Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 7/15 p. 12-13
  • Ihe Unu Ga-eme Ka Unu Ghara Itisa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Unu Ga-eme Ka Unu Ghara Itisa
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI ESI IKE
  • 1 Kpebie Na Ị Gaghị Ahapụ Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị
    Teta!—2018
  • Ụzọ Isi Mee Ka Alụmdi na Nwunye Gị Sikwuo Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ihe nke Abụọ: Ime Ka Obi Ha Dum Dịrị n’Alụmdi na Nwunye Ha
    Teta!—2010
  • Ime Ka Obi Gị Dum Dịgide n’Ebe Nwunye Gị Ma Ọ Bụ Di Gị Nọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 7/15 p. 12-13
Ebe di na nwunye na-ebi n’udo kpapụrụ akpapụ mgbe snoo na-ada

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Ihe Unu Ga-eme Ka Unu Ghara Itisa

IHE MERE O JI ESI IKE

Ụbọchị unu gbara akwụkwọ, unu kwere ibe unu nkwa na unu agaghị ahapụ ibe unu nakwa na unu ga-agbakọ aka na-edozi nsogbu ọ bụla unu ga-enwe. Nkwa a dị ezigbo mkpa n’ihi na naanị ihe kwesịrị ikewa unu bụ ọnwụ.

Ma, o nwere ike ịbụ na nghọtahie ụfọdụ unu na-enwe kemgbe ahụ emeela ka unu ghara ịdịcha ná mma. Obi gị ọ̀ ka dị ná nkwa ahụ i kwere?

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ebe di na nwunye nọ n’ụgbọ mmiri e kegidere n’ikpere mmiri

Otú ahụ arịlịka si ejide ụgbọ mmiri ka nkwa di na nwunye kwere ibe ha si eme ka ha ghara itisa

Nkwa i kwere ga-enyere gị aka. Obi anaghị esi ọtụtụ ndị ike ikwe nkwa. Ụfọdụ chere na mmadụ ikwe nkwa bụ ike onwe ya agbụ. Kama iche ụdị ihe a, buru n’obi na nkwa i kwere di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-eme ka unu na-ebi n’udo. Otu nwaanyị aha ya bụ Megan kwuru na mgbe di na nwunye na-ese okwu, nkwa ha kwere ibe ha ga-eme ka obi sie ha ike na ha agaghị ahapụ ibe ha.a Ọ bụrụ na obi esie gị ike na o nweghị ihe ga-eme ka unu tisaa, ọ ga-eme ka unu gbaa mbọ dozie nghọtahie ọ bụla unu nwere.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ahapụla Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ese okwu, i kwesịrị ịgba mbọ mezuo nkwa ahụ i kwere ya, ọ bụghị ileghara ya anya. Olee otú ị ga-esi eme ya?

IHE I NWERE IKE IME

Kpebie na ị gaghị ahapụ di gị ma ọ bụ nwunye gị. Ị nụ ka a na-ekwu na mmadụ lụhaala di ma ọ bụ nwaanyị na ọ lụchaala, ọ̀ na-adị gị ka e keela gị agbụ tọgbọ, ka ọ̀ na-emesi gị obi ike? Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị see okwu, ihe mbụ na-agbata gị n’obi ọ̀ bụ ịhapụ ya? Ọ bụrụ na ị ghọta na di na nwunye ekwesịghị ịhapụ ibe ha, ọ ga-eme ka i mezuo nkwa ahụ i kwere.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Matiu 19:6.

Eṅomila papa gị na mama gị ma ọ bụrụ na ha tisara. Ụfọdụ ndị na-akpaso di ha ma ọ bụ nwunye ha àgwà otú papa ha na mama ha si kpasoo ibe ha. Otu nwaanyị aha ya bụ Lea kwuru, sị: “Papa m na mama m gbara alụkwaghịm mgbe m ka bụ nwata. O mere ka m na-eche ma ò nwere uru ọ bara di na nwunye ịnọgide na-ebi n’agbanyeghị nsogbu ha na-enwe.” Ọ bụghị iwu na ị ga-eme ihe papa gị na mama gị mere. Obi sie gị ike na i nwere ike ime ihe dị iche.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Galeshia 6:4, 5.

Agwala di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu ọjọọ. Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwee nghọtahie, agwala ya ihe ndị ị ga-emecha kwaara mmakwaara. Dị ka ihe atụ, agwala ya na ị ga-ahapụrụ ya ụlọ ma ọ bụkwanụ na ị na-aga ịchọrọ onye ga na-eme gị obi ụtọ. Ịgwa ya ụdị ihe a gosiri na i jighị nkwa ahụ i kwere ya ụbọchị unu gbara akwụkwọ kpọrọ ihe. Kama ime ka ihe dị mma, ọ ga-eme ka unu gwawa ibe unu okwu ọjọọ. Kama ịgwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ụdị okwu a, i nwere ike ịsị ya: “M ma na iwe ji anyị abụọ ugbu a, ma olee otú anyị ga-esi dozie nsogbu a?”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 12:18.

Na-eme ihe ndị ga-egosi na di gị ma ọ bụ nwunye gị dị gị ezigbo mkpa. Dowe foto di gị ma ọ bụ nwunye gị n’ebe ị na-arụ ọrụ. Na-ekwu okwu ọma gbasara ya. Gbalịa na-akpọ ya na fon mgbe ọ bụla ị nọghị n’ụlọ. I kwuwe okwu, na-ekwu gbasara unu abụọ. I nwere ike ịsị “mụ na nwunye m,” ma ọ bụ “mụ na di m.” I mee ihe a niile, ị na-agwa onwe gị na i jighị di gị ma ọ bụ nwunye gị egwu egwu, ndị ọzọ ga-ejikwa anya ha hụ na ọ bụ eziokwu.

Mete ndị ị ga-amụta ezigbo ihe n’aka ha enyi. I nwere ike ịmụta ihe bara uru n’aka ndị di na nwunye ndị na-ekweghị ka nsogbu kewaa ha kemgbe ọtụtụ afọ ha biwere. Jụọ ha otú imezu nkwa ha kwere na ha abụọ agaghị ahapụ ibe ha sirila nyere ha aka. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ ígwè ka a na-eji amụcha ígwè. Otú ahụ ka ihu mmadụ na-amụcha ihu mmadụ ibe ya.” (Ilu 27:17) Ọ bụrụ na i soro ihe a Baịbụl kwuru, ị ga-amụta ihe n’aka ndị di na nwunye na-ekweghị ka ihe ọ bụla kewaa ha.

a Baịbụl kwuru na mmadụ nwere ike ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụrụ na ọ kwara iko. Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Baịbụl Kwuru—Mgbe Di ma Ọ Bụ Nwunye Mmadụ Kwara Iko.” Isiokwu a dị na Teta! a.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”​—Matiu 19:6.

  • “Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.”​—Ndị Galeshia 6:5, footnote.

  • “Onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.”​—Ilu 12:18.

AHAPỤLA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ

Ụlọ Nche Septemba 15, 2003 kwuru na ọ bụrụ na di na nwunye ji ibe ha kpọrọ ihe, ịhapụ ibe ha agaghị na-agbata ha n’uche. Ha chewe otú ihe nwere ike ịdị n’ọdịnihu, obi na-esi ha ike na ha ka ga-abụkwa di na nwunye n’oge ahụ, e nweghịkwa otú itisa si abata ha n’obi. Iche echiche otú ahụ ga-eme ka ha abụọ kwụsie ike. Ụlọ Nche ahụ kwukwara ihe otu nwaanyị kwuru. Ọ sịrị: ‘Ọ bụrụgodị na m na-ewesa di m iwe, ma ọ bụkwanụ na nsogbu anyị na-enwe mere ka obi na-ajọ m njọ, ụjọ anaghị atụ m na anyị ga-etisa. Ihe na-echegbukarị m bụ otú anyị ga-esi ekpezi. Ma, obi na-esi m ike na o nweghị ihe ga-eme ka anyị ghara ikpezi.’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya