enweghị Nne na Nna?

“Olee otú ndụ dịịrị m ịnọ n’enweghị nne na nna? Apụrụ m ikwu na ọ dị nnọọ mwute n’ihi ọtụtụ ihe. O siri nnọọ ike itolite n’enwetaghị ịhụnanya nke nne na nna gị.” —Joaquín.

“Ihe ịma aka kasị ukwuu m chere ihu bụ mgbe ndị nne na nna na-aghaghị ịbịa bịanye aka na rịpọt kaadị ụlọ akwụkwọ. O wutere m nnọọ, enwekwara m oké owu ọmụma. Ọ ka na-adị m otú ahụ mgbe ụfọdụ.”—Abelina dị afọ 16.

Ọ BỤ ọdachi nke oge anyị—ọtụtụ nde ndị na-eto eto na-etolite n’enweghị nne na nna. N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe ọtụtụ puku aghọwo ndị na-enweghị nne ma ọ bụ nna n’ihi agha. N’Africa ntiwapụ nke ọrịa AIDS akpawo otu ụdị ajọ ike ahụ. Ụmụaka ụfọdụ abụrụwo nnọọ ndị nne na nna ha gbahapụrụ. Ezinụlọ dị iche iche abụrụwo ndị e kewasịrị n’ihi agha ma ọ bụ ọdachị ndị na-emere onwe ha.

Ọnọdụ ndị dị otú a bụ ihe a na-ahụkarị ọbụna n’oge Bible. Dị ka ihe atụ, a kpọtụrụ uche n’ọnọdụ ọjọọ nke nwa mgbei ugboro ugboro n’ime Akwụkwọ Nsọ. (Abụ Ọma 94:6; Malakaị 3:5) Agha na ọnọdụ ọjọọ ndị ọzọ kewakwara ezinụlọ dị iche iche laa azụ n’oge ahụ. Ya mere Bible na-ekwu banyere otu nwa agbọghọ nta e kewapụrụ site n’ebe nne na nna ya nọ mgbe usuu ndị agha Siria dọọrọ ya n’agha.—2 Ndị Eze 5:2.

Ikekwe ị bụ otu n’ime ọtụtụ nde ndị ntorobịa bụ́ ndị na-enweghịkwa nne na nna. Ọ bụrụ otú ahụ, ị maara nnọọ otú ọnọdụ ahụ bụruru ihe na-akpata obi mgbu. Gịnị mere nke a jiworo mee gị?

O Sighị Gị n’Aka

Ị̀ na-ahụ onwe gị ka ị na-eche ma Chineke o si n’ụzọ ụfọdụ na-enye gị ntaramahụhụ? Ma ọ bụ ikekwe ị na-ewesa nne na nna gị oké iwe n’ihi ịnwụ—ka a ga-asị na ha kpachaara anya nwụọ. Nke mbụ, obi sie gị ike na Chineke adịghị ewesa gị iwe. Nne na nna gị amaghịkwa ụma kpebie ịhapụ gị. Ọnwụ bụ ọdachi nke ihe a kpọrọ mmadụ na-ezughị okè ketara, mgbe ụfọdụkwa ọ na-adabara ndị nne na nna mgbe ụmụ ha ka na-eto eto. (Ndị Rom 5:12; 6:23) Dị ka ihe àmà na-egosi, Jisọs Kraịst n’onwe ya nwere ahụmahụ ịbụ onye nna nkuchi ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Josef, nwụnahụrụ.a N’ezie nke ahụ abụghị n’ihi mmehie ọ bụla Jisọs mere.

Marakwa na anyị na-ebi n’ime “oge dị oké egwu.” (2 Timoti 3:1-5) Ime ihe ike, agha, na mpụ egbuwo ọtụtụ nde mmadụ na narị afọ nke a n’eleghị anya n’azụ. Ndị ọzọ anwụwo n’ihi “mgbe na ihe ndapụta,” nke pụrụ ịdabara onye ọ bụla. (Eklisiastis 9:11) N’agbanyeghị otú ọnwụ nne na nna gị pụrụ igburu gị mgbu n’obi, o sighị gị nnọọ n’aka. Kama ịta onwe gị ụta ma ọ bụ ịdị na-erubiga újú ókè, nweta nkasi obi ná nkwa Chineke nke mbilite n’ọnwụ.b Jisọs buru amụma, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) Abelina, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, na-ekwu, sị: “Ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ na olileanya nke mbilite n’ọnwụ enyeworo m aka nke ukwuu.”

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na nne na nna gị ka dị ndụ ma ha agbahapụwo gị? Chineke chọrọ ka nne na nna zụlite ma nye ụmụ ha ihe na-akpa ha. (Ndị Efesọs 6:4; 1 Timoti 5:8) Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ndị nne na nna ụfọdụ egosiwo omume nke ịbụ “ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ” n’ebe ụmụ ha nọ n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ. (2 Timoti 3:3) Nye ndị ọzọ, mgbahapụ ahụ bụ ihe na-esi n’ịdabiga ogbenye ókè, ọgwụ ọjọọ iri mmadụ ahụ, ịtụ mkpọrọ, ma ọ bụ aṅụrụma apụta. N’eziokwu, e nwekwara ndị nne na nna na-agbahapụ ụmụ ha nanị n’ihi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. N’agbanyeghị ihe ọ bụla kpatara ya, mmadụ ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe nne na nna ya nọ na-egbu mmụọ. Ma nke a apụtaghị na e nwere ihe na-eme gị ma ọ bụ na ị ga-eji obi amamikpe na-emekpa onwe gị ahụ. N’ezie, ọ bụ nne na nna gị bụ ndị na-aghaghị ịza Chineke ajụjụ banyere otú ha siworo mesoo gị. (Ndị Rom 14:12) Otú ọ dị, ọ bụrụ na a manyewo nne na nna gị ikewapụ onwe ha site n’ebe ị nọ n’ihi ọnọdụ karịrị ha, dị ka ọdachị ndị na-emere onwe ha ma ọ bụ ọrịa, mgbe ahụ o nweghị onye ụta dịịrị! E nwere olileanya nke unu ịbụ ndị e jikọtaghachiri, ọ bụrụgodị na olileanya ahụ eyie ihe dị nta mgbe ụfọdụ.—Tụlee Jenesis 46:29-31.

Ahụmahụ Na-akpaghasị Uche

Ka ọ dịgodị, ị pụrụ iche ọtụtụ nsogbu tara akpụ ihu. Otu ihe ọmụmụ nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu duziri, nke a kpọrọ Children in War (Ụmụaka n’Agha), na-ekpughe, sị: “Ụmụaka ndị a hapụrụ nanị ha bụ ndị nọ n’ihe ize ndụ karị—ndị . . . na-eche ihe mgbochi ndị sikarịsịrị ike ihu iji dị ndụ, ndị na-enweghị nkwado iji tolite otú o kwesịrị nakwa ndị a na-emetọ. Ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe nne na nna ya nọ pụrụ ịbụ otu n’ime mfu ndị kasị akpaghasị uche nye nwatakịrị.” Ikekwe ị na-ahụ onwe gị ka ị na-alụso mmetụta nke ịda mbà n’obi na nkụda mmụọ ọgụ.

Cheta Joaquín, onye a kpọtụrụ aha ná mbụ. Nne na nna ya kewara, mgbe ahụkwa gbahapụ ya na ụmụnne ya. Ọ gbara nanị otu afọ n’oge ahụ, ọ bụkwa ụmụnne ya ndị nwanyị tọrọ ya zụlitere ya. Ọ na-akọwa, sị: “M na-ajụ ihe mere na anyị enweghị nne na nna dị ka ndị enyi m. Mgbe m hụkwara ka nna na nwa ya nwoke na-egwuri egwu, ọ na-adị m ka ya bụrụ nna m.”

Inweta Enyemaka

N’agbanyeghị otú ịbụ onye a zụlitere n’enweghị nne na nna pụrụ isiru n’ike, ọ pụtaghị na ị gaje ịbụ onye na-abaghị uru. Site n’inweta enyemaka na nkwado, ọ bụghị nanị na ị pụrụ ịnọgide na-adị ndụ kama nwee ihe ịga nke ọma. Nke a pụrụ iyi ihe siiri gị ike ikwere, karịsịa ma ọ bụrụ na ị nọ ná mwute na iru újú. Otú ọ dị, ghọta na mmetụta ndị dị otú ahụ bụ ihe o kwesịrị ịbụ nakwa na ha agaghị emekpa gị ahụ ruo mgbe ebighị ebi. N’Eklisiastis 7:2, 3, anyị na-agụ, sị: “Ọ dị mma ije n’ụlọ oruru újú, karịa ije n’ụlọ ọṅụṅụ mmanya vine . . . Iru újú dị mma karịa ịchị ọchị: n’ihi na e sitere n’ịjọ njọ nke ihu mee ka obi dị mma.” Ee, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị ma dị mma ibe ákwá na iru újú mgbe ọdachi dị egwu mere. Ị pụkwara ịhụ ya dị ka ihe na-enye aka ịkọrọ enyi gị nwere nghọta ma ọ bụ otu onye òtù nke ọgbakọ tozuru okè ihe nzuzo gị na unu ikwurịta banyere ihe mgbu ị na-enwe.

N’eziokwu, ị pụrụ ịbụ onye a nwara ikewapụ onwe gị iche. Ma Ilu 18:1 na-adọ aka ná ntị, sị: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.” Ọ ka mma ịchọ enyemaka nke onye nwere obiọma ma nwee nghọta. Ilu 12:25 na-ekwu, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.” Ị pụrụ nanị inweta “okwu ọma” ahụ ma ọ bụrụ na ị kọọrọ mmadụ “nchegbu” gị.

Ònye ka ị pụrụ ịgwa? Chọta nkwado n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Jisọs na-ekwe nkwa na ị pụrụ ịchọta “ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne” n’ebe ahụ bụ́ ndị ga-ahụ gị n’anya, nweekwa nchegbu banyere gị. (Mak 10:30) Joaquín na-echeta, sị: “Isoro ụmụnna ndị Kraịst na-akpakọrịta mere ka m lee ndụ anya n’ụzọ dị iche. Ijechi nzukọ anya dugara m n’inwekwu ịhụnanya n’ebe Jehova nọ nakwa ịchọ ijere ya ozi. Ụmụnna ndị tozuru okè nyere ezinụlọ m enyemaka ime mmụọ na ndụmọdụ. Taa, ụfọdụ n’ime ụmụnne m bụ ndị ozi oge nile.”

Chetakwa na Jehova bụ “Nna nke ụmụ mgbei.” (Abụ Ọma 68:5, 6) Laa azụ n’oge Bible, Chineke gbara ndị ya ume imeso ụmụ mgbei omume n’ụzọ obi ebere na ikpe ziri ezi. (Deuterọnọmi 24:19; Ilu 23:10, 11) O nwekwara ụdị nchegbu dị otú ahụ taa maka ndị ntorobịa na-enweghị nne na nna. Ya mere jekwuru Chineke n’ekpere, na-enwe nchekwube na ihe banyere gị na-emetụta ya nakwa na ọ ga-aza. Eze Devid dere, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m. Na-ele anya Jehova: dị ike, ka obi gị nweekwa ume.”—Abụ Ọma 27:10, 14.

N’agbanyeghị nke ahụ, onye ntorobịa na-enweghị nne na nna na-eche ọtụtụ ihe ịma aka ihu kwa ụbọchị. Ebee ka ị ga-ebi? Olee otú ị ga-esi nweta ego iji na-ebi ndụ? Isiokwu ga-abịa n’ọdịnihu ga-atụle otú a pụrụ isi merie ụfọdụ n’ime ihe ịma aka ndị a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Tupu ọnwụ ya, Jisọs nyefere onye na-eso ụzọ ya bụ́ Jọn nne ya ilekọta, ihe na-eyighị ka ọ gaara eme ma a sị na nna nkuchi ya bụ́ Josef, ka dị ndụ.—Jọn 19:25-27.

b Iji nweta ihe ọmụma banyere otú a pụrụ isi nagide ọnwụ nke nne ma ọ bụ nna, lee isiokwu nke “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” pụtara ná mbipụta nke Teta! August 22 (Bekee) nakwa na September 8, 1994 (Bekee).

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]

“Ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ na olileanya nke mbilite n’ọnwụ enyeworo m aka nke ukwuu”

[Foto dị na peeji nke 17]

Mgbe ụfọdụ ị pụrụ inwe owu ọmụma

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

N’ọgbakọ e nwere ndị enyi pụrụ inyere gị aka ma gbaa gị ume

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya