Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Gịnị Mere Ndị Mụrụ m Anaghị Ekwe M Soro Ndị Ọzọ Kporie Ndụ?
Allisona bụ nwa agbọghọ bi n’Ọstrelia. Ọ bịa akwụkwọ n’ụtụtụ Mọnde ọ bụla, ahụ́ anaghị eru ya ala.
Ọ sịrị: “Ihe onye ọ bụla na-akọ bụ ihe o mere ná ngwụcha izu. Ha na-akọ akụkọ ndị na-atọgbu onwe ha, dị ka oriri ndị ha gara, ụmụ okorobịa ole ha na ha susuru ọnụ, nakwa otú ha si gbanahụ ndị uwe ojii . . . Ụjọ ga na-atụ gị ma ha na-akọ ya, ma ihe ndị ha na-akọ na-atọgbu onwe ya! Ha na-alọta n’elekere ise n’isi ụtụtụ, ọ naghịkwa ewe ndị mụrụ ha iwe. Tupu ya eruodị oge ha ji agawa ebe ndị ha na-aga n’abalị, ndị mụrụ m agwala m gaa lakpuo!
“Ọ na-abụ ụmụ akwụkwọ ibe m kọchaara m ihe ndị ha mere ná ngwụcha izu, ha ajụọ m ihe ndị mụnwa mere. Gịnịkwanụ ka m mere? Agara m ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, gaakwa ozi ọma. Ọ na-adị m ka a naghị ekwe m mee ihe ndị ga-enye m obi ụtọ. Ihe m na-agwakarị ha bụ na o nweghị ihe m mere. Ihe ha na-ajụzi m bụ ihe mere na esoghị m ha gaa.
“Ị ga-eche na ụbọchị Mọnde gafee, ihe aka mma. N’ebeekwanụ! O ruhaala Tuzdee, ihe onye ọ bụla na-ekwuzi bụ ihe ha ga-eme ná ngwụcha izu nke na-abịa abịa! Ihe m na-emekarị bụ ịnọ na-egere ihe ndị ha na-ekwu. Ọ na-adị m nnọọ ka m̀ bụ onye a jụrụ ajụ!”
Ọ̀ NA-ADỊ gị otú ahụ n’ụlọ akwụkwọ unu n’ụtụtụ Mọnde ọ bụla? O nwere ike na-adị gị ka ò nwere ebe ndị na-eto eto ibe gị nọ n’èzí na-egwuri egwu ma ndị mụrụ gị ekweghị gị pụta èzí, ma ọ bụkwanụ ya adị gị ka ebe a kpọ gị gaa oriri na nkwari ma e kweghị gị detụ ihe ọ bụla ọnụ n’ebe ahụ. Ọ bụghị na ị chọrọ ime ihe niile ndị na-eto eto ibe gị na-eme. Naanị ihe ị chọrọ bụ ka a na-enwetụkwanụ oge a na-ahapụ gị ka i kporie ndụ! Dị ka ihe atụ, olee nke n’ime ihe ndị a e ji atụrụ ndụ ị ga-akacha achọ ime ná ngwụcha izu na-abịa abịa?
◯ ịga ebe a na-agba egwú
◯ ịga ebe a na-eti egwú
◯ ịga ebe a na-eme ihe nkiri
◯ ịga oriri na nkwari
◯ ihe ọzọ ․․․․․
Ọ dị mma ka ị na-ekpori ndụ. (Ekliziastis 3:1, 4) Nke bụ́ eziokwu bụ na Onye kere gị chọrọ ka i kporie ndụ n’oge ị na-eto eto. (Ekliziastis 11:9) Ndị mụrụ gị chọkwara ka i kporie ndụ, n’agbanyeghị na ọ ga-esiri gị ike ikweta mgbe ụfọdụ. Ma e nwere ihe abụọ dị mkpa ndị mụrụ gị ga-echebara echiche, ha bụ: (1) ihe ị ga-eme ma ị gaa na (2) ndị gị na ha ga-eso aga.
Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị enyi gị akpọọ gị ka gị na ha gaa kporie ndụ ma ị maghị ihe ndị mụrụ gị ga-eme ma ị gwa ha? E nwee ihe ị ga-ekpebi ma ị̀ ga-eme ma ọ bụ na ị gaghị eme, Baịbụl gwara gị ka i chebara ihe ndị i nwere ike ime echiche, ma nke ọma ma nke ọjọọ, nakwa ka i chee echiche n’ihe ihe nke ọ bụla i kpebiri ime ga-akpatara gị. (Diuterọnọmi 32:29; Ilu 7:6-23) Ugbu a ndị enyi gị kpọrọ gị ka unu gaa kporie ndụ, olee ihe ndị i nwere ike ime?
NKE MBỤ: AGWALA HA—GAWA.
Ihe mere ị ga-eji achọ ime ya: Ị chọrọ ka ndị enyi gị mara na ị bụghịzi nwata, na ị bụghịzi onye a na-atụrụ ihe niile ọ na-eme. I weere ndị mụrụ gị ka ndị na-amaghị nke a na-akọ, ma ọ bụkwanụ ị na-eleda ndị mụrụ gị anya.—Ilu 15:5.
Ihe ndị ọ ga-akpatara gị: Ndị enyi gị ga-eji ya mara na ị ga-aghọgbuli mmadụ. Ọ bụrụ na ị ga-aghọgbuli ndị mụrụ gị, ọ pụtara na ị ga-aghọgbulikwa ndị enyi gị. Ndị mụrụ gị mechaa chọpụta, ọ ga-ewute ha, o nwekwara ike ime ka ha kwụsị gị ịga ebe ndị ọzọ ị chọrọ ịga! Inupụrụ ndị mụrụ gị isi nakwa ịga ebe ọ bụla n’agwaghị ha agwa bụ izuzu nzuzu.—Ilu 12:15.
NKE ABỤỌ: AGWALA HA—AGALA.
Ihe mere ị ga-eji achọ ime ya: I chebarala iso ndị enyi gị gaa echiche ma chọpụta na ihe a ga-eme ebe ahụ adịghị mma ma ọ bụkwanụ na ụfọdụ ndị ga-aga ya enweghị àgwà ọma. (1 Ndị Kọrịnt 15:33; Ndị Filipaị 4:8) O nwekwara ike bụrụ na ị chọrọ ịga, ma obi akaghị gị ịgwa ndị mụrụ gị.
Ihe ndị ọ ga-akpatara gị: Ọ bụrụ na ị gaghị n’ihi na ị ma na ọ dịghị mma ịga, obi ga-akakwu gị ịgwa ndị enyi gị ahụ na ị gaghị aga. Ma, ọ bụrụ na ihe mere na ị gaghị bụ n’ihi na obi akaghị gị ịgwa ndị mụrụ gị, i nwere ike nọrọ n’ụlọ, obi ana-agbawa gị, gị ana-eche na naanị gị bụ onye na-anaghị ekpori ndụ n’ụwa a.
NKE ATỌ: GWA HA—MARA IHE HA GA-EKWU.
Ihe mere ị ga-eji achọ ime ya: Ị ghọtara na ị nọ n’okpuru ndị mụrụ gị, ị na-erubekwara ha isi. (Ndị Kọlọsi 3:20) Ị hụrụ ndị mụrụ gị n’anya; ị makwa na ị pụọ n’agwaghị ha agwa, ọ ga-ewute ha. (Ilu 10:1) I nwekwara ohere ịgwa ha ihe bụ mkpa gị.
Ihe ndị ọ ga-akpatara gị: Ndị mụrụ gị ga-ama na ị hụrụ ha n’anya nakwa na ị na-erubere ha isi. Ha chọpụtakwa na ihe ị rịọrọ ha adịghị njọ, ha nwere ike ikwe gị gaa.
Ihe Mere Ndị Mụrụ Gị Nwere Ike Iji Sị Gị Agala
Ma ọ́ bụrụkwanụ na ndị mụrụ gị asị gị agala? O nwere ike iwe gị ezigbo iwe. Ma, ị ghọta ihe mere ha ji sị gị agala, ọ ga-enyere gị aka ka ị ghara iwe iwe. Dị ka ihe atụ, ihe mere ha ji sị gị agala nwere ike ịbụ n’ihi otu n’ime ihe ndị a a kọwara n’okpuru ebe a ma ọ bụ karịa.
Ha tọrọ gị, kakwa gị mara ihe. Ọ bụrụ na a sị gị họrọ ebe ị ga-aga egwu mmiri, o nwere ike, ebe ị ga-ahọrọ bụ ebe e nwere ndị na-agụpụta ndị mmiri chọrọ iri. Maka gịnị? Maka na mgbe mmiri ị na-egwu na-atọ gị ụtọ, ọ ga-esiri gị ike ịma mgbe ị banyewere ná nsogbu. Ma ndị ahụ na-agụpụta onye mmiri na-achọ iri na-anọ n’ebe ha ga-ahụ ndị na-egwu mmiri nke ọma, nke na-eme ka ha na-ahụ nsogbu ọ bụla na-abịanụ.
Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị mụrụ gị. Ebe ọ bụ na ha tọrọ gị, karakwa gị mara ihe, ha nwere ike ịma nsogbu ndị nwere ike ịdapụta ma gịnwa agaghị ama. Otú ahụ ndị ọrụ ha bụ ịgụpụta onye mmiri na-achọ iri na-agaghị egbochi gị igwu mmiri otú ga-atọ gị ụtọ, otú ahụkwa ka ndị mụrụ gị na-ebughị n’obi igbochi gị ikpori ndụ. Kama, ha chọrọ inyere gị aka ka ị ghara ịdaba ná nsogbu ndị nwere ike ime ka ị taa ahụhụ n’ọdịnihu.
Ha hụrụ gị n’anya. Ndị mụrụ gị achọghị ka ihe ọjọọ ọ bụla mee gị. Ọ bụ maka na ha hụrụ gị n’anya mere ha ji ekweta ka i mee ihe ụfọdụ mgbe o kwesịrị ka ha kweta ma jụ ikweta mgbe o kwesịrị ka ha jụ. O nwee ihe ị chọrọ ka ha kwe gị mee, ihe ha na-ajụ onwe ha bụ: ‘Anyị kwe ya mee ihe a, ànyị ga-ebulikwa ihe ga-esi na ya pụta?’ Ọ bụ naanị mgbe o doro ha anya na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla ga-eme gị ka ha ga-ekweta ka i mee ihe ahụ ị chọrọ ime.
Ha aghọtachaghị ihe ị chọrọ ime. Nne na nna ndị hụrụ ụmụ ha n’anya na-akpachara anya n’ihe ọ bụla gbasara ụmụ ha ka ụmụ ha ghara ịbanye ná nsogbu. Ọ bụrụ na ha aghọtaghị ihe ị chọrọ ime, ma ọ bụkwanụ ya dị ha ka ò nwere ihe ụfọdụ dị mkpa gbasara ihe ahụ ị chọrọ ime ị na-agwabeghị ha, ha nwere ike ịjụ.
Ihe Ị Ga-eme Ka Ha Nwekwuo Ike Ịsị Gị Gaa
O nwere ihe anọ ị ga-eme.
Gwa ha eziokwu: Buru ụzọ gwa onwe gị eziokwu. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee nnọọ ihe mere m ji chọọ ịga? Ọ̀ bụ na ihe a ga-eme ebe ahụ na-amasị m ka m̀ chọrọ ịga ya n’ihi na ndị ọgbọ m na-aga ya? Ọ̀ bụ maka na e nwere nwa agbọghọ ma ọ bụ nwa okoro m nwere mmasị n’ebe ọ nọ ga-abịa ebe ahụ?’ Gwazie ndị mụrụ gị eziokwu. O nwere mgbe ha hà ka gị, ha makwa gị nke ọma. N’ihi ya, ọ bụrụgodị na ị gwaghị ha ihe i bu n’obi, ha ka nwere ike ịchọpụta. Obi ga-adị ha ụtọ ma ị gwa ha eziokwu, ndụmọdụ ha ga-abakwara gị uru. (Ilu 7:1, 2) Ma ọ bụrụ na ị gwaghị ha eziokwu, ị ga-eme ka ha ghara ịtụkwasị gị obi, meekwa ka o siere ha ike ịsị gị gawa.
Gwa ha ya n’oge kwesịrị ekwesị: Arịọla ndị mụrụ gị ihe mgbe ha ka si ọrụ lọta ma ọ bụ mgbe ha nwere ihe ọzọ dị mkpa ha na-eme. Rịọ ha ihe ị chọrọ ịrịọ ha mgbe ahụ́ ruru ha ala. Ma echerela ruo mgbe oge i ji aga ihe ahụ rurula eru tupu ị gwawa ha ya, ma siwe ọnwụ ka ha gwa gị ma ị̀ ga-aga ma ọ bụ na ị gaghị aga. Ndị mụrụ gị agaghị achọ iji ọkụ ọkụ kpebie ihe ha ga-agwa gị. Jụọ ha ya n’ezigbo oge, obi ga-adịkwa ha mma na ị gwara ha ya n’oge.
Gwa ha ihe niile gbasara ya: Ezochirila ha ihe ụfọdụ gbasara ihe ahụ ị chọrọ ịga. Gwa ha hoo haa ihe a ga-eme n’ebe ahụ ị chọrọ ịga. Obi anaghị adị ndị nne na nna mma ma nwa ha sị ha, “Amaghị m,” nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha jụrụ nwa ahụ, sị: “Olee ndị ga-abịa ya?,” “À ga-enwe onye toro eto ga-abịa ya,” ma ọ bụkwanụ “Olee oge unu ga-eji emecha ya?”
Gwa ha okwu otú dị mma: Elela ndị mụrụ gị anya ka hà bụ ndị iro gị. Were ha ka ndị gị na ha na-achụ otu ihe, n’ihi na n’eziokwu, gị na ha na-achụ otu ihe. Ọ bụrụ na i were ndị mụrụ gị ka ndị gị na ha na-achụ otu ihe, ị ga-ewetu obi rịọ ha ihe, nke ahụ ga-emekwa ka ha chebara ihe ahụ ị na-arịọ ha echiche. Ọ bụrụ na ha ajụ, jiri nwayọọ jụọ ha ihe mere ha ji jụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ha asị na ị gaghị aga ebe a na-eti egwú, gbalịa chọpụta ihe mere ha ji sị gị agala. Ọ̀ bụ n’ihi ụdị onye ga-akụ egwú ahụ, ebe a ga-akụ ya, ndị ga-abịa ebe ahụ, ma ọ bụkwanụ ego ole a ga-akwụ tupu a banye ebe ahụ? Agwala ha ihe ndị dị ka, “Unu atụkwasịghị m obi,” “Ndị ọzọ niile ga-agacha,” ma ọ bụ “Nne na nna ndị enyi m na-ekwecha ha gaa!” Gosi ndị mụrụ gị na ị ma na ihe ọ bụla ha kpebiri dị mma nakwa na ị ga-anabata ya. I mee otú ahụ, ha ga-akwanyere gị ùgwù. O nwekwara ike n’oge ọzọ, ha ga-eme ihe niile ha nwere ike ime iji kwe gị gaa.
Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụghị ezigbo aha ya.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]
“Ihe mere ndị mụrụ m ji ekweta ihe m gwara ha bụ n’ihi na ana m agwa ha eziokwu. M na-eme ka ha mata ndị mụ na ha na-akpa. Ha makwa na m gaa ebe a na-eme oriri na nkwari, e mewe ihe ọ bụla m ma na ọ dịghị mma, na m ga-esi ebe ahụ pụọ.”
[Foto]
Kimberly
[Igbe dị na peeji nke 20]
JỤỌ NDỊ MỤRỤ GỊ
Ị̀ chọrọ ịma ihe ndị mụrụ gị chere n’okwu a? Naanị otú ị ga-esi ama bụ ịjụ ha! Ị chọpụta mgbe ọ ga-adaba adaba ịgwa ha okwu, jụọ ha ihe mere na ha anaghị ekwe ka i soro ndị ọzọ na-ekpori ndụ. Chepụta otu ajụjụ ị ga-achọ ịjụ ha, deekwa ya n’okpuru ebe a.
․․․․․
[Foto dị na peeji nke 20]
Ndị ọrụ ha bụ ịgụpụta onye mmiri chọrọ iri na-aka ndị na-egwu mmiri ama ihe na-eme ná mmiri. Otú ahụkwa ka ndị mụrụ gị ka gị mara ihe nwere ike ime ka ị banye ná nsogbu