Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 1/8 p. 10-13
  • Ichebe Nnwere Onwe—n’Ụzọ Dị Aṅaa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ichebe Nnwere Onwe—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmata Ihe Ndị Na-akpata Ekweghị Ibe Nọrọ
  • Ụzọ Kasị Mma Isi Lụsoo Ekweghị Ibe Nọrọ Ọgụ
  • Ikwe Ibe Nọrọ na Ihe Karịrị Ya
  • Echiche Ziri Ezi Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Dịkwuo Ụtọ
    Teta!—1997
  • Ịnagide Ihe—Site n’Otu Akụkụ Gabigara Ókè Gaa n’Ọzọ
    Teta!—1997
  • Ekweghị Okpukpe Ọzọ Dịrị Taa
    Teta!—1999
  • Mmadụ Ịnabata Mmadụ Ibe Ya
    Teta!—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 1/8 p. 10-13

Ichebe Nnwere Onwe—n’Ụzọ Dị Aṅaa?

N’OBERE obodo bụ́ Rengasdengklok, Indonesia, agbụrụ dị iche iche bikọrọ ọnụ n’udo ruo ọtụtụ afọ. Otú ọ dị, ihe yiri ikwe ibe nọrọ e nwere kwụsịrị na January 30, 1997. Ime ihe ike malitere mgbe ọ fọrọ nke nta ka elekere anya atọ nke ụtụtụ kụọ n’otu ụbọchị ememe okpukpe mgbe otu onye kwere ekwe malitere ịkụ ịgba ya. N’imeghachi omume n’ụzụ ahụ, otu nwoke nọ n’okpukpe ọzọ gwara onye agbata obi ya okwu mkparị. Ha barịtara mba, malitekwa ịtụ onwe ha okwute. Chi bọrọ, ọgba aghara mụbakwara ka ndị ọzọ sonyere n’esemokwu ahụ. Tupu chi ejie, e bibiwo ụlọ nsọ ndị Buddha abụọ na anọ n’ime chọọchị Krisendọm. Akwụkwọ akụkọ bụ́ International Herald Tribune kọrọ banyere ihe a merenụ n’okpuru isiokwu bụ́ “Ntakịrị Ekweghị Ibe Nọrọ Akpasuo Ọgba Aghara Agbụrụ.”

N’ọtụtụ mba, agbụrụ ndị ka nta bụ́ ndị iwu na-echebere ihe ndị ruuru ha ọtụtụ mgbe na-abụ ndị a na-adịghị ekwe ka ha nọrọ. N’ụzọ doro anya, ime ka e nwee nnwere onwe site n’iwu adịghị ewepụ ihe ndị na-akpata ekweghị ibe nọrọ. Eziokwu ahụ bụ́ na ekweghị ibe nọrọ zoro ezo apụtaghị na ọ dịghị adị. Ọ bụrụ na ọnọdụ agbanwee n’ọdịnihu ma eleghịkwa anya duga n’ọnọdụ nke ajọ mbunobi, ekweghị ibe nọrọ nke zoro ezo pụrụ ịpụta ìhè ngwa ngwa. Ọ bụrụgodị na a kpagbughị ndị mmadụ kpọmkwem, a pụrụ ibuso ha iro ma ọ bụ a pụrụ ịbịachigide echiche ha. Olee otú a pụrụ isi gbochie nke a?

Ịmata Ihe Ndị Na-akpata Ekweghị Ibe Nọrọ

Anyị na-ajụkarị ma ọ bụ na-enwe obi abụọ banyere ihe dị iche ma ọ bụ ihe a na-adịghị ahụkebe, nke ka nke echiche ndị dị iche na nke anyị. Nke a ọ̀ pụtara na ikwe ibe nọrọ apụghị ikwe omume? Akwụkwọ òtù UN bipụtara bụ́ Elimination of All Forms of Intolerance and Discrimination Based on Religion or Belief depụtara amaghị nke a na-akọ na enweghị nghọta dị ka ihe ndị “so n’ihe ndị kasị akpata ekweghị ibe nọrọ na ịkpa ókè n’ihe banyere okpukpe na nkwenkwe.” Otú ọ dị, a pụrụ ịlụso amaghị nke a na-akọ, nke bụ́ ihe na-akpata ekweghị ibe nọrọ, ọgụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site ná mmụta kwesịrị ekwesị. “Mmụta pụrụ ịbụ ụzọ bụ́ isi nke isi lụsoo ịkpa ókè na ekweghị ibe nọrọ ọgụ,” ka otu akụkọ nke Òtù UN Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na-ekwu.

Gịnị kwesịrị ịbụ nzube nke mmụta a? Magazin bụ́ UNESCO Courier na-atụ aro na kama ịkwalite ịjụ òtù okpukpe dị iche iche, “mmụta maka ikwe ibe nọrọ kwesịrị ilegide anya n’igbochi ihe ndị na-eduga n’ịtụ ndị ọzọ egwu na ịkpapụ ha iche, o kwesịkwara inyere ndị na-eto eto aka ịzụlite ikike ime mkpebi n’onwe ha, iji nlezianya na-eche echiche na inwe ezi uche.”

O doro anya na usoro mgbasa ozi pụrụ ikere òkè dị mkpa n’ịkwalite “iji nlezianya na-eche echiche na inwe ezi uche.” Ọtụtụ òtù nke mba nile na-aghọta ikike usoro mgbasa ozi nwere ịkpụzi echiche na ịkwalite inwerịta nghọta. Otú ọ dị, ọ bụrụ na usoro mgbasa ozi ga-akwalite ikwe ibe nọrọ kama ịkwalite ekweghị ibe nọrọ dị ka ụfọdụ na-eme, a chọrọ nkà ide akụkọ nke a pụrụ ịtụkwasị obi, nke ezi uche dị na ya. Site n’oge ruo n’oge, ndị odeakụkọ aghaghị ime ihe megidere echiche ọha mmadụ na-anakwere. Ha aghaghị ide ihe sitere ná nnyocha e ji ezi nzube mee na nchọpụta ndị ile mmadụ anya n’ihu na-adịghị na ha. Ma nke ahụ ò zuru?

Ụzọ Kasị Mma Isi Lụsoo Ekweghị Ibe Nọrọ Ọgụ

Ikwe ibe nọrọ apụtaghị na onye ọ bụla ga-enwe otu ụdị echiche. Ndị mmadụ nwere ike ha agaghị ekwenyere ibe ha. Ụfọdụ pụrụ iche n’ụzọ siri ike na nkwenkwe nke onye nke ọzọ ezighị nnọọ ezi. Ha pụrụ ọbụna ikwupụta echiche ha dị iche n’ihu ọha. Otú ọ dị, ọ bụrụhaala na ha adịghị akọsa ihe bụ ụgha iji nwaa ịkpali ajọ mbunobi, nke a abụghị ekweghị ibe nọrọ. A na-ahụ ekweghị ibe nọrọ mgbe a na-akpagbu otu ìgwè, jiri iwu ndị pụrụ iche na-ede ha, kpapụ ha iche, machibido ha iwu, ma ọ bụ site n’ụzọ ndị ọzọ gbochie ha ime ihe dị ka nkwenkwe ha si dị. N’ekweghị ibe nọrọ nke gabigara ókè, ụfọdụ na-egbu mmadụ, ndị ọzọ aghaghịkwa ịnwụ n’ihi nkwenkwe ha.

Olee otú a pụrụ isi lụsoo ekweghị ibe nọrọ ọgụ? A pụrụ ịgba ya n’anwụ, dị ka Pọl onyeozi gbara ekweghị ibe nọrọ nke ndị ndú okpukpe nke ụbọchị ya n’anwụ. (Ọrụ 24:10-13) Otú ọ dị, mgbe o kwere mee, ụzọ kasị mma isi lụsoo ekweghị ibe nọrọ ọgụ bụ ibu ụzọ rụọ ọrụ—ịkwalite ikwe ibe nọrọ, ya bụ, ịkụziri ndị mmadụ ịghọta ndị ọzọ nke ọma karị. Akụkọ nke òtù UN banyere ikpochapụ ekweghị ibe nọrọ nke e zoro aka na ya ná mmalite na-ekwu, sị: “Ebe ụdị nile nke ekweghị ibe nọrọ na ịkpa ókè ndị dabeere n’okpukpe ma ọ bụ na nkwenkwe na-amalite n’uche mmadụ, n’ihi ya ọ bụ n’uche mmadụ ka e kwesịrị ibu ụzọ malite ọrụ.” Mmụta dị otú ahụ pụrụ ọbụna ime ka ndị mmadụ n’otu n’otu nyochaa nkwenkwe ha.

Federico Mayor, bụ́ ọga kpata kpata nke Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu, dere, sị: “Ikwe ibe nọrọ bụ omume ọma nke onye nwere nkweta.” Mgbe ọ na-ede ihe na magazin bụ́ Réforme, ụkọchukwu so n’òtù Dominic bụ́ Claude Geffré, kwuru, sị: “Ezigbo ikwe ibe nọrọ na-adabere ná nkweta siri ike.” Onye nkwenkwe ya juru afọ yiri nnọọ ka nkwenkwe nke ndị ọzọ agaghị eyi ya egwu.

Ndịàmà Jehova achọpụtawo na ụzọ magburu onwe ya isi kwalite ikwe ibe nọrọ bụ isoro ndị ọzọ nwere nkwenkwe dị iche kwurịta okwu. Ndịàmà na-eji amụma Jisọs bụ́ na ‘a ga-ekwusa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile’ akpọrọ ihe, a makwaara ha nke ọma maka izisa ozi ọma ha n’ihu ọha. (Matiu 24:14) N’ọrụ a, ha na-enwe ohere ịnụ ka ndị nọ n’ọtụtụ okpukpe dị iche iche—nakwa ndị na-ekweghị na Chineke—na-akọwa nkwenkwe ha. N’aka nke ha, Ndịàmà na-adị njikere ịkọwara ndị chọrọ ịṅa ntị, nkwenkwe ha. N’ụzọ dị otú a ha na-akwalite inwekwu ihe ọmụma na nghọta. Ihe ọmụma na nghọta dị otú a na-eme ka ọ dị mfe karị ikwe ibe nọrọ.

Ikwe Ibe Nọrọ na Ihe Karịrị Ya

N’agbanyeghị ebumnobi kasị mma nke ọtụtụ ndị nwere na mgbalị siri ike nke ụfọdụ ndị na-eme, n’ụzọ doro anya ekweghị okpukpe ọzọ dịrị ka bụ nsogbu taa. Iji nwee mgbanwe n’ezie, ihe ọzọ dị mkpa. Akwụkwọ akụkọ France bụ́ Le Monde des débats mere ka nsogbu ahụ pụta ìhè: “Mmetụta uche na ọnọdụ ime mmụọ na-akọkarị ọha mmadụ nke oge a. Iwu pụrụ ime ka e nwee nnwere onwe pụọ n’aka ndị na-eyi nnwere onwe ikpe okpukpe egwu. Ọ pụrụ, o kwesịkwara ime ka e nwee ịha nhata n’iwu, n’ejighị aka ike na-akpa ókè.” Akwụkwọ bụ́ Democracy and Tolerance na-ekweta, sị: “Anyị ka nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eme iji mezuo nzube nke ime ka inwerịta nghọta na nkwanye ùgwù bụrụ ụkpụrụ akparamàgwà n’ụwa nile.”

Bible na-ekwe nkwa na n’oge na-adịghị anya, a ga-ejikọta ihe a kpọrọ mmadụ n’ezi ofufe nke otu ezi Chineke. Ịdị n’otu a ga-eme ka e nwee ezi òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, bụ́ ebe ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù ga-adị. Amaghị nke a na-akọ agakwaghị eti ụmụ mmadụ ihe otiti, ebe Alaeze Chineke ga-ezi ndị mmadụ ụzọ Jehova, si otú a na-egbo mkpa ọgụgụ isi, mmetụta uche, na nke ime mmụọ ha. (Aịsaịa 11:9; 30:21; 54:13) Ezigbo ịha nhata na nnwere onwe ga-ejupụta ụwa. (2 Ndị Kọrint 3:17) Site n’inweta nghọta ziri ezi banyere nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ, ị pụrụ imeri amaghị nke a na-akọ na ekweghị ibe nọrọ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

E Yie Okpukpe Egwu

N’afọ ndị na-adịbeghị anya gọọmenti anwawo ịkpachi Ndịàmà Jehova nọ na France site n’ịjụ inye ha otu ihe ahụ a na-enye okpukpe ndị ọzọ. Na nso nso a, e bokwasịrị ụtụ isi buru ibu n’onyinye a na-anata maka ịkwado ọrụ okpukpe nke Ndịàmà ahụ. N’ụzọ na-ezighị ezi gọọmenti France bokwasịrị ha oké ụtụ isi bụ́ nde $50 (ụtụ isi na nhá), ná nzube doro anya nke ime ka ike gwụ ìgwè ndị Kraịst a dị 200,000 na ndị na-emere ha ebere na France. Nke a bụ ajọ mbunobi okpukpe doro anya bụ́ nke megidere ụkpụrụ nile nke nnwere onwe, òtù ụmụnna, na ịha nhata.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ekweghị ibe nọrọ na-edugakarị n’ime ihe ike

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

N’agbanyeghị ọrụ okpukpe nke Ndịàmà Jehova, ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti France na-asị na ha abụghị okpukpe!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya