Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 2/8 p. 4-6
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Nzube Chineke?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Nwere Nzube
  • A Rụpụta Ihe Dị Mma
  • Alaeze Chineke nke Otu Puku Afọ
  • Tụkwasị Jehova Obi na Ọ Ga-emezu Nzube Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Nkwere Chineke Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị Na-eru Ọgwụgwụ Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Alaeze Chineke—Ịchịisi Ọhụrụ Nke Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ahụhụ Nile Ga-akwụsị n’Isi Nso!
    Ahụhụ Nile Ga-akwụsị n’Isi Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 2/8 p. 4-6

Gịnị Bụ Nzube Chineke?

ỌTỤTỤ mmadụ bụ́ ndị nwere obi abụọ banyere ịdị adị nke Chineke kasị ike, nke na-ahụ n’anya na-ajụ, sị: Ọ bụrụ na Chineke dị adị, n’ihi gịnị ka o jiworo kwere ka nhụjuanya na mmebi iwu dị ukwuu dịrị n’akụkọ ihe mere eme nile? N’ihi gịnị ka o ji kwe ka ọnọdụ dị mwute nke ihe ndị anyị na-ahụ gburugburu anyị taa dịrị? Gịnị mere na o meghị ihe iji kwụsị agha, mpụ, ikpe na-ezighị ezi, ịda ogbenye, na nhụsianya ndị ọzọ na-arị elu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu n’ọtụtụ mba nke ụwa?

Ụfọdụ na-ekwu na Chineke kere eluigwe na ala, tinye ụmụ mmadụ n’ime mbara Ụwa, ma hapụzie ha ịchịkwa ihe omume ha. Dị ka echiche a na-egosi, ọ bụghị Chineke ka a ga-ata ụta maka nsogbu na nhụsianya ụmụ mmadụ wetaara onwe ha n’ihi anyaukwu ma ọ bụ ejizighị ihe ha.

Otú ọ dị, ndị ọzọ adịghị anabata nchepụta dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, prọfesọ physics bụ́ Conyers Herring, bụ́ onye sịrị na ya kwenyere na Chineke, na-ekwu, sị: “Anabataghị m echiche ahụ bụ́ na e nwere Chineke, onye tinyere usoro na-arụ ọrụ ka klọọkụ eri ogologo oge gara aga ma fanye aka n’ụkwụ kemgbe ahụ na-ekiri ka ihe a kpọrọ mmadụ na-agbaso nsogbu ndị siri ike mgba. Otu ihe kpatara nnabata m na-anabataghị nke a bụ na ahụmahụ m nwere na nkà mmụta sayensị enyeghị m ihe ọ bụla mere m ga-eji kwere na e nwere ụdị eluigwe na ala ọ bụla ‘na-arụ ọrụ ka klọọkụ’ nke bụ nnọọ ezigbo ya n’ikpeazụ. A pụrụ ime ka nchepụta nkà mmụta sayensị anyị . . . dịkwuo mma karị mgbe nile, ma eji m n’aka na ọ dịghị mgbe a na-agaghị achọpụta na ha ezughị okè. Echere m na ọ ka mma inwe okwukwe n’ikike ahụ dị ndụ nke na-eme ka ọganihu a kwe omume mgbe nile.”

Chineke Nwere Nzube

Nzube mbụ nke Chineke bụ ka ndị ezi omume, bụ́ ụmụ mmadụ zuru okè biri na mbara Ụwa. Aịsaịa onye amụma dere, sị: “Otú a ka Jehova Nke keworo eluigwe sịrị; Ya onwe ya bụ Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya; Ya onwe ya mere ka o guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.”—Aịsaịa 45:18.

Kama imejupụta ụwa site n’ikepụta mmadụ otu otu, Chineke zubere iji ọmụmụ site n’aka ụmụ mmadụ mejupụta ụwa. Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, nke a emebighị nzube mbụ ya, ma ọ kpatara mgbanwe kwesịrị ekwesị nke ụfọdụ ihe ndị dị mkpa ka e wee mezuo nzube ya maka ụmụ mmadụ na ụwa.

Ruo ihe dị ka afọ 6,000 mbụ n’ime oge a, Chineke ahapụwo ihe a kpọrọ mmadụ ime ihe n’adabereghị ná nduzi sitere n’aka ya kpọmkwem. Nke ahụ bụ ihe nne na nna anyị mbụ ji aka ha họrọ. (Jenesis 3:17-19; Deuterọnọmi 32:4, 5) Adabereghị ná nduzi Chineke a nke o kwere ka ọ dịrị na ọchịchị mmadụ sochirinụ kama nke Chineke, ga-egosipụta enweghị ike mmadụ ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike na enweghị ike ya ịchị mmadụ ibe ya n’ụzọ gara nke ọma.

Otú ọ dị, Jehova amarawo ihe a si na ya pụta tupu o mee. O nyere ndị so dee Bible mmụọ nsọ idetu ya. Dị ka ihe atụ, Jeremaịa onye amụma dere, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.

Nwoke ahụ nwere amamihe bụ́ Solomọn kwuru okwu banyere ajọ ihe na-esochinụ mgbe ụmụ mmadụ nwara ịchị mmadụ ibe ha, dị ka ha meworo n’ọtụtụ narị afọ. “Ihe nile a ka m hụworo, m wee nye obi m ịrụ ọrụ ọ bụla nke a rụworo n’okpuru anyanwụ: mgbe dị mgbe otu mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.

Otú ọ dị, n’abụtụghị onye ‘fanyere aka n’ụkwụ na-ekiri ka ihe a kpọrọ mmadụ na-agbaso nsogbu ndị siri ike mgba,’ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile enwewo ezi ihe mere o ji kwere ka ọtụtụ afọ ndị a gabiga n’etinyeghị aka kpọmkwem ná ndụ nke ihe ka n’ihe a kpọrọ mmadụ.

A Rụpụta Ihe Dị Mma

Afọ 6,000 gara aga nke akụkọ ihe mere eme mmadụ pụrụ iyi ogologo oge ma e jiri ya tụnyere nkezi nke oge ndụ anyị nke na-erughị afọ 100. Ma dị ka ọgụgụ oge nke Chineke sị dị na otú o si ele oge na-agafenụ anya, ọtụtụ puku afọ ndị a dị ka ụbọchị isii—ihe na-erughị otu izu! Pita onyeozi kọwara, sị: “Unu ekwela ka otu ihe a mee unu nchefu, ndị m hụrụ n’anya, na otu ụbọchị dị ka [otu puku afọ] n’anya Onyenwe anyị, [otu puku afọ] dịkwa ka otu ụbọchị.”—2 Pita 3:8.

Ya mere Pita na-aga n’ihu ịgbagha ebubo ọ bụla nke nleghara anya ma ọ bụ iyigharị oge nke e boro Chineke, site n’ịgbakwụnye, sị: “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.”—2 Pita 3:9.

N’ihi ya mgbe afọ ndị ọ kara aka bịara ná njedebe, Onye Okike ga-akwụsị ojiji e ji mbara ụwa anyị mara mma na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ ga-enyeworị oge zuru ezu ka mmadụ gosipụta enweghị ike ya ịchị achị ma ọ bụ ịkwụsị agha, ime ihe ike, ịda ogbenye, ọrịa, na ihe ndị ọzọ na-akpata nhụjuanya. Site n’ihe mere eme, nke a ga-emesi ihe Chineke chọrọ n’aka mmadụ ná mmalite ike—na ha aghaghị ịgbaso nduzi Ya iji nwee ihe ịga nke ọma.—Jenesis 2:15-17.

Dị ka mmezu nke amụma Bible si gosi, anyị bi ugbu a n’akụkụ ikpeazụ nke “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke. (2 Timoti 3:1-5, 13; Matiu 24:3-14) Nkwere Chineke kwere ka ọchịchị mmadụ nke na-adabereghị n’ebe ọ nọ nakwa mmebi iwu na nhujuanya dịrị na-abịaru njedebe ya. (Daniel 2:44) N’oge na-adịghị anya mkpagbu kasị ukwuu nke ụwa a hụtụrụla ga-abịakwasị anyị, na-ejedebe ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,’ bụ́ Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16) Agha a nke Chineke ga-eduzi agaghị ebibi aka ọrụ Chineke bụ́ ụwa, ma ọ ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa.’—Mkpughe 11:18.

Alaeze Chineke nke Otu Puku Afọ

A ga-enwe ọtụtụ nde ndị ga-adị ndụ n’ụwa mgbe Amagedọn gasịrị. (Mkpughe 7:9-14) A ga-emezuworị amụma ahụ dị n’Ilu 2:21, 22, bụ́: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”

Nzube Chineke bụ na oge pụrụ iche nke otu puku afọ ga-esochi agha ezi omume ahụ bụ́ Amagedọn. (Mkpughe 20:1-3) Nke a ga-abụ Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, dị ka Eze nke Alaeze eluigwe Chineke. (Matiu 6:10) N’oge ịchịisi Alaeze a na-enye ọṅụ n’ụwa, a ga-akpọlite ọtụtụ nde ụmụ mmadụ site n’ụra ọnwụ ha isonyere ọtụtụ nde ndị lanarịrị Amagedọn. (Ọrụ 24:15) A ga-eweghachikọta ha nile n’izu okè, mgbe ahụkwa—ná ngwụsị nke Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst ahụ—ụwa ga-emesịzi jupụta ná ndị ikom na ndị inyom zuru okè, bụ́ ụmụ Adam na Iv. A ga-emezuworị nzube Chineke n’ụzọ dị ebube na n’ụzọ gara nke ọma.

Ee, nzube Chineke bụ ‘ihichapụ anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo. Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.’ (Mkpughe 21:4, 5) A ga-emezurịrị nzube ahụ n’ọdịnihu dị nnọọ nso.—Aịsaịa 14:24, 27.

[Foto dị na peeji nke 5]

N’ime ụwa ọhụrụ Chineke, ụmụ mmadụ ga-ebi n’obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya