Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 8/8 p. 9-10
  • Ị Pụrụ Ikpebi Ihe Ọdịnihu Gị Ga-agụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Pụrụ Ikpebi Ihe Ọdịnihu Gị Ga-agụ
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọdịnihu A kara Aka na Nnwere Onwe Ime Nhọrọ
  • Ihe Kpatara Ihe na Ihe Ọ Rụpụtara
  • Gịnị Ka Ọdịnihu Gị Ga-abụ?
  • Ịchọ Ọdịnihu A Kara Aka nke Mmadụ
    Teta!—1999
  • Ọ̀ Bụ Akara Aka Na-ekpebi Ọdịnihu Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ọdịnihu Gị Dị Gị n’Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • Gịnị Ka Ọdịnihu Gị Ga-abụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 8/8 p. 9-10

Ị Pụrụ Ikpebi Ihe Ọdịnihu Gị Ga-agụ

Ọ BỤ ezie na e lere ịjụ ndị mmụọ ase anya dị ka “nnukwu ihe e jiri ọgụgụ isi rụzuo n’ụwa oge ochie nile,” ọ bụ “nkà nke ndị amụma bụ́ ndị Hibru kwara emo,” ka ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Joan Oates na-ekwu. N’ihi gịnị?

N’agbanyeghị na mba ndị na-eche na akara aka na-ekpebi ndụ gbara ha gburugburu, ụmụ Israel oge ochie jụrụ echiche nke bụ́ na ikike na-enweghị nchịkwa na-ekpebi ndụ ha. N’iwu o nyere mba ahụ, Chineke gwara ha, sị: “A gaghị ahụta n’etiti gị . . . onye na-ajụ ase, ma ọ bụ onye na-eji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ma ọ bụ onye na-agba afa, ma ọ bụ onye mgbaasị, ma ọ bụ . . . dibịa afa.”—Deuterọnọmi 18:10, 11.

N’ịbụ ndị na-enweghị echiche akara aka ma ọ bụ na-ejekwurughị ndị dibịa afa, ụmụ Israel nwere obi ike n’ọdịnihu. N’ịkọwa ihe kpatara nke a, akwụkwọ nkà ihe ọmụma ndị Katọlik e dere n’asụsụ French bụ́ Théo na-ekwu na mba ahụ kweere na “ikike na-enweghị nchịkwa emetụtaghị mmadụ na ụwa. Chineke nwere ihe o zubeere mmadụ.” Gịnị bụ nzube a?

Ọdịnihu A kara Aka na Nnwere Onwe Ime Nhọrọ

Chineke kwere ụmụ Israel nkwa udo na ọganihu ma ha rube isi n’iwu ya. (Levitikọs 26:3-6) Ọzọkwa, ha tụrụ anya Mesaịa bụ́ onye ga-eweta ọnọdụ ezi omume n’ụwa. (Aịsaịa, isi nke 11) Otú ọ dị, eziokwu ahụ bụ́ na Chineke kwere ihe ndị a ná nkwa apụtaghị na ndị mmadụ pụrụ ịnọrọ nnọọ ma hapụ ka ihe na-eme. N’ụzọ megidere nke ahụ, a gwara ha, sị: “Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya.”—Eklisiastis 9:10.

Nke a hiwere isi n’echiche nke nnwere onwe ime nhọrọ. Ụmụ Israel nweere onwe ha ijere Chineke ozi na ikpebi ihe ọdịnihu ha ga-abụ. Chineke kwere ha nkwa, sị: “Ọ ga-erukwa, ọ bụrụ na unu ejisie ike ige ntị ihe m nile e nyere n’iwu, nke Mụ onwe m na-enye unu n’iwu taa, ịhụ Jehova, bụ́ Chineke unu, n’anya, na iwere obi unu nile na mkpụrụ obi unu nile fee Ya ofufe, na m ga-enye mmiri ozuzo ala unu na mgbe ya, mmiri ozuzo mbụ na mmiri ozuzo ikpeazụ, ka i wee chịkọta ọka gị, na mmanya vine ọhụrụ gị, na mmanụ gị.” (Deuterọnọmi 11:13, 14) Ngọzi Chineke dịkwasịrị ụmụ Israel mgbe ha rubeere ya isi.

Nwa oge tupu ha abanye n’ala ahụ o kwere ha ná nkwa, Chineke nyere mba Israel ihe ha ga-ahọrọ: “Lee, etinyewo m n’ihu gị taa ndụ na ezi ihe, na ọnwụ na ihe ọjọọ.” (Deuterọnọmi 30:15) Ihe ga-abụ ọdịnihu onye nke ọ bụla dabeere n’omume na mkpebi ya. Ijere Chineke ozi pụtara ndụ na ngọzi, ebe ịjụ ime otú ahụ pụtara ihe isi ike. Ma gịnị banyere taa?

Ihe Kpatara Ihe na Ihe Ọ Rụpụtara

Anyị nọ n’okpuru iwu okike ndị e mere ka ha dịrị maka ọdịmma anyị. Otu n’ime ndị a bụ iwu nke ihe kpatara ihe na ihe ọ rụpụtara, ma ọ bụ, dị ka Bible si kwuo ya, “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.” (Ndị Galetia 6:7) Ozugbo anyị matara ụkpụrụ a, a pụrụ ịtụle ikwe omume nke ụfọdụ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

Ọ bụrụ na anyị akwọọ ụgbọala ara ara, o yikarịrị ka anyị ga-enwe ihe mberede karịa mgbe anyị ji mkpachara anya na-akwọ ụgbọala. Ọ bụrụ na anyị na-ese ụtaba, o yikarịrị ka anyị ga-arịawa cancer karịa mgbe anyị na-adịghị ese. N’eziokwu, ihe ndị na-eme eme dị ka mwakpo nke ndị ahụ na-eyi ọha egwu e kwuru okwu ya n’isiokwu nke mbụ dị n’ime usoro isiokwu a yiri ka ha agaghị eme anyị, ịtụlekwa ma ha pụrụ ime agaghị abakwa uru. Otú ọ dị, inwe echiche nke akara aka agaghị abara anyị uru. Ọ dịghị eme ka anyị ghọta oge dị ugbu a ma ọ bụ ọdịnihu. Ikwere n’ụgha adịghị emesighachi obi ike n’ezie maka ọdịnihu. Otú ahụ kwa ka ọ dị n’iche na Chineke na-ekpebi ihe ọ bụla na-emenụ.

Gịnị Ka Ọdịnihu Gị Ga-abụ?

E deghị ọdịnihu anyị ede tupu o ruo kama ọ bụ oge dị ugbu a na-ekpebi ya. Ọ bụ ezie na ndụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke, Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na anyị ga-eme ihe dị ukwuu n’ikpebi ihe anyị bụ ugbu a na ihe ọdịnihu anyị ga-abụ. Eziokwu ahụ bụ́ na anyị nwere nhọrọ ime ka Chineke nwee obi ụtọ ma ọ bụ, n’ụzọ megidere nke ahụ, ịkpasu ya iwe na-egosi na Chineke ahapụwo anyị ịchịkwatụ ndụ anyị.—Jenesis 6:6; Abụ Ọma 78:40; Ilu 27:11.

Ọzọkwa, Akwụkwọ Nsọ na-emesi ya ike ugboro ugboro na e jikọtara ọdịnihu anyị na ntachi obi na ụzọ ndụ anyị, bụ́ nke na-agaraghị enwe isi ma ọ bụrụ na a kaalarị ihe nile aka. (Matiu 24:13; Luk 10:25-28) Mgbe ahụ, ọ bụrụ na anyị ahọrọ irubere Chineke isi ma kwesị ntụkwasị obi nye ya, ọdịnihu dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya ya?

Bible na-ekpughe na ihe a kpọrọ mmadụ nwere ọdịnihu dị mma. A ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs bụ́ ebe udo na ịnọ ná nchebe ga-adị. (Abụ Ọma 37:9-11; 46:8, 9) Ọdịnihu ahụ ga-abịarịrị n’ihi na Onye Okike pụrụ ime ihe nile ga-emezu nkwa ya. (Aịsaịa 55:11) Ma anyị ịbụ ndị e ji ndụ na Paradaịs gọzie adabereghị n’akara aka: a ga-enweta ya ma anyị jiri nrube isi na-eme uche Chineke ugbu a. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-8; Mkpughe 7:14, 15) Chineke enyewo anyị nnwere onwe ime nhọrọ ma na-agba anyị ume: “Gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ.” (Deuterọnọmi 30:19) Gịnị ka ị ga-ahọrọ? Kama ịbụ ihe dabeere n’akara aka, ihe ga-abụ ọdịnihu gị dị gị n’aka.

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Chineke ezubewo ọdịnihu magburu onwe ya maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya