Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Ịbụ Onye A Na-akwa Emo?
NDỊ ntorobịa bụ́ ndị na-eme omume ma ọ bụ na-eji ejiji n’ụzọ dị iche n’ebe ndị ọgbọ ha dị pụrụ ịbụ ndị a na-akwa ajọ emo. Nke a bụ eziokwu banyere ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst, bụ́ ndị àgwà ha na-adịkarị nnọọ iche na nke ndị na-eto eto ndị ọzọ. Kraịst ó kwughị banyere ụmụazụ ya, sị: “Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu”?—Jọn 15:20.
Olee otú nke a si emetụta ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà Jehova? A na-akwa ụfọdụ n’ime ha emo n’ihi na ha adịghị eme ememe ụfọdụ; a na-akatọ ndị ọzọ n’ihi na ha adịghị ekele ọkọlọtọ. Ọbụna a na-enye ọtụtụ n’ime ha nsogbu n’ihi aṅụghị ọgwụ ọjọọ, ikwu eziokwu, na n’ihi ịgbaso ụkpụrụ omume nke Bible.
Ọnọdụ a abụghị ihe ọhụrụ. N’ezie, Pita onyeozi gwara ndị Kraịst bi na narị afọ mbụ, sị: “Ha na-eche na ọ bụ ihe mmadụ na-ahụghị mgbe ọ bụla na unu adịghị eso [ndị nke mba nile] . . . , ha na-ekwulu unu.” (1 Pita 4:4) Nsụgharị ndị ọzọ dere ya sị, ha “na-akpọ unu aha ọjọọ” (Knox) ma ọ bụ, “Ha na-akparị unu.”—Today’s English Version.
Ọ̀ dịtụwo mgbe a kwara gị emo n’ihi nkwenkwe okpukpe gị? Ya bụrụ otú ahụ, nwee obi ike. Ọ bụghị nanị gị! Ị ga-enwekwa obi ụtọ ịmara na ị pụrụ ịmụta ịnagide ahụ erughị ala nke ịbụ onye a na-akwa emo n’ihi okwukwe ya.
Ihe Mere Ha Ji Akwa Emo
N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji eji ndị okwukwe na àgwà ha dị iche na nke ha eme ihe ọchị? Mgbe ụfọdụ ndị na-akwa emo—dị nnọọ ka ndị ọchọ okwu—na-atụ egwu. Ha pụrụ ime gị akaje iji mee ka ndị ọgbọ ha na-ele ha anya ọma karị. Ma eleghị anya, mgbe nanị ha nọ, ọ bụ ole na ole n’ime ndị nsogbu dị otú ahụ ka ọ ga-amasị—ma ọ bụ ga-enwe obi ike—ịkatọ gị n’ihu ọha.
N’aka nke ọzọ, dị ka Pita dere, ụfọdụ ndị na-akwa emo “na-eche na ọ bụ ihe mmadụ na-ahụghị mgbe ọ bụla.” Ee, àgwà gị pụrụ ịgbagwoju ha anya n’ezie. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ha pụrụ iji obi ọcha na-eche na ihe gị na-apụ iche n’ihi na ị dịghị ekere òkè n’ihe omume ndị e jikọtara ha na ụfọdụ ememe. Ọbụna ọ pụrụ ịbụ na ha enwetawo ihe ọmụma na-ezighị ezi banyere Ndịàmà site n’aka ndị mmegide obi tara mmiri.
N’agbanyeghị ihe kpatara ya, mgbe a gwara gị okwu mkparị, ị pụrụ ikwere n’ilu Bible bụ́: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.” (Ilu 12:18) Ma cheta na ọ pụrụ ịbụ na ndị na-ekwu okwu dị otú ahụ adịghị ekwu ya n’ihi na ha kpọrọ gị asị dị ka mmadụ. O yikarịrị ka hà na-eme kpọmkwem ihe ilu Bible ahụ kwuru—“na-ekwu okwu n’echeghị eche.”
Otú o sina dị, ịbụ onye a na-akwa emo pụrụ igbu mgbu, dị nnọọ ka ebe a mara mmadụ mma. A pụrụ ọbụna ịnwa gị imebi okwukwe gị iji kwụsị oké okwu mkparị ahụ. Mgbe ahụ, olee otú ị pụrụ isi nagide ịbụ onye a na-akwa emo n’ihi nkwenkwe ya?
Ime Ngọpụ
Pita onyeozi dụrụ ndị Kraịst ọdụ, sị: bụrụnụ ndị “e doziworo mgbe dum ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime unu, ma ka unu were nwayọọ na egwu gọpụ.” (1 Pita 3:15) Ime ngọpụ dị otú ahụ banyere okwukwe gị na-achọ ka i nweta ezi ihe ọmụma nakwa ka ị ghọta ihe ndị mere i ji kwere n’ihe ndị i kweere.
Otú ọ dị, ị ghaghị ịmụtakwa otú ị ga-esi jiri “egwu” na-agwa ndị ọzọ okwu ma ọ bụ, dị ka The Bible in Basic English si sụgharịa ya, “n’ejighị nganga.” Ihe ọmụma Bible na ozizi ya i nwere ekwesịghị ime ka i chee na ị karịrị ndị ọzọ. N’ụzọ megidere nke ahụ, i kwesịrị ịgbalị ịzụlite àgwà Pọl onyeozi, bụ́ onye dere banyere ozi ya, sị: “Emere m onwe m ka m bụrụ ohu mmadụ nile, ka m wee rite ọtụtụ mmadụ n’uru karị.”—1 Ndị Kọrint 9:19.
Ọ bụrụ na ị chọpụta na ị na-eme ihere ime ngọpụ banyere okwukwe gị, obi ekoropụla gị. Ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà enwewo mmetụta dị otú ahụ. “Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ elementrị,” ka Jamal na-ekwu, “Amaghị m otú m ga-esi kọwaara ndị ọzọ ihe mere na m adịghị eme ememe dị iche iche ma ọ bụ ekele ọkọlọtọ ma ọ bụ ọbụna ihe mere m ji aga ozi site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ.” Gịnị nyeere ya aka? “Papa m nọgidere na-enyere m aka ruo mgbe m mesịrị nwee ike ịkọwa ihe ndị a, nke a kpatakwara mgbanwe dị ukwuu.” Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịkọwara ndị ọzọ ihe ndị i kwere na ha, ikekwe ị pụrụ ịchọ enyemaka nke nne ma ọ bụ nna gị ma ọ bụ nke onye ọzọ tozuru okè n’ọgbakọ ndị Kraịst iji nyere gị aka ịghọta ihe ọmụma Chineke nke ọma.—Ndị Efesọs 3:17-19.
Otu onye ntorobịa bụ́ Onyeàmà dị afọ 16 kwuru na usoro ihe omume nke ọmụmụ Bible onwe onye nyeere ya aka iji obi ike kwuwaa okwu n’ụlọ akwụkwọ. “N’oge gara aga, mgbe ụmụ klas ibe m ga-eme m akaje n’ihi ịbụ Onyeàmà, anaghị m ama ihe m ga-ekwu,” ka ọ na-ekweta. “Ugbu a, dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile, ana m amụsi Bible ike karị, m na-enwekwa ike ịzaghachi. Ịmata ihe isiokwu ndị kasị ọhụrụ nke magazin Ụlọ Nche na Teta! na-ekwu na-enyere m aka ịgwa ụmụ akwụkwọ ibe m banyere ihe ndị m kwere na ha.”
Otú ọ dị, o nweghị ọnọdụ abụọ yiri ibe ha. N’ihi ya ọnọdụ dịgasị iche iche ga-achọ azịza dịgasị iche. Otú ọ dị, mgbe okwu ọjọọ kpasuru gị iwe, o kwesịtụghị ekwesị ‘inyeghachi ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ.’ (Ndị Rom 12:17-21) Ihe ịgwagwara okwu mkparị ga-eme, n’agbanyeghị ókè o yiruru ka ọ na-atọ ọchị, bụ ime ka ọ ka njọ, ọ pụkwara ọbụna ịkpalikwu ịkwa emo. N’ihi ya, ụfọdụ ahụwo na ọ ka mma ileghara mkparị ahụ anya.
N’ọnọdụ ụfọdụ, dị ka mgbe e kwuru okwu n’ụzọ na-adịghị njọ iji chọọ nanị ime ihe ọchị, ọ pụrụ ọbụna ịbụ ihe amamihe dị na ya isoro chịa ọchị mgbe e kwuru okwu ahụ kama iwe iwe n’ihi ya. (Eklisiastis 7:9) Ọ bụrụ na onye ahụ na-akwa emo ahụ na okwu ya adịghị ihe ọ na-eme, ọ pụrụ ịkwụsị nsogbu ahụ ọ na-enye.—Tụlee Ilu 24:29; 1 Pita 2:23.
Ikwuwa Okwu
Otú ọ dị, e nwere mgbe ị pụrụ inwe ike iji akọ nye nkọwa dị nkenke banyere ihe ndị i kwere na ha. Otu nwata nwanyị dị afọ 13 nwalere nke a, ọ rụpụtakwaara ya ezigbote ihe. “M na-aga klas ịmụ ihe,” ka ọ na-ekwu, “mgbe ọtụtụ ụmụ akwụkwọ malitere iji Ndịàmà Jehova eme ihe ọchị. M chọọ ikwu okwu, ma ha pụwara nnọọ ma nọgide na-achị m ọchị—ma e wepụ otu onye.” Nwa akwụkwọ ahụ bụ́ Onyeàmà kọwara, sị: “Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jaimee bịakwutere m ma gwa m na ya nwere akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.a O kwuru na ya agụmiela ya, na ya nwekwara mmasị inwetakwu ihe ọmụma banyere ihe ndị anyị kweere. Amalitere m iduziri Jaimee Bible.” N’ịbụ onye ahụmahụ o nwere gbara ume, onye ntorobịa ahụ bụ́ Onyeàmà malitere ịgwa ndị na-eto eto ndị ọzọ okwu. “Mgbe nile ana m eleta ụmụ akwụkwọ ibe m anọ bụ́ ndị gosiworo mmasị, bụkwa ndị m ji n’aka na ha ga-amụ ihe n’oge na-adịghị anya,” ka ọ na-ekwu.
Ọtụtụ afọ gara aga, otu nwa akwụkwọ nọ ná mba Africa bụ́ Liberia nwere ahụmahụ yiri nke ahụ. Mgbe ha na-enwe ihe ọmụmụ nkà mmụta mmekọrịta ọha na eze, o jiri nkwanye ùgwù kọwaa na dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, na ya kweere n’okike ọ bụghị n’evolushọn. Na mbụ, ọtụtụ n’ime ụmụ klas ya katọrọ ya nke ukwuu. Ma onye nkụzi ha kwere ka ọ kọwaara klas ahụ ihe ndị o kweere, mgbe nke ahụ gasịrị onye nkụzi ahụ natara akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?b
Mgbe onye nkụzi ahụ gụsịrị akwụkwọ ahụ, ọ gwara klas ahụ, sị: “Akwụkwọ a enweghị atụ. Ọ bụ otu n’ime akwụkwọ sayensị ndị kasị mma m gụtụworo.” Onye nkụzi ahụ kọwaziri na ya chọrọ iji akwụkwọ Creation ahụ na akwụkwọ ọgụgụ klas ahụ kụzie ihe n’agba agụmakwụkwọ abụọ na-abịanụ, ọ gwakwara ndị nọ na klas ahụ ka ha nata nwa akwụkwọ ahụ bụ́ Onyeàmà akwụkwọ nke ha. E nyefere ọtụtụ akwụkwọ, ọtụtụ ụmụ akwụkwọ gbanwekwara otú ha si ele Ndịàmà Jehova anya!
Okwukwe A Nwalere Anwale Bụ Okwukwe Siri Ike
N’eziokwu, mgbe ụfọdụ ọnụ ọgụgụ nke ndị na-enweghị—ma ọ bụ na-enweghị mmasị ná—nguzo gị dabeere na Bible pụrụ ime ka ike gwụ gị. (Tụlee Abụ Ọma 3:1, 2.) N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịchọ mmekọrịta nke ndị gị na ha kwere n’otu ihe. (Ilu 27:17) Ma gịnị ma ọ bụrụ na e nweghị ndị ntorobịa gị na ha kwere n’otu ihe n’ụlọ akwụkwọ unu ma ọ bụ n’agbata obi unu?
Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, cheta na Enyi gị kasị ukwuu bụ Jehova Chineke, ọ pụkwara inyere gị aka. Ọ bụwo onye Setan Ekwensu kasị kwaa emo kemgbe ọtụtụ puku afọ. N’ihi ya, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ na-eme ka obi Jehova ṅụrịa mgbe ị na-eguzosi ike n’okwukwe gị. Ụzọ dị otú ahụ na-enye ya ohere ‘ịzaghachi Setan, bụ́ onye [na-akwa ya emo, NW] okwu.’—Ilu 27:11.
Ọ bụ nnọọ ihe a ga na-atụ anya ya na site n’oge ruo n’oge, a ga-anwale okwukwe gị. (2 Timoti 3:12) Ma, Pita onyeozi na-emesi anyị obi ike na ọdịdị nke okwukwe anyị a nwalere anwale “dịkarịrị ọlaedo oké ọnụ ahịa nke ukwuu, bụ́ ọlaedo nke na-ala n’iyi, ọ bụ ezie na a na-eji ọkụ nwapụta ya.” (1 Pita 1:7) N’ihi ya, mgbe a kọchara gị n’ihi okwukwe gị, lee ya anya dị ka ohere iji wusiwanye okwukwe gị ike na iji gosipụta ntachi obi gị. Pọl onyeozi dere na ntachi obi na-eduga “n’ọnọdụ a nwapụtara anwapụta.” (Ndị Rom 5:3-5, NW) Ee, ọchịchọ inweta ihu ọma Jehova na-enye gị nkwali siri ike ịnagide mgbe a na-akwa gị emo n’ihi okwukwe gị!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 13]
Ị̀ pụrụ ime ngọpụ banyere okwukwe gị?