Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 2/8 p. 7-9
  • Ịmata Nanị Ezi Chineke Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmata Nanị Ezi Chineke Ahụ
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aha E Ji Amata Ya
  • Jehova Ka Ọ̀ Bụ Yahweh?
  • Ọ̀ Dị Ihe O Mere n’Ezie?
  • Àgwà Ezi Chineke Ahụ
  • E Kpughee Ezi Chineke Ahụ
  • Ònye Bụ Jehova?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-akpọ Aha Chineke Ọ Bụ Ezie na Otú E Si Akpọ Ya Edochaghị Anyị Anya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • A4 Otú Aha Chineke Si Gbaa n’Akwụkwọ Nsọ Hibru
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Aha Chineke
    Teta!—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 2/8 p. 7-9

Ịmata Nanị Ezi Chineke Ahụ

Ọ FỌRỌ nke nta ka ọ bụrụ na ruo oge nile ụmụ mmadụ dịworo adị, ha enwewo ọtụtụ chi. E nwewo ọtụtụ nke na o siri ike ikwu kpọmkwem chi na chi nwanyị ole e feworo ofufe gburugburu ụwa—ma o ruru ọtụtụ nde.

Ebe e gosipụtaworo na e nwere Chineke, anyị na-ajụzi, Ole nke n’ime chi nile a na-efe ofufe gburugburu ụwa, ma ugbu a ma n’oge gara aga, bụ ezi Chineke ahụ? E kwuru n’ụzọ doro anya na e nwere nanị otu ezi Chineke bụ́ onye a pụrụ ịmata otú ahụ n’ime Bible na Jọn 17:3: “Ma nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”

Aha E Ji Amata Ya

Ọ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya na aha aka ga-adị chi ọ bụla a ma ama mkpa iji mee ka ọ dị iche n’ebe chi ndị ọzọ nwere aha nke ha dị. Ọ ga-akasị mma ịbụ aha chi ahụ nyere onwe ya, kama ịbụ aha ndị na-efe ya nyere ya.

Otú ọ dị, banyere nke a, otu eziokwu siri nnọọ ike nghọta na-ebilite. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’okpukpe ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike na-enye chi ha aha aka ha, ndị Juu na chọọchị ndị bụ́ isi nke Krisendọm enwebeghị ike iji aha aka pụrụ iche mee ka a mata chi nke ha na-efe. Kama nke ahụ, ha na-eji utu aha ndị dị ka Onyenwe anyị, Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, na Nna, na-eme ihe.

Mgbe ọ na-ede ihe n’akwụkwọ bụ́ Theology, onye na-ede akwụkwọ bụ́ David Clines kwuru ihe a na-esonụ: “N’ihe dị ka n’agbata narị afọ nke ise na nke abụọ B.C., otu ihe ọghọm dị oké njọ dakwasịrị Chineke: aha ya funahụrụ ya. Ikwu ihe merenụ kpọmkwem, ndị Juu kwụsịrị iji aha aka Chineke bụ́ Yahweh na-eme ihe, malitekwa iji nkebi okwu ndị dịtụ ogologo na-ezo aka na Yahweh: Chineke, Onyenwe anyị, Aha ahụ, Onye Dị Nsọ, Ọnụnọ ahụ, ọbụna Ebe ahụ. Ọbụna n’ebe e dere Yahweh n’ihe odide nke Bible, ndị na-agụ ya kpọpụtara aha ahụ dị ka Adonai. Mgbe e mesịrị bibie ụlọ nsọ ahụ kpam kpam, ọbụna ememe okpukpe ndị a na-adịghị emekebe bụ́ mgbe a na-eji aha ahụ eme ihe kwụsịrị, ọbụna e chefukwara otú e si akpọpụta aha ahụ.” Otú ọ dị, ọ dịghị onye pụrụ ikwu kpọmkwem mgbe ndị Juu na-agbaso ọdịnala kwụsịrị ịkpọpụta aha Chineke ma jiri okwu Hibru maka Chineke na Eze Onyenwe anyị dochizie anya ya.

Mgbe ahụ, o yiri ka ihe mbụ kpọmkwem dị mkpa ime n’ọchịchọ ọ bụla a na-achọ ịmata ‘nanị ezi Chineke ahụ’ ga-abụ iji aha ya mara ya. Ime nchọpụta dị otú ahụ esighị ike ma ọlị, n’ihi na e dere aha Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Onye Okike, n’ụzọ doro anya ma dị mfe n’Abụ Ọma 83:18: “Ka ụmụ mmadụ wee mara na gị, onye aha nanị gị bụ JEHOVA, bụ onye kasị ihe nile elu n’ụwa nile.”—King James Version.

Jehova Ka Ọ̀ Bụ Yahweh?

Ọ bụ ezie na aha Jehova pụtara na King James Version na ná nsụgharị Bible ndị ọzọ, ụfọdụ na-ahọrọ iji aha ahụ bụ́ Yahweh na-eme ihe kama iji Jehova. Olee aha nke ziri ezi?

E dere ihe odide Bible ndị kasị ochie n’asụsụ Hibru. N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, aha Chineke pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000, e jikwa mgbochiume anọ asụpe ya—YHWH ma ọ bụ JHVH. A na-akpọkarị okwu ndị a mgbochiume anọ mejupụtara Tetragrammaton, ma ọ bụ Tetragram, nke e nwetara site n’okwu Grik abụọ pụtara “mkpụrụ akwụkwọ anọ.” Ugbu a okwu banyere mkpọpụta ziri ezi na-ebilite n’ihi na ihe mejupụtara ihe odide mbụ nke Hibru bụ mgbochiume na-enweghị ụdaume iji duzie onye na-agụ ya. Ya mere ma mkpọpụta nke Tetragrammaton ahụ ọ̀ ghọrọ Yahweh ma ọ bụ Jehova na-adabere n’ụdaume nke onye na-agụ ya tinyere na mgbochiume anọ ahụ. Taa ọtụtụ ndị ọkà mmụta Hibru na-ahọrọ Yahweh dị ka mkpọpụta nke bụ ezie.

Otú ọ dị, Jehova kasị mma n’ihi inwe nkwekọ. N’ụzọ dị aṅaa? A nabatawo mkpọpụta ahụ bụ́ Jehova n’asụsụ Bekee ruo ọtụtụ narị afọ. Ndị na-akwadoghị iji mkpọpụta a na-eme ihe ekwesịghịkwa ịkwado ojiji e ji mkpọpụta ahụ a nakweere bụ́ Jeremaịa na ọbụna Jisọs na-eme ihe. Ọ ga-adị mkpa ịgbanwe Jeremaịa ịbụzi Yir·meyahʹ ma ọ bụ Yir·meyaʹhu, bụ́ mkpọpụta mbụ ya na Hibru, Jisọs ga-abụzikwa Ye·shuʹaʽ (Hibru) ma ọ bụ I·e·sousʹ (Grik). N’ihi ya, ọtụtụ ndị mmụta Bible, gụnyere Ndịàmà Jehova, na-eche na inwe nkwekọ na-akwado ojiji nke e ji “Jehova” a marawororị nke ọma na ihe ndị yiri ya n’asụsụ ndị ọzọ na-eme ihe.

Ọ̀ Dị Ihe O Mere n’Ezie?

Ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka na ọ dịghị ihe o mere n’ezie ma ị kpọrọ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile aha aka ya ma ọ bụ na ị kpọghị ya, o jukwara ha afọ ikwu banyere Chineke na ịkpọ ya Nna ma ọ bụ nanị Chineke. Otú ọ dị, okwu abụọ ndị a bụ utu aha kama ịbụ aha, ha abụghịkwa aha aka ma ọ bụ nke na-eme ka ihe pụọ iche. N’oge Bible e jiri okwu ahụ e ji eme ihe maka Chineke (ʼElo·himʹ, Hibru) kọwaa chi ọ bụla—ọbụna chi ndị Filistia na-ekpere arụsị nke a kpọrọ Degon. (Ndị Ikpe 16:23, 24) Ya mere onye Hibru ịgwa onye Filistia na ya, bụ́ onye Hibru ahụ, ne-efe “Chineke,” agaghị emeworị ka a mata ezi Chineke ahụ ọ na-efe ofufe.

Otu ihe na-akpali mmasị bụ ihe e kwuru n’akwụkwọ bụ́ The Imperial Bible-Dictionary nke 1874: “[Jehova] bụ aha aka n’ebe nile, na-egosipụta Chineke bụ́ onye, nanị ya kwa; ebe Elohim nwere ọdịdị nke ahaizugbe karị, na-egosikarị Ọkaaka ahụ n’ezie, ma ọ naghị abụcha otú ahụ, nke o ji abụkwanụ otu ahụ mgbe nile. . . . Onye Hibru pụrụ ịkpọ Elohim ahụ, bụ́ ezi Chineke ahụ, n’ụzọ mere ka ọ dị iche n’ebe chi ụgha nile dị; ma ọ naghị akpọ Jehova ahụ ma ọlị, n’ihi na Jehova bụ aha nke nanị ezi Chineke ahụ. Ọ na-akpọkarị Chineke m . . . ; ma ọ bụghị Jehova m ma ọlị, n’ihi na mgbe ọ kpọrọ Chineke m, ọ bụ Jehova ka o bu n’obi. Ọ na-ekwu banyere Chineke nke Israel, ma ọ bụghị banyere Jehova nke Israel ma ọlị, n’ihi na e nweghị Jehova ọzọ. Ọ na-ekwu banyere Chineke dị ndụ, ma ọ bụghị banyere Jehova nke dị ndụ ma ọlị, n’ihi na ọ pụghị ịghọta Jehova n’ụzọ ọzọ ma ọ bụghị na ọ na-adị ndụ.”

Àgwà Ezi Chineke Ahụ

Otú ọ dị, nanị ịmata aha mmadụ apụtaghị na anyị maruru ya ala. Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị maara aha ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama. Ọbụna ndị ikom na ndị inyom a ma ama ná mba ndị ọzọ pụrụ inwe aha ndị anyị maara nke ọma. Ma nanị ịmata aha ha—ọbụna otú e si akpọpụta ha n’ụzọ ziri ezi—adịghị apụta n’onwe ya na anyị ma ndị a n’onwe anyị ma ọ bụ mara ụdị mmadụ ha bụ. N’otu aka ahụ, iji mara nanị ezi Chineke ahụ, ọ dị anyị mkpa ịmata ma nwee mmasị n’àgwà ya.

Otú ọ dị, ọ bụ eziokwu na ọ dịtụghị mgbe ụmụ mmadụ ga-enwe ike ịhụ ezi Chineke ahụ anya, ma o jiriwo obiọma mee ka e detuoro anyị ọtụtụ nkọwa zuru ezu banyere ụdị onye ọ bụ n’ime Bible. (Ọpụpụ 33:20; Jọn 1:18) E mere ka ụfọdụ ndị amụma bụ́ ndị Hibru site n’ike mmụọ nsọ hụ ogige eluigwe nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile n’ọhụụ. Ihe ha na-akọwa adịghị egosi nanị ùgwù dị ukwuu na oké ebube na ike kamakwa ịdị jụụ, ịdị n’usoro, ịma mma, na ịdị ụtọ.—Ọpụpụ 24:9-11; Aịsaịa 6:1; Ezikiel 1:26-28; Daniel 7:9; Mkpughe 4:1-3.

Jehova Chineke kọwaara Mosis ụfọdụ n’ime àgwà ya na-adọrọ adọrọ ma na-akpali mmasị, dị ka e dekọrọ n’Ọpụpụ 34:6, 7: “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; Onye na-edebere [ọtụtụ puku] ebere, Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie.” Í kwenyeghị na ịma àgwà Chineke ndị a na-eme ka anyị bịa ya nso, na-emekwa ka anyị chọọ ịmatakwu ihe banyere ya dị ka onye?

Ọ bụ ezie na ọ dịghị mmadụ ga-enwe ike ịhụ Jehova Chineke n’ebube ya na-egbukepụ egbukepụ, e dekọrọ na mgbe Jisọs Kraịst bụ mmadụ n’elu ụwa, o gosipụtara n’ezie ụdị onye Jehova Chineke, bụ́ Nna ya nke eluigwe, bụ. N’otu oge Jisọs sịrị: “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla n’Onwe ya, ma ọ bụghị ihe Ọ hụrụ na Nna Ya na-eme: n’ihi na ihe ọ bụla Ya onwe ya na-eme, ndị a ka Ọkpara Ya na-emekwa otú ahụ.”—Jọn 5:19.

Ya mere anyị pụrụ ikwubi site na nke a na obiọma, ọmịiko, ịdị nwayọọ, na omume enyi nke Jisọs nakwa ịhụnanya siri ike ọ hụrụ ezi omume na ịkpọasị ọ kpọrọ ajọ omume bụcha àgwà ndị Jisọs hụrụ n’ime Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, mgbe ya na Jisọs nọ n’ogige eluigwe tupu ọ ghọọ mmadụ n’elu ụwa. Ya mere, mgbe anyị ji nghọta matazuo n’ezie ihe aha ahụ bụ́ Jehova pụtara, n’ezie anyị nwere ihe nile mere anyị ga-eji nwee mmasị n’ebe aha nsọ ahụ dị ma gọzie ya, too ma bulie ya elu, tụkwasịkwa ya obi.

Isi n’ụzọ dị otú a mata nanị ezi Chineke ahụ bụ n’ezie usoro na-adịghị agwụ agwụ, dị ka a kọwapụtara ya n’ụzọ doro anya ná nsụgharị nke Jọn 17:3 na New World Translation of the Holy Scriptures. N’ebe a ọdịdị okwu ziri ezi nke ngwaa ahụ bụ́ “ịmara” na-enye aka nke ukwuu, n’ihi na e jiri okwu na-egosi ihe na-eme na-aga n’ihu mee ihe kama iji okwu na-egosi ihe na-eme ugbu a. Ya mere, anyị na-agụ: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha na-anara ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke, na nke onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” Ee, ịnọgide na-anara ihe ọmụma banyere nanị ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, na nke Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ usoro na-ekwesịtụghị ịkwụsị akwụsị.

E Kpughee Ezi Chineke Ahụ

N’ihi ya, a pụrụ ikewapụ ezi Chineke ahụ iche n’ọtụtụ chi ụgha, n’ụzọ dị mfe. Ọ bụ Onye Okike pụrụ ime ihe nile nke eluigwe na ala, tinyere mbara Ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ bi n’ime ya. O nwere aha aka pụrụ iche—Jehova, ma ọ bụ Yahweh. Ọ bụghị akụkụ nke chi atọ n’ime otu dị omimi, ma ọ bụ Atọ n’Ime Otu. Ọ bụ Chineke nke ịhụnanya, ọ na-achọkwa ka mmadụ o kere eke nweta nnọọ ihe kasị mma. Ma ọ bụkwa Chineke nke ikpe ziri ezi, ọ gaghị ekwe ka ndị na-anọgide na-emebi ụwa ma na-akwalite agha na ime ihe ike dịgide ruo ebighị ebi.

Jehova ekpughewo mkpebi ya nke na-abụghị nanị iwepụ ajọ omume na nhụjuanya n’ụwa kamakwa ime ya ka ọ ghọọ paradaịs, ebe ụmụ mmadụ ndị nwere obi eziokwu pụrụ ibi n’obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:10, 11, 29, 34) Ugbu a Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile echiwo Ọkpara ya, bụ́ Jisọs, Eze eluigwe nke Alaeze Chineke, n’oge na-adịghịkwa anya Jisọs ga-eweta ụwa ọhụrụ nke ezi omume ahụ ma wetaghachi ọnọdụ Paradaịs n’ụwa anyị.—Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10.

Anyị nwere olileanya na ugbu a i nwere ike ịza ajụjụ ahụ bụ́, Chineke ọ̀ dị adị n’ezie? na ịmata ezi Chineke ahụ, n’ụzọ dị mfe karị.

[Foto dị na peeji nke 9]

Jisọs Kraịst mere ka a mara Jehova dị ka nanị ezi Chineke ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya