Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g04 4/8 p. 28-29
  • Ihe Dị Mma Karịa Ime Mgbanwe Nkịtị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Dị Mma Karịa Ime Mgbanwe Nkịtị
  • Teta!—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpu A Na-eti Maka Mgbanwe
    Teta!—2004
  • Jizọs Agwọọ Ndị Ìsì, Nyekwara Zakịọs Aka
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ndị Na-eti Mkpu Maka Mgbanwe Hà Ga-agwọta Nsogbu Ndị E Nwere?
    Teta!—2004
  • Jisọs Akụzie Ihe na Jeriko
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2004
g04 4/8 p. 28-29

Ihe Dị Mma Karịa Ime Mgbanwe Nkịtị

Ọ BỤRỤ na osisi na-amị mkpụrụ na-abaghị uru, a gaghị edozi nsogbu ahụ site n’igbupụ alaka ole na ole na ya. A ghaghị igbutu osisi ahụ ma bụpụsịa mkpọrọgwụ ya. Mgbe ahụ, a kụọ osisi ọzọ, nke ga-amị ezi mkpụrụ.—Matiu 7:16-20.

N’ihi otu ihe ahụ, ọbụna ndị ahụ ji ebumnobi ndị kasị mma eme mgbanwe, na-agbalị idozi nanị ihe mgbaàmà nke ihe ọjọọ ndị a na-eme n’obodo—nrụrụ aka, ikpe na-ezighị ezi, nnapụ, na ohi. Otú ọ dị, ha akpabeghịdị ihe na-akpata ha aka. Ihe ọ dị mkpa ka a gbanwee bụ usoro ihe ahụ nile. Nke a bụ ihe Bible na-ekwe nkwa ya.

Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe nke ga-eme ihe karịrị nnọọ ịkpụgharị, ịhazigharị, ma ọ bụ ịgbanwe ọha mmadụ. Ọchịchị ahụ ga-eguzobe ụzọ dị nnọọ ọhụrụ nke isi na-achịkwa ihe omume ụmụ mmadụ, na-eme ka ihe nile a kpọrọ mmadụ dịrị n’otu n’okpuru ịchịisi ya. Ọchịchị a ga-edozi nsogbu ndị metụtara agụmakwụkwọ, ọrụ, ụlọ, nri, ahụ́ ike, na gburugburu ebe obibi.

Abụ Ọma 72:12-14 na-akọwa n’ụzọ amụma, ihe Eze Mezaịa ahụ ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha.”

Ma, ọ bụrụ na a gaje ikpochapụ nrụrụ aka, ikpe na-ezighị ezi, na nnapụ n’etiti ọha mmadụ, n’ezie, ọ bụghị nanị ọchịchị bụ ihe na-aghaghị ịgbanwe kama ndị mmadụ aghaghịkwa ịgbanwe. N’ihi ya, Alaeze ahụ ga-enye onye ọ bụla nduzi banyere ụzọ ọ ga-esi na-ebi ndụ na-enye ọṅụ, nke nwere nzube, na nke na-akwụghachi ụgwọ. Bible na-ekwe nkwa na Alaeze Chineke ga-enyere ndị ọ ga-achị n’ụwa aka ime mgbanwe n’onwe ha. N’ụzọ dị aṅaa?

Alaeze ahụ ga-akụziri ndị ọ ga-achị ụzọ nke Jehova Chineke, si otú ahụ na-enyere ha aka ịzụlite okwukwe na ịhụnanya. (Aịsaịa 11:9) Ịhụnanya n’ebe Chineke nọ na-akpali obi ime ihe. Dị ka ihe atụ, na narị afọ mbụ, Jizọs zutere Zakịọs, onyeisi ndị ọnaụtụ, bụ́ onye na-afọju akpa ya site n’ịtụkwasị ihe n’ego ole e kwuru ka ndị mmadụ na-atụ n’ụtụ isi. Jizọs emenyeghị onye ọrụ Bekee a na-arụrụ aka ihere iji mee ka ọ gbanwee ụzọ ya. Kama nke ahụ, Jizọs nyeere Zakịọs aka ịhụ ebe ọ na-adịghị emezi emezi ma chegharịa. Ezi ihe ọmụma nke ụkpụrụ Chineke na inwe ịhụnanya n’ebe Ọ nọ, kpaliri Zakịọs ime ihe. O mere mgbanwe ndị dị ịrịba ama.—Luk 19:1-10.

Nke ahụ ọ́ bụghị ihe ngwọta ka mma maka amaghị eme nke ọha mmadụ? Ọchịchị zuru okè ma zie ezi nke ga-elekọta ihe omume nke ihe a kpọrọ mmadụ, tinyere ndị mmadụ n’otu n’otu ịbụ ndị a kwaliri ịgbanwe ụzọ ha. N’oge ahụ, ọ̀ ga-adị anyị mkpa itiwe mkpu ka e mee mgbanwe? Ọ gaghịzi adị anyị mkpa, ebe ọ bụ na Chineke ga-emewo ihe nile ka ha dị ọhụrụ. Ihe mbụ ga-agabigawo.—Mkpughe 21:4, 5.

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Alaeze Chineke ga-eweta, ọ bụghị mgbanwe nkịtị, kama mgbanwe zuru ezu

[Foto dị na peeji nke 29]

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nyeere ndị mmadụ n’otu n’otu aka ime mgbanwe n’onwe ha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya