Ndalata nke Okpukpe na Britain
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA BRITAIN
AKWỤKWỌ akụkọ bụ́ The Sunday Times nke London kọrọ na ndị Britain 1,500 na-agbahapụ chọọchị ndị bụ́ isi kwa izu. Mmadụ 600,000 esila na Chọọchị Roman Katọlik pụọ kemgbe 1980, Church of England— nke mmadụ 600 ka “na-agbahapụ” kwa izu—na-enwekwa mmadụ na-erughị otu nde ná nzukọ ya, nke na-erughị ọkara ndị na-eje ya n’afọ 50 gara aga. Mgbe Nzukọ Ezumezu Ndị Isi Chọọchị nke 1992 kpebisịrị ichi ndị inyom echichi, ihe dị ka ndị ụkọchukwu 500 nke Church of England pụrụ.
Ọtụtụ ndị gbahapụrụ chọọchị na-ewekarị iwe ma bụrụ ndị a na-emechukarị ihu na ọ dịghị onye mere mgbalị ịkwụsị ha ịpụ ma ọ bụ kpọtụrụ ha ịhụ ihe a pụrụ ime iji nyere ha aka ozugbo ha pụrụ, ka The Times kọrọ. Ụfọdụ “kwuru na ndị ụkọchukwu abịaghị ha nso,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru.
Ndị Britain na-enweta “nduzi na-adalata adalata nke ime mmụọ na nke omume,” ka achịbishọp Roman Katọlik nke Westminster bụ́ kadinal Basil Hume, kwuru. Gịnị kpatara ndalata a? “Ụnwụ Okwu Chineke,” bụ isi akụkọ nke akwụkwọ akụkọ bụ́ Catholic Herald. O kwuru, sị: “Mgbe a na-edo Mas a na-agụpụtara anyị akụkụ ụfọdụ n’Agba Ọhụrụ na nke Ochie, ma o sika ike, ma ọ bụrụdị na ọ dịtụla mgbe ọ bụla a kọwaara anyị ihe ha na-ekwu. . . . Ndụ ndị senti na akwụkwọ dịgasị iche na-atụle ihe ime mmụọ dị mma, ma ha ezughị ezu iji ghọta Akwụkwọ Nsọ.” Isiokwu a kwubiri na e nweghị “okwu nke oge a dabeere na Bible nke nzube ya bụ iduzi ọgbakọ.”
N’akwụkwọ ozi o degaara ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ Lincolnshire bụ́ Boston Target, otu onye na-agụ ya kwuru, sị: “Okwukwe ndị mmadụ nwere n’ebe okpukpe dị na-ajụ oyi . . . Gịnị ka ndị ozi chọọchị ndị a na-eme ụbọchị nile? Ha adịghị apụ n’ezie dị ka Kraịst pụrụ ma jekwuru ndị mmadụ . . . Nanị okpukpe yiri ka ọ na-eche banyere ndị mmadụ bụ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-ejekwuru ndị mmadụ, ndị na-ekere òkè n’ezie n’ikwusa eziokwu ahụ—ha na-akpọ gị òkù ịbịa nzukọ ha, ha na-ekwu ma na-eme ihe banyere gburugburu ebe obibi. Abụghị m Onyeàmà Jehova, ma ana m akwanyere ndi a ùgwù ma na-aṅa ha ntị.”
Ọ̀ dịtụwo mgbe i jere nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè unu? N’ebe ahụ ị ga-anata ntụziaka na-akpali akpali ma na-enye aka. Ọ̀ ga-amasị gị ka a zaa ajụjụ Bible ndị i nwere? N’afọ gara aga, n’ala 233, Ndịàmà Jehova tinyere ihe karịrị otu nde awa nke oge ha n’inyere ndị mmadụ aka ịghọta Bible n’efu, na-eduzi ihe karịrị nde ọmụmụ Bible ebe obibi anọ. Ndịàmà Jehova weere ọrụ ịkụzi Bible nke a dị ka ọrụ kasị mkpa a na-arụ n’oge a. Anyị na-akpọku gị ka ị chọpụta ihe kpatara ya.—Matiu 24:14; 28:19, 20.