Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/08 p. 12-13
  • Ònye Chepụtara Baịbụl?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Chepụtara Baịbụl?
  • Teta!—2008
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmadụ Iri Anọ Dere Ya, Otu Onye Chepụtara Ya
  • O “Si n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke”
  • Aka Ụmụ Mmadụ Kpara Ya
  • Baịbụl nke Zuru Ezu
  • Olee Otú Chineke Si Duzie Odide Bible?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ònye Dere Baịbụl?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • ‘Mmụọ Nsọ Duru Ha’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Baịbụl Ò Si “n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke” n’Eziokwu?
    Teta!—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2008
g 1/08 p. 12-13

Echiche Baịbụl

Ònye Chepụtara Baịbụl?

BAỊBỤL kwuru ndị dere ya n’ezoghị ọnụ. Akwụkwọ dị iche iche nke Baịbụl ji okwu ndị dị ka “okwu Nehemaya,” “ọhụụ Aịzaya,” na “okwu Jehova nke ruru Joel . . . ntị,” malite. (Nehemaya 1:1; Aịzaya 1:1; Joel 1:1) N’akụkọ ụfọdụ e dere n’ime ya, e kwuru na ọ bụ Gad, Netan, ma ọ bụ Samuel dere ya. (1 Ihe E Mere 29:29) N’okwu mmeghe nke ọtụtụ abụ ọma ndị dị na Baịbụl, e dere aha onye bụrụ nke ọ bụla n’ime ha.—Abụ Ọma 79, 88, 89, 90, 103, na 127.

Ebe ọ bụ na e ji ụmụ mmadụ dee Baịbụl, ndị na-ekwu na ọ bụghị Okwu Chineke sịrị na Baịbụl bụ akwụkwọ ụmụ mmadụ ji amamihe dee dị ka akwụkwọ ọ bụla ọzọ. Ma, ihe a ha na-ekwu ọ̀ bụnụ eziokwu?

Mmadụ Iri Anọ Dere Ya, Otu Onye Chepụtara Ya

Ọtụtụ ndị so dee Baịbụl kwuru na ọ bụ Jehova, onye naanị ya bụ ezi Chineke, nyere ha ikike ide ihe ndị ha dere, nakwa na ọ bụ Ya ma ọ bụ mmụọ ozi Ya nke nọchiri anya Ya duziri ha. (Zekaraya 1:7, 9) Ndị amụma ndị dere Akwụkwọ Nsọ Hibru kwuru ihe karịrị narị ugboro atọ, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru.” (Emọs 1:3; Maịka 2:3; Nehọm 1:12) Ọtụtụ n’ime ihe ha dere ji okwu ndị dị ka “okwu Jehova wee ruo Hosia . . . ntị,” malite. (Hosia 1:1; Jona 1:1) Pita onyeozi kwuru banyere ndị amụma Chineke, sị: “Ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.”—2 Pita 1:21.

Ya mere, Baịbụl bụ otu akwụkwọ nke nwere akụkụ dị iche iche. Ọtụtụ ndị ikom ndị dere ya kwuru na ọ bụ Chineke mere ka ha dee ihe ndị ha dere. Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ na Chineke ji ndị odeakwụkwọ bụ́ ụmụ mmadụ dee echiche ya. Olee otú o si mee nke a?

O “Si n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke”

Pọl onyeozi kọwara, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) N’asụsụ Grik, okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “si n’ike mmụọ nsọ Chineke” pụtara n’ụzọ nkịtị “Chineke kunyere ume.” Nke a pụtara na Chineke ji ike ya a na-adịghị ahụ anya duzie uche ndị dere Baịbụl, si otú ahụ mee ka ha mata ihe ọ chọrọ ka ha dee. Ma, ọ bụ Jehova n’onwe ya dere Iwu Iri ahụ ná mbadamba nkume abụọ. (Ọpụpụ 31:18) Mgbe ụfọdụ, Chineke gwara ndị ohu ya bụ́ ụmụ mmadụ ihe ha ga-ede, Ya na-ekwu ha ana-ede. Ọpụpụ 34:27 sịrị: “Jehova wee gaa n’ihu ịsị Mozis: ‘Deere onwe gị okwu ndị a . . . ’”

N’oge ndị ọzọ, Chineke mere ka ụmụ mmadụ hụ ihe ndị ọ chọrọ ka ha dee n’ọhụụ. Ọ bụ ya mere Ezikiel ji sị: “M wee hụ ọhụụ Chineke.” (Ezikiel 1:1) N’otu aka ahụ, “Daniel rọrọ nrọ ma hụ ọhụụ mgbe o dina n’elu ihe ndina ya. O wee dee nrọ ahụ n’akwụkwọ n’oge ahụ.” (Daniel 7:1) Ọ bụkwa otú ahụ ka e si gwa Jọn onyeozi ihe o dere n’akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl, bụ́ Mkpughe. Jọn dere, sị: “Site n’ike mmụọ nsọ, anọrọ m n’ụbọchị Onyenwe anyị, m wee nụ olu nke na-adasi ike ka opi n’azụ m. Olu ahụ sịrị: ‘Dee ihe ị na-ahụ n’akwụkwọ mpịakọta.’”—Mkpughe 1:10, 11.

Aka Ụmụ Mmadụ Kpara Ya

Na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ emeghị ka akparamàgwà ndị dere ya ghara ịbata n’ihe ha dere. N’eziokwu, ndị so dee ya gbara mbọ nke onwe ha iji dee ihe Chineke gwara ha. Dị ka ihe atụ, onye dere akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ekliziastis kwuru na ya “gbara mbọ ịchọta okwu dị ụtọ na ide okwu ziri ezi bụ́ eziokwu.” (Ekliziastis 12:10) Mgbe Ezra na-ede akụkọ ihe mere eme ndị o dere, o lebara anya ma ọ dịkarịa ala n’akwụkwọ iri na anọ ndị ọzọ, ndị dị ka ‘ihe ndekọ nke ihe ndị mere n’ụbọchị Eze Devid’ nakwa ‘n’Akwụkwọ Ndị Eze Juda na Izrel.’ (1 Ihe E Mere 27:24; 2 Ihe E Mere 16:11) Luk bụ́ onye dere Oziọma Luk dere ya ‘n’usoro n’usoro n’ihi na o si ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi.’—Luk 1:3.

Akwụkwọ ụfọdụ nke Baịbụl mere ka a matatụ ụdị mmadụ ndị dere ha bụ. Dị ka ihe atụ, Matiu, onye a na-akpọ Livaị, bụ́ onye ọnaụtụ tupu ya aghọọ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs, na-edenyekarị ole ihe ọ na-ekwu banyere ya dị. N’ime ndị niile dere banyere ndụ na ozi Jizọs, ọ bụ naanị ya dere na ego ole e ji rara Jizọs nye bụ “mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.” (Matiu 27:3; Mak 2:14) Luk, bụ́ ọgwọ ọrịa, dere kpọmkwem ụdị ọrịa a gwọrọ ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-akọwa ihe na-arịa ụfọdụ ndị Jizọs gwọrọ, o kwuru banyere onye “oké ahụ́ ọkụ” na-esogbu na “nwoke nke ekpenta zuru ahụ́.” (Luk 4:38; 5:12; Ndị Kọlọsi 4:14) Ya mere, mgbe mgbe Jehova kwere ka ndị dere Baịbụl jiri okwu nke aka ha dee ihe ndị ha dere, deekwa ha otú ha onwe ha si chọọ. Ma n’otu mgbe ahụ, o duziri uche ha ka ihe ha dere bụrụ kpọmkwem ihe ọ chọrọ ka ha dee, ziekwa ezie.—Ilu 16:9.

Baịbụl nke Zuru Ezu

Ọ́ bụghị ihe ịtụnanya na ndị ikom iri anọ nọ n’obodo dịgasị iche iche n’agbata otu puku afọ na narị afọ isii, ndị biri n’obodo dịgasị iche iche, dere otu akwụkwọ nke nwere nnọọ otu olu, nweekwa otu isiokwu magburu onwe ya? Nke a agaraghị ekwe omume ma á sị na ọ bụghị otu Onye nke chepụtara ya duziri ha niile.

Ọ bụrụ na Jehova ejighị ụmụ mmadụ dee Okwu ya, ọ̀ pụtara na o nweghị otú ọzọ o nwere ike isi dee ya? Mbanụ. Ma, o mere nke a iji gosi na ọ maara ihe. N’ezie, otu n’ime ihe mere Baịbụl ji amasị ma onye ukwu ma onye nta bụ maka na ndị dere ya gosiri otú obi na-adị ụmụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, Eze Devid gosiri na obi na-ama onye mmehie chegharịrị echegharị ikpe, bụ́ onye na-arịọ ka Chineke meere ya ebere.—Abụ Ọma 51:2-4, 13, 17, okwu mmeghe ya.

Ọ bụ ezie na Jehova ji ụmụ mmadụ dee Baịbụl, anyị pụrụ inwe ụdị obi ike ahụ Ndị Kraịst oge gboo nwere, bụ́ ndị nabatara Akwụkwọ Nsọ “ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

◼ Ònye chepụtara “Akwụkwọ Nsọ dum”?—2 Timoti 3:16.

◼ Olee ụzọ ndị Jehova bụ́ Chineke si mee ka ndị dere Okwu ya mata ihe ọ chọrọ ka ha dee?—Ọpụpụ 31:18; 34:27; Ezikiel 1:1; Daniel 7:1.

◼ Ihe ndị ikom si n’ike mmụọ nsọ dee Baịbụl dere, olee otú ò si gosi ụdị mmadụ ha bụ nakwa ihe ndị na-amasị ha?—Matiu 27:3; Luk 4:38.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya