Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 9/14 p. 12-13
  • Otú Ị Ga-esi Na-akwụsi Ike n’Ihe I Kwuru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Na-akwụsi Ike n’Ihe I Kwuru
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI ESI IKE
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Otú Ị Ga-esi Chebe Ụmụ Gị
    Teta!—2007
  • Kụziere Ụmụ Gị Ka Ha Na-erube Isi
    Teta!—2015
  • Uru Mmadụ Ijide Onwe Ya Bara
    Teta!—2019
  • Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Na-agha Ụgha
    Teta!—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 9/14 p. 12-13
Nwatakịrị chọrọ iwere ụgbọala ụmụaka ma papa ya ekweghị

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Otú Ị Ga-esi Na-akwụsi Ike n’Ihe I Kwuru

IHE MERE O JI ESI IKE

Nwa gị anaghị ekwe ekwe mgbe ọ bụla ị jụrụ imere ya ihe o kwuru. Ị jụ imere ya ihe o kwuru, ya ebido ibe ákwá. O nweghịkwa ihe ị ga-eme ma ọ bụ kwuo ga-eme ka o mechie ọnụ naanị ma i mere ihe ahụ. O bekatazie ákwá, gị emeere ya ihe ahụ ị jụrụ ime.

Ị ga-amụtali otú ị ga-esi na-akwụrụ n’ihe i kwuru. Ka anyị buru ụzọ kwuo ihe ụfọdụ i kwesịrị ịma.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ịjụ ime ihe nwa gị kwuru apụtaghị na ị na-emegbu ya emegbu. Ụfọdụ ndị nne na nna na-eche na ha kwesịrị imere nwa ha ihe ọ bụla o kwuru nakwa na ha kwesịrị ịrịọ ya ma ọ bụ kọwaara ya ihe mere ha ji jụ ime ihe ahụ. Ha na-ekwu na nwa ha ga-ewe iwe ma ha jụ ime ihe o kwuru.

Nke bụ́ eziokwu bụ na obi agaghị adị nwa gị mma ma ị jụ ime ihe ọ chọrọ. Ma, ọ ga-akụziri ya ezigbo ihe. Ọ ga-amụta na ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ na-enweta ihe ọ chọrọ n’ụwa a. Ọ bụrụ na ọ na-abụ ị jụ imere nwa gị ihe o kwuru, e mechaa gị emeere ya ihe ahụ maka na ọ na-ebe ákwá, ọ gaghị na-eji ihe i kwuru akpọrọ ihe. Ọ ga-emekwa ka ọ na-ebe ákwá mgbe ọ bụla ị jụrụ imere ya ihe ọ chọrọ n’ihi na ọ ma na ya besie ákwá ike, i meere ya ihe ahụ. Ka oge na-aga, o nwere ike ime ka nwa gị wesawa gị iwe ma ị jụ ime ihe o kwuru. Ị manụ na ọ bụrụ na ị naghị akwụrụ n’ihe i kwuru, nwa gị agaghị na-akwanyere gị ùgwù.

Ị jụ ime ihe o kwuru, ị na-akụziri ya otú ọ ga-esi na-akpa àgwà ọma ma o too. Ọ ga-amụta na mmadụ ileghara ihe na-agụ ya agụụ anya mgbe ụfọdụ bara uru. Ọ bụrụ na nwa gị amụta na ịhapụ ihe ụfọdụ bara uru, ọ ga-enyere ya aka mgbe ọ na-eto. Ọ ga-eme ka ọ jụ iso ndị ọgbọ ya na-aṅụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụkwanụ na-akwa iko.

Ọ bụrụ na ị na-ajụ imere nwa gị ihe ụfọdụ, ị na-azụ ya ka ọ ghọọ mmadụ. Otu ọkachamara aha ya bụ David Walsh sịrị, “N’eziokwu, ọ bụghị ihe niile mmadụ chọrọ ka ọ na-enweta n’ụwa a. Ụmụ anyị agaghị aba uru ma ọ bụrụ na anyị na-akụziri ha na mmadụ ga na-enweta ihe ọ bụla ọ chọrọ.”

IHE I NWERE IKE IME

Lekwasị anya n’ihe ị chọrọ. Ị chọrọ ka ihe gaziere nwa gị, ka ọ baa uru, ka ọ na-ejidekwa onwe ya. Ma, ọ bụrụ na ị na-enye ya ihe ọ bụla ọ nara gị, ọ gaghị abụ ụdị onye ahụ. Baịbụl gosiri na ọ bụrụ na a zụtọọ nwata, o too, ọ ga na-atụ anya na ọ ga na-enweta ihe ọ bụla ọ chọrọ. (Ilu 29:21) N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-ajụ imere nwa gị ihe ọ chọrọ mgbe ụfọdụ, ị na-azụ ya ka ọ baa uru. Ọ ga-amụtakwa ihe na ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 19:18.

Amala ọnụ jijiji. Gị na nwa gị abụghị ọgbọ. N’ihi ya, ọ baghị uru ka gị na ya rụwa ụka ka à ga-asị na ọ bụ ya ga-agwa gị ihe ị ga-eme. Ka ụmụaka na-eto, ha kwesịrị ịzụ ikike nghọta ha azụ, ka ha nwee ike na-amata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. (Ndị Hibru 5:14) N’ihi ya, ọ dịghị njọ ma gị na nwa gị na-akparịta ihe ụfọdụ. Ma, gị na ya ekwesịghị ịnọ na-arụ ụka banyere ihe mere i ji jụ ime ihe o kwuru. Ọ bụrụ na gị na ya anọrọ na-arụ ụka mgbe niile banyere ihe mere i ji jụ, ọ ga na-agba ihe ọ bụla i kpebiri ụkwụ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Efesọs 6:1.

Kwụrụ n’ihe i kwuru. Nwa gị nwere ike bewe ákwá ma ọ bụ rịọwa gị arịrịọ ka ọ mara ma ị ga-agbanwe obi gị. Ọ bụrụ na o mee ihe a mgbe unu nọ n’ụlọ, gịnị ka ị ga-eme? Ihe otu akwụkwọ kwuru banyere ịzụ ụmụaka kwuru bụ: ‘Gwa ya ka ọ gaa n’ime ụlọ nọrọ, obi ya dajụọ, ya pụta. Gwakwa ya na ị chọghị ịnụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ikwu maka na ị gaghị agbanwe obi gị.’ O nwere ike isitụrụ gị ike na mbụ ịgwa nwa gị ụdị ihe a, nwa gị nwekwara ike iche na ị na-egwu egwu. Ma, ọ ga-ege gị ntị ma ọ chọpụta na ị na-akwụ n’ihe i kwuru.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Jems 5:12.

Ya abụla mgbe ọ bụla nwa gị kwuru ihe ị ga-emere ya, gị ajụ, ka i wee gosi ya na ọ bụ gị mụrụ ya

Adịla na-esi ọnwụ mgbe niile. Ya abụla mgbe ọ bụla nwa gị kwuru ihe ị ga-emere ya, gị ajụ, ka i wee gosi ya na ọ bụ gị mụrụ ya. Kama, na-eme ihe otú na-egosi na i “nwere ezi uche.” (Ndị Filipaị 4:5) Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ihe ụfọdụ i kwesịrị imere nwa gị. Ma, i kwesịghị ịna-emere ya ihe o kwuru maka na ọ na-ebe ákwá ma ọ bụ na-esi ọnwụ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 3:21.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Nye nwa gị ntaramahụhụ mgbe olileanya ka dị.”—Ilu 19:18.

  • “Ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi.”—Ndị Efesọs 6:1.

  • “Ka Ee unu bụrụ Ee, ka Ee e unu bụrụkwa Ee e.”—Jems 5:12.

  • “Unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.”—Ndị Kọlọsi 3:21.

ỊJỤ IME IHE ỤFỌDỤ NWA GỊ CHỌRỌ BARA URU

Otu ọkachamara aha ya bụ David Walsh kwuru, sị, “Ndị nne na nna na-achọ ka obi na-adị ụmụ ha mma mgbe niile. Ma, ọ bụrụ na o nweghị mgbe ihe ị na-eme na-ewe nwa gị iwe ma ọ bụ wute ya, mara na ị na-azụtọ ya. Ọ bụrụ na ị naghị eme ihe ga-ewute nwa gị oge ụfọdụ, olee otú ọ ga-esi mụta ịna-edi ihe ndị mmadụ ga-eme ya ma o too? Ọ bụrụ na ị naghị akụziri nwa gị otú ọ ga-esi na-ejide onwe ya, olee ebe ọ ga-amụta ya? Ọ bụ gị kwesịrị ịkụziri ya na ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ na-enweta ihe ọ chọrọ n’ụwa a.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya