Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 5/8 p. 9-12
  • Nhọrọ nke Ịgba Alụkwaghịm

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nhọrọ nke Ịgba Alụkwaghịm
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Bụrụ na E Nwere Ụmụ
  • Okwu Ego na Ikpe
  • Mmekọrịta Gbanwere Agbanwe
  • Ịrụ Ọrụ Maka Nnwetaghachi Onwe
  • Obi Ekoropụla Gị
  • Ihe Anọ I Kwesịrị Ịma Banyere Ịgba Alụkwaghịm
    Teta!—2010
  • Ihe Unu Ga-eme Ka Unu Ghara Ịgba Alụkwaghịm n’Agadi
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Ịgba Alụkwaghịm Ọ̀ Bụ Ngwọta Ya?
    Teta!—2004
  • Na-akwanyere “Ihe Chineke Kekọtara” Ùgwù
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 5/8 p. 9-12

Nhọrọ nke Ịgba Alụkwaghịm

“Ọ bụrụ na onye òtù ọlụlụ gị anwụọ, ndị mmadụ ga-egosi gị nghọta ọbụna ma ọ bụrụ na ị bụghị onye òtù ọlụlụ kasị mma. Ma ọ bụrụ na di gị ahapụ gị—ụfọdụ ga-eche na ị gbalịsighị ike otú kwesịrị ekwesị. Biko, biko, NYERE M AKA!”—Onye na-agụ Teta! na South Africa.

EKWESỊGHỊ ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm pụrụ ịbụ ihe na-akpasasị nnọọ uche. Ọ bụ ezie na ọtụtụ enwewo ọtụtụ ihe mere ha na onye òtù ọlụlụ ha ga-eji kpezie ma chebe alụmdi na nwunye ha, ndị ọzọ nwere ihe ndị kwesịrị ekwesị mere ha ga-eji mee nhọrọ nke Chineke nyere nke ịgba onye òtù ọlụlụ ha kwara iko alụkwaghịm. (Matiu 5:32; 19:9) Dị ka ihe atụ, nchebe, ọnọdụ ime mmụọ, na ọdịmma nile nke nwunye kwesịrị ntụkwasị obi na ụmụ ya pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ. Ọ pụkwara inwe nchegbu banyere ibute ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ. Ma ọ bụ, ikekwe, ọ gbagharawo di ya n’ihi iko ọ kwara, ma o nwechaghị ihe ndabere maka inwe olileanya na ya pụrụ inwe ezi ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ ọzọ nakwa na ya ka pụrụ isoro ya biri dị ka di ya.

“Nke a bụ mkpebi kasị siere m ike ná ndụ,” ka otu nwanyị nọ ná mwute kwetara. Mkpebi siri ike n’ezie—ọ bụghị nanị n’ihi na mmebi e mebiri ntụkwasị obi ya na-egbusi ya mgbu ike n’obi kamakwa n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe ndị na-esi n’ịgba alụkwaghịm apụta ga-emetụta ndụ ya dum. Ya mere, ma nwanyị ò kwesịrị ịgba di ya na-ekwesịghị ntụkwasị obi alụkwaghịm ma ọ bụ na o kwesịghị bụ mkpebi onwe onye. Ndị ọzọ kwesịrị ịkwanyere ikike Bible nyere onye òtù ọlụlụ aka ya dị ọcha ime mkpebi ahụ ùgwù.

Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị na-eji ọsọ ọsọ agba alụkwaghịm n’agụkọghị ihe ọ ga-ewe nke ọma. (Tụlee Luk 14:28.) Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị nhọrọ nke ịgba alụkwaghịm gụnyere?

Ọ Bụrụ na E Nwere Ụmụ

“Ndị nne na nna na-etinyebiga uche ha ókè ná nsogbu ha na-echezọkarị ma ọ bụ na-elegharakarị mkpa ụmụ ha anya,” ka akwụkwọ bụ́ Couples in Crisis na-ekwu. N’ihi ya, mgbe ị na-eche echiche ịgba alụkwaghịm, buru ọnọdụ ime mmụọ na ọdịmma nke ụmụ gị n’uche. Ọtụtụ ndị nnyocha na-ekwu na a gbaa alụkwaghịm n’udo, ụmụaka eyichaghị ka ha ga-ata ahụhụ. Ọbụna n’ọnọdụ ndị siri ike, ịdị nwayọọ ga-enyere mmadụ aka ka ọ ‘ghara ịlụ ọgụ, kama ka ọ dị nwayọọ n’ebe mmadụ nile nọ.’—2 Timoti 2:24, 25.a

Ọ bụrụ na mmadụ ahọrọ ịgba alụkwaghịm, e kwesịrị iburu n’uche na ọ bụ di na nwunye—ọ bụghị ụmụ ha—na-agba alụkwaghịm. Papa na Mama ka dị ụmụaka ahụ mkpa. Otú ọ dị, a pụrụ inwe ọnọdụ ndị siri oké ike, dị ka mgbe nwatakịrị nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye e metọrọ. Ma e kwesịghị iji maka ndịrịta iche nke okpukpe ma ọ bụ esemokwu dịịrị di na nwunye gbochie ụmụaka inweta abamuru nke inwe nne na nna.

Ihe ọzọ a ga-echeta bụ mmetụta uche na-esighị ike nke ụmụaka na mkpa ha nwere maka mmesi obi ike, ịhụnanya, na mmetụta ịhụnanya dị ukwuu. “Ndịgide nke Ịhụnanya a,” ka otu akwụkwọ na-ekwu, “ga-enye ha ma ọnọdụ ma ntọala iji nagide ọnọdụ ọhụrụ ahụ.” Ọzọkwa, ilebara mkpa ime mmụọ ha na-enwe kwa ụbọchị anya pụrụ inyere ha aka ịnọgide na-akwụsi ike.—Deuterọnọmi 6:6, 7; Matiu 4:4.

Okwu Ego na Ikpe

Ịgba alụkwaghịm ga-efurịrị onye òtù ọlụlụ nke ọ bụla ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ego na ihe onwunwe, inwetụ ntụsara ahụ, na ikekwe ebe obibi masịrị ya nke ukwuu. Ebe ọ pụrụ ịbụ na a ghaghị iji ego na-ezukwaghị ezu na-ahụ maka mmefu buwanyere ibu, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ime atụmatụ mmefu ego kwesịrị ekwesị dị ka ihe ndị ka mkpa a na-eji ego eme si dị. E kwesịrị ịzere ọchịchọ imechi mfu na iwe site n’imefu ego karị ma ọ bụ iji ụgwọ.

Ọ bụrụ na e mee mkpebi ịgba alụkwaghịm, ọ dịkwa mkpa isoro onye òtù ọlụlụ kpebie otú a ga-esi eji ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀ e nwekọrọ ọnụ na-eme ihe. Dị ka ihe atụ, iji gbochie imebisị ego dị n’ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀ e nwekọrọ ọnụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ịgwa manịja ụlọ akụ̀ ka ọ hụ na di na nwunye ahụ bịanyere aka n’akwụkwọ maka ịdọrọ ego ruo mgbe onye nke ọ bụla nwere ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀ nke ya.

Ọ bụkwa ihe amamihe dị na ya inwe ihe ndekọ nke ego ị na-akpata na nke ị na-emefu, n’ịkwadebe maka okwu banyere ego e ji elekọta onye òtù ọlụlụ mgbe a gbasịrị alụkwaghịm. Ọzọkwa, n’ọtụtụ mba, iwu na-achọ ka ndị mmadụ gwa ndị na-ahụ maka ụtụ isi banyere ọnọdụ ha gbanwere agbanwe.

Ọzọkwa, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-erite uru site n’ịkpọtụrụ onye ọkàiwu—onye nwere ahụmahụ n’okwu banyere ịgba alụkwaghịm kpọmkwem. Ụfọdụ mba na-ekwe ka ndị ngabita ma ọ bụ ndị mkpezi nyere di na nwunye ahụ aka ka ha kwekọrịta ime mkpebi ha abụọ ga-anabata n’udo, bụ́ nke ụlọikpe ga-abịanyezi aka na ya. Ọtụtụ ndị nne na nna na-ahọrọ iji onye ọkachamara na-adịghị eme ka e see okwu eme ihe, nke ka nke n’ebe o metụtara ụmụaka. Kama imeri n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe, ndị nne na nna ahụ na-ezube ibelata esemokwu na iwe. Ihe onwunwe ụfọdụ ekwesịghị nnọọ mmetụta uche na ego ọ ga-ewe iji nweta ha.

Mmekọrịta Gbanwere Agbanwe

“Anyị ekwesịghị ilelị mmechuihu na obi abụọ nke ọtụtụ ndị na-enwe n’ebe enyi ha gbara alụkwaghịm nọ,” ka otu onye na-eme nnyocha na-eme ka a mata. Ọ bụrụgodị na onye òtù ọlụlụ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-eme ihe n’agabigaghị ikike iwu, omume ọma, na Akwụkwọ Nsọ nyere ya, a pụrụ nnọọ inwe ụfọdụ ndị ga-ele ya anya dị ka onye kpatara ntisa alụmdi na nwunye ahụ. Mmeghachi omume ha pụrụ isite n’ekele na-ekpoghị ọkụ ruo ná nzere pụtara ìhè. Nke kakwa njọ, ndị bụbu ezi ndị enyi pụrụ ibu iro a na-ezoghị ezo.

Ọtụtụ amaghị nnọọ ókè nkwado dị mmadụ mkpa mgbe ọ na-agba alụkwaghịm; ha pụrụ iche na akwụkwọ ozi dị nkenke ma ọ bụ kaadị ezuola. Otú ọ dị, a na-enwekarị ndị enyi “na-amata mmetụta ha na-enwe,” ka akwụkwọ bụ́ Divorce and Separation na-ekwu, “ha ga-akpọkwa na fon ka ha hụ ma ị̀ chọrọ ka mmadụ soro gị gaa ebe ọ bụla, ma ị̀ chọrọ ka e meere gị ihe ma ọ bụ ma ị̀ chọrọ ka e soro gị kwurịta okwu.” N’ezie, dị ka Bible si kwuo, ‘onye na-ahụ n’anya nke na-arapara n’ahụ karị nwanne’ dị mmadụ mkpa n’oge dị otú ahụ ná ndụ.—Ilu 18:24.

Ịrụ Ọrụ Maka Nnwetaghachi Onwe

Mgbe afọ 16 ọ gbasịrị alụkwaghịm gasịrị, otu nne na-ekweta, sị: “A ka nwere oge mgbe owu na-amasi m ike—ọbụna mgbe mụ na ndị mmadụ nọ.” Olee otú o si anagide ya? “Ewulitewo m ihe nchebe ụfọdụ,” ka ọ na-echeta, “site n’iji ọrụ n’aka, ilekọta nwa m nwoke, na ilekọta ụlọ m. Amalitekwara m ịga nzukọ Ndịàmà Jehova, isoro ndị agbata obi m na-ekerịta nkwenkwe m, na imere ndị ọzọ ihe. Nke ahụ nyeere m aka nke ukwuu.”

Akara ụbọchị na oge ụfọdụ n’afọ pụrụ ime ka e cheta ihe ndị na-egbu mgbu n’obi ma mee ka e nwee mwute: ụbọchị e kpughere ekwesịghị ntụkwasị obi ahụ, oge ọ pụrụ n’ụlọ, akara ụbọchị e kpere ikpe ahụ n’ụlọikpe. Ihe omume ndị na-enye obi ụtọ bụ́ ndị di na nwunye ahụ na-ekerebu òkè na ha—dị ka oge ezumike na ememe mgbaafọ nke agbamakwụkwọ—pụrụ ịbụ oge ndị na-akpali mmetụta uche siri ike nnagide. “Ana m anagide ụbọchị ndị ahụ site n’ime ndokwa iwepụta oge soro ezinụlọ m ma ọ bụ ezi ndị enyi m maara maka ọnọdụ m nọkọọ,” ka Pat na-ekwu. “Anyị na-eme ihe ndị ga-ewepụ ihe ndị gara aga dị n’uche anyị ma tinye ndị ọhụrụ. Ma enyemaka m kasị ukwuu bụ mmekọrịta mụ na Jehova—ebe m matara na ọ ghọtara mmetụta m na-enwe.”

Obi Ekoropụla Gị

Ọ dịghị mkpa ka ndị òtù ọlụlụ aka ha dị ọcha bụ́ ndị na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ma họrọ iji ikike Chineke nyere ha ịgba onye òtù ọlụlụ ha kwara iko alụkwaghịm mee ihe nwee obi amamikpe ma ọ bụ tụọ ụjọ na Jehova ahapụwo ha. Ọ bụ ụzọ aghụghọ nke onye òtù ọlụlụ ahụ kwara iko—bụ́ nke kpataworo “ịkwa ákwá na ịsụ ude”—bụ ihe Chineke kpọrọ asị. (Malakaị 2:13-16) Ọbụna Jehova, bụ́ Chineke nke “obi ebere,” ma otú ịbụ onye onye a hụrụ n’anya jụrụ na-adị. (Luk 1:78; Jeremaịa 3:1; 31:31, 32) Mgbe ahụ, jide n’aka na “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, Ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere Ya.”—Abụ Ọma 37:28.

Otú ọ dị, ọ ga-aka nnọọ mma ma ọ bụrụ na a pụrụ ibu ụzọ zere ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye na ọdachi ndị na-esi na ya apụta. Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ,b bụ́ ihe nduzi ezinụlọ dị irè, na-enyere ọtụtụ ndị nọ gburugburu ụwa aka iwulite alụmdi na nwunye obi ụtọ na izere ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye. O nwere isiokwu ndị na-ekwu banyere iwulite alụmdi na nwunye obi ụtọ, ịzụ ụmụ, na ịnagide nsogbu alụmdi na nwunye. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ ndị bipụtara magazin a ụtọ inyekwu gị ihe ọmụma banyere isiokwu a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A pụrụ ịchọtakwu ihe ọmụma n’usoro isiokwu bụ́ “Ikike Ịkpọrọ Nwa—Gịnị Bụ Echiche Ziri Ezi?” na n’isiokwu bụ́ “Inyere Ụmụ Ndị Gbara Alụkwaghịm Aka,” dị ná mbipụta Teta! nke December 8, 1997, na nke April 22, 1991 (Bekee).

b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 10]

ỤMỤAKA EKWESỊGHỊ INWE NDỊ NNE NA NNA GBARA ALỤKWAGHỊM

Na 1988 Diana nwụworo anwụ, bụ́ Adaeze nke Wales, kwuru na na Britain nanị, kwa ụbọchị ihe ruru ụmụaka 420 na-ahụ ka ndị mụrụ ha na-agba alụkwaghịm. Otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ụmụaka ndị ahụ erubeghị afọ ise. N’ụzọ dị mwute, ihe ha ka pasent 40 nke ụmụaka adịkwaghị ahụ otu n’ime ndị mụrụ ha anya mgbe ha gbasịrị alụkwaghịm.

N’adịghị ka ihe ọtụtụ ndị na-eche, “ọ bụ nanị ụmụaka ole na ole nke ndị nne na nna gbara alụkwaghịm na-anabata ntisa ahụ,” ka otu onye a na-akwanyere ùgwù nke na-ede banyere ahụ ike na ọgwụ na-ekwu. “Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ụmụaka ga-ahọrọ ịhụ ka ndị mụrụ ha na-ebikọ ọnụ ọbụna ma ọ bụrụ na ọnọdụ ezinụlọ ahụ siri ike.” Ọ bụrụgodị na di na nwunye arụrịta ụka nke ukwuu n’oge ahụ a na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ha ekwesịghị ikpebi ngwa ngwa na ịkwụsị alụmdi na nwunye ahụ ga-akara ụmụ ha mma. Ime mgbanwe n’omume na n’akparamàgwà ha pụrụ ime ka o kwe ha mee ibikọ ọnụ maka ọdịmma nke ezinụlọ ahụ dum.

“Ndị di na-enwe mmekọahụ aghara aghara,” ka Pamela Winfield na-ede akwụkwọ na-ekwu, “kwesịrị iche echiche banyere ihe mgbu ụmụ ha ga-enwe n’oge ntisa ebe obibi nke nzuzu ha ga-akpata.”

[Igbe dị na peeji nke 11]

CHINEKE Ọ̀ KPỌRỌ ỊGBA ALỤKWAGHỊM NILE ASỊ?

“Ihe nyesiri m nsogbu ike,” ka Pat na-ekweta, “bụ iche na ‘Jehova kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị.’ Ajụjụ dị m n’uche mgbe nile bụ, ‘M̀ na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ?’”

Ka anyị lee ihe gbara Malakaị 2:16 gburugburu iji zaa ajụjụ ahụ. N’oge Malakaị, ọtụtụ ndị Israel na-agba nwunye ha alụkwaghịm, ikekwe iji lụrụ ụmụ agbọghọ na-ekpere arụsị. Chineke katọrọ àgwà aghụghọ a. (Malakaị 2:​13-⁠16) N’ihi ya, ihe Chineke kpọrọ asị bụ mmadụ ịchụpụ onye òtù ọlụlụ ya n’ihi ihe na-enweghị ihe ọ bụ iji lụrụ ọzọ. Onye kwara iko n’ụzọ aghụghọ ma gbazie onye òtù ya alụkwaghịm ma ọ bụ na-amanye ya ka ọ gbaa ya alụkwaghịm emewo mmehie n’ụzọ aghụghọ, nke a kpọrọ asị.

Otú ọ dị, amaokwu ndị a akatọghị ịgba alụkwaghịm nile. A pụrụ iji okwu Jisọs kwadoo nke a: “Onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, ma ọ bụghị n’ihi ịkwa iko, lụrụkwa nwunye ọzọ, ọ na-akwa iko.” (Matiu 19:⁠9, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ebe a Jisọs kwetara na ịkwa iko bụ ihe ndabere kwesịrị ekwesị maka ịgba alụkwaghịm Akwụkwọ Nsọ kwadoro​—⁠n’ezie, nanị ihe ndabere kwesịrị ekwesị maka ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye. Onye òtù ọlụlụ aka ya dị ọcha pụrụ ikpebi ịgbaghara onye òtù ọlụlụ ya mejọrọnụ. Otú ọ dị, onye họọrọ iji okwu Jisọs mere ihe ndabere maka ịgba onye òtù ọlụlụ ya kwara iko alụkwaghịm emeghị ihe Jehova kpọrọ asị. Ọ bụ àgwà aghụghọ nke onye òtù ọlụlụ ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ka Chineke kpọrọ asị.

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ndị òtù ọlụlụ aka ha dị ọcha na ụmụ ha na-erite uru site ná nkwado ịhụnanya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya