Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 11/15 p. 12-13
  • Ihe Ị Ga-eme ma Ị Laghachi n’Ụlọ Unu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ị Ga-eme ma Ị Laghachi n’Ụlọ Unu
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI E SI IKE
  • Ètoruola m ibiri nke onwe m?
    Teta!—2010
  • Ètoruola M Ịga Biri nke Onwe M?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsịlata Imefu Ego?
    Teta!—2006
  • Ijizi Ego Ejizi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 11/15 p. 12-13
Ebe di na nwunye na-emepere nwa ha nwoke lọghachiri n’ụlọ ha ụzọ ka ọ kwabata ngwongwo ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Ihe Ị Ga-eme ma Ị Laghachi n’Ụlọ Unu

IHE MERE O JI E SI IKE

O nwere mgbe ụfọdụ ndị na-eto eto na-ahapụ papa ha na mama ha gaa biri nke ha. Ihe siwere ha ike, ha alaghachi. Ụdị ihe a ò metụla gị?

Ọ naghị adị mfe onye na-eto eto ịlaghachi n’ụlọ papa ya na mama ya, ọ bụrụgodị na ha na ya dị ná mma. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Chiomaa kwuru, sị: “Mgbe naanị m bi, m na-ahụ onwe m ka onye toro eto n’ihi na m na-ekpebiri onwe m ihe m na-eme. Ma, mgbe m lọghachiri n’ụlọ anyị, ọ dị m ka m̀ malitere ụwa n’isi.” Otu nwa okorobịa aha ya bụ Obinna kwukwara ụdị ihe a Chioma kwuru. Ọ sịrị: “Achọghị m ịlaghachi n’ụlọ anyị. Ma, o nweghị ihe ọzọ m ma m ga-eme. M bịara yie onye na-abaghị uru.”

Ọ bụrụ na ị nọ n’ụdị ọnọdụ a, isiokwu a ga-enyere gị aka.

IHE NA-AKPATA YA

Okwu ego. Ọtụtụ ndị na-eto eto gara biri onwe ha anaghị ama ihe ha ga-eme eme mgbe ha chọpụtara na mmadụ ịkpa afọ ya abụghị obere ihe. Obinna anyị kwupụrụ okwu ya kwuru na ego niile dị ya n’aka gwụrụ mgbe ya gara biri onwe ya. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ugochi. Ọ hapụrụ ụlọ nne na nna ya mgbe ọ dị afọ iri abụọ na anọ. Ma mgbe otu afọ na ọnwa isii gafere, ọ laghachiri. O kwuru, sị: “A sị na mụ na papa m na mama m bi, ego gaara na-afọdụ m n’aka. O nweghị ego m ji pụọ, ma eji m ndị mmadụ ụgwọ mgbe m lọtara.”b

Enweghị ọrụ. A chụọ onye gara biri onwe ya n’ọrụ, ihe nwere ike ịmalite siwere ya ike a sịgodị na ọ na-elekọtabu onwe ya. Ọ bụ ụdị ihe a mere Ugochi. O kwuru, sị: “Mgbe m gụchara akwụkwọ, enwetara m ọrụ. Ma, ike gwụrụ m mgbe a chụrụ m n’ọrụ. Enweghịkwa m olileanya inweta ụdị ọrụ ahụ m na-arụbu n’ime obodo m bi.”

Ihe adịghị otú mmadụ tụrụ anya ya. Ụfọdụ ndị na-eto eto amaghị na mmadụ ịkpa afọ ya abụghị obere ihe. Ha malite ịrụ ọrụ, ha na-achọpụta na ọ dịghị mfe otú ha chere na ọ ga-adị. Ọ dị otú a, ọ na-edo ha anya na mmadụ ibiri onwe ya ma na-akpa afọ ya adịghị mfe. N’obi ha niile, ha amaghị na ọ bụ otú ahụ ka ụwa na-adị.

IHE I NWERE IKE IME

Gwa papa gị na mama gị na ị chọrọ ịlọta. E nwere ihe ụfọdụ gị na nne na nna gị nwere ike ịkpa akpa. Nke mbụ, gwa ha oge ị ga-anọru n’ụlọ unu. Nke abụọ, gị na ha kwurịta otú ị ga-esi na-enye aka akwụ ụgwọ ihe ụfọdụ n’ụlọ. Nke atọ, unu kwuo otú ị ga-esi na-enye aka n’ọrụ dị́ n’ụlọ unu. Nke anọ abụrụ otú ị ga-esi na-akpata ego ị ga-eji na-egbo mkpa gị. N’agbanyeghị afọ ole ị dị, i kwesịrị irubere nne na nna gị isi ebe ọ bụ na gị na ha bizi.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ọpụpụ 20:12.

Adịla na-emefu ego. Otu akwụkwọ kọwara na otú mmadụ si eri ego ya na-egosi ma ego ọ̀ ga na-afọdụ onye ahụ n’akpa. Ọ kọwakwara na ọ dị mma ma ọ bụrụ na mmadụ aghara ịna-emefu ego n’ihe na-adịghị ya mkpa.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Luk 14:28.

Mụta ihe n’aka ndị ọzọ. Nne gị na nna gị ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ torola eto nwere ike inyere gị aka ka ị mụta otú ị ga-esi na-ahazi ego gị nakwa otú ị ga-esi na-emefu ya ka ọ ghara ibu gị aka. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Adamma kwuru, sị: “Ebidoro m n’isi mụwa ihe m kwesịrị ịna-eme. Otu enyi m nyeere m aka ka m depụtachaa ihe ndị dị́ m mkpa na ihe ndị na-adịghị m mkpa. Mgbe m dechara ha, achọpụtara m na ọtụtụ ihe m na-eji ego m azụ bụ ihe ndị na-enweghị oké uru ha na-abara m. Adụrụ m onwe m ọdụ na ihe ga-enyere m aka ma m biri onwe m bụ ịmụta iji ego eme ihe ndị bara uru.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 13:10.

Ihe dị mkpa abụchaghị ụdị ọrụ ị na-arụ, kama ọ bụ otú o si doo gị anya

Gbaa mbọ nweta ọrụ. Jiri oge ahụ ị nọ nkịtị chọwa ọrụ. Ndị mmadụ nwere ike ịna-agwa gị na naanị ọrụ i kwesịrị ịrụ bụ nke dị gị n’obi kemgbe ụwa. Ma, ọ bụrụ na obi gị adịrị naanị n’ịrụ ọrụ ahụ na-agụ gị agụụ kemgbe ụwa, o nwere ike ime ka o siere gị ike inweta ọrụ. O nwekwara ike ime ka ọrụ ọ bụla ị hụrụ ghara ịdị gị mma n’anya. Kama ịnọ na-achọ naanị otu ọrụ dị gị n’obi, kpebie ịrụ ọrụ ọ bụla ị hụrụ. Ihe dị mkpa abụchaghị ụdị ọrụ ị na-arụ, kama ọ bụ otú o si doo gị anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ọrụ edoo mmadụ anya, aka esiekwa ya ike na ya, ịrụ ya ga na-atọ ya ụtọ. Nke a gosiri na ihe ga-eme ka ọrụ mmadụ na-atọ ya ụtọ abụghị ịrụ ọrụ dị́ ya n’obi.

a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b N’Amerịka, ụmụ akwụkwọ mahadum na-enwekarị ụdị nsogbu a. Otu akwụkwọ akụkọ Amerịka kwuru na ọ bụrụ na nwa akwụkwọ biiri ego kwụọ ụgwọ akwụkwọ, ya gụchaa, ọ na-eji ihe karịrị nde naịra isii n’ụgwọ.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Sọpụrụ nna gị na nne gị.”—Ọpụpụ 20:12.

  • “Ọ̀ dị onye n’ime unu nke chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka o wee hụ ma ò nwere ihe ga-ezu iji wuchaa ya?”—Luk 14:28.

  • “Ndị na-agba izu na-enwe amamihe.”—Ilu 13:10.

MAKA NDỊ NNE NA NNA

Malite mgbe gị na ụmụ gị ka bi kụziwere ha ihe ndị ga-enyere ha aka ma ha mechaa biri onwe ha. Otu n’ime ihe unu ga-akụziri ha bụ ka ha ghara ịna-emefu ego. Ihe ọzọ bụ ịkụziri ha otú e si aga ozi ụfọdụ n’ụlọ dị ka isi nri, ịsa ákwà, ide ákwà nakwa otú ha ga-esi na-arụzi ihe ụfọdụ n’ụgbọala. Ihe ọzọkwa dị mkpa unu ga-akụziri ha bụ otú ha na ndị mmadụ ga-esi na-emekọ ihe.

Ka unu nwee ike inyekwuru ụmụ unu aka, gụọnụ akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè,Nke 1, peeji nke 305 na 306. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa na www.jw.org/ig. Ị gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya