Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 8/8 p. 23-25
  • N’ihi Gịnị Ka Mama M Ji Arịasi Ọrịa Ike?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka Mama M Ji Arịasi Ọrịa Ike?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ihi Gịnị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna M Ji Arịa Ọrịa?
  • Mmetụta Na-egbu Mgbu
  • Ihe Ị Pụrụ Ime
  • Ijigide Nguzozi Ime Mmụọ Gị
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ọgwụ Ike Ma Ọ Bụ Mmanya Eriela Papa M Ma Ọ Bụ Mama M Ahụ́?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Olee otú m ga-esi die ọnwụ papa m ma ọ bụ mama m?
    Teta!—2009
  • Otú M Si Eru Uju Ò Kwesịrị Ekwesị?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Gịnị Ma Ọ Bụrụ na Ndị Mụrụ M Emegide Ọlụlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye M?
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 8/8 p. 23-25

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

N’ihi Gịnị Ka Mama M Ji Arịasi Ọrịa Ike?

Ọrịa cancer gburu papa Al.a N’ịbụ onye a kụziwooro nkwa Bible nke mbilite n’ọnwụ, n’ụzọ ụfọdụ Al jisiri ike nagide ọnwụ nna ya. Ma mgbe a chọpụtara na mama ya na-arịa cancer, ọ maliteghachiri inwe nchegbu na ịtụ egwu. Echiche nke nne ya ịnwụnahụkwa ya tụrụ Al egwu. ‘N’ihi gịnị ka o ga-eji bụrụ mama m ga-arịa ọrịa?’ ka ọ ga-ajụ onwe ya n’obi mgbawa.

DỊ KA Dr. Leonard Felder si kwuo, “e nwere ihe karịrị nde ndị America iri isii bụ́ ndị . . . ndị ha hụrụ n’anya na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nkwarụ.” Felder na-ekwukwasị: “N’ụbọchị ọ bụla, ihe dị ka otu onye n’ime ndị America anọ ọ bụla na-arụ ọrụ na-enwekwu ibu ọrụ nke igbo mkpa nne ma ọ bụ nna ya na-arịa ọrịa” ma ọ bụ nke onye ọzọ ọ hụrụ n’anya. Ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ bụghị nanị gị. Otú o sina dị, ịhụ ka onye ị hụrụ n’anya dara ọrịa na-atụ egwu ma na-egbu mgbu. Olee otú ị pụrụ isi nagide ya?

N’ihi Gịnị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna M Ji Arịa Ọrịa?

Ilu 15:13 na-ekwu, sị: “E ji ihe mwute nke obi tigbuo mmụọ mmadụ.” Ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị ichegbubiga onwe gị ókè mgbe nne ma ọ bụ nna gị na-arịa ọrịa. Dị ka ihe atụ, obi gị pụrụ ịdị na-ama gị ikpe banyere ọnọdụ ọjọọ nke nne ma ọ bụ nna gị. Ikekwe ọ nọwo na-esitụrụ gị na nne ma ọ bụ nna gị ike ịdị ná mma. Ọ pụrụ ịbụ na unu arụrịtawo ụka kpụ ọkụ n’ọnụ otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ. Ugbu a nne ma ọ bụ nna gị na-arịa ọrịa, ị pụrụ iche n’ụzọ ụfọdụ na o si gị n’aka. Ma ọ bụ ezie na esemokwu ezinụlọ pụrụ ịkpata nchekasị, o sikata ike ka ọ kpata ọrịa ọjọọ. A pụrụ inwe esemokwu na ụmụ nghọtahie ụfọdụ ọbụna n’ezinụlọ ndị Kraịst na-ahụ n’anya. Ya mere ọ dịghị gị mkpa iburu ibu arọ nke obi amamikpe, dị ka a ga-asị na ọ bụ gị kpatara ọrịa nne ma ọ bụ nna gị.

N’ụzọ bụ́ isi, mama ma ọ bụ papa gị na-arịa ọrịa n’ihi mmehie nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv. (Ndị Rom 5:12) N’ihi mmehie mbụ ahụ, “ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.”—Ndị Rom 8:22.

Mmetụta Na-egbu Mgbu

N’agbanyeghị nke ahụ, ị pụrụ ịdị na-echegbu onwe gị. Mama Terri na-arịa lupus, bụ́ ọrịa na-akpa mmadụ aka ọjọọ. Terri na-ekweta, sị: “Mgbe ọ bụla m na-anọghị n’ụlọ, ana m echegbu onwe m ma mama m ọ nọkwa nke ọma. Ọ na-esiri m ike itinye uche n’ihe. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na achọghị m ka ọ na-echegbu onwe ya, adịghị m ekwupụta otú ọ dị m.”

Ilu 12:25 na-ekwu, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala.” Ndị ntorobịa nọ n’ọnọdụ a na-adakarị nnọọ mbà n’obi. Terri na-ekwu na ọ gbawara ya obi mgbe ọ hụrụ na nne ya enwekwaghị ike ịrụ ọrụ ndị dị mfe. Ihe na-akpatakwu nchegbu ahụ bụ eziokwu ahụ bụ́ na ndị ntorobịa—nke ka nke ụmụ agbọghọ—na-abụkarị ndị a manyere ibughara ibu ọrụ ọzọ. Dị ka Prọfesọ Bruce Compas si kwuo, “a na-ebokwasị ụmụ agbọghọ ibu arọ ezinụlọ, dị ka ilekọta ụlọ na ụmụnne ha ndị obere, bụ́ ndị ha na-enweghị ike ịnagide na ndị na-egbochi ha itolite nke ọma n’ụzọ mmekọrịta ọha na eze.” Ụfọdụ ndị ntorobịa na-ekewapụ onwe ha iche, na-ege egwú na-akụda mmụọ ma na-akpata ịda mbà n’obi.—Ilu 18:1.

Mmadụ ịtụ egwu na nne ma ọ bụ nna ya pụrụ ịnwụ bụkwa ihe na-emekarị. Terri bụ otu nwa, ọ bụkwa nanị nne ya na-azụ ya. Terri na-akwa ákwá oge ọ bụla nne ya gara ụlọ ọgwụ, na-atụ egwu na ọ gaghị alọta. Terri na-ekwu, sị: “Ọ bụ nanị anyị abụọ. Achọghị m ka ezigbo enyi m nwụọ.” Otu nwa agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma aha ya bụ Martha kwetara n’otu aka ahụ, sị: “Adị m afọ iri na asatọ, ma ụjọ nne na nna m ịnwụnahụ m ka na-atụ m. Ọ ga-abụ nnọọ oké mmetụta nke owu ọmụma.” Mmetụta ndị ọzọ a na-enwekarị n’ihe banyere ọrịa nke nne ma ọ bụ nna bụ ehighị ụra nke ọma, nrọ ọjọọ, na nsogbu iri ihe.

Ihe Ị Pụrụ Ime

N’agbanyeghị otú ihe pụrụ iyi ka o siruru n’ike ugbu a, ị pụrụ ịnagide ya! Malite site n’ịkọrọ nne na nna gị egwu na nchegbu gị. Olee nnọọ otú ọnọdụ nne ma ọ bụ nna gị dịruru ná njọ? Olee ohere o nwere ịgbake? Ndokwa dị aṅaa ka e meworo maka ilekọta gị a dịghị ama ama nne ma ọ bụ nna gị aghara ịgbake? Ì nwere ohere ọ bụla ịnọ n’otu ọnọdụ ahụ ma i mewanye okenye? Ọ bụ ezie na ọ na-esiri ndị nne na nna ike ikwu banyere ihe ndị dị otú ahụ, ọ bụrụ na i jiri nwayọọ na nkwanye ùgwù rịọ maka enyemaka ha, o yiri ka ha ga-eme ihe nile ha nwere ike ime iji nye aka ma kwado gị.

Soro ha kwurịtakwa mmetụta gị na-ewuli elu. Al na-echeta na ya emeghị otú ahụ mgbe ọ matara na nne ya na-aga ịnwụ n’ihi ọrịa cancer. Ọ na-ekwu, sị: “Agwaghị m ya otú m si hụ ya n’anya. Amaara m na ọ chọrọ ịnụ ya n’ọnụ m, ma dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma o mere m ihere ịgwa ya mmetụta dị otú ahụ. Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị ọ nwụrụ, obi m na-amakwa m ikpe ugbu a n’ihi na mgbe m nwere ohere ikwu ya, ekwughị m ya. M na-akwakwa ụta n’ihi na ọ bụ onye kasị mkpa ná ndụ m.” Alala azụ ime ka nne na nna gị mata otú i si hụ ha n’anya.

Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, nweta ihe ọmụma n’onwe gị banyere ọrịa nne ma ọ bụ nna gị. (Ilu 18:15) Ikekwe dọkịta ezinụlọ unu pụrụ inyere gị aka na nke a. Ịmata banyere ya ga-enyere gị aka inwekwu ọmịiko, ndidi, na igosikwu nghọta. Ọ pụkwara inye aka ịkwadebe gị maka mgbanwe anụ ahụ ọ bụla nke nne ma ọ bụ nna gị pụrụ inwe, dị ka àpà, ndasị nke ntutu isi, ma ọ bụ oké ike ọgwụgwụ.

Nne ma ọ bụ nna gị ọ̀ nọ n’ụlọ ọgwụ? Mgbe ahụ mee ka nleta gị na-akpata ihu ọchị ma na-ewuli elu. Mee ka mkparịta ụka unu na-akpali nchekwube ruo ókè kwere mee. Kọọrọ ya banyere ọrụ ụlọ akwụkwọ na ihe omume ndị Kraịst gị. (Tụlee Ilu 25:25.) Ọ bụrụ na i bi ná mba ebe a na-atụ anya ka ndị ikwu butere onye ọrịa nri ma jeere ya ozi ndị ọzọ, rụọ ọrụ nke dịịrị gị n’emeghị mkpesa. Iji ejiji dị ọcha ma dị mma abụghị nanị na ọ ga-eme nne ma ọ bụ nna gị obi ụtọ kama ọ ga-enwekwa mmetụta dị mma n’ebe ndị ọrụ ụlọ ọgwụ na ndị dọkịta nọ. Nke a pụrụ imeziwanye nlekọta a na-enye nne ma ọ bụ nna gị.b

Nne ma ọ bụ nna gị ọ̀ na-agbake n’ụlọ? Ya bụrụ otú ahụ mee ihe ị pụrụ ime iji nye aka n’ilekọta ya. Wepụta onwe gị ikere ókè nke ọma n’ọrụ ụlọ. Gbalịa iṅomi Jehova site n’inye onwe gị ‘n’afọ ofufo, n’akwaghịkwa ụta.’ (Jemes 1:5) Mee ihe nile i nwere ike iji gosipụta mmụọ emeghị mkpesa, nke nchekwube, nke obi ụtọ.

Otú ọ dị, ị ka nwere ọrụ ụlọ akwụkwọ. Gbalịa iwepụta oge maka ya, n’ihi na agụmakwụkwọ gị ka dị mkpa. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, hapụtụ oge ụfọdụ maka ezumike na ntụrụndụ. (Eklisiastis 4:6) Nke a ga-enye gị ume ọhụrụ ma nyere gị aka inye nne ma ọ bụ nna gị nkwado ka mma. Nke ikpeazụ, zere ikewapụ onwe gị. Nabata nkwado nke ndị Kraịst ibe gị. (Ndị Galetia 6:2) Terri na-ekwu, sị: “Ọgbakọ ghọrọ ezinụlọ m. Ndị okenye dị njikere mgbe nile isoro m kwurịta okwu na inye m agbamume. Agaghị m echefu nke ahụ echefu.”

Ijigide Nguzozi Ime Mmụọ Gị

Nke kasị mkpa n’ihe nile bụ ijigide nguzozi ime mmụọ gị. Na-eme ihe omume ime mmụọ mgbe nile, dị ka ịmụ Bible, ịga nzukọ, na ikwusara ndị ọzọ ozi ọma. (1 Ndị Kọrint 15:58) N’ọnwa oge okpomọkụ, Terri na-amụba òkè ọ na-ekere n’ọrụ izisa ozi ọma dị ka ọsụ ụzọ inyeaka. Ọ na-ekwukwasị: “Mgbe nile mama m na-agba m ume ijikere maka na ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nke ahụ baara anyị abụọ uru. Ebe ọ bụ na ọ pụghị ịga nzukọ nile dị ka ọ chọrọ, ana m aṅa ntị nke ọma ka m wee nwee ike ịkọrọ ya banyere ya mgbe e mesịrị. Ọ na-adabere n’ebe m nọ maka inye ya nri ime mmụọ mgbe ọ na-enweghị ike ịnọ n’ebe ahụ.”

Otu isiokwu dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times chịkọtara okwu nke ọma mgbe o kwuru banyere onye ọrụ ebere bụ́ onye nọgideworo “na-enwe ihe ijuanya banyere otú ụmụaka pụrụ itoru, ọbụna na-emekwa nke ọma n’agbanyeghị mkpasasị uche nke ọrịa nne ma ọ bu nna ha kpataara ha.” Ọ na-ekwu, sị: “Ha na-azụlite nkà ụfọdụ ha na-amaghị na ha nwere . . . Ọ bụrụ na ha pụrụ ịnagide nke a, ha pụrụ ịnagide ọtụtụ ihe.”

Gị onwe gị pụkwara ịnagide oge a siri ike. Dị ka ihe atụ, mama Terri agbasiwo nnọọ ike ugbu a ilekọta onwe ya. Ikekwe, ka oge na-aga, nne ma ọ bụ nna gị ga-agbakekwa. Ma ka ọ dịgodị ugbu a, echefula na i nwere nkwado nke Enyi gị nke eluigwe, bụ́ Jehova. Ọ bụ “Onye na-anụ ekpere,” ọ ga-anụkwa arịrịọ gị maka enyemaka. (Abụ Ọma 65:2) Ọ ga-enye gị—na nne ma ọ bụ nna gị na-atụ egwu Chineke—“ọkịka nke ike ahụ” ka i wee nwee ike ịnagide.—2 Ndị Kọrint 4:7; Abụ Ọma 41:3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ụfọdụ.

b Isiokwu bụ́ “Ileta Onye Ọrịa—Ụzọ Isi Nye Aka,” dị ná mbipụta Teta! nke March 8, 1991 (Bekee), nwere ọtụtụ aro ndị dị irè.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

“Mgbe ọ bụla m na-anọghị n’ụlọ, ana m echegbu onwe m ma mama m ọ nọkwa nke ọma”

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Inweta ihe ọmụma banyere ọrịa nne ma ọ bụ nna gị pụrụ ịkwadebe gị nke ọma karị iji nye aka

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya