Nke 2—Na-elebara Onwe Gị Anya
“Ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya.” (Ndị Efesọs 5:29) Ọ bụrụ na i mee ihe ndị dị mkpa iji lebara onwe gị anya, ọ ga-eme ka ahụ́ dịkwuo gị mma.
◯ Na-ezu ike nke ọma. “Obere ezumike dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè na ịchụso ifufe.” (Ekliziastis 4:6) N’oge anyị a, ndụ gbalụ gbalụ na mere nke a mere nke a na-eme ka ndị mmadụ ghara inwe oge ha ji ehi ụra. Ma ka ahụ́ nwee ike na-adị mmadụ mma, ọ dị ezigbo mkpa na ọ ga na-ehi ụra. Nchọpụta ndị e mere gosiri na ọ bụ mgbe anyị na-arahụ ụra ka ahụ́ anyị na ụbụrụ anyị na-emezi ihe ndị mebiri na ha, nke na-eme ka anyị nwee ike ịna-eche echiche nke ọma nakwa ka obi na-adị anyị mma.
Ihi ụra na-eme ka ihe na-alụso ọrịa ọgụ n’ahụ́ anyị na-arụ ọrụ nke ọma. Ọ na-emekwa ka ọ ghara ịdịrị anyị mfe ibu oké ibu, ịdakarị mbà n’obi, inwe ọrịa ndị nje na-akpata, ọrịa shuga, ọrịa strok, ọrịa obi, ọrịa kansa, ma ọ bụdị ọrịa Alzheimer. Kama iji ihe ndị dị ka swiit, kọfị, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-achụ ụra, ọ ka mma ịrahụ ụra n’ihi na ọ bụ ihe Chineke mere ka ọ na-enyere ahụ́ anyị aka. Ọtụtụ ndị toro eto kwesịrị ịna-ehiru ụra awa asaa ma ọ bụ asatọ n’abalị ọ bụla tupu ha enwee ike ịdị mma n’anya, dị garagara, ma rụọ ọrụ ha otú kwesịrị. Ndị na-eto eto kwesịrị ihi ụra karịa otú ahụ. Ndị na-eto eto, ndị na-adịghị ehi ụra nke ọma, na-arịakarị ọrịa na-emetụta ụbụrụ ha, ụra na-eburukarịkwa ha ma ha nyawa ụgbọala.
Mgbe anyị kwesịrị ịna-ehi ụra karịchaa bụ mgbe anyị na-arịa ọrịa. Ọ bụrụ na ọrịa ụfọdụ, dị ka azụ̀zụ̀, ji anyị aka ọjọọ, naanị ihikwu ụra na ịṅụ nnukwu mmiri nwere ike ime ka anyị gbakee.
◯ Na-elebara ezé gị anya. Ọ bụrụ na ọ na-abụ i richaa nri, gị ataa atụ ma ọ bụ jiri brọsh saa ezé gị ma were eriri e mere maka iwepụ ihe ndị kpafanyere n’ezé wepụsịa ihe ndị kpafanyere gị n’ezé, karịchaa tupu ị lakpuo ụra, ọ ga-eme ka ezé gị ghara ire ure, nje aghara ịbanye n’agbụ̀ gị, ezé gị agharakwa ịdapụ. Ọ bụrụ na anyị enweghị ezé, o nwere ike nri ndị anyị na-eri agaghị na-abachara anyị uru. Nchọpụta e mere na-egosi na enyí anaghị anwụ n’ihi na ha akaala nká, kama agụụ na-egbu ha mgbe ike gwụrụ ezé ha nke na ha enweghịzi ike ịta ihe nke ọma. Ụmụaka ndị mụtarala iji brọsh asa ezé ha, ndị na-ejikwa eriri e ji ewepụsị ihe kpafanyere n’ezé ewepụsị ihe kpafanyere ha n’ezé ma ha richaa nri, na-aka agbasi ike mgbe ha na-eto eto nakwa ná ndụ ha niile.
◯ Na-aga ụlọ ọgwụ. E nwere ọrịa ụfọdụ e kwesịrị ịgara ụlọ ọgwụ. Ịchọpụta ihe na-arịa mmadụ n’oge na-eme ka a gwọta onye ahụ ngwa ngwa, na-emekwa ka a ghara imefu oké ego. N’ihi ya, ọ bụrụ na ahụ́ adịchaghị gị, kama ịṅụ ọgwụ ga-akwụsịtụ ya, gbalịa gaa ụlọ ọgwụ ka a chọpụta ihe na-eme gị ma gwọọ gị.
Ịga ụlọ ọgwụ mgbe niile ka a na-ele gị ahụ́ nwere ike ime ka ị gbaara ọtụtụ nsogbu ọsọ, otú ahụ nwaanyị dị ime nke na-aga ụlọ ọgwụ mgbe niile ga-esikwa agbara nsogbu ọsọ.a Ma buru n’obi na ndị dọkịta anaghị arụ ọrụ ebube. Ọ bụ naanị mgbe Chineke ga-eme ka ‘ihe niile dị ọhụrụ’ ka ọrịa niile ga-ala.—Mkpughe 21:4, 5.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Gụọ isiokwu bụ́ “Healthy Mothers, Healthy Babies,” nke dị na Teta! (Bekee) November 2009.