Nkwenkwe Ụgha—n’Ihi Gịnị Ka O Ji Dị Nnọọ Ize Ndụ?
NKWENKWE ụgha ọ̀ pụrụ imerụ gị ahụ? Ụfọdụ ndị pụrụ ileghara echiche a anya ma ọ bụ chee na ọ dịchaghị ize ndụ. Ma, n’akwụkwọ ya bụ́ Believing in Magic—The Psychology of Superstition (Ikwere na Majik—Echiche Nkwenkwe Ụgha), Prọfesọ Stuart A. Vyse na-adọ aka ná ntị, sị: “Nkwenkwe ụgha pụrụ ibelata ọnọdụ ibi ndụ ma ọ bụrụ na mmadụ na-emefu nnukwu ego n’aka ndị na-eme anwansi, ndị na-agba afa, ndị na-eji ọnụ ọgụgụ agba afa, ma ọ bụ ndị na-eji kaadị akọwa ọdịnihu mmadụ, ma ọ bụ ọ bụrụ na ememe nkwenkwe ụgha mmadụ na-eme ka nsogbu ịgba chaa chaa ya dịgide.” Ikwe ka nkwenkwe ụgha chịkwaa ndụ anyị pụrụ ịkpata ihe ndị dị oké njọ karị.
Dị ka anyị hụworo, ọtụtụ nkwenkwe ụgha na-ebelata ịtụ ọdịnihu egwu. Otú ọ dị, ọ dị mkpa ịmata ọdịiche dị n’etiti nkwenkwe ụgha na ezi ihe ọmụma banyere ihe ga-abụ ọdịnihu anyị. Tụlee otu ihe atụ.
Akụkọ Na-enye Ihe Ọmụma
Na 1503, mgbe ọtụtụ ọnwa nke ime nchọpụta n’ụsọ oké osimiri nke Etiti Kọntinent America gasịrị, Christopher Columbus jisiri ike kwọrute ụgbọ mmiri ya abụọ ndị ikpeazụ n’ebe bụ́ àgwàetiti Jamaica ugbu a. Na mbụ, ndị bi n’àgwàetiti ahụ jiri obi ha soro ndị nchọpụta ahụ tọrọ atọ kerịta ihe oriri ha. Otú ọ dị, ka oge na-aga, àgwà ọjọọ nke ndị njem ụgbọ mmiri ahụ mere ka ndị bi n’àgwàetiti ahụ kwụsị inye ha ihe oriri. Ọnọdụ ahụ jọrọ oké njọ, ebe ọ bụ na ọ ga-ewe oge ụfọdụ tupu ụgbọ mmiri ọzọ abịarute ịnapụta ha.
Dị ka akụkọ ahụ si kwuo, Columbus gụrụ akwụkwọ ngụkọ oge ya ma chọpụta na chi ga-eji n’ehihie February 29, 1504. N’iji nkwenkwe ụgha nke ndị bi n’àgwàetiti ahụ mee ihe, ọ dọrọ ha aka ná ntị na ọchịchịrị ga-agba n’ehihie ọ gwụlakwa ma ha nyere ndị ha na ya so ihe oriri. Ndị àgwàetiti ahụ leghaara ịdọ aka ná ntị ahụ anya—ruo mgbe chi malitere iji n’ehihie! Mgbe ahụ, “n’ịkwasi ákwá ike na iti mkpu,” ha “si n’akụkụ ọ bụla buru ọtụtụ ihe gbagawa n’ebe ụgbọ mmiri ahụ dị.” A nọ na-enye ndị nchọpụta ahụ ihe oriri ruo oge nile ha nọrọ n’ebe ahụ.
Nye ndị àgwàetiti ahụ, Columbus mere ezigbo majik. Ma ihe ha kwubiri dabeere na nkwenkwe ụgha efu. N’eziokwu, “amụma” ahụ dabeere ná ngagharị na-adịghị agbanwe agbanwe nke ụwa, ọnwa, na anyanwụ. Ndị na-enyocha mbara igwe pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi banyere ihe ndị dị otú ahụ dị ka chi iji n’ehihie ogologo oge tupu ha emee, ihe ọmụma a dịkwa n’akwụkwọ ngụkọ oge. Ọzọkwa, ngagharị na-adịghị agbanwe agbanwe nke ihe ndị dị na mbara igwe na-eme ka ndị na-enyocha mbara igwe mara ebe ha nọ kpọmkwem n’oge ọ bụla. N’ihi ya, mgbe akwụkwọ akụkọ unu mara ọkwa oge anyanwụ ga-awa ma ọ bụ oge ọ ga-ada, ị na-ekwenye na ọ bụ eziokwu.
Onye Okike Ukwu nke ihe ndị dị n’eluigwe bụ ya n’ezie na-enye ihe ọmụma a na-ebipụta banyere oge chi ga-eji n’ehihie, oge anyanwụ ga-awa, na oge ọ ga-ada. Ma amụma nke ndị na-agba afa, ndị na-eme anwansi, ndị na-ekiri nkume crystal, na ndị na-eji kaadị akọwa ọdịnihu mmadụ sitere n’aka onye ọzọ, onye na-emegide Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Tụlee ihe anyị na-ekwu.
Onye Dị Ize Ndụ
N’Ọrụ Ndị Ozi 16:16-19, ihe ndekọ dị nsọ na-akọ na “otu nwa agbọghọ” nọ n’obodo ochie bụ́ Filipaị na-ewetara ndị nwe ya ọtụtụ uru site “n’ibu amụma ụgha.” Otú ọ dị, akụkọ ahụ na-ekwu hoo haa na onye na-agwa ya ihe ọ ga-ebu n’amụma abụghị Onye Okike pụrụ ime ihe nile, kama ọ bụ “mmụọ nke a na-akpọ Paịtọn.” N’ihi ya, mgbe Pọl onyeozi chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, nwa agbọghọ ahụ enwekwaghị ike o ji ebu amụma.
Mgbe anyị ghọtara na amụma ndị dị otú ahụ na-esi n’aka ndị mmụọ ọjọọ, anyị ga-ahụ ihe mere Iwu Chineke nyere Israel ji kwuo, sị: “A gaghị ahụta n’etiti gị . . . onye na-ajụ ase, ma ọ bụ onye na-eji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ma ọ bụ onye na-agba afa, ma ọ bụ onye mgbaasị, ma ọ bụ dibịa nrafu, ma ọ bụ onye na-ajụ mmụọ ihe, ma ọ bụ dibịa afa . . . n’ihi na ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ.” (Deuterọnọmi 18:10-12) N’eziokwu, Iwu ahụ kwuru na omume ndị dị otú ahụ bụ ịda iwu ntaramahụhụ ya bụ ọnwụ.—Levitikọs 19:31; 20:6.
Ọ pụrụ ịtụ gị n’anya ịmata na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-akwado ọtụtụ omume nkwenkwe ụgha yiri ndị na-adịghị emerụ ahụ. Ma, Bible na-ekwu na Setan “na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrint 11:14) Setan na ndị mmụọ ọjọọ ọ na-achị pụrụ ime ka omume ndị jọgburu onwe ha yie ndị na-adịghị emerụ ahụ, ọbụna yie ndị bara uru. Mgbe ụfọdụ, ha pụrụ imepụta ihe àmà ma mee ka ha mezuo, na-eduhie ndị na-ahụ ha ruo n’ókè nke iche na ihe àmà ndị dị otú ahụ sitere n’aka Chineke. (Tụlee Matiu 7:21-23; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:9-12.) Nke a na-akọwa ihe mere amụma ụfọdụ ndị na-azọrọ na ha nwere ike pụrụ iche buru ji emezu mgbe ụfọdụ.
Otú ọ dị, ọtụtụ, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ihe ka n’ọtụtụ, ná ndị na-azọrọ na ha nwere ike pụrụ iche bụ ndị aghụghọ, nanị ndị wayo, bụ́ ndị dị njikere ịghọnara ego n’aka ndị dị mfe nghọgbu. Ma hà bụ ndị aghụghọ ma ọ bụ na ha abụghị, Setan na-eji ha nile eme ihe n’ụzọ dị irè iji wepụ uche ndị mmadụ n’ebe Jehova nọ, na-eme ka ha kpuo ìsì n’ebe “ozi ọma nke ebube” dị.—2 Ndị Kọrint 4:3, 4.
Ọgwụ “Chi Ọma” na Ikpere Arụsị
Gịnịkwa banyere ọgwụ “chi ọma” na usoro nkwenkwe ụgha ndị mmadụ na-eji eme ihe iji nweta echiche nke nchebe na nchịkwa n’ebe ihe ndị na-eme ná ndabata ná ndụ dị? Ndị a na-akpata ọtụtụ ihe ize ndụ ndị siri ike nghọta. Dị ka ihe atụ, onye nwere nkwenkwe ụgha pụrụ isi otú ahụ na-ahapụrụ ike ndị a na-adịghị ahụ anya ndụ ya ka ha na-achịkwa. Ọ naghị atụgharị uche ma chee ezi echiche n’ihe, kama ime nke ahụ, ọ na-atụ egwu na-enweghị isi.
Otu onye edemede na-ehota ihe ize ndụ ọzọ dị na ya. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe mmadụ dabeere n’ọgwụ chi ọma maka nchebe, ọgwụ ahụ echebeghịkwa ya, onye ahụ pụrụ ịchọ ikwu na ọ bụ ihe ndị ọzọ mere kpataara [ya] ihe ndabara ọjọọ, kama ikweta na o si ya n’aka.” (Tụlee Ndị Galetia 6:7.) N’ụzọ na-akpali mmasị, onye edemede bụ́ Ralph Waldo Emerson kwuru n’otu oge, sị: “Ndị na-amachaghị ihe na-ekwenye na chi ọma . . . Ndị maara ihe na-ekwenye na ihe na-akpata ihe.”
“Ihe na-akpata ihe” nke na-eme ná ndụ anyị na-abụkarị ihe ndị na-eme ná ndabata—“mgbe na ihe ndapụta” nke na-adabara anyị nile. (Eklisiastis 9:11) Ọ bụghị ọnọdụ mberede nke “chi ọjọọ” na-akpata ihe ndị na-eme ná ndabata. Ndị Kraịst ma na usoro nkwenkwe ụgha na ọgwụ majik adịghị emetụta ihe ndị na-eme ná ndabata. Mgbe ha mere, a na-echetara anyị eziokwu Bible bụ́: “Unu bụ ndị na-amataghị ihe ga-eme echi. Ndụ unu bụ gịnị? N’ihi na unu bụ alụlụ, nke na-apụta ìhè nwa oge, e mesịa o wee pụọ n’anya.”—Jemes 4:14.
Ọzọkwa, ezi ndị Kraịst ma na a na-asọpụkarịrị ọgwụ chi ọma nakwa ememe ma ọ bụ usoro nkwenkwe ụgha. N’ihi ya, ndị Kraịst na-ele ihe nile dị otú ahụ anya dị ka ụdị dị iche iche nke ikpere arụsị, bụ́ ndị a katọrọ n’ụzọ doro anya n’Okwu Chineke.—Ọpụpụ 20:4, 5; 1 Jọn 5:21.
Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Mara Ọdịnihu
Nke a apụtaghị na ndị Kraịst adịghị eche banyere ọdịnihu. N’ụzọ megidere nke ahụ, ezi uche na-egosi na ịma ọdịnihu bara ezigbo uru. Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ mata ihe gaje ime, anyị pụrụ ime ihe kwesịrị ekwesị, n’ụzọ ga-abara anyị na ndị anyị hụrụ n’anya uru.
Otú ọ dị, ọ dị ezigbo mkpa ịchọ ihe ọmụma a n’ebe kwesịrị ekwesị. Aịsaịa onye amụma dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị mmadụ ga-agwa gị ka ị jụọ ndị na-agba afa na ndị na-ajụ mmụọ ihe ase . . . Ị ga-asị ha, ‘Ṅaanụ ntị n’ihe Onyenwe anyị na-ezi unu! Unu aṅakwala ndị na-ajụ ndị mmụọ ihe ntị—ihe ha na-agwa unu agaghị abara unu uru.’”—Aịsaịa 8:19, 20, Today’s English Version.
Onye kwesịrị ekwesị nke na-enye ezi ihe ọmụma banyere ọdịnihu bụ Onye Chepụtara Bible. (2 Pita 1:19-21) Akwụkwọ a e dere site n’ike mmụọ nsọ nwere ọtụtụ ihe àmà na-egosi na a pụrụ ịdabere n’amụma ndị Chineke pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova, buru—n’eziokwu, a pụrụ ịdabere na ha dị nnọọ ka a pụrụ ịdabere ná ngagharị nke ihe ndị ahụ dị na mbara igwe ndị “e buru amụma ha” n’ọtụtụ akwụkwọ ngụkọ oge. Iji gosi izi nnọọ ezi nke amụma Bible, tụlee ihe atụ a. Ka anyị were ya na otu onye a ma ama taa pụtara n’ọha mmadụ ma buo amụma ihe ndị ga-eme n’afọ 200 n’ihu, maka afọ 2199. Amụma ya gụnyere ihe ndị a:
◻ Nnukwu agha ga-ada n’etiti mba ndị na-abụbeghị ike ọchịchị ụwa na-ama ibe ha aka, ihe ga-esi na ya pụta ga-agbanwekwa akụkọ ihe mere eme.
◻ Usoro a ga-eji mee ihe ga-agụnye ọrụ nkà nke ga-echegharị oké osimiri ihu.
◻ A kpọrọ aha onye ga-emerinụ—ọtụtụ afọ ọbụna tupu a mụọ ya.
◻ A kọwara ihe ga-abụ ọdịnihu a kara aka nke onye a ga-emeri, na-eme ka amụma ahụ metụta ọtụtụ narị afọ ọzọ n’ọdịnihu.
Ọ bụrụ na amụma ndị a mezuru, ọ́ gaghị eme ka ndị mmadụ tụlee ihe ndị ọzọ onye a kwuru banyere ọdịnihu?
Ihe anyị ka kọwasịrị ugbu a mere eme n’ezie. Ihe dị ka afọ 200 tupu ndị Midia na ndị Peasia emerie Babilọn, Jehova, site n’aka Aịsaịa onye amụma, buru ihe ndị na-esonụ n’amụma:
◻ Nnukwu agha ga-ada n’etiti Medo-Peasia na Babilọn.—Aịsaịa 13:17, 19.
◻ Atụmatụ agha a ga-eji mee ihe ga-agụnye ime ka osimiri nchebe yiri ékpè takọọ. Ọzọkwa, a ga-eghewe ọnụ ụzọ ámá e si abanye n’obodo ahụ e wusiri ike oghe.—Aịsaịa 44:27–45:2.
◻ Aha onye ahụ ga-emerinụ ga-abụ Saịrọs—nke e buru n’amụma ihe dị ka afọ 150 tupu a mụọ ya.—Aịsaịa 45:1.
◻ Ka oge na-aga, Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.—Aịsaịa 13:17-22.
Amụma ndị a nile mezuru. Ya mere, amụma ọzọ ndị Jehova buru, ndị dị n’Okwu ya e dere ede, ó rughị eru ịbụ ihe ndị ị ga-etinye mgbalị ịtụle?
Ọdịnihu Dị Ebube nke Chineke Na-ekwe ná Nkwa
Gịnị ka Bible buru n’amụma? Bible na-ekwe nkwa na n’ụwa ọhụrụ nke Chineke ga-eweta, ọ dịghị onye ga-echegbu onwe ya n’ihi amaghị ihe ga-eme n’ọdịnihu. Rịba nkwa Chineke kwere ndị ga-ebi n’oge ahụ ama: “Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka [ndị m] maa jijiji.”—Maịka 4:4.
Bible gakwara n’ihu na-ekwe nkwa na Chineke ‘ga-asaghe aka Ya, werekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’ (Abụ Ọma 145:16) Mmezu nke nkwa ahụ ọ̀ ka ga-ewe oge? Ee e! Tupu oge eruo nnọọ, Bible buru amụma na ọnọdụ ndị anyị na-ahụ n’ụwa ugbu a bụ ihe àmà na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ” nke ajọ usoro ihe dị ugbu a.—2 Timoti 3:1-5.
N’oge na-adịghị anya Onye Okike na-ahụ n’anya ga-ewepụ ajọ ọnọdụ ndị a. Ọ ga-eme ka agha nile, bụ́ ndị na-akpata anọghị ná nchebe na ahụhụ, kwụsị. Ọzọkwa, ịkpọasị, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, mpụ, na ime ihe ike ga-aghọ ihe gara aga ruo mgbe ebighị ebi. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:10, 11.
Ezi ahụ ike so n’ọtụtụ ngọzi ndị ụmụ mmadụ ga-ama ụtọ ha n’ụwa ọhụrụ a. Ọbụna ọnwụ na iru újú na-eso ya agaghị adịkwa ọzọ. Chineke n’onwe ya na-ekwu, sị: “Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.”—Mkpughe 21:4, 5.
N’oge ahụ ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke ihe ndị na-eme ná ndabata bụ́ ndị na-akpaghasị ma na-ebibi ndụ taa ga-adakwasị. Ndị ajọ mmụọ na Setan, bụ́ ndị na-akpata egwu nkwenkwe ụgha na ajọ ụgha agaghị adịkwa. Eziokwu ndị a na-eme obi ụtọ dị na Bible.
[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
Nkwenkwe ụgha na mgbaasị nwere njikọ chiri anya
[Ebe E Si Nweta Foto]
E wezụga nwanyị nọ n’ime nkume crystal: Ihe Osise Les Wies/Tony Stone
[Foto dị na peeji nke 10]
Nkwenkwe ụgha agaghị adị n’ụwa ọhụrụ Chineke