Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g03 9/8 p. 20
  • Nhọrọ Ndị Na-emetụta Ahụ́ Ike Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nhọrọ Ndị Na-emetụta Ahụ́ Ike Gị
  • Teta!—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụra—Ọ̀ Bụ Ihe Ọma Na-adịchaghị Mkpa Ka Ọ̀ Bụ Ihe Dị Oké Mkpa?
    Teta!—2003
  • Ihi Ụra nke Dị Gị Mkpa
    Teta!—2004
  • Olee Uru Ụra Bara?
    Teta!—2011
  • Ndị Nọ N’afọ Iri Na Ụma Na-ero Ụra—Ọ̀ Bụ Ihe Na-akpata Nchegbu?
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2003
g03 9/8 p. 20

Nhọrọ Ndị Na-emetụta Ahụ́ Ike Gị

IRI ezigbo nri na inwe ezi ahụ́ ike na-abụkarị ihe ịma aka. N’ihi nrụgide ndị a na-enwe taa, o yiri ka ọ̀ na-aka adịrị ndị mmadụ mfe iri nri ndị dị ka bred na keeki kama ịga siwe nri ọhụrụ, ọ na-adịkwara ha mfe karị iji ohere ha nwere na-ekiri TV ma ọ bụ kọmputa kama iji ya na-enwe mmega ahụ́. Otú ọ dị, nhọrọ ndị a pụrụ ịdị na-eme ka ọnụ ọgụgụ na-abawanye ụba nke ndị okenye na ụmụaka na-enwe nsogbu ahụ́ ike ndị dị njọ.

N’Eshia, ka magazin bụ́ Asiaweek na-ekwu, “iri nri ndị nwere abụba ma na-atọ bịrịbịrị nakwa àgwà ndị na-arịwanye elu nke ịnọ n’otu ebe, emewala ka ọnụ ọgụgụ mmadụ buru nnọọ ibu na-arịa ọrịa shuga.” N’ụzọ dị mwute, ọrịa ahụ na-arịakarịzi ndị na-akatabeghị ahụ́ n’etiti ọha mmadụ. Na Canada kwa, “ndị nnyocha chọpụtara na ọ bụ nanị otu onye n’ime ụmụaka asaa ọ bụla na-erubeghị afọ iri na ụma na-aracha mkpụrụ osisi ma na-eri akwụkwọ nri ruo n’ókè kwesịrị ekwesị [nakwa] na ọ bụ nanị ihe ji nke nta gafee ọkara na-egwuri egwu ruo n’ókè nke ọsụsọ ịgba ha,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail na-ekwu. Ụzọ ndụ dị otú ahụ na-eme ka ndị a na-eto eto nọrọ “n’ọnọdụ nke ịrịa ọrịa obi ngwa ngwa ka ha na-erule afọ iri atọ na ụma,” ka akụkọ ahụ na-ekwu.

N’otu aka ahụ, ndị ọkachamara banyere ụra na-ekwu na ọ pụrụ ịdị ndị toworo eto mkpa ihi ụra ruo ihe dị ka awa asatọ kwa abalị nakwa na ọ pụrụ ịdị ndị na-eto eto mkpa ihi ụra ruo ọbụna karị awa asatọ. N’ezie, n’otu nnyocha e mere na Mahadum Chicago, ụmụ okorobịa ndị ahụ́ gbasiri ike, bụ́ ndị hiri ụra nanị awa anọ kwa abalị ruo ụbọchị isii, malitere inwe mgbaàmà nke nsogbu ahụ́ ike ndị agadi na-enwekarị. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-echu onwe ha ụra ọtụtụ awa maka ọrụ, ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ ntụrụndụ, ihe ndị ga-esi na ya pụta pụrụ ịdị iche n’ihe ha bu n’uche chuo onwe ha ụra. Onye na-eme nnyocha banyere ụra na Mahadum Cornell nke New York, bụ́ James Maas, na-ekwu, sị: “Ọ bụ otu ihe ịrụ ọrụ, ọ bụkwa ihe ọzọ ịmụrụ anya, iche echiche nke ọma, ma bụrụ onye ụra na-agaghị eburu mgbe ọ na-akwọ ụgbọala n’okporo ụzọ awara awara.”

N’ezie, ihe ndị ọzọ na-emetụtakwa ahụ́ ike anyị. Dị ka ihe atụ, inwe nchekwube pụrụ iso mee ka anyị nwee ezi ahụ́ ike. Inwekwa ezi nzube ná ndụ pụrụ ịkpali anyị ime nhọrọ ndị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe ezi ahụ́ ike.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya