Ndị Ọkachamara n’Ikpofu Unyi n’Ala Ụmụ Ahụhụ
NANỊ ihe karịrị afọ 150 gara aga, ndị mmadụ malitere imepụta usoro bụ́ ọkpọka nke ikpofu nsị na unyi. Otú ọ dị, e nweelarị ọkachamara n’ikpofu unyi—obere ahụhụ a na-ahụ n’ebe okpomọkụ America.
Otu ìgwè nke ihe dị ka otu nde ụmụ ahụhụ ndị na-akụta akwụkwọ mejupụtara, bi n’ebe obibi dị n’okpuru ala. Ụmụ ahụhụ ndị so n’ìgwè ahụ nwegasịrị ọrụ dị iche iche e kenyere ha ịrụ. Ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-achịkọta iberibe mkpá akwụkwọ, bụ́ nke ìgwè ọzọ na-atari. Ụmụ ahụhụ ndị na-elekọta gburugburu ebe obibi na-eji ihe ahụ a tariri atari eme ka nje fungus a na-eri eri pulite n’ime oghere ndị di n’ebe obibi ha. Ha na-ewepụkwa ihe ọ bụla pụrụ ịgbasa ọrịa, dị ka nje fungus ndị na-emerụ ahụ́, ụmụ ahụhụ ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ ndị na-anwụ anwụ, na ihe ndị maliteworo ire ure. Ma olee otú ụmụ ahụhụ na-esi ekpofu unyi?
Onye Britain bụ́ ọkà mmụta sayensị na Mahadum Sheffield achọtawo azịza ya, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Independent na-akọ. Na nso oghere ndị ahụhụ ndị na-elekọta gburugburu ebe obibi na-anọ arụ ọrụ, e nwere oghere ndị buru ibu karị bụ́ ebe ndị a na-ekpofu unyi. Ụmụ ahụhụ ndị na-ahụ maka ihe mkpofu na-etinye oge ha nile n’ebe ahụ, na-abọgharị unyi ahụ iji mee ka o ree, bụ́ nke, n’aka nke ya, na-ebibi nje ndị na-akpata ọrịa. Ụmụ ahụhụ ndị na-elekọta gburugburu ebe obibi adịghị abanye n’oghere ndị a na-edebe ihe mkpofu ma ọlị. Ha na-ebubata unyi n’otu ọwara, ndị na-ahụ maka ihe mkpofu abịa buru ha. Usoro a dị irè e si ekpofu unyi na-egbochi ebe ahụ ịbụ nke e metọrọ ma na-echebe ahụ́ ike nke ìgwè ụmụ ahụhụ ahụ.
Ọ bụghị nanị na Jehova Chineke kenyere ụmụ ahụhụ amamihe ebumpụta ụwa kamakwa, ihe karịrị afọ 3,500 gara aga, o nyere ụmụ Izrel ụkpụrụ nduzi dị irè maka inwe ahụ́ ike. Itinye iwu ndị a n’ọrụ ga-egbochi imetọ ihe oriri na mmiri, kwụsị mgbasa nke ọrịa ndị na-efe efe, ma hụ na a na-ekpofu nsị n’ụzọ na-adịghị ize ndụ. Lee ka a pụrụ isi zere nhụjuanya dị ukwuu na ọnwụ nke ọtụtụ mmadụ site n’ịgbaso ụkpụrụ ndị dị otú ahụ!—Levitikọs 11:32-38; Ọnụ Ọgụgụ 19:11, 12; Deuterọnọmi 23:9-14.