Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g00 2/8 p. 31
  • Mgbanwe ná Ndị Na-anwụ n’Agha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbanwe ná Ndị Na-anwụ n’Agha
  • Teta!—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Kọwawo Otu Ihe Omimi Dị Egwu
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Nleta Popu Letara UN—Gịnị Ka Ọ Rụzuru?
    Teta!—1996
  • Gịnị Bụ Ọdịnihu nke Agha?
    Teta!—1999
  • Udo Adịrịghị Ndị Ozi Ụgha!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2000
g00 2/8 p. 31

Mgbanwe ná Ndị Na-anwụ n’Agha

“AGHA ndị a na-alụ taa dị iche ná ndị a lụrụ n’oge gara aga . . . Ndị nkịtị, kama ịbụ ndị agha,” na-abụwanye ndị na-anwụ na ha, ka “Echiche,” bụ́ ihe omume Redio nke òtù UN kọrọ. Dị ka ihe atụ, n’oge a na-alụ agha ụwa mbụ, nanị pasent 5 nke ndị nile nwụrụnụ bụ ndị nkịtị. Otú ọ dị, n’oge a na-alụ agha ụwa nke abụọ, ọnụ ọgụgụ ndị nkịtị nwụrụnụ rịrị elu ruo pasent 48. Taa kwa, ka Redio òtù UN kwuru, “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile na-anwụ n’agha bụ ndị nkịtị—90%—ihe ka ọtụtụ ná ndị a bụkwa ndị inyom, ụmụntakịrị na ndị agadi.”

Dị ka Olara Otunnu, bụ́ Onye Nnọchiteanya Pụrụ Iche Maka Ụmụaka na Agha nke odeakwụkwọ ukwu òtù UN si kwuo, “e gbuwo ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde ụmụaka abụọ n’ọnọdụ ndị metụtara agha eri afọ 1987.” Ná ngụkọta, nke ahụ bụ ihe karịrị ụmụaka 450 na-anwụ n’agha kwa ụbọchị n’ime afọ 12 gara aga! Ọzọkwa, n’ime otu oge ahụ, e merụwo ihe karịrị nde ụmụaka isii ahụ n’ụzọ dị njọ ma ọ bụ nye ha nkwarụ na-agaghị ala ala.

Otu ụzọ òtù UN pụrụ isi belata ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ụmuaka na-anwụ n’agha, ka Maazị Otunnu na-atụ aro ya, bụ site n’ịkpọ ụfọdụ ebe ógbè udo. “E kwesịrị iwere ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nọ na ha bụ ụmụaka, dị ka ụlọ akwụkwọ, ụlọ ọgwụ, na ámá egwuregwu, dị ka ebe ndị a na-agaghị alụ agha.” Otú ọ dị, Redio òtù UN kwukwasịrị, “igbochi agha egbochi” bụ ụzọ kasị irè òtù UN ga-esi hụ na ndị nkịtị anwụghị n’agha. N’ezie, igbochi ndị mmadụ ịnwụ n’agha na-achọ n’ezie ka e kpochapụ agha n’onwe ya. Ọ̀ dị mgbe nke ahụ ga-eme?

Ebe ihe a kpọrọ mmadụ lụworo agha ruo ọtụtụ afọ, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eche n’ụzọ ziri ezi na ọ dịghị mgbe ụmụ mmadụ ga-eweta udo zuru ụwa ọnụ. Otú ọ dị, Okwu Chineke, bụ́ Bible na-ekwe nkwa na Jehova Chineke ga-eme otú ahụ: “[Ọ] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.” (Abụ Ọma 46:9) Olee mgbe nke a ga-eme? Oleekwa ihe mere anyị pụrụ iji jide n’aka na nkwa Chineke nke udo zuru ụwa ọnụ ga-emezu? Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta azịza nye ajụjụ ndị a, biko detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ, na-eji adres kasị dịrị gị nso e depụtara na peji nke 5, ma ọ bụ gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova nke dị gị nso. Ọ dịghị ọrụ dị na ya, ọ dịghịkwa efu ego—nanị azịza ha kpọmkwem ka ị ga-enweta.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]

UN PHOTO 156450/J. Isaac

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya