Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 1/8 p. 14-15
  • Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ Chineke?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ike Nọ n’Ọrụ
  • Ọrụ Dị Iche Iche nke Mmụọ Nsọ
  • E Jiri Ike Chineke Mee Ihe Maka Anyị
  • Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Mmụọ Nsọ Ọ̀ Bụ Onye?
    Teta!—2006
  • Otú Mmụọ Chineke Si Duo Ndị Kraịst Na Narị Afọ Mbụ Na Otú O si Edu Ndị Kraịst Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 1/8 p. 14-15

Echiche nke Bible

Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ Chineke?

“Ma mgbe e mere ndị Juu nile baptism, o ruo, mgbe e mesịkwara Jisọs baptism, mgbe ọ na-ekpekwa ekpere, na e meghere eluigwe, mmụọ nsọ wee fedakwasị ya n’oyiyi ahụ, dị ka nduru, olu wee site n’eluigwe, sị, Gị onwe gị bụ ọkpara m m hụrụ n’anya; ihe gị dị m ezi mma.”—Luk 3:21, 22.

N’OKWU ọ gwara otu ìgwè ndị ọkà ihe ọmụma na Gris oge ochie, Pọl onyeozi kpọrọ Chineke “Onyenwe eluigwe na ala.” Ọ bụ Chineke a, ka Pọl kwuru, bụ “Onye kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya” na onye “na-enye mmadụ nile ndụ, na ume, na ihe nile.” (Ọrụ 17:24-28) Olee otú Chineke si emezu ihe a nile? Ọ bụ site na mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ.

Bible na-akọwakwa na Chineke nwere ‘ụba nke ike, na ume n’ike.’ (Aịsaịa 40:26) Ee, ọ bụ Chineke kere eluigwe na ala nile, nke na-egosipụta ịba ụba nke ike ya.

Ike Nọ n’Ọrụ

Ọ gaghị ezicha ezi ikwu na mmụọ nsọ bụ ike Chineke. Nke a bụ n’ihi na mmadụ ma ọ bụ ihe pụrụ inwe ike na-anọghị n’ọrụ n’ime onwe ya, dị ka ike nke dị n’ime batịrị e si n’ọkụ eletrik kwụpụta, nke a na-ejibeghị rụọ ọrụ. Otú ọ dị, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere mmụọ Chineke n’echiche nke ihe nọ n’ọrụ, nke dịtụ ka ike eletrik nke na-esite n’ime batịrị e ji na-arụ ọrụ. (Jenesis 1:2) Ya mere, mmụọ nsọ Chineke bụ ume ọrụ ya nke o zipụworo, ike ya nọ n’ọrụ.

Mgbe ụfọdụ Bible na-ekwu na mmụọ nsọ rụrụ otu ọrụ ma ọ bụ banyere ya ịnọ n’ebe dị iche site n’ebe Chineke nọ. (Matiu 28:19, 20; Luk 3:21, 22; Ọrụ 8:39; 13:4; 15:28, 29) Ụfọdụ ndị gụworo akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị otú ahụ na-ewere ya na mmụọ nsọ bụ onye dị nnọọ iche n’ebe Chineke nọ. N’ihi gịnị ka e ji kwuo banyere ya otú a n’Akwụkwọ Nsọ? Mmụọ nsọ ọ̀ bụ onye dị iche n’ebe Chineke nọ?

Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile dị n’ọdịdị nke dị nnọọ iche n’ebe ihe o kere eke a na-ahụ anya dị. Ọ bụ mmụọ, nke anya anyị a kpaara ókè na-adịghị ahụ. (Jọn 4:24) Bible na-ekwu na Jehova Chineke bi n’eluigwe na o sikwa n’ebe ahụ na-elekwasị ihe a kpọrọ mmadụ anya. (Abụ Ọma 33:13, 14) Nke a kwere nghọta. Onye Okike ahụ aghaghị ịdị ukwuu karịa ihe ndị o ji na-arụ ọrụ. Ọ na-aghọtazu ha, na-eji ha eme ihe, na-eme ha, ma na-achịkwa ha.—Jenesis 1:1.

Site n’ebe obibi ya a na-adịghị ahụ anya, Chineke pụrụ ime ka ihe mee mgbe ọ bụla na n’ebe ọ bụla. N’ihi ya, ọ dịghị ya mkpa ịnọ n’ebe ike ọrụ ya nọ na-arụ ọrụ. Ọ pụrụ izipụ mmụọ ya ịrụzu otu ọrụ. (Abụ Ọma 104:30) Nke a pụrụ ịdịrị ndị mmadụ n’oge a mfe nghọta bụ́ ndị na-eji ígwè remote control na-enweghị waya na-achịkwa ngwá ụlọ dị iche iche. Taa anyị na-amata ikike nke ike ndị a na-adịghị ahụ anya dị ka ike elektrik ma ọ bụ ụzarị ìhè. N’otu aka ahụ, Chineke pụrụ iji ike ya dị nsọ, ma ọ bụ mmụọ ya, nke a na-adịghị ahụ anya mezuo ihe ọ bụla o zubere ime, n’esighị n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ.—Aịsaịa 55:11.

N’oge Bible, echiche a pụrụ isiworị ike nghọta. Obi abụọ adịghị ya na ikwu banyere mmụọ nsọ dị ka ike dị iche nyeere ndị na-agụ banyere ya aka ịghọta otú Chineke si eji ike ya eme ihe, ọ bụ ezie na ọ dịghị anọ n’ebe ahụ ike ya na-arụ ọrụ n’onwe ya. Mgbe Bible na-ezo aka n’ebe mmụọ nsọ dị na o mewo nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ihe ọ na-ekwu n’ezie bụ na Chineke n’onwe ya ezipụwo ma ọ bụ jiri ike ya mee ihe n’ahụ mmadụ ma ọ bụ ihe iji mezuo uche ya.

Ọrụ Dị Iche Iche nke Mmụọ Nsọ

Jehova jiri mmụọ nsọ kee ihe nile dị ndụ na ndị na-adịghị ndụ. (Abụ Ọma 33:6) Chineke jikwara ya bibie ọgbọ nke ụmụ mmadụ na-eme ihe ike, na-enweghịkwa nchegharị, site n’iju mmiri. (Jenesis 6:1-22) Ọ bụkwa otu ike ọrụ a ka Chineke jiri bufee ndụ dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara ya n’akpa nwa nke onye Juu na-amaghị nwoke bụ́ Meri.—Luk 1:35.

Mgbe ụfọdụ, mmụọ ahụ nyere ụmụ mmadụ ume ikwupụta eziokwu ahụ n’ihu ndị iro n’atụghị egwu na n’obi ike, ọtụtụ mgbe na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ. (Maịka 3:8) E nwekwara ọtụtụ ihe atụ na Bible, karịsịa ndị metụtara amụma, mgbe e ji ike a nye ndị ikom na ndị inyom nghọta pụrụ iche. Ebe ọ na-adịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ikwu ihe ọdịnihu ga-abụ kpọmkwem, nke a bụ ọrụ dị ịrịba ama nke mmụọ ahụ.—2 Pita 1:20, 21.

Mmụọ ahụ pụkwara inye ndị mmadụ ike ịrụ ọrụ ebube. Dị ka ihe atụ, site n’ike a, Jisọs pụrụ ịchịkwa ike nke okike, ịgwọ ọrịa dị iche iche, na ọbụna ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Luk 4:18-21; 8:22-26, 49-56; 9:11) E jiri mmụọ ahụ mee ihe n’ịhazi na inye ndị Kraịst oge mbụ ume iji jee ozi dị ka ndị àmà Chineke n’ụwa nile.—Ọrụ 1:8; 2:1-47; Ndị Rom 15:18, 19; 1 Ndị Kọrint 12:4-11.

E Jiri Ike Chineke Mee Ihe Maka Anyị

Ọ̀ ga-ekwe omume ndị ohu Chineke bụ́ mmadụ taa inwetatụ ike site n’isi iyi a na-adịghị agwụ agwụ nke ume? Ee! Chineke na-enye ndị ya ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke mmụọ nsọ iji nyere ha aka ịghọta na imezu uche ya. Ọ na-enye ndị rịọrọ arịrịọ sitere n’ezi obi, e ji ekpere rịọ, ndị nwere obi ziri ezi, ndị na-ebi ndụ kwekọkwara n’ihe ndị ọ chọrọ, mmụọ ya. (1 Ndị Kọrint 2:10-16) Mmụọ ahụ pụrụ iji “ọkịka nke ike” kwadebe ụmụ mmadụ na-ezughị ókè, na-eme ka ha nwee ike ijere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ihe mgbochi. Mgbe ahụ, n’ezie, ọ bụ ọchịchọ nke ndị nile na-atụ egwu Chineke inweta ma jigide mmụọ Chineke.—2 Ndị Kọrint 4:7; Luk 11:13; Ọrụ 15:8; Ndị Efesọs 4:30.

N’isi nso Chineke ga-eji ike a bara ụba kwụsị ikpe na-ezighị ezi na nhụjuanya dị n’ụwa ọjọọ a, si otú ahụ doo aha ya dị nsọ ma dị ukwuu nsọ. Mmụọ nsọ ga-enwe mmetụta dị mma n’ụwa dum, mkpụrụ ya ga-apụtakwa ìhè ka mmadụ nile hụ, na-enye Onye Nwe ya otuto.—Ndị Galetia 5:22, 23; Mkpughe 21:3, 4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya