Ọdịnihu E Ji n’Aka n’Ikpeazụ!
“Ụwa nile ezuwo ike, dị jụụ: ha etiwawo mkpu ọṅụ.”—AỊSAỊA 14:7.
“ỤWA anyị bụ ebe e nwere ndị bụ́ dike n’ike nuklia na ndị nwere ntakịrị ụkpụrụ omume ọma. Anyị maara ihe banyere agha karịa ka anyị maara banyere udo, mara banyere igbu mmadụ karịa ka anyị maara banyere ịdị ndụ.” Okwu ndị ahụ, nke otu ọchịagha Ndị Agha United States kwuru na 1948, na-echetara anyị ihe e kwuru na Bible: “Otu mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Mgbe ụmụ mmadụ nwere ngwá agha nuklia, ha pụrụ ime ihe dị njọ karịa imejọ ụmụ mmadụ ibe ha; ha pụrụ igbu ha!
Ọtụtụ ndị kwenyere na inwe na iji ngwá agha nuklia eme ihe megidere ụkpụrụ omume ọma. Dị ka ihe atụ, George Lee Butler bụ́ ọchịagha Ndị Agha Ụgbọelu nke United States laworo ezumike nká kwuru, sị: “Nanị ịdị adị nke ngwá agha nuklia n’ebe mmadụ kwakọbara ngwá agha ya ka na-enye echiche bụ́ na anyị pụrụ iji uche hụ ọnọdụ ndị anyị pụrụ . . . n’ụzọ ụfọdụ ile iji ngwá agha ahụ eme ihe anya dị ka ihe na-adịchaghị njọ. Nke ahụ ezighị nnọọ ezi.”
Ka o sina dị, onye Britain na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Martin Woollacott na-ekwu, sị: “Ngwá agha nuklia ka na-adọrọ mmasị, n’agbanyeghị ihe ndị na-eme nchepụta na ndị na-akụzi ụkpụrụ omume ọma na-ekwu banyere abaghị uru ha na ịdị njọ ha. Gọọmenti dị iche iche kwenyere na ọ dị ha mkpa maka nchebe ezi uche dị na ya; ha na-adaberekwa na ha n’ihi na ngwá agha nuklia nwere ụdị ike ọjọọ nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị soja maara ma chọọ inwe.”
Ọ bụ ezie na kemgbe iri afọ ise gara aga, mmadụ agbalịwo n’ụzọ ụfọdụ izere agha nuklia. Ma n’otu oge ahụ, e jiriwo ngwá agha ndị na-abụghị nke nuklia gbuo ọtụtụ puku ụmụ mmadụ. N’ịtụle ihe mmadụ meworo n’oge gara aga, ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya iwere ya na, ka oge na-aga, a ga-eji ngwá agha nuklia ndị a dị egwu mee ihe.
Ihe Ndị Bụ́ Isi Na-akpata Ya
À pụrụ ịkwụsị àgwà ịchọ ịlụ agha nke mmadụ? Ụfọdụ na-arụ ụka na ụmụ mmadụ na-alụ agha n’ihi ịdị iberibe, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, na oké mkpali ndị na-ezighị ezi. “Ọ bụrụ na ihe ndị a bụ ihe ndị bụ́ isi na-akpata agha,” ka ọkà mmụta bụ́ Kenneth Waltz na-ekwu, “mgbe ahụ a ga-akwụsị agha site n’ịkwalite mmụọ ụmụ mmadụ na inyekwu ha ihe ọmụma.”
Ndị ọzọ na-ekwu na ihe ndị na-akpata agha bụ ọdịdị nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba nile. Ebe ọ bụ na mba nke ọ bụla kwụụrụ onwe ya na-achọ ọdịmma nke mba ya, a ga-alụrịrị agha. Ebe ọ bụ na e nweghị otu ụzọ, nke a pụrụ ịdabere na ya isi dozie esemokwu, agha na-ada. William E. Burrows na Robert Windrem dere n’akwụkwọ ha bụ́ Critical Mass, sị: “Akụkụ siri ike metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. A pụghị inwe usoro nchịkwa dị irè ma ọ bụrụ na e nweghị mkpebi bụ́ isi nke ndị ọchịchị ịkwụsị na ọbụna ichigharị mmụba nke ngwá agha ndị dị ike ihu.”
Tụlee nkwurịta okwu na-aga n’ihu iji tinye Nkwekọrịta Ịmachibido Ụdị Nnwale Nile nke Ngwá Agha n’ọrụ. Magazin bụ́ Guardian Weekly kọwara ha dị ka “nkwurịta okwu kpụ ọkụ n’ọnụ n’agbata mba ndị nwere ike nuklia na mba ndị nwetarala ngwá agha nuklia na nzuzo ma ọ bụ nwee nkà na ụzụ iji kpụpụta ha ngwa ngwa.” Otu isiokwu ahụ kwetara, sị: “Ọ dịghị nke ọ bụla [n’ime ha] na-eme atụmatụ ịhapụ ngwá agha ya ma ọ bụ ikike o nwere ịkpụpụta ha, ma ọ bụ ohere o nwere imeziwanye ma ngwá agha ya ma ikike ịkpụpụta ha.”
N’ụzọ pụtara ìhè, mmekọrịta nke mba na mba dị mkpa ma ọ bụrụ na a ga-akwụsị iyi egwu nile nke nuklia. Akwụkwọ bụ́ Critical Mass na-ekwu, sị: “Ya mere ịtụkwasịrịta ibe ha obi aghaghị ịnọchi mkpochapụrịta e ji n’aka n’ebe nile, . . . ma ọ bụghị otú ahụ mbibi ga-esochi ka oge na-aga.” N’ụzọ dị mwute, mmekọrịta na nkwurịta okwu mba na mba taa na-eyikarị ihe Daniel onye amụma kọwara na narị afọ 26 gara aga: ‘Ha na-ekwu okwu ụgha n’otu tebụl.’—Daniel 11:27, Byington.
Mmekọrịta Zuru Ụwa Ọnu n’Okpuru Ọchịchị Ga-achị Ụwa
Ka o sina dị, Bible na-emesi anyị obi ike na Chineke n’onwe ya na-ezube iweta ezi mmekọrịta zuru ụwa ọnụ n’okpuru ọchịchị dị nnọọ irè nke ga-achị ụwa. Ọtụtụ nde mmadụ ekpewo ekpere maka ọchịchị a n’amaghị ama mgbe ha na-ekpe Ekpere Onyenwe Anyị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) Alaeze bụ ọchịchị. Onyeisi nke ọchịchị Alaeze ahụ bụkwa Onyeisi Udo, bụ́ Jisọs Kraịst. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ . . . Ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.” (Aịsaịa 9:6, 7) Bible na-ekwe nkwa banyere ọchịchị ahụ nọ n’aka Jisọs, sị: “Ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [ma ọ bụ ọchịchị ụmụ mmadụ] mee ka ha gwụsịa.”—Daniel 2:44.
Ọchịchị a ga-achị ụwa ga-eweta ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi—ma ọ bụghị site n’iji ngwá agha nuklia eme ihe ma ọ bụ site ná nkwekọrịta a na-apụghị ịtụkwasị obi maka ịchịkwa ngwá agha. Abụ Ọma 46:9 na-ebu amụma na Jehova Chineke “na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; Ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; Ọ na-esure ụgbọala nile n’ọkụ.” Emerughị ihe n’isi agaghị ezu. Ọ bụghị nanị ibelata ọnụ ọgụgụ ngwá agha nuklia ka Alaeze Chineke dị n’okpuru Kraịst ga-eme—ọ ga-ekpochapụ ha na ngwá agha ndị ọzọ kpam kpam.
Iyi egwu nuklia agaghị adị n’ihi na a gaghị enwe mba ndị bụ́ dike, mba ndị dị aghụghọ, a gaghị enwekwa ndị na-eyi ọha egwu. Ezi udo ga-adịgide: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.” Okwu ndị a e kwuru site n’ike mmụọ nsọ sitere n’aka Chineke onye na-apụghị ikwu okwu ụgha.—Maịka 4:4; Taịtọs 1:2.
Dị ka Abụ Ọma 4:8 si kwuo, a ga-enweta ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nanị n’ime ndokwa Jehova Chineke: “N’udo ka m ga-eji otu mgbe ahụ dinaa ala, rahụ ụra: n’ihi na Gị onwe gị, Jehova, nanị Gị, na-eme ka m biri ná ntụkwasị obi.” Dị ka akụkọ ihe mere eme mmadụ gosiworo n’ụzọ dị mwute, nkwa ọ bụla e kwere iweta “udo na ịnọ ná ntụkwasị obi” n’abụghị site n’Alaeze Jehova pụrụ nanị ịbụ ụgha.—Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3.
“Ịnọ Jụụ na Ntụkwasị Obi”
Ma gịnị banyere ọdịdị ịchọ ịlụ agha nke mmadụ n’onwe ya? “Ezi omume ka ndị bi n’elu ụwa dum mmadụ bi mụtaworo.” (Aịsaịa 26:9) Ntụziaka dị otú ahụ a ga-enye banyere ezi omume ga-enwe mmetụta dị ukwuu n’ọdịdị nke mmadụ na n’ọnọdụ ụwa: “Ihe ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo; ihe nke ga-esi n’ofufe ezi omume ahụ pụta bụkwa ịnọ jụụ na ntụkwasị obi ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 32:17) A ga-eji ịhụnanya onye agbata obi na inwe nchegbu banyere ọdịmma nke mmadụ nile dochie anya oké iwe ma ọ bụ mkpali ime ihe ike ọ bụla. Ndị bi n’ụwa “ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:4.
N’okwu amụma, Aịsaịa buru amụma na a ga-agbanwe ụmụ mmadụ nwere àgwà ndị dị ka nke anụ ọhịa. O kwuru banyere oge mgbe “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa.” N’ihi ya, “anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha. . . . Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile.”—Aịsaịa 11:6-9.
Ikwere ná nkwa ndị a Chineke kwere emewo ka Ndịàmà Jehova nwee nchekwube ná ndụ. Mgbe anyị na-elepụ anya n’ọdịnihu, anyị adịghị ahụ ụwa nke e ji ngwá agha nuklia bibie. Kama nke ahụ, anyị na-ahụ mmezu nke nkwa Bible, bụ́: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Ụfọdụ ga-akpọ okwukwe dị otú ahụ amaghị ihe na ihe ezi uche na-adịghị na ya. Ma ònye n’ezie bụ onye na-amaghị ihe? Onye nwere okwukwe ná nkwa Chineke ka ọ̀ bụ onye nabatara nkwa efu nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Nye ndị hụrụ udo n’anya n’ezie, azịza ya doro anya.a
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ndịàmà Jehova enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka inakwere ozi Bible nke na-enye olileanya site n’ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Ị pụrụ ime ndokwa ka ha bịa kpọtụrụ gị site n’idetara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ ma ọ bụ site n’ije n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
“Mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:4
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
N’ụwa ọhụrụ Chineke, ezinụlọ nile ‘ga-ebi ná ntụkwasị obi,’ a ga-ekpochapụkwa ụdị ngwá agha nile
[Foto dị na peeji nke 10]
A na-ewepụ àgwà ịchọ ịlụ agha ka ụmụ mmadụ na-amụ Okwu Chineke, bụ́ Bible ma na-etinye ya n’ọrụ