Ụdị Uwe Anyị Na-eyi—Ọ̀ Dị Ihe O Mere N’ezie?
“AMAGHỊ m ihe m ga-eyi!” Arịrịọ a maka enyemaka ọ̀ bụ ihe ị na-anụkarị? N’ezie, ụlọ ọrụ ndị na-akwa ákwà taa na-enwe oké mmasị iji uwe ndị kasị ọhụrụ ha nwere nyere gị aka—ma ọ bụ ọbụna megharịkwuo gị anya.
Iji mee ka mkpebi sikwuo ike, n’ụbọchị ndị a a pụrụ ịgba gị ume iji ejiji, ọ bụghị n’ụzọ kwesịrị ekwesị, kama n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Banyere àgwà a gbanwere agbanwere nke afọ ndị 1990, otu uche akwụkwọ akụkọ nke na-ekwu banyere ejiji na-ekwu, sị: “Ọ pụrụ ịbụ ihe na-emesi obi ike ịmata na ọ bụghị nanị na ọ dị mma iyi uwe e metọtụrụ emetọ, nke metụrụ ochie, nke rikasịtụrụ erikasị na nke ṅachara aṅacha n’ozuzu ya, kama ọ bụ ihe a na-achọsi ike.”
N’eziokwu, n’afọ ndị na-adịbeghị anya mkpọsa ngwá ahịa ndị bụ́ ịgba, ndị e ji eme mkpọsa ngwá ahịa na TV, ndị ọgbọ, ibuli onwe onye elu, nakwa ịdị iche enwewo mmetụta dị ukwuu n’ụdị uwe ndị mmadụ na-eyi, nke ka nke n’ahụ ndị na-eto eto. Ọbụna ụfọdụ n’ime ha na-ezu ohi ka ha yie ụdị uwe ọhụrụ.
Ọtụtụ ụdị uwe na-ewu ewu n’afọ ndị 1990 malitere n’etiti ndị na-emebiga ihe ókè nke afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, dị ka ndị nnupụisi nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ nke afọ ndị 1960. Afụ ọnụ, ogologo ntutu a na-abọghị abọ, na uwe tetọchara etetọ gosiri ọjụjụ a jụrụ ụkpụrụ ọkpụtọrọkpụ. Ma ejiji nnupụisi kpalitekwara ịgbaso ụkpụrụ ọhụrụ, ụdị nrụgide ọhụrụ nke ndị ọgbọ.
Uwe aghọwo ihe e ji eme ihe na nke na-ekwupụta ụdị onye mmadụ bụ karị. Uwe, karịsịa T-shirt, aghọwo bọọdụ mkpọsa ozi nke na-akpọsa n’ekwughị okwu egwuregwu ndị na-ewu ewu na ndị a ma ama n’egwuregwu, ihe ọchị, iwe, ịchọ okwu, omume ọma—ma ọ bụ nke rụrụ arụ—na ngwá ahịa. Ma ọ bụ ha pụrụ ịwụ akpata oyi n’ahụ. Tụlee otu isi akụkọ pụtara na nso nso a na magazin bụ́ Newsweek: “Obi Ọjọọ Bụ Ihe Uwe Ndị Nọ n’Afọ Iri na Ụma Na-ekwu.” Isiokwu ahụ na-ehota ihe otu onye dị afọ 21 na-ekwu banyere T-shirt ya, sị: “M na-eyi ya n’ihi na ọ na-agwa ndị mmadụ otú obi dị m. Achọghị m onye ọ bụla ịkparị m, achọghịkwa m ka onye ọ bụla nye m nsogbu.”
Ihe a na-egosi n’ihu na n’azụ ha pụrụ ịdị iche site n’otu onye gaa n’onye ọzọ. Ma ịgbaso ụkpụrụ ọhụrụ—ihe e ji amata otu ìgwè ma ọ bụ mmụọ nnupụisi zuru ebe nile, nke m godị, omume rụrụ arụ, ma ọ bụ ime ihe ike—na-apụta ìhè. Otu onye na-akwa ákwà na-etinye oghere n’uwe dị ka onye nwe ya si chọọ. “Ha pụrụ ịhọrọ oghere égbè ntakịrị, oghere nnukwu égbè, ma ọ bụ oghere égbè na-awụ mgbọ,” ka ọ na-ekwu. “Ọ bụ nanị ihe uwe na-ekwu.”
Gịnị Ka Ejiji Na-egosi?
“N’ozuzu ya uwe bụ otu ụzọ i si eme ka a mata ebo i si na ya n’ọha mmadụ,” ka Jane de Teliga, bụ́ onye na-ahụ maka ejiji n’Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie nke Powerhouse, dị na Sydney, Australia na-ekwu. Ọ na-ekwukwasị: “Ị na-ahọrọ ebo ị chọrọ ka a gụnyekọta gị na ha, na-ejikwa ejiji ha.” Dr. Dianna Kenny, bụ́ onye na-akụzi akparamàgwà mmadụ na Mahadum Sydney, kwuru na dị ka ụzọ e si amata onye mmadụ bụ uwe dịruru mkpa ka okpukpe, akụ̀ na ụba, ọrụ, agbụrụ, agụmakwụkwọ, na adres ụlọ mmadụ. Dị ka magazin bụ́ Jet si kwuo, esemokwu agbụrụ e nwere n’otu ụlọ akwụkwọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nanị nke ndị ọcha na United States “bilitere n’ihi na ụmụ agbọghọ nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ bụ́ Ndị Ọcha na-akpa isi ha, na-eyi uwe owoghoro, na uwe ‘awantịrọ’ ndị ọzọ n’ihi na e ji ha mara Ndị Isi Ojii.”
Isonyere otu ìgwè na-apụtakwa ìhè n’obere ìgwè ụfọdụ, dị ka n’etiti ndị na-eti egwú: “N’ọtụtụ ọnọdụ,” ka magazin bụ́ Maclean’s na-ekwu, “uwe na ụdị egwú ha na-ekwekọ: ndị nwere mmasị n’egwú reggae na-eyi uwe ndị nwere àgwà na-egbuke egbuke na okpu ndị Jamaica, ebe ndị egwú rock na-amasị na-enwe mmasị ikpu okpu ndị na-eme ski na efe ndị e ji ákwà plaid kwaa.” Ma n’agbanyeghị ụdị ọ bụ, ejighị nlezianya yiri uwe, iyi uwe na-ekwesịghị ekwesị, ịdị nkịkara ka onye dara ogbenye, bụ́ nke a na-akpọ aha ọjọọ, pụrụ ịnapụ mmadụ nnukwu ego.
Gịnị Na-eme Ụkpụrụ Iji Ejiji?
“Ihe nile dị iche n’ihe ị pụrụ iche,” ka Woody Hochswender, bụ́ onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ na-ekwu. “Ejiji ndị nwoke, bụ́ nke ụkpụrụ siri ike na-achịkwabu, na-aghọwanye nke na-enweghị nchịkwa . . . Ihe nile kwesịrị iyi ka a ga-asị na e jighị nlezianya yiri ya.” Otú ọ dị, àgwà a pụrụ n’ọnọdụ ụfọdụ igosi omume ọ gbasaghị m. Ma ọ bụ ọ pụrụ igosi enweghị ùgwù onwe onye ma ọ bụ enweghị nkwanye ùgwù maka ndị ọzọ.
N’otu isiokwu na-akọ banyere echiche ụmụ akwụkwọ nwere banyere ndị nkụzi, akwụkwọ bụ́ Perceptual and Motor Skills na-akọwa na “ọ bụ ezie na a na-ele onye nkụzi yi uwe jeans anya dị ka onye na-eme ihe ọchị n’ime klas, a kwanyeere okwu ya ùgwù kasị dị ala, a na-ewerekarị ya ọtụtụ ugbo dị ka onye nkụzi yiri onye na-amaghị ihe.” Otu akwụkwọ ahụ na-ekwu na “a na-ele onye nkụzi nwanyị yi uwe jeans anya dị ka ihe ọchị, onye a pụrụ ịgakwuru, onye na-enwechaghị ihe ọmụma, onye na-enwechaghị ùgwù, onye na-adịghị ka onye nkụzi, na onye a na-enwe mmasị n’ebe ọ nọ karị.”
Ka ọ dịgodị, n’achụmnta ego, anyị ka nwere ihe ọzọ ejiji na-ekwu: ejiji iji dọta mmasị. N’afọ ndị a, ọtụtụ ndị inyom achọwo ịrịgo n’ọkwá ndị dị elu. “M na-eji ejiji ka ọ kpọtụwa,” ka Marie, bụ́ onyeisi nke otu ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ na-ekwu. “M chọrọ ka a hụ m. M chọrọ igosipụta onwe m dị ka onye mara ezigbo mma,” ka ọ na-ekwukwasị. Marie kwuru eziokwu n’ikpughe na o lekwasịrị anya n’onwe ya.
Ejiji ndị na-ewu ewu na-abatakwa n’ụzọ a na-apụghị izere ezere na chọọchị. Ụfọdụ n’ime ndị ji ejiji kpọrọ ihe karị ọbụna ejiriwo chọọchị ha mee ihe iji gosi ejiji ha kasị ọhụrụ. Ma, taa, ndị ụkọchukwu, ka ha na-eyi uwe mwụda ha, na-anọ n’elu ikpo okwu mgbe nile na-ahụ ọgbakọ nke jupụtara ná ndị yi uwe jeans na akpụkpọ ụkwụ kanvas ma ọ bụ uwe ndị na-ewu ewu.
Gịnị Kpatara Oké Nchegbu A Banyere Onwe Onye na Ịbụ Onye Dị Iche?
Ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ na-ekwu na iyi uwe na-ewu ewu—karịsịa n’etiti ndị na-eto eto—bụ otu ụzọ nke ịchọ ọdịmma onwe onye, n’ihi na ọ na-egosipụta ọchịchọ nke ịdọta mmasị ndị ọzọ. Ha na-akọwa ya dị ka “ọchịchọ na-adịghị apụ apụ nke onye nọ n’oge uto ya ile onwe ya anya dị ka onye ndị ọzọ na-ekiri.” N’ụzọ dị otú ahụ, ọ na-ekwu, sị: “Echere m na m na-eri gị isi dị ka onwe m na-eri m isi.”—American Journal of Orthopsychiatry.
Nkà ihe ọmụma ndị na-ebute mmadụ ụzọ ma na-eleghara Chineke anya dị ka onye na-adịghị mkpa akwalitewokwa echiche (nke azụmahịa na-agbasakarị) nke bụ́ na, dị ka mmadụ, ị bụ onye kasị mkpa n’ụwa nile. Nsogbu e nwere bụ na ugbu a e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri mmadụ isii n’ime ndị a ‘kasị mkpa.’ Ọtụtụ nde ndị nọ n’okpukpe Krisendọm adabawokwa n’ịhụ ihe onwunwe n’anya a, na-achụsosi “ndụ dị mma, ugbu a,” ike. (Tụlee 2 Timoti 3:1-5.) Ihe ọzọkwa bụ ndakpọ nke njikọ ezinụlọ na ezi ịhụnanya, ọ bụghịkwa ihe ijuanya na ọtụtụ ndị, karịsịa ndị na-eto eto, na-achọsi ike inwe echiche nke ịbụ onye dị iche na nke nchebe.
Otú ọ dị, ndị na-enwe nchegbu banyere uwe ha na otú Chineke si ele ha anya na-ajụ n’onwe ha, sị: Ruo n’ókè hà aṅaa ka m kwesịrị ịgbaso ụkpụrụ iji ejiji na-agbanwe agbanwe? Olee otú m ga-esi mara ma uwe m ò kwesịrị ekwesị? Ọ̀ na-ekwu ihe na-edochaghị anya ma ọ bụ ọbụna ihe na-ezighị ezi banyere m?
M̀ Jiri Ejiji Kwesịrị Ekwesị?
N’ụzọ bụ́ isi, ihe anyị yi bụ okwu aka anyị. Ihe ndị na-amasị anyị n’otu n’otu dịgasị iche, otú ego anyị nwere sikwa dị iche iche. Omenala dịgasịkwa iche site n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ, site ná mba gaa ná mba, na site n’ọnọdụ ihu igwe nke otu ógbè gaa n’ọzọ. Ma n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ gị, buru ụkpụrụ a n’uche: “E nwere oge maka ihe nile, e nwekwara oge maka ihe nile a na-eme n’okpuru eluigwe.” (Eklisiastis 3:1, Revised Standard Version) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, jie ejiji n’ụzọ kwekọrọ n’ihe a na-eme. Nke abụọ, “[jiri] obi umeala soro Chineke gị na-eje ije.”—Maịka 6:8.
Nke ahụ apụtaghị iji ejiji n’ụzọ ime nsọ nsọ, kama nke ahụ, n’ụzọ “kwesịrị ekwesị” na nke na-egosi “uche zuru okè.” (1 Timoti 2:9, 10) Ọtụtụ mgbe, nke a pụtara nanị igosi njide onwe onye, bụ́ àgwà nke magazin bụ́ Working Woman jikọtara ya na ejiji dị mma na ịma mma. Dị ka ụkpụrụ ọma, ya adịla mgbe ị ga-ekwe ka uwe gị bute gị ụzọ, iji dọrọ uche ndị ọzọ. Magazin ahụ bụ́ Working Woman na-ekwu, sị: “Jie ejiji . . . n’ụzọ ga-eme ka ndị mmadụ ghara ilekwasị anya nanị n’uwe gị kama, ka ha hụkwa àgwà ọma gị dị ka mmadụ.”
Akwụkwọ bụ́ Perceptual and Motor Skills na-ekwu, sị: “Akwụkwọ ndị na-enyocha òkè uwe na-ekere n’ime ka e nwee otu echiche banyere mmadụ na ná nzipụ ozi n’ekwughị okwu na-egosi na uwe bụ ihe dị mkpa n’inye echiche ndị mbụ a na-enwe banyere ndị ọzọ.” N’ụzọ dị otú a, otu nwanyị gbara afọ 40 na ụma, bụ́ onye nweburu oké afọ ojuju n’ihi ikike ndọrọ o nwere site n’ụdị uwe ọ na-eyi, na-ekwu, sị: “Ọ kpataara m nnukwu nsogbu n’ihi na o mere ka o sie ike ịghọta ọdịiche dị n’etiti ndụ m na-ebi n’ebe m na-arụ ọrụ na nke na-ebi mgbe m nọ n’onwe m. A na-enwekarị ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-achọ ịkpọrọ m mee mkpapụ.” Otu nwanyị bụ́ onye mpịazi ego, mgbe ọ na-akọwa ụdị ejiji dị iche na nke ahụ, na-akọ, sị: “Ahụwo m otú ụmụ nwoke si akpaso ụmụ nwanyị na-eji ejiji n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, ma ọ bụ na-eji nnọọ ejiji dị ka ụmụ nwoke, àgwà. A na-ewere ha ịbụ ụmụ nwanyị na-akpa ike bụ́ ndị na-awakpo n’ebe dị njọ, ndị nwoke na-emekwa ka ihe siere ha ike karị.”
Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jeffie chọpụtara na ya na-ezipụ ozi na-edochaghị anya mgbe ọ kpụrụ isi na-ewu ewu. “Echere m nnọọ na ọ dị ‘iche,’” ka ọ na-echeta. “Ma ndị mmadụ malitere ịjụ m, ‘Ị̀ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova n’ezie?’ nke ahụ na-emekwa ihere.” Jeffie aghaghị ịjụ onwe ya ajụjụ ụfọdụ e ji enyocha obi. N’ezie, ọ́ bụghị eziokwu na ọ bụghị nanị ọnụ anyị kamakwa uwe na ejiji anyị na-ekwu okwu “site n’ihe nke obi nwebigara ókè”? (Matiu 12:34) Gịnị ka uwe gị na-ekpughe—obi nke zubesiri ike ịdọrọ uche gaa n’Onye Okike ka ọ̀ bụ gaa n’onwe gị?
Jiri “Uche Zuru Ókè” Jie Ejiji
Tụleekwa mmetụta uwe gị na-enwe n’ebe ị nọ. Iji ejiji iji dọta mmasị na iji ejiji gabiga ókè pụrụ ime ka ị fụlie onwe gị elu, iyi uwe na-adịghị mma pụrụ ịkpatakwu echiche na-ezighị ezi i nwere banyere onwe gị, T-shirt ndị na-akpọsa ihe nkiri sinima kasị amasị gị ma ọ bụ onye a ma ama n’egwuregwu ma ọ bụ ụfọdụ ndị ọzọ a ma ama pụrụ iji nwayọọ nwayọọ nuba gị n’ife onye a ma ama ofufe—ikpere arụsị. Ee, uwe gị na-ezi ndị ọzọ ozi—na-agwakwa ha banyere gị.
Gịnị ka uwe gị na-ekwu banyere gị ma ọ bụrụ na ị na-eji ejiji ka ọ kpọtụwa ma ọ bụ iji kpalie mmasị? Ị̀ na-akwalite àgwà ndị i kwesịrị ịdị na-agba mgba imeri n’ezie? Ọzọkwa, ụdị onye dị aṅaa ka ị na-achọ ịdọrọ mmasị ya? Ndụmọdụ e dekọrọ ná Ndị Rom 12:3 pụrụ inyere anyị aka imeri ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, oké mpako n’ihi ọdịdị anyị, na echiche na-ezighị ezi. N’ebe ahụ Pọl onyeozi na-adụ anyị ọdụ ka anyị “ghara ịtụkwasị uche n’onwe [anyị] karịa nke [anyị] kwesịrị ịtụkwasị uche; kama ịtụkwasị uche n’inwe uche zuru okè.” Inwe “uche zuru okè” pụtara ịma ihe.
Nke a dị ndị nwere ibu ọrụ na ndị a tụkwasịrị obi mkpa karịsịa. Ihe nlereanya ha na-enwe mmetụta dị ike n’ahụ ndị ọzọ. Dị ka ọ na-adịkarị, ndị na-eru eru maka ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ ndị Kraịst na ndị nwunye ha bụ́ ndị Kraịst ga-egosikwa àgwà imeru ihe n’ókè na nsọpụrụ n’uwe na ejiji ha. Ọ dịghị mgbe anyị ga-achọ ịdị ka nwoke ahụ Jisọs kwuru okwu banyere ya n’ihe atụ ya nke oriri ọlụlụ nwunye: “Mgbe eze ahụ batara ikiri ndị nọdụrụ ná nri, ọ hụ n’ebe ahụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye.” Mgbe ọ nụrụ na nwoke a enweghị ezigbo ihe mere o ji yiri uwe dị otú ahụ na-egosighị nkwanye ùgwù, “eze ahụ sịrị ndị na-ejere ya ozi, Keenụ ya ụkwụ na aka, tụpụ ya . . . ezi.”—Matiu 22:11-13.
N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ndị nne na nna, site n’okwu na n’ihe nlereanya ha, kụnye n’ime ụmụ ha àgwà ziri ezi na ịma ihe dị mma n’ihe banyere uwe. Nke a pụrụ ịpụta na ọ dị ndị nne na nna mkpa ịkwụsi ike mgbe ụfọdụ mgbe ha na nwa ha nwoke ma ọ bụ nwa ha nwanyị na-atụgharị uche. Ma lee ihe na-agba ume ọ bụ mgbe a jara anyị mma anyị na-atụghị anya ya maka ụkpụrụ dị elu nke iji ejiji na àgwà nke ụmụ anyị na-eto eto na nke anyị!
Ee, a tọhapụwo ndị ohu Jehova pụọ n’oké mpako n’ihi ọdịdị anyị, ihe ndị na-ewu ewu dị oké ọnụ, na oké nchegbu banyere onwe onye. Ha nwere ụkpụrụ Chineke iduzi ha, ọ bụghị mmụọ nke ụwa. (1 Ndị Kọrint 2:12) Ọ bụrụ na ị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị a, ịhọrọ uwe gị ekwesịghị isi oké ike. Ọzọkwa, dị ka ọbọ́ e leziri anya nke ọma họrọ bụ́ nke e tinyere foto na ya, uwe gị agaghị ekpuchi àgwà gị, ọ gaghịkwa ewetara gị mkparị. Ka ị na-agbalịkwu ịdị ka Chineke, otú ahụ ka ị ga na-akwalitekwu ịma mma ime mmụọ karịrị nke uwe gị ga-eme ka ị maa.