Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 10/09 p. 18
  • Ijidesi Aka Nri Chineke Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ijidesi Aka Nri Chineke Ike
  • Teta!—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Ha Chọpụtaworo na Jezreel?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Nkà Mmụta Ọdịdị Ụwa nke Bible Ò Ziri Ezi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Mụ Onwe M, Bụ́ Jehova Chineke Gị, Sekpụ Gị n’Aka Nri Gị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Mgbe Nchegbu Banyere Ọdịdị Ahụ́ Ghọrọ Ihe Na-echu Ụra
    Teta!—2004
Teta!—2009
g 10/09 p. 18

Ijidesi Aka Nri Chineke Ike

◼ Jezreel, onye bi na Mexico, bu otu ọrịa akpụkpọ ahụ́ a na-adịghị ahụkebe pụta ụwa. Ọrịa a na-eme ka akpụkpọ ahụ́ ya na-akpọ nkụ ma na-ewe iwere. Jezreel, sịrị: “Ọrịa a mere ka m na-asọ oyi n’anya, ma ọ naghị efe efe.”

Mgbe Jezreel dị obere, a gbalịrị ịgwọ ya n’ụlọ ọgwụ dị iche iche. N’otu ụlọ ọgwụ a kpọgara ya mgbe ọ dị afọ abụọ, e dowere ya n’ebe naanị ya na-anọ, e mekwara ka ebe ahụ dị ezigbo ọcha ka ọ ghara ibute nje ọ bụla. Ma ihe a niile emeghị ka nsogbu ya ka mma. Ndị ụlọ ọgwụ nyeziiri ya aka ịma otú ọ ga-esi na-edi otú ndị mmadụ si emeso ya.

Ndị chere na ọrịa Jezreel na-efe efe na-eze ya eze. Otú a ndị mmadụ si eze ya eze adịghịrị ya mfe idi mgbe ọ dị obere, karịchaa ma ọ chọọ ka ya na ụmụaka ndị ọzọ gwuo egwu. O chetara otu ihe merenụ, sị, “Ha na-eji m eme ihe ọchị ma na-akpọ m aha ọjọọ ndị dị ka ozu a gbasiri agbasi na onye si n’ụwa ọzọ.”

Ma ọrịa a a na-ahụ anya emeela ka Jezreel nwee ohere ịkọrọ ndị ọzọ banyere olileanya o nwere n’ihi ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl. Ndị mmadụ na-ajụkarị ya ma ọkụ ọ̀ gbara ya. Ọ bụrụ na ọ sị ha mba, ha ajụzie ya ihe mere akpụkpọ ahụ́ ya ji dị otú ọ dị. Ọ na-akọwaziri ha otú ọrịa akpụkpọ ahụ́ ahụ si eme ya, gwakwa ha na e nwebeghị otú e si agwọ ya.

Ọ na-agwakwa ha, sị: “Enwere m olileanya kacha mma n’ụwa, n’ihi na Jehova Chineke kwere nkwa na ndị niile na-erube isi n’iwu ya ga-adị ndụ n’ụwa ọhụrụ nke ọrịa na ahụ́ mgbu na-agaghị adị.” (Mkpughe 21:3, 4) Otú a Jezreel si na-akọwara ndị mmadụ banyere ọrịa a ọ na-arịa emeela ka o nweta ndị ha na ya na-amụ Baịbụl. Ọ na-enyekwa ya ọṅụ ịhụ ka ọtụtụ n’ime ha na-aghọ ndị ha na ya na-efekọ Chineke.

Jezreel sịrị: “Obi dị m ụtọ na a mụrụ m n’ezinụlọ Ndị Kraịst, nakwa na m nwere ezigbo ndị enyi bụ́ Ndịàmà Jehova ibe m. Ọ dịghị onye n’ime ha na-agbara m ọsọ n’ihi otú m dị. E mere m baptizim mgbe m dị afọ iri na asaa, enweekwala m ọtụtụ ohere ijere Onye kere m ozi kemgbe afọ iri na anọ e mechara m baptizim.”

Jezreel na-echeta okwu na-agba ume Jehova kwuru n’Aịzaya 41:10, 13, ebe na-agụ, sị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. . . . M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie gị ike. N’ihi na mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”

Ijidesi aka nri Jehova ike enyerela Jezreel aka ka ọ ghara ịna-echegbu onwe ya banyere otú ndị mmadụ si ele ya anya, o nyekwarala ya aka idi nsogbu niile ọrịa ya ahụ kpataara ya. O so ọtụtụ nde ndị ọzọ na-atụ anya oge Chineke ga-emezu nkwa ndị mara mma o kwere.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya